Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/10 p. 9
  • Ihe nke Asaa: Ịtọ Ntọala Siri Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe nke Asaa: Ịtọ Ntọala Siri Ike
  • Teta!—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
    Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
  • Ndị Di na Nwunye Hà Pụrụ Iguzogide Nsogbu Ndị Yiri Oké Ifufe?
    Teta!—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2010
g 1/10 p. 9

Ihe nke Asaa: Ịtọ Ntọala Siri Ike

Gịnị ka ọ pụtara? A naghị anọkata nwee ezinụlọ bụ́ a kwaa akwụrụ, otú ahụ ụlọ bụ́ a kwaa akwụrụ na-anaghị anọkata dịwa. Ụlọ a chọrọ ka ọ bụrụ a kwaa akwụrụ ga-enwe ntọala siri ike, otú ahụ ka ọ dịkwa ezinụlọ. Ihe na-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ bụ na ha na-ege ntị n’ezigbo ndụmọdụ.

Gịnị mere o ji dị mkpa? E biela ọtụtụ akwụkwọ na magazin ndị e ji enye ndụmọdụ gbasara ezinụlọ, nweekwa ndụmọdụ ndị nke a na-enye na tiivi. Ụfọdụ ndị na-enye ndụmọdụ n’okwu alụmdi na nwunye na-agwa di na nwunye na-ese okwu ka ha abụọ ghara ịgbasa, ebe ndị ọzọ na-agwa ha ka ha gbasaa. Ndị ọkachamara n’okwu di na nwunye na-agbanwekwa echiche ha. Dị ka ihe atụ, na 1994, otu ọkachamara a ma ama n’ileba anya ná nsogbu ndị na-eto eto na-enwe kwuru na ọtụtụ afọ gara aga mgbe ya bidoro ọrụ ya, na ya chere na “ọ na-akara ụmụaka mma ma ha na naanị papa ha ma ọ bụ naanị mama ha biri n’obi ụtọ karịa ha na nne na nna ha ndị na-esekarị okwu ibi. Echekwara m na ịgba alụkwaghịm ka mma karịa di na nwunye idiwe nsogbu ha na-enwe.” Ma mgbe ọ rụrụ ọrụ ahụ iri afọ abụọ, echiche ya gbanwere. Ọ sịrị: “Ịgba alụkwaghịm na-akpatara ọtụtụ ụmụaka nsogbu.”

Echiche ndị mmadụ na-agbanwe agbanwe, ma ndụmọdụ kacha mma e nwere ike inweta ga-agbakwasịrịrị ụkwụ n’ihe Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru. Malite na peeji nke 3 ruo nke 8 na magazin a, ị ga-achọpụta na e nwere otu amaokwu Baịbụl e dere n’elu peeji nke ọ bụla. Amaokwu Baịbụl ndị ahụ enyerela ọtụtụ ezinụlọ aka inwe ezigbo obi ụtọ. Ha na-enwekwa nsogbu otú ahụ ezinụlọ ndị ọzọ na-enwe. Ma ihe dị iche bụ na ezinụlọ ndị nke na-enwe obi ụtọ ji ihe Baịbụl kwuru tọọ ntọala siri ike, ya emee ka alụmdi na nwunye ha na ndụ ezinụlọ ha ka mma. O kwesịghị iju anyị anya na Baịbụl na-aba uru otú a n’ihi na Jehova Chineke, Onye chepụtara ihe e dere na ya, bụ Onye Malitere ezinụlọ.—2 Timoti 3:16, 17.

Megodị ihe a. Jiri akwụkwọ depụta amaokwu Baịbụl ndị ahụ e dere n’elu peeji nke 3 ruo nke 8. Denyekwa amaokwu Baịbụl ndị ọzọ baarala gị uru. Dewezie ya ebe aka gị ga-eru ya ngwa ngwa, na-agụkwa ha mgbe niile.

Kpebie ihe ị ga-eme. Kpebie ịna-eme ihe Baịbụl kwuru n’ezinụlọ unu.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọ bụrụ na ezinụlọ unu na-eme ihe Baịbụl kwuru, unu ga-emerili nsogbu unu na-enwe otú ahụ ụlọ ntọala ya siri ike na-agaghị ada ma oké ifufe fewe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya