Akụkụ nke 2—Ụwa nke Ahụhụ Na-adịghị
1, 2. Echiche dị aṅaa nke dị iche ka ọtụtụ ndị nwere?
OTÚ ọ dị, ọtụtụ nde ndị mmadụ gburugburu ụwa nwere echiche dị nnọọ iche kpam kpam. Ha na-ahụ ọdịnihu dị ebube nke dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Ha na-asị na kpọmkwem n’elu ala ebe a, a ga-enwe ụwa nke ajọ omume na ahụhụ na-agaghị adị ma ọlị. Obi siri ha ike na a ga-ekpochapụ ihe ọjọọ ma guzobe ụwa nke dị ọhụrụ kpam kpam. Ọbụna na ha na-asị na a na-eguzobe ntọala nke ụwa ọhụrụ ahụ ugbu a!
2 Ndị a na-asị na agha, obi ịta mmiri, imempụ, ikpe na-ezighị ezi, na ịda ogbenye agaghị adị n’ụwa ọhụrụ ahụ. Ọ ga-abụ ụwa nke ọrịa, mwute, anya mmiri, na ọbụna ọnwụ, na-adịghị. Na mgbe ahụ, ụmụ mmadụ ga-etoru izu okè ma bie ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ na paradaịs elu ala. Leenụ, ọbụna na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha ga-enwekwa ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi!
3, 4. N’ihi gịnị ka obi ji sie ndị dị otú ahụ ike banyere echiche ha?
3 Echiche nke a banyere ọdịnihu ọ̀ bụ nanị nrọ, inwe ọchịchọ efu maka ihe na-agaghị ekwe omume? Ee e, ọ dịghị ma ọlị. Ọ dabeere n’okwukwe nke ntọala ya siri ike, na Paradaịs nke a na-abịanụ aghaghị iwere ọnọdụ. (Ndị Hibru 11:1) N’ihi gịnị ka ha ji jiri n’aka otú a? N’ihi na Onye Okike kachasị ihe nile elu nke kere eluigwe na ala ekwewo ya ná nkwa.
4 Banyere nkwa dị iche iche nke Chineke, Bible na-asị: “Ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ.” “Chineke abụghị mmadụ, nke ọ ga-ekwu okwu ụgha . . . Ọ̀ bụ na ya onwe ya asịwo na ọ ga-eme ihe, ma o meghị ya? Ma ọ bụ, ò kwuwo okwu, ma o meghị ya ka o guzosie ike?” “Jehova nke usuu nile nke ndị agha aṅụwo iyi, sị, N’ezie dị ka m cheworo, otú a ka ọ ga-adị; na dị ka m zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.”—Joshua 23:14; Ọnụ Ọgụgụ 23:19; Aịsaịa 14:24.
5. Ajụjụ ndị dị aṅaa dị mkpa ka a zaa ha?
5 Otú ọ dị, ọ bụrụ na nzube Chineke bụ iguzobe paradaịs elu ala nke ahụhụ na-adịghị na ya, gịnị mere o ji kwere ka ihe ọjọọ na-eme na nke mbụ ya? N’ihi gịnị ka o ji chere puku afọ isii ruo ugbu a iji dozie ihe na-ezighị ezi? Ọtụtụ narị afọ ndị ahụ nke ịta ahụhụ hà pụrụ ịbụ ihe na-egosi na Chineke adịghị eche banyere anyị n’ezie, ma ọ bụ ọbụna na ọ dịghị adị?