Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 4/12 p. 6-7
  • Ịkwụwa Aka Ọtọ Bara Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkwụwa Aka Ọtọ Bara Uru
  • Teta!—2012
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Uru Onye A Tụkwasịrị Obi Na-erite
  • Emela Ihe Ga-emecha Ghọ Gị Ahịa
  • Ọ Ga-abara Gị Uru ma Ihe Siwere Gị Ike
  • Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwụwa Aka Ọtọ
    Teta!—2012
  • Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ihe Niile
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ihe Na-agaziri Onye Na-akwụwa Aka Ọtọ
    Teta!—2012
  • Gịnị Ka Achụmnta Ego Gị Ga-efu Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2012
g 4/12 p. 6-7

Ịkwụwa Aka Ọtọ Bara Uru

“Ihe oriri e ji ụgha nweta na-atọ mmadụ ụtọ, ma n’ikpeazụ, ajịrịja nkume ga-eju ya ọnụ.”—Ilu 20:17.

Ọ̀ BỤ eziokwu na mmadụ na-akwụwa aka ọtọ, ọ gaghị ahụ tụrụ rachaa? Ọ bụghị eziokwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe anaghị agaziri onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ anaghị atụkwasị ụdị onye ahụ obi. Ị manụ na ụwa ga-ara mmadụ ahụ́ ma ndị ọzọ anaghị atụkwasị ya obi.

Uru Onye A Tụkwasịrị Obi Na-erite

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ma na ị na-akwụwa aka ọtọ, ihe ọ bụla ị na-eme ga na-aga nke ọma. O nwedịrị ike ị gaghị ama na ọ bụ ya mere ihe ji na-agaziri gị. Ì chetara Franz, onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ? Ọ bụ ịkwụwa aka ọtọ mere ihe ji gaziwere ya n’ụlọ ọrụ ha. O kwuru, sị: “Mgbe m malitere ọrụ, ndị m na-arụrụ ọrụ siiri m ọnyà aghara aghara iji mara ma m̀ na-akwụwa aka ọtọ. Amaghịdị m ihe na-aganụ mgbe ahụ. Ma, ọnyà ha amataghị m, emechakwara m chọpụta na ha siiri m ọnyà. Mgbe ha chọpụtara na m na-akwụwa aka ọtọ, ha nyekwuru m ọrụ ndị m ga na-arụ. Ka oge na-aga, ha hapụrụ m ka m jiri aka m na-eme ihe ụfọdụ. Ha bulikwara m n’ọkwá. Ama m na e nwere ndị ọzọ ka m mara ọrụ a m na-arụ, nweekwa ndị nke nwere ọgụgụ isi karịa m. Ma, a gaghị enye ha ya n’ihi na a tụkwasịrị m obi.”

Emela Ihe Ga-emecha Ghọ Gị Ahịa

N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị kwuru okwu gbasara ọchụnta ego aha ya bụ David. Nwoke ahụ kwuru, sị: “M hụ ka ndị mmadụ na-egwu ndị ọzọ wayo, na-ekpoju akpa ha, m na-agwa onwe m sị, ‘Onye ọ bụla ga-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ, ya abụghị taa, ọ bụrụ echi.’ Ya bụ, mee elu mee ala, onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ ga-eri ihe ya na ya so ala. E nwere ọtụtụ ọrụ ndị e wetaara anyị, bụ́ ndị gaara eme ka anyị tinye aka n’ihe ọjọọ. Ma, anyị ekweghị anara ha. Ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị naara ọrụ ndị ahụ mechara dakpọọ, a kpụpụkwa ụfọdụ ndị ọrụ ha ụlọikpe. O nweghị ihe mere ụlọ ọrụ anyị n’ihi na anyị kwụwara aka ọtọ.”

O nwere otu nwoke bi n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Afrịka. Aha ya bụ Ken. Mgbe ọ chọrọ imepe ebe ọ ga-anọ na-azụ ehi, ọ gara mee ihe niile iwu kwuru. A sị na ọ chọrọ, ọ gaara agakwuru ndị ọrụ gọọmenti nye ha aka azụ, ha ahapụ ya ka ọ na-atụbata ihe ndị o ji azụ ehi. Ọ garaghịkwa na-akwụ ụgwọ a na-akwụ maka ịtụbata ihe n’obodo. Ma, o meghị otú ahụ. Nwoke a kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-azụ ehi n’obodo anyị na-enye ndị ọrụ gọọmenti aka azụ. O were anyịnwa afọ iri tupu anyị emechaa ihe niile iwu obodo kwuru na a ga-eme ma mmadụ chọọ imepe ebe a na-anọ azụ ehi. Mbọ niile a anyị gbara baara anyị uru n’ihi na ndị ahụ a na-enye aka azụ ekweghị ahapụ ndị niile na-enye ha aka azụ. Ha nọ na-enye ha nsogbu ka ha na-ewetekwu ego.”

Ọ Ga-abara Gị Uru ma Ihe Siwere Gị Ike

Ọ bụrụ na ị na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ị na-eme, ihe abịa siwere gị ike, o nwere ike ịdị gị ka igwu wayo ọ̀ ga-akara gị mma. Ma, buru n’obi na ọ bụ mgbe ahụ ihe siwere ike ka ndị na-akwụwa aka ọtọ na-ejikarị ahụ uru àgwà ọma ha bara.

Dị ka ihe atụ, o nwere otu nwoke bi n’Amerịka aha ya bụ Bill. Ọ na-arụrụ ndị mmadụ ụlọ. Mgbe ihe siwere ike, nke na ego adịghị ndị mmadụ ji ewu ụlọ, nwoke a enweghịzi ọrụ. O kwuru, sị: “Ihe siiri ọtụtụ ndị na-enyekarị anyị ọrụ ike. Ọtụtụ n’ime ha jidekwara anyị ezigbote ụgwọ. Mgbe ihe bịara kpọchie nke a na-amaghị otú a ga-eme ya, agakwuuru m otu n’ime ndị na-arụ ụdị ọrụ anyị na-arụ, gwa ya ka o wee ụfọdụ n’ime anyị n’ọrụ. Ọ raghị ahụ́, ya ewee mụ na ọtụtụ ụmụ ọrụ m n’ọrụ. Ọ gwara m na ụwa niile ma na m na-arụ ọrụ nke ọma, na-akwụwakwa aka ọtọ.”

Ndị niile a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu a bụcha Ndịàmà Jehova. N’ihe niile ha na-eme ná ndụ, ha na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru. Ị̀ chọpụtara na ihe mere ihe ji gaziere ha bụ maka na ha na-akwụwa aka ọtọ? Ịkwụwa aka ọtọ emeghị ka ụwa siere ha ike.

Akụkọ ndị a emeghịnụ ka igwu wayo na inye aka azụ ghara ịna-enye ndị mmadụ ego. Ma, ihe e ji ama onye ihe gaziiri ọ̀ bụ naanị ego ọ kpatara?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ma na ị na-akwụwa aka ọtọ, ihe ọ bụla ị na-eme ga na-aga nke ọma

[Foto dị na peeji nke 7]

“Ọ gwara m na ụwa niile ma na m na-arụ ọrụ nke ọma, na-akwụwakwa aka ọtọ.”​—Bill, o bi n’Amerịka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya