Isi nke Iri na Isii
Tụkwasị Jehova Obi Maka Nduzi na Nchebe
1, 2. Ihe ize ndụ dị aṅaa ka ndị Chineke chere ihu na narị afọ nke asatọ T.O.A., oleekwa ndị ọtụtụ n’ime ha nwere mmasị ịgbakwuru maka nchebe?
DỊ KA anyị hụrụ n’isiokwu ndị bu ụzọ n’akwụkwọ a, ndị Chineke chere ihe iyi egwu na-emenye ụjọ ihu na narị afọ nke asatọ T.O.A. Ndị Asiria ọ na-agụ agụụ ịkwafu ọbara na-ebibi ala dị iche iche otu otu, n’oge na-adịghịkwa anya ha ga-awakpo alaeze ebe ndịda nke Juda. Ònye ka ndị bi n’ala ahụ ga-echigharịkwuru maka nchebe? Ha na Jehova nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ, ha kwesịkwara ịdabere n’ebe ọ nọ maka enyemaka. (Ọpụpụ 19:5, 6) Ọ bụ ihe Eze Devid mere. O kwetara, sị: “Jehova bụ oké nkume m, na ebe m e wusiri ike, na onye na-eme ka m gbapụ, Onye m nwere.” (2 Samuel 22:2) Otú ọ dị, dị ka ihe àmà na-egosi, ọtụtụ ndị na narị afọ nke asatọ T.O.A. atụkwasịghị Jehova obi dị ka ebe ha e wusiri ike. Ha nwere mmasị karị n’ịdabere n’ebe Ijipt na Etiopia nọ, na-enwe olileanya na mba abụọ a ga-abụ ihe nchebe siri ike pụọ ná mwakpo ahụ nke ndị Asiria na-eyi egwu ime. Ha hiere ụzọ.
2 Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịsaịa, Jehova dọrọ ha aka ná ntị na ịchọ nchebe n’Ijipt ma ọ bụ n’Etiopia ga-akpata ọdachi. Okwu onye amụma ahụ kwuru site n’ike mmụọ nsọ nwere ihe mmụta bara uru nye ndị ha na ya dịkọrọ ndụ ma na-enye anyị ihe mmụta bara oké uru banyere mkpa ọ dị ịtụkwasị Jehova obi.
Ala Ọbara
3. Kọwaa otú Asiria si jiri ike agha kpọrọ ihe.
3 A ma ndị Asiria ama maka ike agha ha. Akwụkwọ bụ́ Ancient Cities na-ekwu, sị: “Ha fere ike ofufe, ha na-ekpekwa ekpere nye nanị nnukwute arụsị nkume, ọdụm na oké ehi, bụ́ ndị nnukwute aka na ụkwụ ha, nku ugo ha, na isi mmadụ ha bụ ihe àmà nke ike, obi ike, na mmeri. Ịlụ agha bụ aka ọrụ mba ahụ, ndị nchụàjà ha bụkwa ndị na-akpasu agha mgbe nile.” E nwere ezi ihe mere onye amụma nke Bible, bụ́ Nehum, ji kọwaa Nineve, bụ́ isi obodo Asiria, dị ka “obodo ọbara.”—Nehum 3:1.
4. Olee otú ndị Asiria si menye mba ndị ọzọ ụjọ?
4 Atụmatụ agha nke ndị Asiria bụ nke obi ọjọọ a na-adịghị ahụkebe. Ihe ndị a tụrụ atụ dị laa azụ n’oge ahụ na-egosi ebe ndị dike Asiria ji nkò e konyere n’imi na n’egbugbere ọnụ nke ndị e ji eji kpụrụ ha na-aga. Ha ji ube rụpịa ụfọdụ ndị e ji eji anya. Otu ihe odide na-akọ banyere otu mmeri bụ́ ebe ndị agha Asiria gbukapụsịrị akụkụ ahụ nke ndị ha ji eji ma tụkọba ha n’ikpo abụọ ná mpụga obodo ahụ—a tụkọbara isi n’otu ma tụkọba ụkwụ na aka ha na nke ọzọ. A na-agba ụmụaka nke ndị ha meriri n’agha ọkụ. Ụjọ nke obi ọjọọ dị otú ahụ na-akpata aghaghị ịbaworo ndị Asiria uru n’ịlụ agha, na-eme ka ndị nọchiri n’ụzọ ndị agha ha si agafe ghara inwe obi ike iguzogide ha.
Agha E Busoro Ashdọd
5. Ònye bụ onye ọchịchị dị ike nke Asiria n’oge Aịsaịa, oleekwa otú e si kwadoo ịbụ eziokwu nke ihe ndekọ Bible banyere ya?
5 N’oge Aịsaịa, Alaeze Ukwu Asiria nwere ụdị ike na-enweghị atụ n’oge ọchịchị Eze Sagọn.a Ruo ọtụtụ afọ, ndị nkatọ gbaghara ịdị adị nke onye ọchịchị a, ebe ọ na-adịghị ebe ọ bụla ha maara a kpọrọ ya aha n’akwụkwọ na-abụghị nke okpukpe. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ndị ọkà mmụta ihe ochie gwupụtara obí eze Sagọn e bibiri ebibi, a kwadokwara ịbụ eziokwu nke ihe ndekọ Bible ahụ.
6, 7. (a) Ma eleghị anya, n’ihi ihe ndị dị aṅaa ka Sagọn ji nye iwu ka e busoo Ashdọd agha? (b) Olee otú ọdịda Ashdọd ga-esi metụta ndị agbata obi Filistia?
6 Aịsaịa kọwara ná mkpirikpi otu n’ime agha ndị Sagọn lụrụ: “Tatan bịaruru Ashdọd, mgbe Sagọn, bụ́ eze Asiria, zitere ya, o wee busoo Ashdọd agha, were ya.” (Aịsaịa 20:1)b N’ihi gịnị ka Sagọn ji nye iwu ka e busoo obodo Filistia bụ́ Ashdọd agha? Otu ihe bụ na Filistia na Ijipt jikọrọ aka, Ashdọd, nke bụkwa ebe ụlọ nsọ Degọn dị, dị n’ụzọ dị n’akụkụ osimiri, site n’Ijipt ruo Palestine. N’ihi ya obodo ahụ dị n’ebe dị mma. A pụrụ ile iweghara ya anya dị ka nzọụkwụ mbụ n’imeri Ijipt. Ọzọkwa, ihe ndekọ ndị Asiria na-akọ na Azuri, bụ́ eze Ashdọd, na-agba izu imegide Asiria. N’ihi ya, Sagọn mere ka e wepụ eze ahụ na-enupụ isi ma tinye nwanne nwoke nke eze ahụ tọrọ, bụ́ Ahimiti, n’ocheeze. Ma, nke ahụ emeghị ka okwu bie. Nnupụisi ọzọ tiwapụrụ, na nke ugbu a Sagọn mere ihe n’ụzọ siri ike karị. O nyere iwu ka e busoo Ashdọd agha, bụ́ nke a nọchibidoro ma merie. Ma eleghị anya, Aịsaịa 20:1 na-ezo aka n’ihe a merenụ.
7 Ọdịda nke Ashdọd bụ ihe iyi egwu nye ndị agbata obi ya, karịsịa Juda. Jehova maara na ndị ya ga-achọ ichigharịkwuru “ogwe aka nke anụ ahụ,” dị ka Ijipt ma ọ bụ Etiopia nke dị n’ebe ndịda. N’ihi ya, o nyere Aịsaịa ọrụ ka o mee ihe ngosi nke bụ́ ịdọ aka ná ntị siri ike.—2 Ihe E Mere 32:7, 8.
‘Gbara Ọtọ na Ụkwụ Efu’
8. Ihe dị aṅaa bụ́ amụma, nke sitere n’ike mmụọ nsọ, ka Aịsaịa mere?
8 Jehova gwara Aịsaịa, sị; “Jee, tọpụ ákwà mkpe n’úkwù gị, yipụkwa akpụkpọ ụkwụ gị n’ụkwụ gị.” Aịsaịa rubere isi n’iwu Jehova. “O wee mee otú a, gbara ọtọ na-ejegharị n’ụkwụ efu.” (Aịsaịa 20:2) Ákwà mkpe bụ ákwà yiri akpa ajị̀ nke ndị amụma na-eyikarị, ọtụtụ mgbe n’ihe metụtara ozi ịdọ aka ná ntị. A na-eyikwa ya n’oge ọgba aghara ma ọ bụ mgbe a nụrụ ozi banyere ọdachi. (2 Ndị Eze 19:2; Abụ Ọma 35:13; Daniel 9:3) Aịsaịa ọ̀ gba ọtọ jegharịa n’ezie n’echiche nke eyikwasịghị ihe ọ bụla n’ahụ ya? Ọ bụchaghị otú ahụ. Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “gbara ọtọ” pụkwara izo aka na mmadụ iyi ihe na-ekpuchichaghị ya ahụ. (1 Samuel 19:24, nkọwa ala ala peji nke NW) Ya mere ọ pụrụ ịbụ nanị na Aịsaịa yipụrụ uwe elu ya, ma yiri uwe mkpụmkpụ ahụ a na-eyikarị n’ime ahụ. A na-esikarị otú a akpụ ụmụ nwoke e ji eji n’ihe ọkpụkpụ ndị Asiria.
9. Gịnị ka ihe Aịsaịa mere pụtara n’ụzọ amụma?
9 Ihe ihe ahụ a na-adịghị ahụkebe nke Aịsaịa mere pụtara doro anya: “Jehova wee sị, Dị ka ohu m, bụ́ Aịsaịa, si gbara ọtọ na-ejegharị n’ụkwụ efu afọ atọ ịbụ ihe ịrịba ama na ihe ebube megide Ijipt megidekwa Etiopia; otú a ka eze Asiria ga-edulaga ndị Ijipt a dọtara n’agha, na ndị Etiopia e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ma ụmụ nta ma ndị okenye, gbara ọtọ na ụkwụ efu, gbaakwa ọtọ n’otule, ịgbaba Ijipt ọtọ.” (Aịsaịa 20:3, 4) Ee, n’oge na-adịghị anya, a ga-adọrọ ndị Ijipt na ndị Etiopia n’agha. Ọ dịghị onye a ga-ahapụ. A ga-anapụ ọbụna “ụmụ nta ma ndị okenye”—ụmụaka na ndị agadi—ihe onwunwe ha nile ma mee ka ha jee biri n’ala ọzọ. Jehova ji nkọwa a na-akụda mmụọ dọọ ndị bi na Juda aka ná ntị na ịtụkwasị Ijipt na Etiopia obi agaghị abara ha uru. Ọdịda nke mba ndị a ga-eduga ‘n’ịgba ọtọ ha’—mweda n’ala kasịnụ a ga-eweda ha!
Olileanya Adakpọọ, Ịma Mma Agwụ
10, 11. (a) Gịnị ga-abụ mmeghachi omume Juda mgbe ọ chọpụtara na Ijipt na Etiopia adịghị ike n’ebe Asiria nọ? (b) N’ihi gịnị ka ndị bi na Juda pụrụ iji chọọ ịtụkwasị Ijipt na Etiopia obi?
10 Jehova kọwaziri n’ụzọ amụma mmeghachi omume nke ndị ya ka ha na-ahụ na Ijipt na Etiopia, bụ́ ebe ndị ha nwere olileanya ịgbaba, adịghị ike n’ebe ndị Asiria nọ. “Ha ewee tụọ ụjọ, ihere ga-emekwa ha, n’ihi Etiopia, bụ́ ihe ntụkwasị obi ha, na n’ihi Ijipt, bụ́ ịma mma ha. Onye bi n’akụkụ oké osimiri nke a ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ, Lee, otú a ka ihe ntụkwasị obi anyị dị, ebe anyị gbalagaworo ka e wee nyere anyị aka ịnapụta anyị n’aka eze Asiria: ole ebekwa ka anyị onwe anyị ga-ewepụga onwe anyị?”—Aịsaịa 20:5, 6.
11 Juda yiri nanị ibe ala dị n’akụkụ oké osimiri ma e jiri ya tụnyere ike ọchịchị Ijipt na nke Etiopia. Ma eleghị anya, ụfọdụ n’ime ndị bi “n’akụkụ oké osimiri nke a” bụ ndị ịma mma nke Ijipt dọọrọ mmasị ha—oké pyramid ya dị iche iche, ụlọ nsọ ya ndị dị oké elu, na ebe obibi buru ibu na ubi, ubi mkpụrụ osisi, ọdọ mmiri ndị gbara ha gburugburu. Ihe owuwu ndị mara oké mma nke Ijipt yiri ka ha bụ ihe àmà nke ịkwụsi ike na ịdịgide adịgide. N’ezie a pụghị ibibi ala a! Ọ dịkwa ka ndị ọkà n’ịgba ụta, ụgbọ ịnyịnya, na ndị ịnyịnya nke Etiopia hà dọọrọ mmasị ndị Juu ahụ.
12. Ònye ka Juda kwesịrị ịtụkwasị obi?
12 N’ihi ịdọ aka ná ntị ahụ Aịsaịa mere ihe ngosi ya nakwa okwu amụma Jehova, onye ọ bụla so ná ndị sị na ha bụ ndị Chineke, nke nwere ọchịchọ ịtụkwasị Ijipt na Etiopia obi, aghaghị ichesi echiche ike. Lee ka ọ ga-esi ka mma ha ịtụkwasị Jehova obi kama ịtụkwasị mmadụ obi! (Abụ Ọma 25:2; 40:4) Ka ihe si eme, Juda tara oké ahụhụ n’aka eze Asiria, e mesịakwa, ọ hụrụ ka Babilọn bibiri ụlọ nsọ ya na isi obodo ya. Ma, a hapụrụ “otu ụzọ n’ụzọ iri,” bụ́ “mkpụrụ nsọ,” dị ka ogwe nke nnukwute osisi. (Aịsaịa 6:13) Mgbe oge ruru, ozi Aịsaịa ga-ewusi okwukwe nke ntakịrị ìgwè ahụ nọgidere na-atụkwasị Jehova obi, ike nke ukwuu!
Tụkwasị Jehova Obi
13. Nrụgide dịgasị aṅaa na-emetụta mmadụ nile—ma ndị kwere ekwe ma ndị na-ekweghị ekwe—taa?
13 Ịdọ aka ná ntị dị n’Aịsaịa banyere abaghị n’ihe nke ịtụkwasị Ijipt na Etiopia obi abụghị nanị akụkọ na-abaghị uru. Ọ bara uru maka oge anyị. Anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu.’ (2 Timoti 3:1) Ndakpọ akụ̀ na ụba, ịda ogbenye zuru ebe nile, ejighị ọchịchị n’aka, ọgba aghara obodo, na agha dị iche iche na-enwe mmetụta ọjọọ—ọ bụghị nanị n’ahụ ndị na-eleda ịchịisi Chineke anya kamakwa n’ahụ ndị na-efe Jehova. Ajụjụ na-eche onye ọ bụla ihu bụ, ‘Ònye ka m ga-agakwuru maka enyemaka?’
14. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụkwasị nanị Jehova obi?
14 Ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị ndị ọkà n’okwu ego, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ndị ọkà mmụta sayensị dọọrọ mmasị ha, bụ́ ndị na-ekwu banyere ịgwọta nsogbu ụmụ mmadụ site n’iji ịdị nkọ na nkà na ụzụ ụmụ mmadụ eme ihe. Otú ọ dị, Bible na-ekwu hoo haa, sị: “Ọ dị mma ịgbaba n’ime Jehova karịa ịtụkwasị ndị a maara aha ha obi.” (Abụ Ọma 118:9) Atụmatụ nile nke ụmụ mmadụ maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ga-akụ afọ n’ala n’ihi ihe ahụ dabara adaba nke Jeremaịa onye amụma kwuru: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.
15. Olee ebe olileanya nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ahụhụ dị?
15 Ya mere, ọ dị mkpa ka ndị ohu Chineke ghara ịbụ ndị ihe ọ bụla yiri ike ma ọ bụ amamihe nke ụwa a dọọrọ mmasị ha n’ụzọ na-adịghị mkpa. (Abụ Ọma 33:10; 1 Ndị Kọrint 3:19, 20) Nanị olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ahụhụ nwere dị n’aka Onye Okike, bụ́ Jehova. A ga-azọpụta ndị tụkwasịrị ya obi. Dị ka Jọn onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ si dee ya, “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ezo aka n’ebe eze a nọ dị ka Sagọn nke Abụọ. A kpọrọ eze bu ya ụzọ, ọ bụghị eze Asiria, kama eze Babilọn, “Sagọn nke Mbụ.”
b “Tatan” abụghị aha kama utu aha nke e ji amata onyeisi ọchịagha nke ndị agha Asiria, ma eleghị anya osote onye kasị ike n’alaeze ukwu ahụ.
[Foto dị na peeji nke 209]
Ndị Asiria na-arụpịabu ndị ha ji eji anya
[Foto ndị dị na peeji nke 213]
Ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị ihe ụmụ mmadụ rụzuru dọọrọ mmasị ha, ma ọ ka mma ịtụkwasị Jehova obi