Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ngagharị Iwe Ọ̀ Ga-akwụsị Mmegbu?
    Teta!—2013 | Septemba
    • ISIOKWU TETA! A

      Ngagharị Iwe Ọ̀ Ga-akwụsị Mmegbu?

      Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebi akwụkwọ a. Ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16; 18:36) N’isiokwu a, e kwuru banyere ụfọdụ ngagharị iwe ndị mmadụ mere n’obodo dị iche iche. Ma, Ndịàmà Jehova anaghị ekwu na e nwere obodo ka ibe ya mma, ha anaghịkwa eso eme ụdị ngagharị iwe ọ bụla.

      O NWERE otu nwa okorobịa onye Tunisha aha ya bụ Mohamed Bouazizi. Ọ dị iri afọ abụọ na isii. Ọ na-ere ahịa mbugharị n’ihi na o nweghị ọrụ. Ihe ọ na-ere bụ ube bekee, unere na apụl. Obi adịghị ya mma n’ihi na ọ ma na aka ọtụtụ ndị na-achị ala ha adịghị ọcha. Ma ike ụwa bịara gwụ ya n’abalị iri na asaa n’ọnwa Disemba afọ 2010. N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ndị uwe ojii buuru ngwá ahịa ya. Ma, o kweghị ka ha buru skel o ji ere ahịa. Ndị nọ mgbe ihe a mere kwuru na ka a na-eme ka a na-eme, otu nwaanyị onye uwe ojii amaa ya ụra.

      Ihe a e mere Mohamed were ya ezigbo iwe n’ihi na o weere ya na e menyere ya ihere. N’ihi ya, ọ gara n’otu ụlọ ọrụ gọọmenti dị nso n’ebe ahụ ka ọ gwa ha ihe e mere ya, ma e nweghị onye tụpụụrụ ya ọnụ. E kwuru na mgbe o si n’ụlọ ahụ pụta, o ji oké olu jụọ, sị: “Olee otú unu chọrọ ka m si na-akpa afọ mụ na ezinụlọ m?” Ọ wụrụ onwe ya petrol, mụnye onwe ya ọkụ. O rughị izu atọ ya anwụọ.

      Ihe a mere Mohamed Bouazizi wutere ma ndị Tunisha ma ndị obodo ọzọ. Ọtutụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe ahụ mere nwa okorobịa ahụ mere ndị mmadụ ji mee ngagharị iwe ma n’obodo ahụ ma n’obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị Omeiwu nke Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yurop kwuru na e kwesịrị ịna-echeta Bouazizi na mmadụ anọ ndị ọzọ n’ihi na ha mere ihe ga-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha.

      Ihe ahụ mere gosiri na ihe nwere ike gbanwee ma ndị mmadụ gosi na otú ihe si aga n’ọchịchị ma ọ bụ n’obodo ha adịghị ha mma. Ma, gịnị mere ndị mmadụ ji eme ngagharị iwe? È nwere ihe ọzọ ha nwere ike ime kama imewe ngagharị iwe?

      Gịnị Mere Ndị Mmadụ Jizi Emekarị Ngagharị Iwe?

      Ihe ndị na-akpatakarị ngagharị iwe bụ:

      • Ọ bụrụ na ndị mmadụ enweghị mmasị n’otú ihe si aga n’obodo ha. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị na-achị nke ọma, o nweghị onye a ga-anụ olu ya na ibe ya. E nwegodị ihe ha chọrọ ka e meere ha, ha na ndị ọchịchị na-eji nwayọọ kpaa ya akpa. Ma, ọ bụrụ na ndị mmadụ echee na ndị ọchịchị anaghị akwụwa aka ọtọ nakwa na o nweghị ihe na-erute ha aka, ha nwere ike iji ngagharị iwe gosi na obi adịghị ha mma.

      • E nwee ihe ndị ọchịchị mere mmadụ nke wutere ndị obodo. Ọ bụrụ na e nwere ihe e mere mmadụ ya ewute ndị ọzọ, ndị mmadụ nwere ike ịsị na ha agaghị agbachizi nkịtị, na ha ga-emerịrị ihe iji gosi na ihe ahụ adịghị ha mma. Dị ka ihe atụ, i chetaranụ na ọ bụ ihe ahụ e mere Mohamed Bouazizi mere ndị Tunisha ji malite ime ngagharị iwe. N’India, otu nwaanyị aha ya bụ Anna Hazare jụrụ iri nri iji gosi na obi adịghị ya mma na ndị na-achị obodo ahụ anaghị akwụwa aka ọtọ. Ihe a mere ka ndị òtù ya mee ngagharị iwe na narị obodo anọ na iri ise.

      N’oge Sọlọmọn nọ ndụ, o kwuru na ndị mmadụ na-achị ibe ha ọchịchị nchịgbu. (Ekliziastis 8:9) Ma, a na-achịdị ndị mmadụ ọchịchị nchịgbu ugbu a karịa ka ọ dị n’oge ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmadụ anaghịzi agbachi nkịtị ma ndị ọchịchị chịgbuwe ha. Ịntanet na akụkọ ụwa na-eme ka ndị mmadụ mara ihe na-eme n’ebe dị iche iche n’ụwa, ya sọkwa ya ya bụrụ ihe mere n’ime ime obodo. Akụkọ ndị ahụ nwere ike ime ka ndị nọ n’ebe dị iche iche mewe ngagharị iwe.

      Gịnị ka ndị mmadụ na-enweta ma ha mee ngagharị iwe?

      Ndị chọrọ ka ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe nwere ike ikwu na e nwere uru ọ bara. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ikwu na:

      • E ji ya nyere ndị ogbenye aka. N’ihe dị ka iri afọ asatọ na atọ gara aga, ọtụtụ ndị enweghị ọrụ n’Amerịka n’ihi na ihe siri ezigbo ike. Ọtụtụ ndị nwe ụlọ n’oge ahụ gwara ndị na-enweghị ike ịkwụ ụgwọ ụlọ ka ha kwapụ n’ụlọ ha. N’ihi ya, ndị mmadụ mere ngagharị iwe na Chikago. Ngagharị iwe ahụ ha mere mere ka ndị ọchịchị kwuo ka a ghara ịchụpụ onye ọ bụla n’ụlọ o bi. Ha nyekwara ụfọdụ ndị ahụ mere ngagharị iwe ọrụ. E mekwara ụdị ngagharị iwe a na Niu Yọk. Nke a mere ka ndị ọchịchị nye iwu ka iri puku ezinụlọ asaa na puku asaa ndị a chụpụrụ n’ụlọ laghachi n’ebe ha bibu.

      • O mere ka a kwụsị mmegbu. N’afọ 1955, ndị uwe ojii Amerịka kpọchiri otu nwaanyị onye isi ojii n’ihi na ọ jụrụ ibiliri onye ọcha n’oche na bọs. N’ihi ya, ndị isi ojii nọ n’Alabama ekweghịzi aba bọs ọ bụla n’obodo ahụ. Nke a mere ka a kagbuo iwu ahụ kwuru na ndị isi ojii ekwesịghị ịnọdụ n’ebe ndị ọcha na-anọ na bọs.

      • O mere ka a kwụsị ihe a chọrọ ịrụ. N’afọ 2011, a malitere ịrụ ígwè na-enye ọkụ na Họng Kọng. N’ọnwa Disemba afọ ahụ, ọtụtụ ndị mere ngagharị iwe n’ihi na ha kwuru na ihe ahụ a na-arụ ga-emebi ikuku. A kwụsịrị ịrụ ihe ahụ n’ihi ngagharị iwe ahụ e mere.

      Mgbe ụfọdụ, e nwere ike meere ndị mmadụ ihe ha kwo mee ngagharị iwe, ma, ọ bụ Alaeze Chineke ga-egboro mmadụ niile mkpa ha

      Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe ọ bụla ndị mmadụ mere ngagharị iwe ka a na-emere ha ihe ha chọrọ. Dị ka ihe atụ, ndị ọchịchị nwere ike imesi ndị mmadụ ike ma ha mee ngagharị iwe kama imere ha ihe ha chọrọ. N’oge na-adịbeghị anya, onyeisi ala otu obodo fooro ntutu taa na ya ga-echi ndị na-eme ngagharị iwe n’obodo ahụ ọnụ n’ala. Kemgbe ahụ, e gbuola ọtụtụ ndị n’obodo ahụ.

      Ọ bụrụgodị na e meere ndị mmadụ ihe ha ji maka ya mee ngagharị iwe, nsogbu ọzọ nwere ike ịpụta. N’otu obodo dị n’Afrịka, otu nwoke so chụtuo onyeisi ala ha mechara gwa ndị nta akụkọ na ihe ha hụrụ wee kwado ọchịchị ọhụrụ abụghịzi ihe ha na-ahụ ugbu a.

      È nwere ihe ọzọ e nwere ike ime kama imewe ngagharị iwe?

      Ọtụtụ ndị a ma ama na-ekwu na ndị mmadụ kwesịrị ịna-eme ngagharị iwe. Dị ka ihe atụ, onye bụbu onyeisi ala Chek aha ya bụ Václav Havel nọrọ mkpọrọ ọtụtụ afọ n’ihi na ọ na-agbachitere ndị a na-emegbu emegbu. N’afọ 1985, o dere na ndị na-eme ngagharị iwe ga-adị njikere ime ihe ọ bụla ha nwere ike iji gosi otú obi dị ha, ọ bụrụgodị na ime ngagharị iwe ga-ata isi ha. Ihe ha ji eme otú a bụ na o nweghị ihe ọzọ ha ma ha ga-eme iji nweta ihe ha chọrọ.

      Ihe ahụ Mohamed Bouazizi na ndị ọzọ mere gosiri na ha kwetara ihe ahụ Havel kwuru. N’otu obodo dị n’Eshia, ọtụtụ ndị na-amụnye onwe ha ọkụ iji gosi na obi adịghị ha mma na ndị ọchịchị anaghị ekwe ha kpee okpukpe dị ha mma, ma ọ bụkwanụ kwe ka ha kwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ. Mgbe ndị nta akụkọ jụrụ otu nwoke ihe mere ndị mmadụ ji egbu onwe ha iji gosi na ihe a na-eme adịghị ha mma, o kwuru, sị: “Anyị enweghị égbè, anyị achọghịkwa imerụ ndị ọzọ ahụ́. O nweghị ihe ọzọ anyị ma anyị ga-eme.”

      Baịbụl gwara anyị otú a ga-esi kwụsị imegbu ndị mmadụ na ịchị ha ọchịchị nchịgbu. O kwuru na Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ. Ị manụ na ọ bụ otú ndị mmadụ si achị ibe ha na-eme ka ndị obi na-adịghị mma mewe ngagharị iwe. Baịbụl kwuru banyere Onye ga-achị alaeze ahụ, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike.”—Abụ Ọma 72:12, 14.

      Ndịàmà Jehova kwetara na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka ihe dị mma. (Matiu 6:9, 10) N’ihi ya, ha anaghị eso eme ngagharị iwe. Ma, ọ̀ dị gị ka Alaeze Chineke agaghị enwe ike iwepụ ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe? I nwere ike iche otú ahụ. Ma, e nwere ọtụtụ ndị kwetasiri ike na Alaeze Chineke ga-egbo mkpa mmadụ niile. Ọ ga-adị mma ka ị chọpụta ihe mere ha ji kweta.

  • Mmegbu Juru Ebe Niile
    Teta!—2013 | Septemba
    • Mmegbu Juru Ebe Niile

      Akụkọ Patrick O’Kane kọrọ

      ABỤ m onye Nọtan Ayaland. A mụrụ m n’afọ 1965. Mama m na papa m bụ ndị ogbenye. Mgbe m na-eto n’obodo a na-akpọ Deri, ndị Katọlik na ndị Protestant anaghị esi otu ụzọ aga. Esemokwu ha ruru ihe karịrị afọ iri atọ. Ndị Protestant ka ndị Katọlik n’obodo anyị. Ndị Katọlik na-ekwu na ndị Protestant anaghị ekwe ka ndị nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha megharịa ahụ́ nakwa na ha anaghị ekwe ewe ha n’ọrụ. Ha na-ekwukwa na ha ji ndị uwe ojii na-echi ha ọnụ n’ala nakwa na a naghị ekwe enye ha ebe ha ga-ebi.

      Mmegbu juru ebe niile n’obodo anyị, a na-echikwa ndị mmadụ ọnụ n’ala. Enweghị m ike ịgụta ugboro ole e tiri m ihe ma ọ bụ ugboro ole a kpụpụtara m n’ụgbọala tụdo m égbè ma ọ bụkwanụ ugboro ole ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị soja jidere m gbaa m ajụjụ. Ha jidekwara m ọtụtụ ugboro tinyecha m aka n’ahụ́ na-achọ ma ha ga-ahụ ihe dị ka égbè. Ihe a niile were m iwe, m wee kpebie na mụ na ha ga-achịpụ ya.

      E nwere mmadụ iri na anọ ndị amị gbagburu mgbe ha na-eme ngagharị iwe n’obodo anyị. Iji na-echeta ndị ahụ, ụfọdụ ndị obodo anyị malitere ịna-eme ngagharị iwe kwa afọ. Eso m ná ndị mere ngagharị iwe nke afọ 1972. N’afọ 1981, mmadụ iri nọ na mkpọrọ nwụrụ n’ihi na ha jụrụ iri nri maka na ike mkpọrọ agwụla ha. A na-emekwa ngagharị iwe iji cheta ha, esokwa m mee ngagharị iwe ndị ahụ. N’oge ahụ, ndị Briten anaghị ekwe ka onye ọ bụla jiri ọkọlọtọ ndị Ayaland, ma m na-eji ya, m na-edekwa ihe n’ebe ọ bụla m hụrụ iji katọọ ndị Briten. O nweghị mgbe a na-anaghị enwe arụ a kpasara onye Katọlik. Nke a na-emekwa ka a malite ime ngagharị iwe. A malite ya, ọ na-adị ka ngagharị iwe nkịtị, ma, ọ naghị adị anya a malite imebisi ihe.

      Mgbe m nọ mahadum, m na-eso ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ eme ngagharị iwe. M mechara kwaga Lọndọn. Eso m na-eme ngagharị iwe iji gosi na obi adịghị anyị mma maka otú ndị gọọmenti si eme iwu na-abara naanị ndị ọgaranya uru. Ha na-ejikwa iwu ndị ahụ emesi ndị ogbenye ike. O nwekwara mgbe ndị ọchịchị bepụrụ ego n’ụgwọ ọnwa ndị ọrụ bekee. Nke a mere ka ndị ọrụ bekee gbaa abụbụ ọrụ. Esokwa m gbaa abụbụ ọrụ ahụ. Esokwa m mee ngagharị iwe n’afọ 1990 mgbe gọọmenti kwuru na onye ọ bụla torola eto ga na-atụ ụtụ isi. Mgbe anyị mere ngagharị iwe a, e mebisiri ihe n’otu ámá ndị mmadụ na-ezukọtakarị na Lọndọn.

      Nsogbu niile a bịara gwụ m ike. Ọ na-abụ anyị mechaa ngagharị iwe, ihe akakwuo njọ kama ịdị mma.

      Ọ bụ n’oge ahụ ike ihe a niile gwụrụ m ka otu enyi m nwoke gwara m banyere Ndịàmà Jehova. Ha ji Baịbụl kụziere m na Chineke hụrụ mmadụ niile n’anya nakwa na ọ ga-edozi nsogbu niile ọchịchị ụmụ mmadụ kpatarala. (Aịzaya 65:17; Mkpughe 21:3, 4) N’agbanyeghị na ndị mmadụ na-eburu ndị ha na-achị ihe ọma n’obi, ha enweghị ike ime ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ ibe ha asị. Ihe mere ya bụ na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-akpata nsogbu ndị dị n’ụwa. Ma, ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-achị ụmụ mmadụ, ọ ga-enyere anyị aka imeri ná mgba anyị na ha na-agba.—Jeremaya 10:23; Ndị Efesọs 6:12.

      Mgba niile m gbara n’oge ahụ dị ka ebe mmadụ ji nkata na-ekuru mmiri. Obi dị m mma ugbu a maka na amarala m na o nwere mgbe mmegbu na-agaghịzi adị n’ụwa a. N’oge ahụ, e nweghị onye ga-aka ibe ya.

      Baịbụl kwuru na Jehova Chineke “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) O so n’ihe mere obi ji sie anyị ike na ọ ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị imegbu ibe ha. Anyị manụ na ọchịchị mmadụ enweghị ike ịkwụsị mmegbu. (Daniel 2:44) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú Jehova ga-esi kwụsị mmegbu, gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ebe i bi. I nwekwara ike ịga n’adres bụ́ www.jw.org/ig.

      N’agbanyeghị na ndị mmadụ na-eburu ndị ha na-achị ihe ọma n’obi, ha enweghị ike ime ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ ibe ha asị

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya