Echiche Baịbụl
Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Anyị Wepụta Otu Ụbọchị Pụrụ Iche n’Izu Anyị Ga-eji Na-efe Ya?
N’ỤWA niile, ọtụtụ nde ndị Alakụba, ndị Juu na ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst wepụtara otu ụbọchị pụrụ iche n’izu ha ji ekpe okpukpe. Ọ̀ bụ maka gịnị? Dị ka ihe atụ, e nwere otu onye Alakụba aha ya bụ Ibrahim. Nwoke a anaghị eji ịga ụka ha na Fraịdee egwu egwu n’ihi na ọ bụ ụbọchị ha ji ege okwuchukwu ha na ụbọchị ha ji ekpe ekpere. O kwuru, sị: “Achọrọ m ka mụ na Chineke dị ná mma, chọọkwa ka obi ruo m ala.”
Baịbụl ò kwuru na Chineke chọrọ ka anyị wepụta otu ụbọchị pụrụ iche n’izu anyị ga-eji na-efe ya? Iji otu ụbọchị pụrụ iche n’izu na-efe Chineke ọ̀ ga-eme ka mmadụ na Chineke dịrị ná mma?
E Meghị Ya Ka Ọ Dịtee Aka
Ihe karịrị puku afọ atọ na narị ise gara aga, Chineke si n’aka Mozis onye amụma nye ụmụ Izrel Iwu pụrụ iche. Otu n’ime ihe ndị e dere n’Iwu ahụ bụ ụbọchị ndị a gwara ha ka ha na-ezu ike. Ihe e ji wepụta ụbọchị ndị ahụ bụ ka ha jiri ha na-efe Chineke. Ụbọchị Izu Ike nke ha na-enwekarị bụ nke abalị asaa ọ bụla. Ọ na-amalite mgbe anyanwụ dara na Fraịdee, kwụsị mgbe anyanwụ dara na Satọdee.—Ọpụpụ 20:8-10.
Iwu ụbọchị izu ike Chineke nyere ụmụ Izrel ọ̀ gbasara ndị na-abụghị ụmụ Izrel? Mba. Ọ bụ naanị ụmụ Izrel na ndị ọzọ so na-ekpe okpukpe ha ka Iwu Mozis gbasara. Chineke gwara Mozis, sị: “Ụmụ Izrel [ga-edebe] ụbọchị izu ike . . . Ọ bụ ihe ịrịba ama n’etiti mụ na ụmụ Izrel ruo mgbe a na-akaghị aka.”a—Ọpụpụ 31:16, 17.
Baịbụl kwuru na Iwu Mozis bụ “onyinyo nke ihe gaje ịbịa.” (Ndị Kọlọsi 2:17) N’ihi ya, Ụbọchị Izu Ike so n’ihe ndị na-adịteghị aka Jehova mere nke nyeere ụmụ Izrel aka ife ya ofufe. Ọ na-atụ aka n’ihe ka mma nke ga-abịa n’ọdịnihu. (Ndị Hibru 10:1) Baịbụl kwuru na Iwu Mozis, nke idewe Ụbọchị Izu Ike kwa izu so na ya, kwụsịrị mgbe Jizọs nwụrụ. (Ndị Rom 10:4) Gịnị ka e ji dochie ya?
Ụzọ Ọhụrụ E Si Efe Chineke
Mgbe Iwu Mozis kwụsịrị, Chineke mere ka a kọwaa nke ọma otú ọ chọziri ka anyị si na-efe ya. E dekwara ya n’ime Baịbụl. Chineke ò kwuru na ya chọrọ ka anyị wepụta otu ụbọchị pụrụ iche n’izu anyị ga-eji na-efe ya?
Akwụkwọ Nsọ kwuru na ụfọdụ n’ime iwu ndị e nyere ụmụ Izrel gbasara Ndị Kraịst taa. Ha bụ iwu ndị dị ka izere arụsị, izere ịkwa iko na izere iri ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Ma, iwu Chineke nyere ụmụ Izrel gbasara Ụbọchị Izu Ike esoghị ná ndị nke Ndị Kraịst kwesịrị ịna-edewe.—Ndị Rom 14:5.
Olee ihe ọzọ Baịbụl gwara anyị gbasara otú Ndị Kraịst oge ochie si fee Chineke ofufe? Ha na-ezukọ mgbe niile kpee ekpere, gụọ Akwụkwọ Nsọ, gee ntị n’okwu e ji Akwụkwọ Nsọ na-agwa ha. Ha na-abụkwa abụ ha ji eto Chineke. (Ọrụ 12:12; Ndị Kọlọsi 3:16) Ha gaa nzukọ ndị ahụ, a na-akụziri ha ihe, mee ka okwukwe ha sikwuo ike, ha agbarịtakwa ibe ha ume.—Ndị Hibru 10:24, 25.
O nweghị ebe Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ezukọ n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụkwanụ n’ụbọchị ọzọ pụrụ iche n’izu. Gịnịzi mere ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst ji wepụta Sọnde ka ọ bụrụ ụbọchị pụrụ iche ha ji efe ofufe? Ọ bụ mgbe e decharala Baịbụl, ndị mmadụ amalite izi ozizi ụgha na ime ihe ndị na-adịghị na Baịbụl, ka e bidoro ife ofufe n’ụbọchị Sọnde.
Chineke ọ̀ gwara ndị mmadụ ka ha wepụtaghachi otu ụbọchị pụrụ iche n’izu a ga-eji na-efe ya ofufe? Mba. Ihe niile gbasara otú anyị kwesịrị isi na-efe Chineke zuru ezu na Baịbụl. O nweghị ihe ọzọ Chineke kwurula ka a gbakwụnye n’Akwụkwọ Nsọ. Chineke nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ, ya edee, sị: “Ọ bụrụgodị na anyị ma ọ bụ mmụọ ozi nke si n’eluigwe ezisaara unu ozi ọma karịrị ihe anyị zisaara unu n’ozi ọma, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.”—Ndị Galeshia 1:8.
Ofufe Dị Chineke Mma ma Na-enye Ume
N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị ndú okpukpe ndị Juu anaghị eji ife ofufe n’Ụbọchị Izu Ike egwu egwu. Ma, Chineke anabataghị ofufe ha n’ihi na ha bụ ndị ọjọọ. Ha hụrụ ego n’anya, o nweghịkwa ihe ha ji ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha kpọrọ. Ha na-achọkarị ịbụ ndị ukwu, ha anaghị akwụwa aka ha ọtọ, ha nọkwa na-agbasi mbọ ike ka mba ha ghara ịnọ n’okpuru ndị Rom. (Matiu 23:6, 7, 29-33; Luk 16:14; Jọn 11:46-48) Chineke mere Ụbọchị Izu Ike otú ọ ga-esi na-enye ndị mmadụ obi ụtọ. Ma, ha ji aka ha tie ọtụtụ iwu ndị mere ka idewe Ụbọchị Izu Ike siere ndị mmadụ ike n’agbanyeghị na ha sị na ha na-anọchite anya Chineke.—Matiu 12:9-14.
O doro anya na ọ bụghị iwepụta otu ụbọchị pụrụ iche n’izu, jiri ya na-efe ofufe, ga-eme ka otú anyị si efe ofufe dị Chineke mma. Gịnị ka anyị kwesịrị ime? Jizọs kpọrọ anyị òkù a na-eme obi ụtọ. Ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume.” (Matiu 11:28) Ọ bụrụ na anyị na-efe Chineke otú Jizọs kụziiri anyị ka anyị si na-efe ya, anyị ga na-enwe nnọọ ume. Anyị agaghị abụ ndị ihu abụọ, ife Jehova agaghịkwa abụrụ anyị ibu arọ.
N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-agbasi mbọ ike ife Jehova otú Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si fee ya. Kwa izu, ha na-ezukọ na-amụ Baịbụl. Ihe na-enyere ha aka ikpebi ụbọchị ndị ha ga na-enwe ọmụmụ ihe ha bụ otú ihe si dịrị n’obodo ha ma ọ bụ ná mba ha. Ha enweghị ụbọchị pụrụ iche n’izu ha ji efe Chineke otú ahụ okpukpe ndị ọzọ nwere. Í cheghị na ọ ga-adị mma ma i soro Ndịàmà Jehova gaa otu n’ime ọmụmụ ihe ndị ha na-enwe, ma jiri aka gị chọpụta otú o si enye mmadụ ume?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụghị mgbe niile anyị gụtara “mgbe a na-akaghị aka” na Baịbụl ka ọ na-apụta mgbe ebighị ebi. O nwekwara ike ịpụta ogologo oge nke a na-amaghị mgbe ọ ga-agwụ.
Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?
● Ọ̀ bụ iwu na a ga-enwe otu ụbọchị pụrụ iche n’izu ị ga-eji na-efe Chineke?—Ndị Rom 10:4; 14:5.
● Gịnị mere o ji kwesị ekwesị na anyị ga na-ezukọ na-efe Chineke?—Ndị Hibru 10:24, 25.
● Gịnị ga-eme ka otú anyị si efe Chineke ofufe na-eme anyị obi ụtọ?—Matiu 11:28.
[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]
TUZDEE
WENEZDEE
1 TỌZDEE
2 FRAỊDEE
3 SATỌDEE
4 SỌNDE