Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 7/13 p. 10-11
  • Otú Otu Nwaanyị Si Kwụsị Ikpe Okpukpe Ndị Juu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Otu Nwaanyị Si Kwụsị Ikpe Okpukpe Ndị Juu
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • “Anyị Ahụwo Mezaịa Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ònye Bụ Jizọs?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2013
g 7/13 p. 10-11

AJỤJỤ ỌNỤ | RACQUEL HALL

Otú Otu Nwaanyị Si Kwụsị Ikpe Okpukpe Ndị Juu

O nwere otu nwaanyị aha ya bụ Racquel Hall. Mama ya bụ onye Izrel, na-ekpekwa okpukpe ndị Juu. Papa ya abụrụ onye Ọstria, mechaakwa kpewe okpukpe ndị Juu. Nne nne ya na nna nne ya nọ n’òtù na-ahụ na e nweghachiri mba Izrel. Ha bịara biri n’Izrel n’afọ 1948. Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka Izrel nke ugbu a malitere. Ndị na-ede Teta! jụrụ Racquel ihe mere o ji kwụsị ikpe okpukpe ndị Juu. Lee ihe ọ gwara ha.

Gịnị ka ị ga-agwatụ anyị gbasara onwe gị?

A mụrụ m n’Amerịka n’afọ 1979. Papa m na mama m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ atọ. Ma, mama m kpọọrọ m. Ọ kụziiri m omenala ndị Juu, tinyekwa m n’ụlọ akwụkwọ a na-anọ azụ ndị Juu. Mgbe m dị afọ asaa, anyị gara biri n’Izrel. Anyị nọrọ n’ebe ahụ otu afọ. Mgbe ahụ anyị bi n’ebe ahụ, m na-aga akwụkwọ n’ebe ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu na-aga akwụkwọ. Mụ na mama m mechakwara gaa biri na Meksiko.

E nweghị ụlọ okpukpe ndị Juu n’ebe anyị bi, ma ahapụghị m omenala ndị Juu. M na-amụnye kandụl n’Ụbọchị Izu Ike ọ bụla, na-agụkwa akwụkwọ ndị okpukpe anyị. M chọọ ikpe ekpere, mụ agaa buru akwụkwọ ekpere na-agụ. M gaa akwụkwọ, ihe m na-agwakarị ụmụ akwụkwọ ibe m bụ na okpukpe ndị Juu ka okpukpe ndị ọzọ mma. N’oge ahụ, anaghị m agụ Agba Ọhụrụ n’ihi na ọ bụ na ya ka e dere otú Jizọs si jee ozi nakwa ihe ndị ọ kụziri. Ọ bụ mama m gwara m ka m ghara ịgụ ya n’ihi na ọ ga-eduhie m.

Gịnị mere i ji malite ịgụ Agba Ọhụrụ?

Mgbe m dị afọ iri na asaa, alaghachiri m Amerịka ka m gaa gụchaa akwụkwọ. N’ebe ahụ, otu nwa akwukwọ anyị sị na ya bụ Onye Kraịst gwara m na ndụ m agaghị enwe isi ma ọ bụrụ na mụ ekweghị na Jizọs.

“M gwara ya na o nweghị onye ọ bụla ma ihe ga-ekwe na Jizọs.

Ọ jụrụ m ma ò nwetụla mgbe m gụrụ Agba Ọhụrụ.

Mụ asị ya mba.

Ya asị m: “Ọ bụrụ otú ahụ, í cheghị na ị na-ekwu ihe na-edoghị gị anya?”

Ihe a o kwuru ruru m n’ahụ́ n’ihi na m na-ekwukarị na onye ọ bụla na-ekwu ihe na-edoghị ya anya bụ onye iberiibe. N’ihi ya, m weere Baịbụl ya laa n’ụbọchị ahụ, malitekwa ịgụ Agba Ọhụrụ.

Olee otú ihe ị gụtara si nyere gị aka?

Ị̀ makwa na amabughị m na ọ bụ ndị Juu dere Agba Ọhụrụ? Ọ bụ mgbe m bidoro ịgụ ya ka m chọpụtara na ọ bụ ha dere ya. Ihe ọzọ bụ na m bịara chọpụta na Jizọs bụ onye Juu, nakwa na o nwere obiọma, dịrịkwa umeala n’obi. Achọpụtakwara m na o nyeere ndị mmadụ aka, o nweghị mgbe o megburu ha. A gadịrị m n’ọ́bà akwụkwọ were akwụkwọ ndị kwuru banyere Jizọs gụọ. Ma, o nweghị nke mere ka o doo m anya na ọ bụ yanwa bụ Mesaya. Ụfọdụ n’ime ha kwudịrị na Jizọs bụ Chineke. Ma, ama m na ọ bụghị eziokwu. Baịbụl kwuru na Jizọs kpegaara Chineke ekpere. A sị na Jizọs bụ Chineke ọ pụtaranụ na ọ bụ onwe ya ka o kpegaara ekpere. Ihe ọzọ bụ na Jizọs mechara nwụọ mgbe ọ bịara n’ụwa, ma Baịbụl kwuru na Chineke anaghị “anwụ anwụ.”a

Olee otú i si mata nke bụ́ eziokwu?

Ị manụ na eziokwu anaghị emegide onwe ya. M bịara kpebie na m ga-achọpụta nke bụ́ eziokwu. N’ihi ya, ekpegara m Chineke ekpere. Na nke ugbu a, ejighị m akwụkwọ ekpere, o si m n’obi. O teghị aka m kpechara ekpere ahụ, mmadụ akụọ aka n’ụzọ m. Mgbe m meghere ụzọ, ahụrụ m Ndịàmà Jehova abụọ. Ha nyere m akwụkwọ ha ji amụ Baịbụl, mụ na ha ana-amụkwa ya. Nke a mere ka m kweta na ihe ndị ha na-akụziri m si na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova kweere na Jizọs bụ “Ọkpara Chineke,”b ọ bụghị atọ n’ime otu. Ha kwekwara na ọ bụ onye mbụ Chineke kere.c

Ọ dịghị anya mụ na Ndịàmà Jehova mụwara ihe, mụ alaghachi Meksiko. Mgbe m ruru ebe ahụ, mụ na ha bidokwara na-amụ amụma ndị kwuru gbasara Mesaya. Obi dị m ụtọ mgbe m chọpụtara na o nwere ọtụtụ amụma kwuru gbasara Mesaya. Ma, m ka nọ na-enwe obi abụọ. M bịara na-eche ma ọ̀ bụkwa naanị Jizọs ka ihe ndị e kwuru gbasara Mesaya mezuru n’isi. M chekwara na o nwere ike ihe Jizọs kwo mee ihe ndị o mere bụ ka ndị mmadụ chee na ọ bụ yanwa bụ Mesaya.

Gịnịzi mere i ji kweta na Jizọs bụ Mesaya?

Ndịàmà Jehova ahụ gosiri m amụma ndị ọzọ. Onye ọ bụla nụrụ gbasara ha ga-ama na o nweghị onye ga-ejili aka ya mee ka ha mezuo n’isi ya. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị narị afọ asaa tupu a mụọ Mesaya, Maịka onye amụma kwuru na a ga-amụ ya na Betlehem nke Judia.d O nweghị onye n’ime anyị ga-eji aka ya kwuo ebe a ga-amụ ya. Aịzaya bukwara amụma na Mesaya ga-anwụ ọnwụ ihere ka onye ohi. O kwukwara na a ga-eli ya n’ebe a na-eli ndị ọgaranya.e Ọ bụ naanị n’isi Jizọs ka ihe a niile mezuru.

Ihe ikpeazụ ha gwara m bụ gbasara ezinụlọ Jizọs si. Baịbụl kwuru na Mesaya ga-esi n’ezinụlọ Eze Devid.f N’oge ochie, ndị Juu na-edekarị ezinụlọ mmadụ si n’akwụkwọ. A sị na Jizọs esighị n’ezinụlọ Devid, ndị iro ya gaara ekwu ya. Ma, o nweghị mgbe ha kwuru na ọ bụghị eziokwu n’ihi na a naghị enyo ya enyo. Ndị mmadụ kpọdịrị ya “Nwa Devid.”g

Mgbe Jizọs nwụrụ, ihe dị ka afọ iri atọ na asaa agaakwa, ndị agha Rom bịara bibie Jeruselem. Ihe a mere n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst. Nke a pụtara na Mesaya ga-abịarịrị tupu e bibie Jeruselem. Ihe mere m ji kweta ya bụ na akwụkwọ ndị ahụ e dere ezinụlọ ndị Juu furu mgbe ahụ e bibiri Jeruselem. A sị na Mesaya ahụ abịaghị tupu mgbe ahụ, o nweghị otú a gaara esi ama ezinụlọ o si.

Olee ihe i mere mgbe ị matara ihe a niile?

At Deuteronomy 18:18, 19, it was foretold that God would raise up iDiuterọnọmi 18:18, 19 kwuru na Chineke ga-esi n’Izrel họpụta otu onye amụma ga-adị ka Mozis. Chineke kwukwara, sị: “Onye na-egeghị ntị n’okwu m ndị ọ ga-ekwu n’aha m, mụ onwe m ga-emekwa ka ọ zaa ajụjụ maka ya.” Otú m si mụọ ma Agba Ochie ma Agba Ọhụrụ nke ọma mere ka o doo m anya na ọ bụ Jizọs onye Nazaret bụ onye amụma ahụ.

a Habakọk 1:12.

b Jọn 1:34.

c Mkpughe 3:14.

d Maịka 5:2; Matiu 2:1.

e Aịzaya 53:3, 7, 9; Mak 15:43, 46.

f Aịzaya 9:6, 7; Luk 1:30-32. Matiu isi mbụ kwuru gbasara ezinụlọ papa Jizọs, Luk isi atọ ekwuo gbasara ezinụlọ mama ya.

g Matiu 21:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya