Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mmebi Ụwa Ò Ruwela Ka Ọ̀ Bụ Na O Ruwebeghị?
    Teta!—2017 | No. 6
    • Doomsday Clock

      ISIOKWU TETA! A | MMEBI ỤWA Ò RUWELA?

      Mmebi Ụwa Ò Ruwela Ka Ọ̀ Bụ Na O Ruwebeghị?

      NA JENỤWARỊ afọ 2017, ndị sayensị kwuru otu ihe mapụrụ ọtụtụ ndị obi. Ha kwuru na oge a na-atụ anya na ọdachi nwere ike ịkpata ụwa mmebi adịkwuola nso karịa otú ọ dịbu na mbụ. Iji mee ka ihe ha na-ekwu dokwuo anya, ha ji otu elekere mee ihe atụ iji gosi na ụwa a agawala imebi. Ha kpọrọ elekere a Doomsday Clock. Ha wegara aka elekere ahụ ihu ihe dị ka tịnkọm tịnkọm iri atọ, nke mere ka ọ fọ nkeji abụọ na ọkara ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke abalị n’elekere ahụ. Ha kwuru na njinji ga-eji ma ọ kụọ elekere iri na abụọ nke abalị. Ihe ha na-ekwu bụ na ọ bụ n’afọ a ka mmebi ụwa kacha dịrị nso kemgbe ihe dị ka afọ iri isii gara aga.

      Ọ bụ n’afọ 2018 ka ndị sayensị ahụ kwuru na ha ga-eleba anya ọzọ n’otú ihe si kwụrụ n’ụwa iji mata ma mmebi ụwa ọ̀ dịkwuola nso. Elekere ahụ ọ̀ ka ga-egosi na ụwa mmebi adịkwuola nso karịa otú ọ dịbu? Gịnị ka i chere? Mmebi ụwa ò ruwela? O nwere ike isiri gị ike ịza ajụjụ a. A sị ka e kwuwe, ndị ọkachamara enweghịdị otu olu n’okwu a. Ọ bụghị mmadụ niile kweere na ụwa a ga-emebi otu ụbọchị.

      N’eziokwu, e nwere ọtụtụ nde mmadụ kweere na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Ha kwuru na e nwere ihe mere ha ji kwere na ụwa a ga-adịru mgbe ebighị ebi, nakwa na ihe ga-emecha dịrị ụmụ mmadụ ná mma. Ihe a ha kweere ọ̀ bụ eziokwu? Mmebi ụwa ò ruwela ka ọ bụ na o ruwebeghị?

      Gịnị bụ Doomsday Clock? Akwụkwọ bụ Bulletin of the Atomic Scientists kwuru na Doomsday Clock bụ elekere e ji ama atụ ọtụtụ mba n’ụwa kwekọrịtara na ha ga-eji na-amata ma oge ò ruwela mgbe nkà na ụzụ ọjọọ ụmụ mmadụ rụpụtara ga-akpata mmebi ụwa a. Ha kwuru na nkà n’ụzụ kacha njọ bụ ngwá agha ọgwụrụ mba. Ihe ndị ọzọ dịkwa njọ bụ́ nkà na ụzụ ndị na-emebi ihu ígwé, kemikal dị iche iche a na-emepụta nakwa kọmputa ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Ihe ndị a nwere ike isi n’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ kpatara anyị nsogbu ndị na-agaghị ekwe mmekwata.

  • Onye Ọ Bụla Chọrọ Ịmata Azịza Ya
    Teta!—2017 | No. 6
    • ISIOKWU TETA! A | MMEBI ỤWA Ò RUWELA?

      Onye Ọ Bụla Chọrọ Ịmata Azịza Ya

      Ọ BỤRỤ na akụkọ ọjọọ juru n’ụwa taa na-eme ka ụjọ na-atụ gị nakwa ka ị na-echegbu onwe gị, mara na ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. N’afọ 2014, onye na-achị mba Amerika n’oge ahụ aha ya bụ Barack Obama kwuru na ihe ọjọọ dị iche iche ndị ụlọ ọrụ nta akụkọ na-agbasa n’akụkọ, emeela ka ọtụtụ ndị kwuo “na ụwa a aghịghasịala . . . nke na o nwekwaghị mmeta.”

      O teghi aka o kwuchara ihe a, ya ekwuwe gbasara mbọ ndị a na-agba iji gboo nsogbu ndị e nwere n’ụwa taa. Ọ kpọrọ mbọ ndị gọọmenti ụfọdụ na-agba “ozi ọma,” kwuokwa na obi siri ya ezigbo ike na mbọ ha ndị ahụ ga-eme ka ihe dị mma. E nwere ike ikwu na ihe ọ na-ekwu bụ na ya kwetasiri ike na ọ bụ mbọ ndị a ndị mmadụ na-agba ga-eme ka ọdachi ndị ahụ a na-atụ anya na ha ga-akpata ụwa mmebi ghara ime.

      Ọtụtụ ndị kwetara n’ihe a o kwuru. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị tinyere obi ha na sayensị na-ekwu na ọganihu a na-enwe n’ihe banyere nkà na ụzụ ga-enye aka dozie nsogbu ndị e nwere n’ụwa. Otu ọkachamara n’ihe gbasara nkà na ụzụ kwuru na obi siri ya ike na si ugbu a ruo n’ihe dị ka n’afọ 2030, “nkà na ụzụ anyị ga-eji otu puku okpukpu ka nke e nwere taa mma, nakwa na n’afọ 2045, ihe ọ ga-eji ka ya mma ga-eru okpukpu otu nde. Anyị na-eme nke ọma. Ọ bụ eziokwu na nsogbu na-abịa n’ike n’ike, ma, anyị na-egbo ha ngwa ngwa karịa otú ha si abịa.”

      Olee otú nsogbu ụwa a jọruru ná njọ? Ọ̀ bụ eziokwu na ọ fọziri obere ka ụwa mebie? N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị sayensị na ndị ọchịchị na-ekwu na ihe ga-emecha dị mma, ọtụtụ ndị ka nọ ná mgbagwoju anya gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu. Gịnị kpatara ya?

      Ebe ogbunigwe gbawara

      NGWÁ AGHA ỌGWỤRỤ MBA. Òtù Mba Ụwa na òtù ndị ọzọ agbasiela mbọ ike iji hụ na mba dị iche iche mebisịrị ma kwụsị ịkpụ ngwá agha ọgwụrụ mba, ma mbọ ha kụrụ afọ n’ala. Ndị ọchịchị na-agba isi akwara elegharala iwu ndị gbochiri inwe ụdị ngwá agha ndị a anya. Mba ndị ahụ a ma na ha bụ aka ochie n’ịkpụ ngwá agha ọgwụrụ mba anọgidekwala na-akpụpụta ngwá agha ndị ka njọ. Mba ndị nke na-enwebughị ngwá agha ọgwụrụ mba enwetala ya, dịkwa njikere iji ya sụọ ndị mmadụ akwụ.

      Otú mba dị iche iche sizi dị njikere maka agha ọgwụrụ mba ugbu a mere ka ahụ́ ghara irukwa onye ọ bụla ala, ma n’oge o yiri ka e nwere “udo.” Akwụkwọ bụ́ Bulletin of the Atomic Scientists kwuru na ihe na-akacha enye nsogbu n’obi bụ na e nwedịrị “ngwá agha ndị nwere ike ịgbapụ n’onwe ha gaa ‘gbuo’ ndị mmadụ.”

      Ebe otu nwoke dina n’ụlọ ọgwụ

      ỌRỊA NDỊ NA-AKPA ANYỊ AKA ỌJỌỌ. E nwechaghị oké ihe sayensị ga-emeli iji mee ka mmadụ niile na-enwe ezigbo ahụ́ ike. Nsogbu ndị na-akpata ọrịa ndị dị ka ọbara mgbali elu, oké ibu, mmetọ ikuku, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ na-arịzi ibe ya elu. Ọrịa ndị na-anaghị efe efe dị ka kansa, ọrịa obi, na ọrịa shuga na-egbuzi ọtụtụ ndị n’eleghị anya n’azụ. Ọrịa ndị ọzọ dị ka isi mmebi na-akpakwa ọtụtụ ndị aka ọjọọ. N’ime afọ ndị na-adịchabeghị anya, e nweela ọrịa ndị jọgburu onwe ha dị ka Ebola na ọrịa Zika. Ihe a na-ekwu bụ na ọrịa akala ụmụ mmadụ ike, o nweghịkwa onye ma mgbe ọ ga-akwụsị.

      Ihe ndị na-emetọ mmiri na ikuku

      OTÚ NDỊ MMADỤ SI EMETO GBURUGBURU EBE OBIBI. Ụlọ ọrụ dị iche iche anọgidela na-emetọ ikuku. Ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi ikuru ikuku ọjọọ.

      Ọhaneze na ụlọ ọrụ gọọmenti dị iche iche anọgidela na-awụnye mposi, ihe dị iche iche si n’ụlọ ọgwụ, rọba, kemikal na ihe ndị ọzọ na-adịghị mma n’ime osimiri. Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopedia of Marine Science kwuru na “ihe ndị a na-adịghị mma a na-awụnye n’osimiri na-akpa ma azụ̀ ma ahịhịa ndị nọ n’ime osimiri aka ọjọọ, na-egbukwa ha. Otu ihe ahụ ka ọ na-emekwa ndị mmadụ na-eri ha.”

      Ọ na-esi ike inweta mmiri ọṅụṅụ di mma. Otu onye sayensị si Briten aha ya bụ Robin McKie kwuru, sị: “Ụkọ mmiri a na-ekwu banyere ya n’ebe ụfọdụ ga-emecha zuo ụwa niile.” Ndị ọchịchị kwetara na ọ bụ ụmụ mmadụ kpatara ụkọ mmiri a dịnụ, nakwa na nsogbu ndị ọ ga-akpata ga-akarị akarị.

      Ajọ ifufe

      ỌDACHI NDỊ NA-EMERE ONWE HA. Oké ifufe na ala ọma jijiji na-eme ka e nwee idei mmiri ndị na-emebisị ihe, ala mbize na ụdị ọdachi ndị ọzọ. Ha egbuokwala ọtụtụ mmadụ ma kpatara ndị ọzọ nsogbu dị iche iche. Otu nchọpụta Ụlọ Ọrụ Amerịka Na-ahụ Maka Ụgbọelu na Mbara Elu mere ma bipụta gosiri na a ga-enwekwu “ajọ ifufe, oké okpomọkụ nakwa oké mmiri ozuzo na oké ọkọchị ndị ka njọ.” Ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọ̀ ga-ala ụmụ mmadụ niile n’iyi?

      Ọ ga-abụ na ị ma na e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ nwere ike ịkpatara ndị mmadụ ọdachi. Ma, ịnọ na-eche gbasara ihe ọjọọ dị iche iche na-eme n’ụwa taa na ige ndị ọchịchị na ndị sayensị ntị a gaghị eme ka i nweta azịza na-eju afọ maka ihe ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ụfọdụ ndị amatala azịza ajụjụ gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa taa nakwa ihe ga-eme n’ọdịnihu. Olee ebe a ga-esi achọta azịza ajụjụ ndị ahụ?

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Teta!—2017 | No. 6
    • Nwoke nọ n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa

      Ihe Doomsday Clock na-ekwu agaghị emezu n’ihi na Chineke ekwela ụmụ mmadụ nkwa maka ọdịnihu dị mma, kwuokwa na a gaghị ebibi ụwa anyị a

      ISIOKWU TETA! A | MMEBI ỤWA Ò RUWELA?

      Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

      KEMGBE ọtụtụ narị afọ gara aga ka Baịbụl buru amụma gbasara ihe ndị na-eme taa. O kwukwara na ihe ga-emecha dịrị ụmụ mmadụ ná mma n’ọdịnihu. Anyị ekwesịghịkwa ileghara ihe Baịbụl kwuru anya n’ihi na e nweela ọtụtụ amụma Baịbụl mezurunụ otú ahụ o si buo ya.

      Ka anyị lebatụ anya n’ụfọdụ n’ime ha:

      • “N’ihi na mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha, a ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.”—Matiu 24:7.

      • “Ma mara nke a, na n’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.”—2 Timoti 3:1-4.

      Amụma ndị ahụ na-ekwu gbasara ụwa a ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ na-achọ imebi emebi. Ma, e nwere ike ikwu na ụwa e mebiela nke na ụmụ mmadụ agaghị emezitali ya. Baịbụl na-ekwu na ụmụ mmadụ enweghị amamihe ma ọ bụ ikike ha ga-eji kwụsị ihe ọjọọ. Amaokwu Baịbụl ndị na-esonụ gosiri na ọ bụ eziokwu:

      • “E nwere ụzọ nke ziri ezi n’anya mmadụ, ma ụzọ ọnwụ ka nsọtụ ya ga-emecha bụrụ.”—Ilu 14:12.

      • ‘Mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’—Ekliziastis 8:9.

      • “Ọ dịrịghị mmadụ . . . ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.”—Jeremaya 10:23.

      Ọ bụrụ na ndị mmadụ anọgide na-eme otú masịrị ha, ihe ndị ha mepụtara nwere ike ịla ụwa n’iyi. Ma, nke ahụ enweghị ike ime eme. N’ihi gịnị? Lee ihe Baịbụl kwuru gbasara ya:

      • Chineke ‘tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.’—Abụ Ọma 104:5.

      • “Otu ọgbọ na-ala, ọgbọ ọzọ na-abịakwa; ma ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.”—Ekliziastis 1:4.

      • “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

      • “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.

      Ihe ndị a Baịbụl kwuru doro anya. Ikuku e metọrọ emetọ, ụkọ nri, ụkọ mmiri, ma ọ bụ ọrịa na-efe efe agaghị ala ụmụ mmadụ n’iyi. A gakwanụghị eji agha ọgwụrụ mba bibie ụwa anyị a. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ Chineke ka ihe niile gbasara ọdịnihu ụwa a dị n’aka. Chineke hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ha ga-eme. Ha na-erikwa uru ma ọ bụ nweta nsụ si ná mkpebi ha pụta. (Ndị Galeshia 6:7) Ụwa a adịghị ka ụgbọ okporo ígwè n’enweghị njite na-aga ịkpọkasị n’oge na-adịghị anya. Chineke agaghị ekwe ka ụmụ mmadụ bibie ụwa a.—Abụ Ọma 83:18; Ndị Hibru 4:13.

      Ma, Chineke ga-emekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọ ga-eme ka e nwee “udo nke zuru ebe niile.” (Abụ Ọma 37:11) Ihe ọma ndị e kwuru gbasara ha n’isiokwu a, bụ naanị ole na ole n’ime ọtụtụ ihe nde Ndịàmà Jehova mụtara na Baịbụl ga-eme n’ọdịnihu.

      Ndịàmà Jehova bụ otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ, nke jupụtara n’ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nọ afọ ndụ dị iche iche, sikwa n’agbụrụ dị iche iche. Onye ha na-efe bụ naanị otu ezi Chineke ahụ, onye Baịbụl mere ka a mata na aha ya bụ Jehova. Ha anaghị atụ ụjọ ọdịnihu n’ihi na Baịbụl kwuru, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye kere eluigwe, Onye bụ́ ezi Chineke, Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya, Onye mere ka o guzosie ike, onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya: ‘Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.’”—Aịzaya 45:18.

      Isiokwu a lebara anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru gbasara ihe ga-eme ụwa a na ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara ihe mere Chineke ji kee ụwa a, gụọ isi nke 5 na broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.pr418.com/ig

      I nwekwara ike ịnọ na www.pr418.com/ig lee vidio aha ya bụ Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa? (Pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịzie VIDIO)

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya