Mmadụ Ò Kwesịrị Ịghọ Aghụghọ Ka Ọ Ghara Ịda n’Ule?
Ọ BỤRỤ na ị bụ nwa akwụkwọ, o nwere ike ịbụ na ị hụla ụmụ akwụkwọ ibe gị ndị na-aghọ aghụghọ n’ule n’ihi na ha achọghị ịda. Nke bụ́ eziokwu bụ na nsogbu a dị ebe niile. N’afọ 2008, otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka gbara ihe fọrọ obere ka o ruo puku ụmụ akwụkwọ iri atọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị ajụjụ ọnụ. E kee ha niile ụzọ atọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ime ha kwetara na ha ghọrọ aghụghọ n’ule n’afọ ahụ. Ma, e nwere ndị kwuru na e kee ụmụ akwụkwọ ahụ ụzọ anọ, ihe karịrị ụzọ atọ n’ime ha ghọrọ aghụghọ n’ule.
Ọtụtụ ndị na-aghọkwa aghụghọ na Yurop, nke ka nke, mmadụ iwere ihe onye ọzọ dere, jiri ya mere nke ya. Otu akwụkwọ kwuru na a sị ndị mmadụ dee ihe a ga-eji nye ha akara ugo mmụta na mahadum, kama ha ga-eji ụbụrụ ha dee ya, ha agaa n’Ịntanet were ya. Akwụkwọ ahụ kwuru na ihe a ndị mmadụ na-emezi na-echu ndị ọzọ ụra.
Gịnị mere ịghọ aghụghọ n’ule ji ju ebe niile? È nwere uru ọ na-abara ndị na-eme ya? È nwere uru ọ bụla mmadụ ga-erite ma ọ bụrụ na ọ ghọghị aghụghọ n’ule, ya bụrụgodị na onye ahụ emechaghị nke ọma n’ule ahụ?
Gịnị Mere Ịghọ Aghụghọ Ji Ju Ebe Niile?
Àgwà ọma alaala. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị nkụzi na-ekwu na ihe mere ndị mmadụ ji aghọ aghụghọ n’ule bụ na ha na-achọ ọdịmma onwe ha naanị, nakwa na ha ejighị àgwà ọma kpọrọ ihe.” Otu nwa akwụkwọ kwuru ihe mere ha ji ghọọ aghụghọ n’ule. Ọ sịrị: ‘Anyị niile ghọrọ aghụghọ n’ule n’ihi na anyị achọghị ịda. Anyị chọrọ ịba n’ụlọ akwụkwọ ndị dị mma. Anyị abụghị ndị ọjọọ, anyị bụ ezigbo ụmụ akwụkwọ. Naanị ihe dị anyị mkpa bụ ịba mahadum dị mma.’ E nwekwara ụfọdụ ndị nne na nna chere na o nweghị ihe o mere ma ụmụaka na-aghọ aghụghọ n’ule. Ha na-ekwe ka ụmụ ha na-aghọ aghụghọ n’ule n’ihi na ha achọghị ka ha daa. Ha nụ na ụmụ ha ghọrọ aghụghọ n’ule, ha anaghị eme ihe ọ bụla. Nke a na-eme ka ụmụ ha na-akpakwu àgwà ọjọọ.
Ha chọrọ ime nke ọma ka ibe ha. Otu nwoke nwe otu ụlọ ọrụ nke na-enyere ndị mmadụ aka ka ha ghara ịghọ aghụghọ n’ule sịrị na ụfọdụ ụmụ akwụkwọ kwuru na ihe mere ha ji malite ịghọ aghụghọ bụ na ndị na-aghọ aghụghọ n’ule na-eme nke ọma karịa ndị na-anaghị aghọ aghụghọ, o nweghịkwa ihe a na-eme ha.
Ịntanet na ekwentị na-eme ka ọ dịrị ha mfe. Ịntanet na ekwentị emeela ka ọ dịkwuoro ụmụ akwụkwọ mfe ịna-aghọ aghụghọ n’ule. A kụzichaara ha ihe, sị ha dee gbasara ihe ahụ a kụziiri ha, ma ọ bụkwanụ e nye ha ihe ha ga-ede n’ụlọ, kama ha ga-eji ụbụrụ ha dee ya, ha agaa were ya n’Ịntanet, nyekwa ya ndị ọzọ. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ka a na-ejide. Nke a emeela ka obi kaa ndị ọzọ ịna-eme ya.
Ha na-amụta ya n’aka ndị tọrọ ha. Ọ bụghị naanị ụmụ akwụkwọ na-aghọ aghụghọ, ndị torola eto na-aghọkwa aghụghọ. Ndị mmadụ na-aghọ aghụghọ n’ụlọ ọrụ ha, ndị ọchịchị na ndị na-eme egwuregwu na-aghọkwa aghụghọ. Ndị nne na nna anaghịkwa ekwu eziokwu ma a sị ha dee ego ole ha na-enweta ka a mara ego ole a ga-asị ha kwụọ n’ụtụ isi. Ha na-aghọkwa aghụghọ n’ihe banyere ịnshọransị. Otu nwoke kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị ọchịchị na ndị ụmụaka kwesịrị ịmụta àgwà ọma n’aka ha na-aghọ aghụghọ, ihe ha na-agwa ndị na-eto eto bụ na ịghọ aghụghọ dị mma.” Ma, ọ̀ bụ eziokwu? Mmadụ ò kwesịrị ikwo na ya achọghị ịda na-aghọ aghụghọ n’ule?
Gịnị Mere na Mmadụ Ekwesịghị Ịghọ Aghụghọ n’Ule?
Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere mmadụ ji aga akwụkwọ?’ Ọ́ bụghị ka ọ mara otú ọ ga-esi eme ihe ma o too? Dị ka ihe atụ, ihe dapụta n’ebe ọ na-arụ ọrụ, ọ ga-enyere ya aka ịma ihe kpatara ya na ihe ọ ga-eme. Ọ bụrụ na ụmụ akwụkwọ na-aghọ aghụghọ n’ule, ha agaghị amụta otú ha ga-esi eme ihe ndị ahụ. N’ihi ya, mmadụ ghọọ aghụghọ n’ule mee nke ọma, e chee na ọ ma ihe, ebe ọ na-enweghị ihe ọ ma. Onye ahụ malitezie ịrụ ihe e chere na ọ ma arụ, a chọpụta na ọ maghị nke a na-akọ.
Otu nwoke kwukwara na “ụmụ akwụkwọ ndị na-aghọ aghụghọ gụchaa akwụkwọ nweta ọrụ, ha nwere ike ịna-aghọ aghụghọ n’ebe ha na-arụ ọrụ.” Ha dị ka elekere aka adịgboroja yiri nke ezigbo ya.
Mmadụ ghọọ aghụghọ n’ule, e nwekwara ike ijide ya, taa ya ahụhụ ya na ya so. E nwere ike imenye ya ihere, chụọ ya n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ taa ya ahụhụ ka nke ahụ njọ. Baịbụl kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) Ma, ihe kwesịrị ime ka mmadụ ghara ịna-aghọ aghụghọ n’ule abụghị naanị maka na e nwere ike ijide ya. O nwere ihe ndị ọzọ ka mkpa mere anyị kwesịrị iji zere ya.
Ihe Ga Na-agaziri Onye Na-anaghị Aghọ Aghụghọ
Ndị na-eto eto ma ihe na-agba mbọ mụta àgwà ndị ga-abara ha uru ma mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ ma mgbe ha pụtara. Ọ bụ ya mere ha anaghị eji akwụkwọ ha na-aga egwu egwu. Ha na-akpakwa àgwà ọma ndị ga-eme ka obi dị ha ụtọ, dịkwa onye ga-ewe ha n’ọrụ ma ha gụchaa akwụkwọ.
Ọ bụ na Baịbụl ka ị ga-ahụ àgwà ọma ndị ahụ. Ọ bụrụkwa na ndị na-eto eto ana-akpa àgwà ọma ndị ahụ, ọ gaghị aghọ ha ahịa. Kama ịghọ ha ahịa, 2 Timoti 3:16, 17 kwuru na ọ ga-eme ka ha ‘ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.’ Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jorge sịrị: “Ụmụ klas anyị achọghị ịgụ akwụkwọ. Ọ bụ ya mere ha ji aghọ aghụghọ n’ule ka ha ghara ịda. Ma, m chọrọ ka obi dị Chineke ụtọ. Ilu14:2 sịrị na ‘onye na-eje ije n’ịkwụwa aka ọtọ ya na-atụ egwu Jehova, ma onye gbagọrọ agbagọ n’ụzọ ya na-eleda Ya anya.’ Ama m na o nweghị ihe anyị ga-eme, Chineke aghara ịhụ ya. Ọ bụ ya mere na anaghị m aghọ aghụghọ n’ule, anaghịkwa m enyere ndị ọzọ aka ịghọ aghụghọ.”
Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru nwere ike ịbụ ndị ụbụrụ kacha aghọ nkọ na klas, o nwekwara ike ọ gaghị abụ ha. Ma, ọ bụ ha kacha mara ihe n’ihi na ha yiri nwoke wuru ụlọ n’oké nkume. Ihe a ha na-eme agaghịkwa aghọ ha ahịa. (Abụ Ọma 1:1-3; Matiu 7:24, 25) Ihe ọzọ bụ na Jehova hụrụ ha n’anya, ọ gaghịkwa echefu ha.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]
IHE NDỊ I KWESỊRỊ ICHEBARA ECHICHE
● “Ọ bụ egbugbere ọnụ eziokwu ka a ga-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ma ire okwu ụgha ga-adịru naanị nwa mgbe nta.”—Ilu 12:19.
● “Onye na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzi.”—Ilu 28:20.
● “Ezi Chineke ga-ekpe ụdị ọrụ niile ikpe, tinyere ihe niile zoro ezo, iji kpebie ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.”—Ekliziastis 12:14.
● “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”—Ndị Hibru 13:18.
[Foto dị na peeji nke 14, 15]
Ịntanet na ekwentị emeela ka ọ dịkwuoro ụmụ akwụkwọ mfe ịna-aghọ aghụghọ n’ule
[Foto dị na peeji nke 16]
Ụmụ akwụkwọ na-aghọ aghụghọ n’ule dị ka elekere aka adịgboroja yiri nke ezigbo ya