Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dg akụkụ 11 p. 28-32
  • A Na-eguzobe Ntọala nke Ụwa Ọhụrụ ahụ Ugbu A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Na-eguzobe Ntọala nke Ụwa Ọhụrụ ahụ Ugbu A
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ n’Ezie
  • Ịmata Ndị Bụ Ndị Chineke
  • Ihe Ọzọ E Ji Amata Ha
  • Inye Azịza n’Oké Ihe Iseokwu nke Abụọ Ahụ
  • Gịnị Bụ Nhọrọ Gị?
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Jehova Chineke nke Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Olee Ndị Na-ekpe Ezi Okpukpe?
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Anyị Dị n’Otu n’Ụwa Niile
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
dg akụkụ 11 p. 28-32

Akụkụ nke 11

A Na-eguzobe Ntọala nke Ụwa Ọhụrụ ahụ Ugbu A

1, 2. Ná mmezu nke amụma Bible, gịnị na-ewere ọnọdụ kpọmkwem n’ihu anyị?

IHE ọzọ dịkwa ebube bụ eziokwu ahụ nke bụ na a na-eguzobe ntọala nke ụwa ọhụrụ Chineke kpọmkwem ugbu a, ọbụna ka ụwa ochie Setan na-akawanye njọ. N’ihu anyị, Chineke na-achịkọta ndị si ná mba nile ma jiri ha na-eme ntọala nke òtù ụwa ọhụrụ nke ga-anọchi ụwa nke taa na-adịghị n’otu n’oge na-adịghị anya. Na Bible, na 2 Pita 3:​13, a kpọrọ òtù ụwa ọhụrụ nke a “ụwa ọhụrụ.”

2 Amụma Bible kwukwara, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a [oge nke anyị bi n’ime ya ugbu a], . . . ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova [ezi ofufe ya], . . . ọ ga-ezikwa anyị ụzọ ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile.”​—⁠Aịsaịa 2:​2, 3.

3. (a) N’etiti òle ndị ka a na-emezu amụma Aịsaịa? (b) Olee otú akwụkwọ ikpeazụ nke Bible si kwuo okwu banyere nke a?

3 A na-emezu amụma ahụ ugbu a n’etiti ndị na-edo onwe ha n’okpuru ‘ụzọ nke Chineke ma na-aga ije n’ime ya.’ Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-ekwu banyere òtù ụmụ mmadụ nke a zuru ụwa ọnụ ndị na-ahụ udo n’anya dị ka “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” n’ezie ha bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ ndị na-efe Chineke n’ịdị n’otu. Bible na-asịkwa: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.” Ya bụ na ha ga-alanarị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a.​—⁠Mkpughe 7:​9, 14; Matiu 24:⁠3.

Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ n’Ezie

4, 5. N’ihi gịnị ka òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova ji bụrụ ihe kwere mee?

4 Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-etinye ezi mgbalị iji bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná ntụziaka na ụzọ nile nke Chineke. Olileanya ha nke ndụ ebighị ebi bụ nke e kegidesiri ike n’ụwa ọhụrụ Chineke. Site n’ibi ndụ ha kwa ụbọchị n’irubere iwu dị iche iche nke Chineke isi, ha na-egosi ya njikere ha dị ido onwe ha n’okpuru ụzọ o si achị ma ugbu a ma n’ụwa ọhụrụ ahụ. N’ebe ọ bụla, n’agbanyeghị mba ma ọ bụ agbụrụ ha, ha na-erube isi n’otu usoro ụkpụrụ​—⁠bụ́ ndị Chineke guzobere n’Okwu ya. Ọ bụ ya mere ha ji bụrụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ n’ezie, òtù ụwa ọhụrụ nke ga-esi n’aka Chineke.​—⁠Aịsaịa 54:13; Matiu 22:​37, 38; Jọn 15:​9, 14.

5 Ndịàmà Jehova adịghị anara otuto maka ọbụbụ ha bụ òtù pụrụ iche nke ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Ha maara na ọ bụ n’ihi mmụọ siri ike nke Chineke nke na-arụ ọrụ n’ahụ ndị na-edo onwe ha n’okpuru iwu ya. (Ọrụ 5:​29, 32; Ndị Galetia 5:​22, 23) Ọ bụ Chineke na-eme ya. Dị ka Jisọs kwuru, “ihe a na-apụghị ime n’ebe mmadụ nọ bụ ihe a pụrụ ime n’ebe Chineke nọ.” (Luk 18:27) Ya mere Chineke ahụ nke mere ka o kwe mee na e nwere mbara igwe nke na-adịgide adịgide bụkwa onye na-eme ka o kwe mee inwe òtù ụwa ọhụrụ nke na-adịgide adịgide.

6. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova, ọrụ ebube nke ọgbara ọhụrụ?

6 Otú a, ụzọ Jehova ga-esi chịa n’ụwa ọhụrụ ka a pụrụ ịhụ ugbu a n’ihe ọ na-eme ka e nwee ná ntọala ụwa ọhụrụ ahụ nke a na-eguzobe ugbu a. A pụkwara ikwu na ihe o jiworo Ndịàmà ya mee bụ ọrụ ebube nke ọgbara ọhụrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na o wulitewo Ndịàmà Jehova ịbụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ n’ezie, nke a na-apụghị iji ọdịmma mba, nke agbụrụ, ma ọ bụ okpukpe, bụ́ ndị na-akpata nkewa, tisasịa. Ọ bụ ezie na Ndịàmà ahụ eruwo ọtụtụ nde ma biri n’ihe karịrị 200 ala dị iche iche, e jikọrọ ha ọnụ n’otu n’ihe nkekọ nke a na-apụghị ịtọsa atọsa. Òtù ụmụnna nke a zuru ụwa ọnụ, nke pụrụ iche n’akụkọ ihe mere eme nile, bụ n’ezie ọrụ ebube nke ọgbara ọhụrụ.​—⁠Aịsaịa 43:​10, 11, 21; Ọrụ 10:​34, 35; Ndị Galetia 3:⁠28.

Ịmata Ndị Bụ Ndị Chineke

7. Olee otú Jisọs sịrị na a ga-esi mara ezi ndụ na-eso ụzọ ya?

7 Olee otú a pụrụ isi matakwuo ndị bụ ndị ahụ Chineke ji na-eme ihe dị ka ntọala nke ụwa ọhụrụ ya? Ọ dị mma, olee ndị na-emezu okwu Jisọs na Jọn 13:​34, 35? Ọ sịrị: “Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka m hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” Ndịàmà Jehova kwere n’okwu Jisọs ma na-eme ya. Dị ka Okwu Chineke si nye ntụziaka, ha ‘na-eme ka ịhụnanya ahụ ha na-ahụrịta onwe ha dị ike.’ (1 Pita 4:⁠8) Ha ‘na-eyikwasị [onwe ha] ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè,’ (Ndị Kọlọsi 3:14) Ya mere ịhụnanya ụmụnna bụ “ihe nnyado” nke na-ejikọ ha ọnụ gburugburu ụwa.

8. Olee otú 1 Jọn 3:​10-12 si gosikwuo ihe a ga-eji mara ndị bụ ndị Chineke?

8 Ọzọ, 1 Jọn 3:​10-12 na-asị: “N’ime nke a ka ụmụ Chineke bụ ndị e meworo ka ha pụta ìhè, ha na ụmụ Ekwensu: onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume esighị na Chineke pụta, onye nke na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya esighịkwa na ya pụta. N’ihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mbụ, ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: ọ bụghị dị ka Ken si bụrụ onye si n’ajọ onye ahụ pụta, wee gbuo nwanne ya.” Otú a, ndị Chineke bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke na-adịghị eme ihe ike.

Ihe Ọzọ E Ji Amata Ha

9, 10. (a) Ọrụ dị aṅaa ka e ji mara ndị na-ejere Chineke ozi ná mgbe ikpeazụ? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova siworo mezuo Matiu 24:⁠14?

9 E nwere ụzọ ọzọ e si amata ndị na-ejere Chineke ozi. N’amụma ya banyere ọgwụgwụ ụwa, Jisọs kwuru banyere ọtụtụ ihe ndị ga-aka oge nke a akara dị ka mgbe ikpeazụ. (Lee Akụkụ nke 9.) Akụkụ bụ isi nke amụma nke a bụ nke a kpọtụrụ uche n’okwu ya na Matiu 24:​14, sị: “A Ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”

10 Ànyị ahụwo ka a na-emezu amụma ahụ? Ee. Eri oge ahụ mgbe ikpeazụ malitere na 1914, Ndịàmà Jehova ekwusawo ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa nile n’ụzọ ahụ Jisọs nyere n’iwu, ya bụ, n’ụlọ ndị mmadụ. (Matiu 10:​7, 12; Ọrụ 20:20) Ọtụtụ nde Ndịàmà na-abịa n’ụlọ ndị mmadụ ná mba nile ịgwa ha okwu banyere ụwa ọhụrụ ahụ. Nke a edujewo na gị ịnata akwụkwọ nke a, ebe ọ bụ na ọrụ Ndịàmà Jehova gụnyere ibipụta na ikesa ọtụtụ ijeri akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche banyere Alaeze Chineke. Ọ̀ dị ndị ọ bụla ọzọ ị maara nke na-ekwusa banyere Alaeze Chineke site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ụwa nile? Mak 13:10 na-egosi na a ghaghị “ibu ụzọ” rụọ ọrụ nkwusa na nkụzi nke a tupu ọgwụgwụ abịa.

Inye Azịza n’Oké Ihe Iseokwu nke Abụọ Ahụ

11. Olee ihe ọzọ Ndịàmà Jehova na-arụzu site n’ido onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke?

11 Site n’ido onwe ha n’okpuru iwu na ụkpụrụ nile nke Chineke, Ndịàmà Jehova na-emezu ihe ọzọ. Ha na-egosi na Setan bụ onye okwu ụgha mgbe ọ sịrị na ụmụ mmadụ apụghị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’okpuru ule. (Job 2:​1-⁠5) N’ịbụ òtù nke ọtụtụ nde ndị si ná mba nile, Ndịàmà ahụ na-egosipụta iguzosi ike n’ihe nye ọchịchị Chineke dị ka otu ìgwè. Ọ bụ ezie na ha bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ha na-akwado akụkụ nke Chineke n’ihe iseokwu nke ọkaaka eluigwe na ala, n’agbanyeghị nrụgide si n’aka Setan.

12. Site n’okwukwe ha, òle ndị ka Ndịàmà na-eṅomi?

12 Taa, ọtụtụ nde ndị a bụ́ Ndịàmà Jehova na-atụkwasị ihe àmà ha n’elu nke ogologo ahịrị nke ndị àmà ndị ọzọ nke oge ochie ndị gosipụtara iguzosi ike n’ihe nye Chineke. Ụfọdụ n’ime ndị ahụ bụ Ebel, Noa, Job, Abraham, Sera, Aịsak, Jekọb, Debora, Rut, Devid, na Daniel, ka a kpọtụ nanị ole na ole. (Ndị Hibru, isi nke 11) Dị ka Bible na-ekwu, ha bụ ‘oké ìgwè ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi.’ (Ndị Hibru 12:⁠1) Ndị a na ndị ọzọ, gụnyere Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya guzosiri ike n’ezi ihe nye Chineke.

13. Okwu ndị dị aṅaa nke Jisọs banyere Setan pụtaworo ìhè ịbụ eziokwu?

13 Nke a na-egosipụta na ihe Jisọs gwara ndị ndú okpukpe banyere Setan bụ eziokwu. “Ma unu na-achọ ụzọ igbu m, bụ́ mmadụ nke gwaworo unu eziokwu, nke m nụrụ n’ọnụ Chineke. . . . Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ Ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ site na mbụ, o guzoghịkwa n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ bụla ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu ihe si n’ihe nke aka ya pụta: n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.”​—⁠Jọn 8:​40, 44.

Gịnị Bụ Nhọrọ Gị?

14. Gịnị na-eme ntọala nke ụwa ọhụrụ ahụ ugbu a?

14 Ntọala ụwa ọhụrụ nke Chineke nke a na-eguzobe ugbu a n’òtù zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na-esiwanye ike. Kwa afọ ọtụtụ narị puku ndị mmadụ na-adabere n’ezi ihe ọmụma wee jiri inwe onwe ha ime mkpebi mee ihe n’ịnabata ọchịchị Chineke. Ha na-aghọ akụkụ nke òtù ụwa ọhụrụ ahụ, na-akwado akụkụ nke Chineke n’ihe iseokwu nke ọkaaka eluigwe na ala, ma na-egosi Setan ịbụ onye ụgha.

15. Olee ọrụ nkewa nke Jisọs na-arụ n’oge anyị?

15 Site n’ịhọrọ ọchịchị Chineke, ha na-eru eru ịbụ ndị a ga-edebe “n’aka nri” nke Kraịst ka ọ na-ekewapụta “atụrụ” pụọ “n’ụmụ ewu.” N’amụma ya banyere mgbe ikpeazụ, Jisọs sịrị: “N’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu; ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe.” Atụrụ bụ ndị weturu onwe ha ala, ndị na-esonyere ma na-akwado ụmụnna Kraịst, na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke. Ụmụ ewu bụ ndị isi ike ndị na-ajụ ụmụnna Kraịst ma ghara ime ihe ọ bụla iji kwadoo ọchịchị Chineke. Gịnị ga-esi na ya pụta? Jisọs sịrị: “Ndị a [ụmụ ewu] ga-apụ jee baa n’ahụhụ mmehie ebighị ebi: ma ndị ezi omume [atụrụ] ga-aba ná ndụ ebighị ebi.”​—⁠Matiu 25:​31-⁠46.

16. Gịnị ka ị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na ị chọrọ ibi na Paradaịs ahụ na-abịanụ?

16 N’ezie, Chineke na-eche banyere anyị! N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka e nwee paradaịs elu ala nke na-enye obi ụtọ. Ị̀ chọrọ ibi na Paradaịs ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, gosi ekele gị maka ihe ndị Jehova na-enye site n’ịmụ banyere ya na iji ihe ị na-amụta na-eme ihe. “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta ya, kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso: onye na-emebi iwu, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”​—⁠Aịsaịa 55:​6, 7.

17. N’ihi gịnị ka a na-ejighị nwee oge igbu n’ịhọrọ onye a ga-efe?

17 Ọ dịghị oge fọdụrụ igbu. Ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a dị nso. Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya. . . . Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”​—⁠1 Jọn 2:​15-⁠17.

18. Ụdị omume dị aṅaa ga-enyere gị aka iji obi ike lepụ anya n’ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ dị ebube nke Chineke?

18 A na-azụ ndị Chineke ugbu a maka ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ. Ha na-amụ nkà ime mmụọ na ndị ọzọ a chọrọ maka iwu paradaịs. Anyị na-agba gị ume ka ị họrọ Chineke dị ka Onye Ọchịchị ma kwadoo ọrụ ịzọpụta ndụ nke ọ na-eme ka a rụọ n’ụwa nile taa. Soro Ndịàmà Jehova mụọ Bible, wee mara Chineke ahụ nke na-eche banyere gị n’ezie, nke ga-ewetakwa ahụhụ ná njedebe. N’ụzọ dị otú a, gị onwe gị kwa pụrụ ịghọ akụkụ nke ntọala nke ụwa ọhụrụ ahụ. Mgbe ahụ ị ga-eji obi ike lepụ anya n’ọdịnihu inweta ihu ọma Chineke na ibi ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ dị ebube.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndịàmà Jehova nwere òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ n’ezie

[Foto dị na peeji nke 32]

A na-eguzobe ntọala nke ụwa ọhụrụ Chineke ugbu a

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya