Isi nke Iri na Abụọ
Unu Atụla Asiria Egwu
1, 2. (a) Dị ka mmadụ si ele ihe anya, n’ihi gịnị ka o ji yie ka Jona o nwere ezi ihe mere ọ na-ejighị chọọ ịnakwere ọrụ e nyere ya ime nkwusa nye ndị Asiria? (b) Olee otú ndị Nineve si meghachi omume n’ozi Jona?
N’ETITI narị afọ nke itoolu T.O.A., onye amụma bụ́ onye Hibru, bụ́ Jona nwa Amịtaị, gara Nineve, bụ́ isi obodo Alaeze Ukwu Asiria n’agbanyeghị ihe ize ndụ dị na ya. O nwere ozi dị oké mkpa ọ ga-ezi. Jehova sịrị ya: “Bilie, jeruo Nineve, bụ́ obodo ukwu ahụ, kpọsaa okwu megide ya; n’ihi na ihe ọjọọ ha arịgotawo n’ihu m.”—Jona 1:2, 3.
2 Mgbe mbụ o nwetara ọrụ ya, Jona gbara ọsọ gbaga n’akụkụ nke ọzọ bụ́ Tashish. Dị ka mmadụ si ele ihe anya, Jona nwere ihe mere ọ na-ejighị chọọ ịga. Ndị Asiria nwere obi ọjọọ. Lee otú otu eze Asiria si mesoo ndị iro ya ihe: “Ebepụrụ m aka na ụkwụ nke ndị isi agha ha . . . Agbara m ọtụtụ n’ime ha e ji eji ọkụ, akpụkwaara m ọtụtụ ná ndụ laa dị ka ndị a dọtara n’agha. Ebepụrụ m ụfọdụ aka na mkpịsị aka, ebepụkwara m ndị ụfọdụ imi.” N’agbanyeghị nke ahụ, n’ikpeazụ mgbe Jona ziri ozi Jehova, ndị Nineve chegharịrị ná mmehie ha, Jehova mekwaara obodo ahụ ebere n’oge ahụ.—Jona 3:3-10; Matiu 12:41.
Jehova Ewelie “Ndele”
3. Olee otú mmeghachi omume nke ụmụ Israel n’ebe ịdọ aka ná ntị ndị amụma Jehova dị si dị iche na nke ndị Nineve?
3 Ndị Israel, bụ́ ndị Jona mekwara nkwusa nye, hà ṅara ntị? (2 Ndị Eze 14:25) Ee e. Ha gbakụtara ofufe dị ọcha azụ. N’ezie, ha ruru n’ókè nke ‘ịkpọ isiala nye usuu nile nke ihe eluigwe, fee Beal ofufe.’ Ọzọkwa, “ha mekwara ka ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom gabiga n’ime ọkụ, ha na-ajụkwa ase, na-agba afa, ree onwe ha ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, ịkpasu Ya iwe.” (2 Ndị Eze 17:16, 17) N’adịghị ka ndị Nineve, Israel adịghị aṅa ntị mgbe Jehova na-eziga ndị amụma ịdọ ha aka ná ntị. Ya mere Jehova kpebiri ime ihe siri ike karị.
4, 5. (a) Gịnị ka e bu n’uche mgbe e kwuru “Asiria,” oleekwa otú Jehova ga-esi jiri ya mee ihe dị ka “ndele”? (b) Olee mgbe e meriri Sameria?
4 Ruo oge ụfọdụ ka Jona gasịrị Nineve, omume ịlụ agha nke Asiria belatara.a Otú ọ dị, ná mmalite nke narị afọ nke asatọ T.O.A., Asiria gosighachiri na ya bụ dike n’agha, Jehova jikwa ya mee ihe n’ụzọ na-atụ n’anya. Aịsaịa onye amụma ziri alaeze ebe ugwu nke Israel ozi ịdọ aka ná ntị Jehova ziri ha, sị: “Ahụhụ ga-adịrị Asiria, bụ́ ndele nke iwe m, mkpanaka ka ọ bụkwa n’aka ha, bụ́ oké iwe m! Imegide mba e merụrụ emerụ ka M na-eziga ya, banyere ndị nke nrubiga ókè iwe m ka M na-enyekwa ya iwu ịkwata ihe nkwata n’agha, na ịlụta ihe nlụta n’agha na ido ha ihe nzọtọ dị ka apịtị nke èzí.”—Aịsaịa 10:5, 6.
5 Lee mweda n’ala ọ bụụrụ ụmụ Israel! Chineke ji mba na-ekpere arụsị—“Asiria”— mee ihe dị ka “ndele” iji taa ha ahụhụ. Na 742 T.O.A., Eze Asiria bụ́ Shalmanesa nke Ise nọchibidoro Sameria, bụ́ isi obodo nke mba Israel ahụ si n’ezi ofufe dapụ. Site n’ebe dịziri adịzi ọ dị, n’elu ugwu nke dị ihe dị ka mita 90 n’ịdị elu, Sameria nọ na-achụghachi ndị iro ya azụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ. Ma ọ dịghị atụmatụ ọ bụla nke mmadụ nke pụrụ igbochi nzube Chineke. Na 740 T.O.A., e meriri Sameria, Asiria zọtọkwara ya.—2 Ndị Eze 18:10.
6. N’ụzọ dị aṅaa ka Asiria si gabiga ihe Jehova bu n’uche maka ya?
6 Ọ bụ ezie na Jehova ji ha kụziere ndị ya ihe, ndị Asiria n’onwe ha amaghị Jehova. Ọ bụ ya mere o ji gaa n’ihu ikwu, sị: “Ma [Asiria], ọ bụghị otú a ka ọ na-ezube, obi ya kwa, ọ bụghị otú a ka ọ na-eche; kama ikpochapụ ekpochapụ dị n’obi ya, ya na ibipụ ọtụtụ mba.” (Aịsaịa 10:7) Jehova bu n’uche ka Asiria bụrụ ngwá ọrụ ya. Ma Asiria chọrọ ịbụ ihe ọzọ. Obi ya kpaliri ya ichepụta ihe ọzọ ka ukwuu—imeri ụwa a maara n’oge ahụ!
7. (a) Kọwaa okwu bụ́ “Ndị isi m, ha nile ábụghị ndị eze?” (b) Gịnị ka ndị jụrụ Jehova taa kwesịrị ịrịba ama?
7 Ọtụtụ n’ime obodo ndị na-abụghị nke ndị Israel, bụ́ ndị Asiria meriri, nwere mgbe ndị eze na-achị na ha. Ndị a bụbu ndị eze aghaghị ido onwe ha ugbu a n’okpuru eze Asiria dị ka ndị isi nọ n’okpuru ya, ya mere ọ pụrụ iji tuo ọnụ n’ezie, sị: “Ndị isi m, ha nile ábụghị ndị eze?” (Aịsaịa 10:8) Chi ụgha nile nke obodo ndị a ma ama nke mba dị iche iche apụghị ịzọpụta ndị na-efe ha pụọ ná mbibi. Chi dị iche iche nke ndị bi na Sameria na-efe, dị ka Beal, Mọlek, na ụmụ ehi ọlaedo, agaghị echebe obodo ahụ. Ebe ha hapụworo Jehova, Sameria ekwesịghị ịtụ anya ka o mee ihe. Ka onye ọ bụla taa, nke jụrụ Jehova, rịba ama ihe mere Sameria. Asiria pụrụ nnọọ itu ọnụ banyere Sameria na obodo ndị ọzọ o meriworo, sị: “Kalno, ọ́ dịghị ka Kakemish? ma ọ bụ Hemat, ọ́ dịghị ka Apad? ma ọ bụ Sameria, ọ́ dịghị ka Damaskọs?” (Aịsaịa 10:9) Ha nile bụ otu ihe ahụ nye Asiria—ihe ọ ga-akwara n’agha.
8, 9. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na Asiria gafere ókè mgbe o lekwasịrị Jerusalem anya?
8 Otú ọ dị, Asiria tufere ọnụ ókè. O kwuru, sị: “Dị ka aka m chọtaworo alaeze nile nke ihe efu, ndị arụsị ha a pịrị apị karịrị nke Jerusalem, karịakwa nke Sameria; dị ka m meworo Sameria, meekwa ihe efu ya nile, ọ́ bụghị otú a ka m ga-eme Jerusalem, meekwa ihe efu ya nile?” (Aịsaịa 10:10, 11) Alaeze ndị Asiria meriworo nwere ọtụtụ arụsị karịa Jerusalem ma ọ bụ ọbụna Sameria. ‘Gịnị,’ ka o chere, ‘ga-egbochi m ime Jerusalem ihe m mere Sameria?’
9 Oji ọnụ! Jehova agaghị ekwe ka o weghara Jerusalem. N’eziokwu, Juda enweghị ihe ndekọ ọma gosiri na ọ kwadoro ezi ofufe mgbe nile. (2 Ndị Eze 16:7-9; 2 Ihe E Mere 28:24) Jehova dọrọ aka ná ntị na n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ya, Juda ga-ata ahụhụ dị ukwuu mgbe Asiria ga-awakpo ya. Ma Jerusalem ga-adịgide. (Aịsaịa 1:7, 8) Mgbe ndị Asiria mere mwakpo ahụ, ọ bụ Hezekaịa bụ eze na Jerusalem. Hezekaịa adịghị ka nna ya bụ́ Ehaz. Leenụ, n’ọnwa mbụ ọ malitere ọchịchị, Hezekaịa mepeghachiri ọnụ ụzọ nke ụlọukwu ahụ ma weghachi ofufe dị ọcha!—2 Ihe E Mere 29:3–5.
10. Gịnị ka Jehova kwere nkwa ime banyere Asiria?
10 Ya mere Jehova akwadoghị mwakpo ahụ Asiria mere atụmatụ ịwakpo Jerusalem. Jehova kwere nkwa na ike ọchịchị ụwa ahụ dị mpako ga-aza ajụjụ: “Ọ ga-erukwa, mgbe Onyenwe unu ga-arụbi ọrụ Ya nile n’ugwu Zaịọn na n’ime Jerusalem, na M ga-eleta mkpụrụ nke oké obi eze Asiria, letakwa ịma mma nke anya mpako ya.”—Aịsaịa 10:12.
Ịga Juda na Jerusalem!
11. N’ihi gịnị ka Asiria ji chee na Jerusalem ga-adị mfe mmeri?
11 Afọ asatọ mgbe e merisịrị alaeze ebe ugwu na 740 T.O.A., eze ọhụrụ nke Asiria, bụ́ Senakerib, zọọrọ njem gaa imegide Jerusalem. Aịsaịa ji okwu uri kọwaa atụmatụ mpako Senakerib, na-asị: “M wee wezụga ókè ndị nile dị iche iche, ọzọ, ihe ha nke e jikerewooro ka m pụnaara ha, m wee budaa, dị ka onye dị ike, ndị na-anọdụ n’ocheeze; aka m achọtawokwa akụ̀ ndị nile dị iche iche dị ka akwụ́; na dị ka mmadụ si achịkọta àkwá a hapụrụ ahapụ, otú a ụwa nile ka mụ onwe m chịkọtaworo: ma ọ dịghị nke na-emegharị nku, ma ọ bụ nke na-asaghe ọnụ, ma ọ bụ nke na-ebe ebe.” (Aịsaịa 10:13, 14) Senakerib tụgharịrị n’uche na obodo ndị ọzọ adawo, Sameria adịkwaghị, ya mere na ọ ga-adị mfe imeri Jerusalem! Obodo ahụ pụrụ iji ụjọ buo agha, ma ọ ga-abụ n’ebeghị ube, a ga-emeri ndị bi na ya n’egbughị oge, chịkọrọ ihe onwunwe ha dị ka àkwá dị n’akwụ́ a hapụrụ ahapụ.
12. Gịnị ka Jehova gosiri na ọ bụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi lee ihe anya n’ihe banyere itu ọnụ Asiria?
12 Otú ọ dị, ọ dị ihe Senakerib na-echefu. Ntaramahụhụ e nyere Sameria si n’ezi ofufe dapụ kwesịrị ya. Otú ọ dị, n’okpuru Eze Hezekaịa, Jerusalem aghọghachiwo ide maka ofufe dị ọcha. Onye ọ bụla chọrọ ịkpa Jerusalem aka ga-ama na Jehova dị adị! N’iwe, Aịsaịa jụrụ, sị: “Anyụike, ọ̀ ga-aja onwe ya n’ahụ onye ji ya egbu ihe? ma ọ bụ mma nkwọ, ọ̀ ga-eme onwe ya ukwuu megide onye na-akwọ ya? dị ka a ga-asị na ndele ga-efegharị ndị na-ebuli ya, dị ka a ga-asị na mkpanaka ga-ebuli onye na-abụghị osisi?” (Aịsaịa 10:15) Alaeze Ukwu Asiria bụ nanị ngwá ọrụ n’aka Jehova, dị nnọọ ka onye na-egbu osisi, onye na-akwọ osisi, ma ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ pụrụ isi jiri anyụike, mma nkwọ, mkpanaka, ma ọ bụ ndele mee ihe. Olee otú ndele ga-esi nwaa anwaa buliwezie onwe ya elu karịa onye ji ya na-eme ihe?
13. Kọwaa ma kwuo ihe mere (a) ndị “mara abụba.” (b) ‘uké na ogwu.’ (ch) “nsọpụrụ nke oké ọhịa ya.”
13 Gịnị ga-eme Asiria? “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ga-eziga ọtịta ahụ n’etiti ndị ya mara abụba: ọ bụkwa n’okpuru nsọpụrụ ya ka a ga-amụnye mmụnye dị ka mmụnye nke ọkụ. Ìhè Israel ga-aghọkwa ọkụ, Onye Nsọ ya ga-aghọkwa onwunwu ọkụ, wee ree ọkụ richapụ uké ya na ogwu ya n’otu ụbọchị. Ọ ga-emekwa nsọpụrụ nke oké ọhịa ya na nke ubi ọma ya ka ọ gwụsịa, ma mkpụrụ obi ma anụ ahụ: ọ ga-adịkwa ka ọtịta ahụ nke onye ọrịa. Ma osisi nke fọdụrụ n’oké ọhịa ya ga-adị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ, nwata ga-edetakwa ha n’akwụkwọ.” (Aịsaịa 10:16-19) Ee, Jehova ga-eweda “ndele” ahụ bụ́ Asiria ala! A ga-eme ka ndị “mara abụba” n’usuu ndị agha Asiria, bụ́ ndị agha ya gbasiri ike, rịa ọrịa na-akpata “ọtịta ahụ.” Ha agaghị eyi ndị siri ike nke ukwuu! Dị ka ọtụtụ uké na ogwu, Ìhè Israel, bụ́ Jehova Chineke ga-agba ndị agha ya ji ụkwụ aga ọkụ. “Nsọpụrụ nke oké ọhịa ya,” bụ́ ndị isi agha ya, ga-anwụsịkwa. Mgbe Jehova mesịrị Asiria ihe, ndị isi agha ya ga-afọdụ nnọọ mmadụ ole na ole nke na obere nwa ga-enwe ike iji mkpịsị aka ya gụọ ole ha dị!—Leekwa Aịsaịa 10:33, 34.
14. Kọwaa ọganihu Asiria nwere n’ala Juda ka ọ na-erule 732 T.O.A.
14 N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ghaghị isiri ndị Juu bi na Jerusalem na 732 T.O.A. ike ikweta na a ga-emeri Asiria. Usuu ndị agha Asiria na-aga n’ihu n’akwụsịtụghị akwụsị. Gee ntị n’aha obodo ndị dị na Juda bụ́ ndị e meriworo: “Ọ bịakwasịwo Aịat . . . Migron . . . Mikmash . . . Geba . . . Rema . . . Gibea nke Sọl . . . Galim . . . Laịsha . . . Anatọt . . . Madmena . . . Gibim . . . Nọb.” (Aịsaịa 10:28-32a)b N’ikpeazụ ndị mwakpo ahụ garuru Lekish, nke dị nanị kilomita 50 site na Jerusalem. N’oge na-adịghị anya usuu ndị agha buru ibu nke Asiria na-eyi obodo ahụ egwu. “Ọ na-efegharị aka ya n’ebe ugwu ada Zaịọn dị, bụ́ ugwu nta Jerusalem.” (Aịsaịa 10:32b) Gịnị ga-egbochili Asiria?
15, 16. (a) N’ihi gịnị ka okwukwe siri ike ji dị Eze Hezekaịa mkpa? (b) Olee ihe ndabere Hezekaịa nwere iji nwee okwukwe na Jehova ga-enyere ya aka?
15 N’obí ya dị n’obodo ahụ, ahụ erughị Eze Hezekaịa ala. Ọ dọwara uwe ya ma yiri ákwà mkpe. (Aịsaịa 37:1) O zipụrụ ndị mmadụ ịgakwuru Aịsaịa onye amụma ịga jụọ Jehova ase n’aha Juda. N’oge na-adịghị anya ha ji azịza Jehova laghachite: “Atụla egwu . . . M ga-egbochikwa obodo a.” (Aịsaịa 37:6, 35) N’agbanyeghị nke ahụ, ndị Asiria nọ na-eyi ha egwu ma nwee obi ike dị ukwuu.
16 Okwukwe—ọ bụ ihe ga-enyere Eze Hezekaịa aka ịgabiga nsogbu a. Okwukwe bụ “nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” (Ndị Hibru 11:1) Ọ gụnyere ile anya gabiga ihe ndị a na-ahụ anya. Ma okwukwe na-adabere n’ihe ọmụma. Ma eleghị anya Hezekaịa chetara na Jehova kwuru okwu ndị a na-akasi obi tupu mgbe ahụ: “Gị ndị m nke bi na Zaịọn, atụla egwu Asiria . . . N’ihi na ọ fọdụrụ nwa mgbe nta, oké iwe ewee gwụsịa, iwe m ga-emekwa ka ha kaa nká. Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-efegharịkwa ụtarị n’elu ya, dị ka ntigbu Midian n’oké nkume Oreb: mkpanaka Ya ga-adịkwa n’elu oké osimiri, Ọ ga-ewelikwa ya otú O mere n’Ijipt.” (Aịsaịa 10:24-26)c Ee, ndị Chineke anọọla n’ọnọdụ ndị siri ike na mbụ. O yiri ka usuu ndị agha Ijipt hà karịrị nnọọ ndị nna nna Hezekaịa ike n’Osimiri Uhie. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Gideọn zutere ndị agha karịrị nnọọ ndị nke ya n’ọnụ ọgụgụ mgbe Midian na Amalek wakporo Israel. Ma, Jehova napụtara ndị ya n’oge abụọ ahụ.—Ọpụpụ 14:7–9, 13, 28; Ndị Ikpe 6:33; 7:21, 22.
17. Olee otú e si ‘mebie’ yoke Asiria, n’ihi gịnịkwa?
17 Jehova ọ̀ ga-emeghachi ihe o mere n’oge ndị mbụ ahụ? Ee. Jehova na-ekwe nkwa, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na ibu arọ ya ga-ewezụga onwe ya n’ubu gị, yoke ya ga-ewezụgakwa onwe ya n’olu gị, ee, a ga-emebi yoke site ná mmanụ.” (Aịsaịa 10:27) A ga-ewepụ yoke Asiria n’ubu nakwa n’olu nke ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ. N’ezie, a “ga-emebi” yoke ahụ—e mebikwara ya! N’otu abalị, mmụọ ozi Jehova gburu mmadụ 185,000 n’ime ndị Asiria. E wepụrụ ihe iyi egwu ahụ, Asiria hapụkwara ala Juda aka ruo mgbe ebighị ebi. (2 Ndị Eze 19:35, 36) N’ihi gịnị? ‘N’ihi mmanụ.’ Nke a pụrụ izo aka ná mmanụ e tere Hezekaịa dị ka eze si n’eriri Devid. N’ụzọ dị otú a, Jehova mezuru nkwa ya: “M ga-egbochikwa obodo a ịzọpụta ya, n’ihi Onwe m, na n’ihi Devid, bụ́ ohu m.”—2 Ndị Eze 19:34.
18. (a) Amụma Aịsaịa ò nwere ihe karịrị otu mmezu? Kọwaa. (b) Nzukọ dị aṅaa taa yiri Sameria oge ochie?
18 Ihe ndekọ Aịsaịa nke a tụlere n’isiakwụkwọ a bụ banyere ihe ndị mere na Juda ihe karịrị afọ 2,700 gara aga. Ma ihe ndị ahụ merenụ dị oké mkpa taa. (Ndị Rom 15:4) Nke a ọ̀ pụtara na ndị so n’akụkọ a na-adọrọ mmasị—ndị bi na Sameria na Jerusalem nakwa ndị Asiria—nwere ndị yiri ha n’oge a? Ee, ọ bụ ihe ọ pụtara. Dị ka Sameria na-ekpere arụsị, Krisendọm na-ekwu na ọ na-efe Jehova, ma o siwo n’ezi ofufe dapụ kpam kpam. N’akwụkwọ bụ́ An Essay on the Development of Christian Doctrine, John Henry Kadinal Newman nke Roman Katọlik kwetara na ihe ndị Krisendọm jiworo na-eme ihe eri ọtụtụ narị afọ, dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, kandụl, mmiri nsọ, uwe ndị ụkọchukwu, na ihe oyiyi, “malitechara n’etiti ndị ọgọ mmụọ.” Jehova enweghị mmasị n’ofufe ndị ọgọ mmụọ nke Krisendọm dịkwa ka ọ na-enweghị mmasị n’ikpere arụsị nke Sameria.
19. Gịnị ka a dọworo Krisendọm aka ná ntị banyere ya, ònyekwa dọrọ ya?
19 Eri ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova adọwo Krisendọm aka ná ntị banyere iwe Jehova. Dị ka ihe atụ, na 1955, e kwuru okwu ihu ọha isiokwu ya bụ “Krisendọm Ka Ọ̀ Bụ Iso Ụzọ Kraịst—Olee nke Bụ́ ‘Ìhè nke Ụwa’?” n’ụwa nile. Okwu ahụ kọwara n’ezoghị ọnụ ụzọ Krisendọm siworo hapụ ezi nkwenkwe na omume ndị Kraịst. Ka e mesịrị, e zigaara ndị ụkọchukwu nọ n’ọtụtụ mba ndepụta nke okwu ihu ọha a dị ike. Dị ka otu nzukọ, Krisendọm aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ. Nanị ihe Jehova ga-eme bụ iji “ndele” nye ya ahụhụ.
20. (a) Gịnị ga-arụ ọrụ dị ka Asiria nke oge a, oleekwa otú a ga-esi jiri ya mee ihe dị ka ndele? (b) Ruo n’ókè ha aṅaa ka a ga-enyeru Krisendọm ahụhụ?
20 Ònye ka Jehova ga-eji nye Krisendọm na-enupụ isi ahụhụ? Anyị na-achọta azịza ya n’isi nke 17 nke Mkpughe. N’ebe ahụ a kọọrọ anyị banyere otu nwanyị na-akwa iko, bụ́ “Babilọn Ukwu ahụ,” nke na-anọchite anya okpukpe ụgha nile dị n’ụwa, gụnyere Krisendọm. Nwanyị ahụ na-akwa iko na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke nwere isi asaa na mpi iri. (Mkpughe 17:3, 5, 7-12) Anụ ọhịa ahụ na-anọchite anya òtù Mba Ndị Dị n’Otu.d Dị ka Asiria oge ochie bibiri Sameria, anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie “ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16) Otú a ka Asiria nke oge a (mba ndị so na UN) ga-esi tie Krisendọm ihe otiti dị ukwuu ma gwepịa ya.
21, 22. Ònye ga-akpali anụ ọhịa ahụ ịwakpo ndị Chineke?
21 À ga-ebibikọta Ndịàmà Jehova na-ekwesị ntụkwasị na Babilọn Ukwu ahụ? Ee e. Chineke adịghị eweso ha iwe. Ofufe dị ọcha ga-adịgide. Otú ọ dị, anụ ọhịa ahụ nke ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ ga-ejikwa anyaukwu lewe anya n’ebe ndị Jehova nọ. N’ime otú ahụ, anụ ọhịa ahụ adịghị emezu uche Chineke, kama uche onye ọzọ. Ònye? Setan bụ́ Ekwensu.
22 Jehova kpughere atụmatụ mpako nke Setan, sị: “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, na ihe dị iche iche ga-abata n’obi gị [Setan], ị ga-echekwa echiche ọjọọ: ị ga-asịkwa, M . . . ga-abakwasị ndị nọ jụụ, ndị nọ ná ntụkwasị obi, ha nile bi n’ebe na-enweghị mgbidi [nchebe] . . . ịkwata ihe nkwata na ịlụta ihe nlụta n’agha.” (Ezikiel 38:10-12) Setan ga-eche, sị, ‘Ee, gịnị ma m kpalie mba dị iche iche ịwakpo Ndịàmà Jehova? Ọ dị mfe inweta ha, ha enweghị ihe nchebe, ha enweghị ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha agaghị eguzogide m. Lee ka ọ ga-esi dị mfe ịchịkọrọ ha dị ka àkwá site n’akwụ́ na-enweghị ihe nchebe!’
23. N’ihi gịnị ka Asiria nke oge a na-agaghị eji nwee ike ime ndị Chineke ihe o mere Krisendọm?
23 Ma lezienụ anya, unu mba dị iche iche! Maranụ na ọ bụrụ na unu akpaa ndị Jehova aka, unu ga-ama na Chineke n’onwe ya dị adị! Jehova hụrụ ndị ya n’anya, ọ ga-alụchitere ha ọgụ dịkwa nnọọ ka ọ lụchiteere Jerusalem n’oge Hezekaịa. Mgbe Asiria nke oge a nwara ikpochapụ ndị ohu Jehova, ọ bụ Jehova Chineke na Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ka ọ ga na-alụso ọgụ n’ezie. Nke ahụ bụ agha nke Asiria na-apụghị imeri na ya. “Nwa atụrụ ahụ ga-emerikwa ha” ka Bible na-ekwu, “n’ihi na Ọ bụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, na Eze kachasị ndị eze nile.” (Mkpughe 17:14; tụlee Matiu 25:40.) Dị ka Asiria nke oge ochie, anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie ‘ga-ala n’iyi.’ A gaghị atụkwa ya egwu ọzọ.—Mkpughe 17:11.
24. (a) Gịnị ka ezi ndị Kraịst kpebisiri ike ime iji kwadebe maka ọdịnihu? (b) Olee otú Aịsaịa si elepụkwu anya n’ihu? (Lee igbe dị na peji nke 155.)
24 Ezi ndị Kraịst pụrụ ịtụ anya ọdịnihu n’atụghị egwu ma ọ bụrụ na ha anọgide na-eme ka mmekọrịta ha na Jehova bụrụ nke siri ike, ọ bụrụkwa na ha emee ka ime uche ya bụrụ ihe mbụ ná ndụ ha. (Matiu 6:33) Mgbe ahụ ọ dịghị mkpa ka ha ‘tụọ egwu ihe ọjọọ ọ bụla.’ (Abụ Ọma 23:4) Ha ga-eji anya nke okwukwe ha hụ ka Chineke weliri aka ya dị ike elu, ọ bụghị maka ịta ha ahụhụ, kama iji chebe ha pụọ n’aka ndị iro ya. Ntị ha ga-anụkwa okwu ndị a na-enye obi ike: “Atụla egwu.”—Aịsaịa 10:24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 203.
b Iji mee ka ihe doo anya, e bu ụzọ tụlee Aịsaịa 10:28-32 tupu Aịsaịa 10:20-27.
c Maka ntụle nke Aịsaịa 10:20-23, lee “Aịsaịa Elepụkwuo Anya n’Ihu,” na peji nke 155.
d A pụrụ inwetakwu ihe ọmụma banyere onye nwanyị ahụ na-akwa iko na anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie bụ n’isi nke 34 na 35 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 155, 156]
AỊSAỊA ELEPỤKWUO ANYA N’IHU
Aịsaịa isi nke 10 lekwasịkarịrị anya n’ụzọ Jehova ga-esi jiri mwakpo nke Asiria mezuo ihe e kpere n’ikpe n’ahụ Israel nakwa ná nkwa o kwere ichebe Jerusalem. Ebe amaokwu nke 20 ruo 23 dị n’etiti amụma a, a pụrụ ile ha anya dị ka ndị mezuru n’ozuzu ha n’otu oge ahụ. (Tụlee Aịsaịa 1:7-9.) Otú ọ dị, ihe ndị e kwuru na ya na-egosi na amaokwu ndị a metụtakarịrị kpọmkwem oge ndị dị n’ihu mgbe Jerusalem n’onwe ya kwa ga-aza ajụjụ maka mmehie nke ndị bi n’ime ya.
Eze Ehaz gbalịrị inweta nchebe site n’ịgakwuru Asiria maka enyemaka. Aịsaịa onye amụma buru amụma na n’oge na-abịa n’ọdịnihu, ndị Israel lanarịrịnụ agakwaghị eme ụdị omume nzuzu ahụ ọzọ. Aịsaịa 10:20 na-ekwu na ha “ga-adabere Jehova, bụ́ Onye Nsọ nke Israel, n’eziokwu.” Otú ọ dị, amaokwu nke 21 na-egosi na ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta ga-eme otú ahụ: ‘Nanị ihe fọdụrụnụ ga-alọta.’ Nke a na-echetara anyị nwa Aịsaịa bụ́ Shea-jashub, onye bụ́ ihe ịrịba ama n’Israel, onye aha ya pụtakwara ‘Nanị Ihe Fọdụrụnụ Ga-alọta.’ (Aịsaịa 7:3) Amaokwu nke 22 nke isi 10 na-adọ aka ná ntị banyere “mkpochapụ” na-abịanụ nke a kaworo aka. Mkpochapụ dị otú ahụ ga-abụ n’ezi omume n’ihi na ọ bụ ntaramahụhụ ikpe ziri ezi nke a ga-enye ndị na-enupụ isi. N’ihi ya, nanị ihe fọdụrụnụ ga-alọta n’ime mba ahụ mmadụ juru nke ‘dị ka ájá oké osimiri.’ Amaokwu nke 23 na-adọ aka ná ntị na mkpochapụ a na-abịanụ ga-emetụta ala ahụ dum. Na nke ugbu a a gaghị ahapụ Jerusalem.
Amaokwu ndị a kọwara nnọọ nke ọma ihe mere na 607 T.O.A. mgbe Jehova jiri Alaeze Ukwu Babilọn mee ihe dị ka “ndele” ya. Onye mwakpo ahụ weghaara ala ahụ dum, gụnyere Jerusalem. A kpụụrụ ndị Juu gaa Babilọn ruo afọ 70. Otú ọ dị, mgbe nke ahụ gasịrị, ụfọdụ ndị—ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị ‘ihe fọdụrụnụ’—laghachiri iji guzobeghachi ezi ofufe na Jerusalem.
Amụma dị n’Aịsaịa 10:20-23 nwere mmezu ọzọ na narị afọ mbụ, dị ka e gosiri ná Ndị Rom 9:27, 28. (Tụlee Aịsaịa 1:9; Ndị Rom 9:29.) Pọl na-akọwa na n’echiche ime mmụọ, “ndị fọdụrụ” n’ime ndị Juu ‘laghachikwuuru’ Jehova na narị afọ mbụ O.A., ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ghọrọ ụmụazụ Jisọs Kraịst, malitekwa ife Jehova “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Ndị Jentaịl kwere ekwe mesịrị sonyere ndị a, na-emejupụta otu mba ime mmụọ, bụ́ “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 6:16) N’oge ahụ e mezuru ihe e kwuru n’Aịsaịa 10:20 (NW): ‘Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ’ mba a raara nye Jehova wezụgara onwe ha n’ebe ọ nọ ma gakwuru ụmụ mmadụ maka enyemaka.
[Foto dị na peeji nke 147]
Senakerib chere na ịchịkọrọ mba dị iche iche dị mfe dị ka ịchịkọrọ àkwá site n’akwụ́