Isi nke Iri Abụọ na Abụọ
Aịsaịa Ebuo Amụma Banyere ‘Ihe Omume Na-eju Anya’ nke Jehova
1, 2. N’ihi gịnị ka Israel na Juda ji nọrọ ná nchebe?
RUO nwa oge, Israel na Juda nọ ná nchebe. Ndị ndú ha esorowo mba ndị buru ibu ma sie ike karị jikọọ aka n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ná mgbalị inweta nchebe n’ime ụwa dị ize ndụ. Sameria, bụ́ isi obodo Israel, agakwuruwo Siria bụ́ onye agbata obi ya, ebe Jerusalem, bụ́ isi obodo Juda, tụkwasịrị obi n’ebe Asiria dị obi ọjọọ nọ.
2 Tinyere ịtụkwasị obi ha ná ndị ọhụrụ a ha na ha jikọrọ aka n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ụfọdụ ndị nọ n’alaeze ebe ugwu ahụ pụrụ ịtụ anya ka Jehova chebe ha—n’agbanyeghị ojiji ha nọgidere jiri ụmụ ehi ọlaedo na-efe ofufe. N’otu aka ahụ, Juda kwenyere na ya pụrụ ịtụkwasị obi ná nchebe Jehova. E kwuwerị, ọ̀ bụ na ụlọukwu Jehova adịghị na Jerusalem, bụ́ isi obodo ha? Ma e nwere ihe omume ndị a na-atụghị anya ha na-echere mba abụọ ahụ. Jehova kpaliri Aịsaịa ibu amụma banyere ihe omume ndị ga-eyi ihe ijuanya n’ezie nye ndị ya na-enupụ isi. Ihe ndị o kwuru nwekwara ihe mmụta dị mkpa nye onye ọ bụla taa.
“Ndị Efraim Na-aṅụbiga Mmanya Ókè”
3, 4. Gịnị ka alaeze ebe ugwu nke Israel ji na-anya isi?
3 Aịsaịa ji okwu na-emenye ụjọ malite amụma ya: “Ahụhụ ga-adịrị okpueze mpako nke ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè, ahụhụ ga-adịkwara okooko ọhịa na-akpọnwụ akpọnwụ nke ịma mma ya mara mma, nke dị n’isi nke ndagwurugwu dị uru nke ndị mmanya vine na-egbu! Lee, otu onye dị ike nke nwere ume ka Onyenwe anyị nwere; dị ka oké mmiri ozuzo nke akụ́ mmiri igwe, . . . otú a ka o jiworo ihe ike tọgbọ ihe n’ala. N’okpuru ụkwụ ka a ga-azọda okpueze mpako nke ndị Efraim na-aṅụbiga mmanya ókè.”—Aịsaịa 28:1–3.
4 Efraim, bụ́ ebo a kasị mara n’ebo iri ahụ dị n’ebe ugwu, na-anọchitezi anya alaeze Israel dum. Isi obodo ya, bụ́ Sameria, dị n’ebe mara mma, nke na-adọrọ adọrọ, “n’isi nke ndagwurugwu dị uru.” Ndị ndú Efraim ji “okpueze mpako” ha, bụ́ nnwere onwe pụọ n’usoro ọbụbụeze Devid nke dị na Jerusalem, na-anya isi. Ma ha bụ ndị “na-aṅụbiga mmanya ókè,” ndị mmanya na-egbu n’ụzọ ime mmụọ n’ihi njikọ aka ha na Siria megide Juda. Ndị mwakpo na-aga ịzọda ihe nile ha ji kpọrọ ihe.—Tụlee Aịsaịa 29:9.
5. Olee ọnọdụ dị ize ndụ Israel nọ na ya, ma olileanya dị aṅaa ka Aịsaịa na-enye ha?
5 Efraim aghọtaghị ọnọdụ dị ize ndụ ọ nọ na ya. Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Okooko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ nke ịma mma ya mara mma, nke dị n’isi nke ndagwurugwu dị uru, ga-adịkwa ka mkpụrụ fig buru ụzọ chaa tutu mgbe okpomọkụ eruo; nke mgbe onye ọ bụla nke na-ahụ ya anya na-ahụ, mgbe ọ na-adị n’ọbụ aka ya o loo ya.” (Aịsaịa 28:4) Efraim ga-adaba n’aka Asiria, ọkpụrụkpụ nri dị ụtọ a ga-elo otu ugboro. Ọ̀ pụtaziri na olileanya adịghị? Dị ka ọ dị n’ọtụtụ oge, olileanya na-adị n’amụma ndị metụtara ikpe ndị Aịsaịa na-ebu. Ọ bụrụgodị na mba ahụ adaa, ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-alanarị, site n’enyemaka Jehova. “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-aghọrọ ndị Ya fọdụrụ okpueze nke mara mma, na okpu ọma nke ịma mma: Ọ ga-aghọkwara onye na-anọkwasị n’oche ikpe mmụọ nke ikpe, Ọ ga-aghọkwara ndị na-achụghachi ndị na-ebu agha ruo ọnụ ụzọ ámá ịdị ike.”—Aịsaịa 28:5, 6.
‘Ha Adagharịwo’
6. Olee mgbe Israel dara, n’ihi gịnịkwa ka Juda na-ekwesịghị iji ṅụrịa ọṅụ?
6 Oge mpịazi bịaara Sameria na 740 T.O.A. mgbe ndị Asiria bibiri ala ahụ, alaeze ebe ugwu ahụ kwụsịkwara ịbụ mba kwụụrụ onwe ya. Olee banyere Juda? Asiria ga-awakpo ala ya, e mesịakwa Babilọn ga-ebibi isi obodo ya. Ma n’oge ndụ Aịsaịa, ụlọukwu nke Juda na ndị nchụàjà ya ga-adịgide, ndị amụma ya ga-anọgidekwa na-ebu amụma. Juda ò kwesịrị ịṅụrị ọṅụ n’ọdịda nke onye agbata obi ya nọ n’ebe ugwu? Ọ dịghị ma ọlị! Jehova na Juda nakwa ndị ndú ya ga-eme mpịazi maka nnupụisi na enweghị okwukwe ha.
7. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ndú Juda siri ṅụbiga mmanya ókè, gịnịkwa si na ya pụta?
7 N’izi Juda ozi ya kpọmkwem, Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ma ọbụna ndị a adagharịwo site ná mmanya vine, ọ bụkwa site n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ka ha ṅagharịworo; onye nchụàjà na onye amụma adagharịwo site n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, mmanya vine elodawo ha, ha aṅagharịwo site n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya; ha adagharịwo n’ọhụhụ, ha asụwo ngọngọ n’ihe nile e kpere n’ikpe. N’ihi na tebụl nile jupụtara n’ihe ọgbụgbọ ruru unyi, ọ dịghị ebe dị ọcha.” (Aịsaịa 28:7, 8) Lee ihe na-asọ oyi ọ bụ! Ịṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ nkịtị n’ụlọ Chineke dị nnọọ njọ. Ma mmanya na-egbu ndị nchụàjà na ndị amụma a n’ụzọ ime mmụọ—inwe obi ike gabigara ókè ná njikọ aka ụmụ mmadụ emechiela uche ha. Ha eduhiewo onwe ha iche na ụzọ ha agwụla nke bara uru, ikekwe na-ekweta na ha nwere atụmatụ ọzọ ugbu a ma ọ bụrụ na nchebe Jehova ezughị. Ná mmanya ogbugbu ime mmụọ ha, ndị ndú okpukpe a na-ekwu okwu nnupụisi ndị na-adịghị ọcha, bụ́ ndị na-egosi na ha enweghị ezi okwukwe ná nkwa Chineke.
8. Olee otú e si meghachi omume n’ozi Aịsaịa?
8 Olee otú ndị ndú Juda si meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị Jehova? Ha kwara Aịsaịa emo, bo ya ebubo ịgwa ha okwu ka ụmụaka: “Ònye ka ọ ga-ezi ihe ọmụma? ọ̀ bụkwa onye ka ọ ga-eme ka ọ ghọta ihe a nụrụ? ọ̀ bụ ndị e meworo ka ha hapụ ịṅụ mmiri ara, ndị a napụrụ ara? N’ihi na ọ bụ ihe e nyere n’iwu tụkwasị ihe e nyere n’iwu, ihe e nyere n’iwu tụkwasị n’ihe e nyere n’iwu; usoro tụkwasị usoro, usoro tụkwasị usoro; nwantịị n’ebe a, nwantịị n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 28:9, 10) Lee ka okwu Aịsaịa si ada ha ka ikwughachi otu okwu ahụ na dị ka ihe a na-anụtụbeghị! Ọ nọ na-ekwughachi ihe o kwuru, sị: ‘Nke a bụ ihe Jehova nyere n’iwu! Nke a bụ ihe Jehova nyere n’iwu! Nke a bụ ụkpụrụ Jehova! Nke a bụ ụkpụrụ Jehova!’a Ma n’oge na-adịghị anya Jehova “ga-agwa” ndị bi na Juda okwu site n’ime ihe. Ọ ga-eziga ndị agha Babilọn imegide ha—ndị ala ọzọ na-asụ asụsụ dị iche n’ezie. Ndị agha ahụ ga-emezurịrị ihe Jehova “nyere n’iwu tụkwasị ihe [o] nyere n’iwu,” Juda ga-adakwa.—Gụọ Aịsaịa 28:11–13.
Ndị Na-aṅụbiga Mmanya Ókè n’Ụzọ Ime Mmụọ Taa
9, 10. Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka okwu Aịsaịa siworo nwee ihe ọ pụtara nye ọgbọ ndị dị n’ihu?
9 È mezuru amụma Aịsaịa nanị n’ahụ Israel na Juda oge ochie? Ọ dịghị ma ọlị! Ma Jisọs ma Pọl hotachara ihe o kwuru, jirikwa ha mee ihe n’ebe mba nọ n’oge nke ha dị. (Aịsaịa 29:10, 13; Matiu 15:8, 9; Ndị Rom 11:8) Taakwa, ọnọdụ yiri nke ahụ dị n’oge Aịsaịa ebilitewo.
10 N’oge a, ọ bụ ndị ndú okpukpe Krisendọm tụkwasịrị obi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha na-adagharị, dị ka ndị Israel na Juda na-aṅụbiga mmanya ókè, na-etinye aka n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ịbụ ndị ndị a kpọrọ ndị ukwu n’ụwa a na-akpọtụrụ. Kama ikwu eziokwu dị ọcha nke Bible, ha na-ekwu ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị ahụcha ụzọ n’ụzọ ime mmụọ, ha abụghịkwa ezi ndị ndú nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Matiu 15:14.
11. Olee otú ndị ndú Krisendọm si emeghachi omume n’ozi ọma Alaeze Chineke?
11 Olee otú ndị ndú Krisendọm si emeghachi omume mgbe Ndịàmà Jehova dọọrọ uche ha gaa na nanị ezi olileanya e nwere, Alaeze Chineke? Ha adịghị aghọta ya. Nye ha, Ndịàmà ahụ na-eyi ka ha na-atagheri ọnụ, dị ka ụmụ ọhụrụ. Ndị ndú okpukpe ahụ na-eleda ndị ozi a anya ma na-akwa ha emo. Dị ka ndị Juu nọ n’oge Jisọs, ha achọghị Alaeze Chineke, ha achọghịkwa ka ìgwè atụrụ ha nụ maka ya. (Matiu 23:13) N’ihi ya, a na-eme ka ha mata na Jehova agaghị anọgide na-ekwu okwu site n’aka ndị ozi ya na-adịghị ize ndụ. Oge ga-abịa mgbe ‘a ga-etiji, mata n’ọnyà ma jide’ ndị na-edoghị onwe ha n’okpuru Alaeze Chineke, ee, bibie ha kpam kpam.
‘Ọgbụgba Ndụ Ha na Ọnwụ’
12. Gịnị bụ ihe Juda chere na ọ bụ ‘ọgbụgba ndụ ya na ọnwụ’?
12 Aịsaịa gara n’ihu ná nkwupụta okwu ya, sị: “Unu asịwo, Anyị na ọnwụ agbawo ndụ, anyị na [Sheol, NW] ekwerịtawokwa nkwa; mgbe [oké idei] mmiri ga-agabiga, ọ gaghị abịakwute anyị; n’ihi na anyị emewo ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị, ọ bụkwa n’okwu ụgha ka anyị zobeworo onwe anyị.” (Aịsaịa 28:14, 15) Ndị ndú Juda na-etu ọnụ na njikọ aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha na-echebe ha pụọ n’ịbụ ndị e meriri. Ha na-eche na ha na “ọnwụ agbawo ndụ” ka ọ hapụ ha. Ma ebe mgbaba ha na-enweghị isi agaghị echebe ha. Njikọ aka ha bụ ụgha, okwu ụgha. N’otu aka ahụ taa, mmekọrịta chịrị anya nke Krisendọm na ndị ndú ụwa agaghị echebe ya mgbe oge Jehova ruru ka ọ zaa ajụjụ. N’ezie, ọ ga-arụpụtara ya ịla n’iyi.—Mkpughe 17:16, 17.
13. Ònye bụ “nkume nke ọnwụnwa” ahụ, oleekwa otú Krisendọm siworo jụ ya?
13 Mgbe ahụ, olee ebe ndị ndú okpukpe a kwesịrị ịdị na-elega anya? Aịsaịa dekọziri nkwa Jehova: “Lee, abụ m onye tọworo ntọala na Zaịọn, bụ́ otu nkume, nkume nke ọnwụnwa, nkume nkuku dị oké ọnụ ahịa nke bụ́ ntọala siri ike: onye na-ekwere agaghị ewere ọsọ ọsọ gbalaga. M ga-emekwa ka ikpe bụrụ eriri, meekwa ka ezi omume bụrụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀: akụ́ mmiri igwe ewee kpochapụ ebe mgbaba nke okwu [ụgha], mmiri ga-eruchapụkwa ebe nzuzo.” (Aịsaịa 28:16, 17) Oge na-adịghị anya mgbe Aịsaịa kwusịrị ihe ndị a, e chiri Eze Hezekaịa kwesịrị ntụkwasị obi eze na Zaịọn, a zọpụtakwara alaeze ya, ọ bụghị site n’aka mba ndị agbata obi ya, bụ́ ndị ha na ha jikọrọ aka, kama site na Jehova ime ihe. Otú ọ dị, okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ emezughị n’ahụ Hezekaịa. Pita onyeozi, n’ihota ihe Aịsaịa kwuru, gosiri na Jisọs Kraịst, bụ́ onye sitere n’eriri Hezekaịa mgbe oge dị anya gasịrị, bụ “nkume nke ọnwụnwa” ahụ nakwa na ọ dịghị onye kwere na Ya nke kwesịrị ịtụ ụjọ. (1 Pita 2:6 ) Lee ihe mwute ọ bụ na ndị ndú Krisendọm, ọ bụ ezie na ha na-akpọ onwe ha ndị Kraịst, emewo ihe Jisọs jụrụ ime! Ha achọwo ịbụ ndị a ma ama na inwe ike n’ụwa a kama ichere ka Jehova weta Alaeze ya n’okpuru Eze bụ́ Jisọs Kraịst.—Matiu 4:8–10.
14. Olee mgbe a ga-ehichapụ “ọgbụgba ndụ [Juda] na ọnwụ gbara”?
14 Mgbe “oké idei mmiri” nke usuu ndị agha Babilọn ga-agabiga ala ahụ, Jehova ga-ekpughe ebe mgbaba ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Juda ịbụ nke ụgha. “A ga-ehichapụkwa ọgbụgba ndụ unu na ọnwụ gbara,” ka Jehova kwuru. “Mgbe [oké idei] mmiri ga-agabiga, unu ga-aghọkwara ya ebe nzọda. Mgbe ọ bụla ọ na-agabiga, . . . o wee bụrụ nanị ọma jijiji ịghọta ihe a nụrụ.” (Aịsaịa 28:18, 19) Ee, e nwere ọkpụrụkpụ ihe a ga-amụta site n’ihe ga-eme ndị na-ekwu na ha na-ejere Jehova ozi ma na-atụkwasị obi ná njikọ aka nke ha na mba dị iche iche.
15. Olee otú Aịsaịa si mee ihe atụ iji gosi na nchebe Juda ezughị ezu?
15 Cheedị echiche banyere ọnọdụ ndị ndú a nke Juda chọtara onwe ha na ya ugbu a. “Ihe ndina dị mkpụmkpụ karịa nke mmadụ ga-esetịpụsị onwe ya n’elu ya; ákwà mkpuchi dịkwa warara karịa nke mmadụ ga-afụchi onwe ya.” (Aịsaịa 28:20) Ọ dị ka a ga-asị na ha dinara ala izuru ike, ma ọ bụ n’efu. Ụkwụ ha ga-apụta n’oyi ma ọ bụ ha asụọ ụkwụ ha asụọ, ákwà mkpuchi dịbigakwa warara ókè nke iji ya kpuchisịa ahụ iji chụọ oyi. Nke a bụ ajọ ọnọdụ dị n’oge Aịsaịa. Ọ bụkwa ọnọdụ dị taa nye ndị ọ bụla na-atụkwasị obi ha n’ebe mgbaba ụgha nke Krisendọm. Lee ka o si jọgbuo onwe ya na n’ihi aka ha na-etinye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ụfọdụ n’ime ndị ndú okpukpe Krisendọm esonyewo n’ajọ arụrụala ndị dị ka mkpocha agbụrụ na mgbukpọ!
‘Ihe Omume Na-eju Anya’ nke Jehova
16. Gịnị bụ ‘ihe omume na-eju anya’ nke Jehova, gịnịkwa mere ọrụ a ji bụrụ ihe a na-adịghị ahụkebe?
16 Ihe ga-esi n’ọnọdụ ahụ pụta n’ikpeazụ ga-adị nnọọ iche n’ihe ndị ndú okpukpe Juda na-atụ anya ya. Jehova ga-eme ihe ga-eju ndị Juda na-aṅụbiga mmanya ókè n’ụzọ ime mmụọ anya. ‘Dị ka n’ugwu Perazim, otú a ka Jehova ga-ebili; dị ka na ndagwurugwu Gibeọn, otú a ka Ọ ga-ewe oké iwe, ka o wee mee ihe omume ya—ihe omume ya na-eju anya—ka o wee rụọkwa ọrụ ya—ọrụ ya bụ ihe a na-adịghị ahụkebe.’ (Aịsaịa 28:21) N’oge Eze Devid, Jehova mere ka ndị ya merie Filistia mmeri ndị dị ịrịba ama n’Ugwu Perazim nakwa na ndagwurugwu Gibeọn. (1 Ihe E Mere 14:10–16) N’oge Joshua, o mere ọbụna ka anyanwụ guzoro otu ebe n’elu Gibeọn ka mmeri ndị Israel na-emeri ndị Amọraịt wee zuo ezuo. (Joshua 10:8–14) Nke ahụ bụ nnọọ ihe a na-adịghị ahụkebe! Ugbu a Jehova ga-alụ ọgụ ọzọ, ma na nke ugbu a, ọ ga-abụ megide ndị na-ekwu na ha bụ ndị nke ya. Ọ̀ dị ihe na-eju anya ma ọ bụ nke a na-adịghị ahụkebe pụrụ ịkarị nke a? Ọ dịghị, ma e buru n’uche eziokwu ahụ bụ́ na Jerusalem bụ ebe bụ́ isi maka ofufe Jehova na obodo nke eze Jehova tere mmanụ. Ruo mgbe ahụ, a kwatutụbeghị ụlọ eze nke Devid dị na Jerusalem. Ka o sina dị, Jehova ga-emerịrị “ihe omume ya na-eju anya.”—Tụlee Habakuk 1:5–7.
17. Mmetụta dị aṅaa ka ịkwa emo ga-enwe ná mmezu nke amụma Aịsaịa?
17 N’ihi ya, Aịsaịa na-adọ aka ná ntị, sị: “Unu aghọla ndị na-akwa emo, ka agbụ unu wee ghara isi ike: n’ihi na ngwụsị, nke a kakwara aka, ka m nụworo n’ọnụ Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, n’elu ụwa nile.” (Aịsaịa 28:22) Ọ bụ ezie na ndị ndú ahụ na-akwa emo, ozi Aịsaịa bụ eziokwu. Ọ nụrụ ya site n’ọnụ Jehova, bụ́ onye ya na ndị ndú ndị ahụ nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ. N’otu aka ahụ taa, ndị ndú okpukpe Krisendọm na-akwa emo mgbe ha nụrụ banyere ‘ihe omume na-eju anya’ nke Jehova. Ha na-abadị mba. Ma ozi Ndịàmà Jehova na-akpọsa bụ eziokwu. Ọ dị n’ime Bible, bụ́ akwụkwọ ndị ndú ahụ na-ekwu na ha na-agbaso.
18. Olee otú Aịsaịa si mee ihe atụ iji gosi na Jehova adịghị emebiga ihe ókè mgbe ọ na-enye ahụhụ?
18 Banyere ndị nwere ezi obi, bụ́ ndị na-adịghị agbaso ndị ndú ndị ahụ, Jehova ga-agbazi ha ma mee ka ha nwetaghachi ihu ọma ya. (Gụọ Aịsaịa 28:23–29.) Dị ka onye ọrụ ugbo si eji ụzọ ndị dị nro karị azọcha akụ́kụ́ ndị na-esighị ike, dị ka cumin, otú a ka Jehova si enye ahụhụ na-adabere n’ụdị onye mmadụ bụ na dị ka ọnọdụ si dị. Ọ dịghị aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ kama ọ na-enye ahụhụ iji gbazie ndị mmehie. Ee, ọ bụrụ na ndị mmadụ egee ntị n’arịrịọ Jehova, olileanya dị. N’otú aka ahụ taa, ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ga-egbochi ihe ga-adakwasị Krisendọm, onye ọ bụla doro onwe ya n’okpuru Alaeze Jehova pụrụ izere amamikpe ahụ na-abịanụ.
Ahụhụ Ga-adịrị Jerusalem!
19. N’ụzọ dị aṅaa ka Jerusalem ga-esi ghọọ “ụsọ ọkụ nke ebe ịchụàjà,” olee mgbekwa, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka nke a ga-esi mezuo?
19 Otú ọ dị, Jehova na-ekwu banyere gịnị ugbu a? “Ahụhụ ga-adịrị Eriel, Eriel, bụ́ obodo ebe Devid mara ụlọikwuu ya! Tụkwasịnụ afọ n’afọ; ka ememe nile gbagharute na mgbe ha: M ga-akpagbukwa Eriel, ize ume na ịsụ ude ga-adịkwa: o wee dịịrị m ka [ụsọ ọkụ nke ebe ịchụàjà Chineke].” (Aịsaịa 29:1, 2) Ikekwe “Eriel” pụtara “Ụsọ Ọkụ nke Ebe Ịchụàjà Chineke,” n’ebe a kwa, ihe àmà na-egosi na ọ na-ezo aka na Jerusalem. Ọ bụ ebe ụlọukwu ahụ na ebe ịchụàjà ya dị. Ndị Juu na-eme ememe ma na-achụ àjà n’ebe ahụ, ma Jehova enweghị mmasị n’ofufe ha. (Hosea 6:6) Kama nke ahụ, o nyere iwu na obodo ahụ n’onwe ya ga-aghọ “ụsọ ọkụ nke ebe ịchụàjà” n’echiche dị iche. Dị ka ebe ịchụàjà, ọbara ga-ejupụta na ya, a ga-esukwa ya ọkụ. Jehova kọwara ọbụna otú nke a ga-esi mee: “M ga-amakwa ụlọikwuu m gburugburu megide gị, were ụlọ agha nọchigide gị, wulie ihe nnọchigide n’agha imegide gị. E wee mee ka ị dị ala, site n’ala ka ị ga-ekwu, ọ bụkwa n’ájá ka okwu ọnụ gị ga-esi pụta, dị ala.” (Aịsaịa 29:3, 4) E mezuru nke a n’ahụ Juda na Jerusalem na 607 T.O.A. mgbe ndị agha Babilọn nọchibidoro ma bibie obodo ahụ, gbaakwa ụlọukwu ya ọkụ. E wedaruru Jerusalem n’ala ebe e wukwasịrị ya.
20. Gịnị ga-abụ ọdachi ga-adakwasị ndị iro Chineke n’ikpeazụ?
20 Tupu oge ọdachi ahụ, site n’oge ruo n’oge Juda na-enwe eze na-erube isi n’Iwu Jehova. Gịnị mezie? Jehova lụọrọ ndị ya ọgụ. Ọ bụ ezie na ndị iro pụrụ ijupụta n’ala ahụ, ha ga-aghọ “ájá dị nta” na “igbogbo ọka.” Mgbe o ruru oge ya, Jehova “ga-eji égbè eluigwe, ji[ri]kwa ala ọma jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku ukwu, na ire ọkụ nke ọkụ na-erichapụ erichapụ” chụsasịa ha.—Aịsaịa 29:5, 6.
21. Kọwaa ihe atụ ahụ dị n’Aịsaịa 29:7, 8.
21 Usuu ndị agha bụ́ ndị iro pụrụ ịtụsi anya ike ibibi Jerusalem na ịkwakọrọ ọtụtụ ihe nlụta n’agha. Ma ọ ga-efo ha n’anya! Dị ka onye agụụ ji, nke rọrọ nrọ ebe ọ na-eri ihe, wee teta n’ụra, ma agụụ na-agụsi ya ike, ndị iro Juda agaghị eri ihe ha tụsiri anya ya ike. (Gụọ Aịsaịa 29:7, 8.) Tụlee ihe mere ndị agha Asiria n’okpuru Senakerib mgbe o yiri Jerusalem egwu n’oge Eze Hezekaịa kwesịrị ntụkwasị obi na-achị. (Aịsaịa, isi nke 36 na 37) N’otu abalị, n’adịghị mmadụ weliri aka ya, a chụghachiri usuu ndị agha Asiria ahụ dị egwu—185,000 ná ndị agha ya nwụrụ! Ọzọ, a ga-emebikwa olileanya inwe mmeri mgbe usuu ndị agha Gọg nke ala Megọg jikeere imegide ndị Jehova n’ọdịnihu dị nso.—Ezikiel 38:10–12; 39:6, 7.
22. Olee otú ịṅụbiga mmanya ókè nke Juda si metụta ya?
22 Mgbe Aịsaịa kwupụtara akụkụ a nke amụma ya, ndị ndú Juda enweghị okwukwe dị ka Hezekaịa. Ha ejiriwo mmanya ṅụnye onwe ha nzuzu n’ụzọ ime mmụọ site ná njikọ aka nke ha na mba ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. “Ka ọ gbagwojuo unu anya, ka o jukwa unu anya; techienụ anya unu, ka e techiekwa anya unu: ha aṅụbigawo mmanya ókè, ma ọ bụghị mmanya ka ha ṅụbigara ókè; ha aṅagharịwo, ma ọ bụghị ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya.” (Aịsaịa 29:9) N’ịbụ ndị mmanya na-egbu n’ụzọ ime mmụọ, ndị ndú a apụghị ịghọta ihe ọhụụ ahụ e nyere ezi onye amụma Jehova pụtara. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Jehova awụkwasịwo unu mmụọ nke oké ụra, wee mechisie anya unu ike, bụ́ ndị amụma; isi unu, bụ́ ndị ọhụụ, ka O kpuchiwokwara. Ọhụụ a nile wee dịrị unu ka okwu nke akwụkwọ a kasiri akara ike, nke a na-enye onye maara akwụkwọ, sị, Biko, gụọ nke a: o wee si, Apụghị m, n’ihi na ihe a kasiworo akara ike ka ọ bụ: e wee were akwụkwọ ahụ nye onye na-amaghị akwụkwọ, sị, Biko, gụọ nke a: o wee sị, Amaghị m akwụkwọ.”—Aịsaịa 29:10–12.
23. N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji kpọọ Juda ịza ajụjụ, oleekwa otú ọ ga-esi mee ya?
23 Ndị ndú okpukpe nke Juda na-ekwu na ha nwere uche n’ụzọ ime mmụọ, ma ha ahapụwo Jehova. Kama nke ahụ, ha na-akụzi echiche ha gbagọrọ agbagọ nke ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ, na-egosi izi ezi nke ọrụ enweghị okwukwe na nke rụrụ arụ ha na-arụ na odudu ha du ndị ahụ aga n’enweghị ihu ọma Chineke. Jehova ga-eji “ọrụ ebube”—“ihe omume ya na-eju anya”—kpọọ ha ịza ajụjụ maka omume ihu abụọ ha. Ọ na-ekwu, sị: “N’ihi na ndị nke a abịaruwo nso n’ọnụ ha, werekwa egbugbere ọnụ ha sọpụrụ m, ma ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe M nọ, egwu ha na-atụrụ m ewee bụrụ ihe mmadụ nyere n’iwu nke e mere ka ha mụta: n’ihi nke a, lee, M gaje ịrụkwa oké ọrụ ọzọ n’etiti ndị nke a, bụ́ oké ọrụ na ọrụ ebube: amamihe nke ndị ha maara ihe ga-alakwa n’iyi, nghọta nke ndị nghọta ha ga-ezobekwa onwe ya.” (Aịsaịa 29:13, 14) Ihe Juda kpọrọ amamihe na nghọta ga-ala n’iyi mgbe Jehova ga-eme ka Ike Ọchịchị Ụwa Babilọn kpochapụ usoro okpukpe ya dum si n’ezi ofufe dapụ. Otu ihe ahụ mere na narị afọ mbụ mgbe ndị ndú ndị Juu kpọrọ onwe ha ndị maara ihe duhiere mba ahụ. Ihe yiri ya ga-emekwa Krisendọm n’oge anyị.—Matiu 15:8, 9; Ndị Rom 11:8.
24. Olee otú ndị Juda si gosi na ha adịghị atụ Chineke egwu?
24 Otú ọ dị, ka ọ dịgodị, ndị ndú ahụ na-etu ọnụ nke Juda kwenyere na ha dị akọ ịgbanahụ ntaramahụhụ maka mmerụ ha na-emerụ ezi ofufe. Hà dị? Aịsaịa gbara ha ọtọ, na-ekpughe ha dị ka ndị na-adịghị atụ Chineke ezigbo egwu, n’ihi ya kwa, ha enweghị ezi amamihe: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ezonarị Jehova ndụmọdụ ha n’ebe dị omimi, ndị ọ bụkwa n’ọchịchịrị ka a na-arụ ọrụ nile ha, ha wee sị, Ònye na-ahụ anyị? ma ọ bụ ònye maara anyị? Lee, ka unu si ekpu ihe ihu nke ukwuu! Ọ̀ bụ n’ụrọ ka a ga-agụ ọkpụite? na ihe e mere eme ga-ekwu okwu banyere onye meworo ya, sị, O meghị m; ma ọ bụ na ihe a kpụrụ akpụ ga-ekwu okwu banyere onye kpụworo ya, sị, Ọ ghọtaghị.” (Aịsaịa 29:15, 16; tụlee Abụ Ọma 111:10.) N’agbanyeghị otú ha chere na ha zoruru ezo, ha “gba ọtọ bụrụkwa [ndị e kpughere ekpughe]” n’anya Chineke.—Ndị Hibru 4:13.
“Ndị Ntị Chiri Ga-anụkwa”
25. N’echiche dị aṅaa ka “ndị ntị chiri” ga-anụ ihe?
25 Otú ọ dị, nzọpụta dịịrị ndị nwere okwukwe. (Gụọ Aịsaịa 29:17–24; tụlee Luk 7:22.) “Ndị ntị chiri ga-anụkwa okwu nile nke akwụkwọ” ahụ, bụ́ ozi si n’Okwu Chineke. Ee, nke a abụghị ịgwọ ntị ochichi nkịtị. Ọ bụ ọgwụgwọ ime mmụọ. Aịsaịa zokwara aka ọzọ ná nguzobe nke Alaeze Mesaịa ahụ na mweghachi nke ezi ofufe n’ụwa site n’ọchịchị Mesaịa. Nke a emezuwo n’oge anyị, ọtụtụ nde mmadụ kwa ndị nwere obi eziokwu na-ekwe ka Jehova gbazie ha, ha na-amụtakwa ito ya. Lee mmezu na-enye obi ụtọ ọ bụ! N’ikpeazụ, oge ga-abịa mgbe onye ọ bụla, ihe ọ bụla na-eku ume, ga-eto Jehova ma doo aha nsọ ya nsọ.—Abụ Ọma 150:6.
26. Ihe ncheta ime mmụọ dịgasị aṅaa ka “ndị ntị chiri” na-anụ taa?
26 Gịnị ka “ndị ntị chiri” dị otú ahụ, bụ́ ndị na-anụ Okwu Chineke taa na-amụta? Na ndị Kraịst nile, karịsịa ndị ọgbakọ na-ewere dị ka ndị nlereanya, aghaghị iji nlezianya zere ‘ịdagharị n’ihi ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya.’ (Aịsaịa 28:7) Ọzọkwa, ike agaghị agwụ anyị n’ịnụ ihe ncheta Chineke, bụ́ ndị na-enyere anyị aka ịdị na-ele ihe nile anya n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ndị Kraịst na-edo onwe ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’okpuru ndị ọchịchị ma na-atụ anya inweta ihe ụfọdụ n’aka ha, nzọpụta na-abịa, ọ bụghị site n’ụwa na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe, kama site n’aka Jehova Chineke. Ọzọkwa, anyị agaghị echefu ma ọlị na dị ka ikpe ahụ e kpere Jerusalem si n’ezi ofufe dapụ, a pụghị ịgbanarị ikpe Chineke megide ọgbọ a. Site n’enyemaka Jehova, anyị pụrụ ịnọgide na-akpọsa ịdọ aka ná ntị ya n’agbanyeghị mmegide, dị ka Aịsaịa mere.—Aịsaịa 28:14, 22; Matiu 24:34; Ndị Rom 13:1–4.
27. Olee ihe ndị Kraịst pụrụ ịmụta site n’amụma Aịsaịa?
27 Ndị okenye na ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịmụta ihe site n’ụzọ Jehova si enye ahụhụ, na-achọ mgbe nile ime ka ndị mmehie nwetaghachi ihu ọma Chineke, ọ bụghị nanị inye ha ntaramahụhụ. (Aịsaịa 28:26–29; tụlee Jeremaịa 30:11.) A na-echetakwara anyị nile, gụnyere ndị na-eto eto, mkpa ọ dị iji obi anyị nile na-ejere Jehova ozi, ọ bụghị nanị imezu iwu nke ịbụ onye Kraịst iji mee ihe na-atọ ụmụ mmadụ ụtọ. (Aịsaịa 29:13) Anyị aghaghị igosi na anyị na-atụ Jehova egwu ziri ezi ma na-akwanyere ya ùgwù miri emi n’adịghị ka ndị na-enweghị okwukwe bi na Juda. (Aịsaịa 29:16) Ọzọkwa, ọ dị mkpa ka anyị gosi na anyị dị njikere ịbụ ndị Jehova gbaziri na ịmụta ihe site n’aka ya.—Aịsaịa 29:24.
28. Olee otú ndị ohu Jehova si ele ọrụ nzọpụta ya anya?
28 Lee ka o si dị mkpa inwe okwukwe na obi ike n’ebe Jehova nọ na n’ụzọ o si eme ihe! (Tụlee Abụ Ọma 146:3.) Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ, ozi ịdọ aka ná ntị anyị na-ekwusa pụrụ iyi ihe ụmụaka. Mbibi a ga-ebibi otu nzukọ, bụ́ Krisendọm, nke na-ekwu na ọ na-ejere Chineke ozi bụ echiche na-eju anya, nke a na-adịghị ahụkebe. Ma Jehova ga-emezu “ihe omume ya na-eju anya.” Obi abụọ adịghị na nke ahụ. N’ihi ya, n’ime mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a ma gabiga ya, ndị ohu Chineke na-atụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu n’Alaeze ya na n’Eze ọ họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst. Ha maara na ọrụ nzọpụta Jehova—nke a ga-arụkọta ya na ‘ọrụ ya a na-adịghị ahụkebe’—ga-ewetara ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi ngọzi ebighị ebi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’asụsụ Hibru mbụ e ji dee ya, Aịsaịa 28:10 nwere ụda ndakọ, dị ka ukwe ụmụ ọta akara. N’ihi ya, ozi Aịsaịa dara ndị ndú okpukpe ahụ ka ikwughachi otu okwu ahụ na dị ka okwu ụmụaka.
[Foto ndị dị na peeji nke 289]
Krisendọm adaberewo ná njikọ aka nke ya na ndị ọchịchị bụ́ mmadụ kama ịdabere na Chineke
[Foto dị na peeji nke 290]
Jehova mere “ihe omume ya na-eju anya” mgbe o kwere ka Babilọn bibie Jerusalem
[Foto dị na peeji nke 298]
Ndị nweburu mgbe ntị chiri ha n’ụzọ ime mmụọ pụrụ ‘ịnụ’ Okwu Chineke