Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jt p. 22-24
  • Ezi Uru Ozi Ọma ahụ Baara Obodo Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Uru Ozi Ọma ahụ Baara Obodo Gị
  • Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ụkpụrụ Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Baịbụl Ọ̀ Kagburu Mmadụ Ịlụ Onye Agbụrụ Ọzọ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Mgbe Mbunobi Na-agaghị Adịkwa Ọzọ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
jt p. 22-24

Ezi Uru Ozi Ọma ahụ Baara Obodo Gị

N’ỤWA nke oge a, anyị na-anụkarị ka a na-ekwu, sị: “Ụkpụrụ nke Iso Ụzọ Kraịst abaghị uru. Ha agaghị nnọọ ekwe mgbaso n’ọha mmadụ gwara ọgwa nke taa.” Otú ọ dị, e kwupụtara echiche dị iche ná mkparịta ụka a kọrọ na onye ndú ndị Hindu bụ́ Mohandas K. Gandhi na onye na-anọchitebu anya mba Britain n’India, bụ́ Lord Irwin nwere. E kwuru na Lord Irwin jụrụ Gandhi ihe o chere ga-agwọta nsogbu dị n’etiti Great Britain na India. Gandhi wetere otu Bible, mepee n’isi nke ise nke akwụkwọ Matiu ma kwuo, sị: “Mgbe mba nke gị na nke m ga-ekwenyekọ n’ozizi nile nke Kraịst ziri n’ime Ozizi Elu Ugwu nke a, anyị ga-edoziwo ihe isi ike nile, ọ bụghị nanị nke mba anyị dị iche iche, kama ọ bụ nke elu ụwa dum.”

Ozizi ahụ na-ekwu banyere ịchọ iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na ịdị nwayọọ n’obi, ịdị na-eme udo, ime ebere, na ịhụ ezi omume n’anya. Ọ katọrọ ọ bụghị nanị igbu ọchụ, kamakwa, iweso ndị ọzọ iwe, ọ bụghị nanị ịkwa iko kamakwa iche echiche na-akpali agụụ ịkwa iko. O kwuru okwu megide omume ịgba alụkwaghịm n’ajụghị ase bụ́ nke na-ekewa ezinụlọ ma na-emerụ ụmụaka ahụ. Ọ na-agwa anyị, sị: ‘Hụ ọbụna ndị na-enweghị mmasị n’ebe ị nọ n’anya, nye ndị nọ ná mkpa ihe, kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe n’emeghị ebere, mesoo ndị ọzọ ihe otú ị ga-achọ ka e si mesoo gị.’ Ndụmọdụ a nile, ọ bụrụ na e tinye ha n’ọrụ, ga-eweta abamuru dị ukwuu. Ka ndị mmadụ na-etinyekwu ha n’ọrụ n’obodo gị, otú a ka obodo gị ga na-adịwanye mma!

Ndịàmà Jehova na-akpali ndị mmadụ ime nke a. Bible na-akụziri ha ịkwanyere alụmdi na nwunye ùgwù. Ha na-azụ ụmụ ha ịgbaso ụkpụrụ ndị ziri ezi. A na-emesi mkpa ezinụlọ dị ike. Ezinụlọ dị n’otu bụ ngọzi nye obodo gị, ọbụna nye mba gị. Akụkọ ihe mere eme jupụtara n’ihe atụ nke ike ụwa ndị dara mgbe ihe nkekọ ezinụlọ na-esikwaghị ike, mgbe omume rụrụ arụ mụbakwara. Ka ndị mmadụ n’otu n’otu na ezinụlọ Ndịàmà Jehova na-akpali ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị Kraịst na-amụbakwu, otú a ka isi ike, omume rụrụ arụ, na mpụ na-ebelatakwu n’obodo gị.

Otu n’ime nsogbu na-emekpa obodo na mba dị iche iche ahụ bụ ịkpa ókè agbụrụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, Pita onyeozi kwuru, sị: “Ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” Pọl dekwara, sị: “Onye Juu ma ọ bụ onye Grik apụghị ịdị, ohu ma ọ bụ onye nwe onwe ya apụghị ịdị, nwoke na nwanyị apụghị ịdị: n’ihi na unu onwe unu nile bụ otu onye n’ime Kraịst Jisọs.” (Ọrụ 10:34, 35; Ndị Galetia 3:28) Ndịàmà Jehova kwetara nke a. Ndị si n’agbụrụ na ụcha akpụkpọ ahụ nile na-ebikọ ma na-arụkọ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile ha, n’alaka, nakwa n’ọgbakọ ha dị iche iche.

N’Africa, ebo ụfọdụ apụghị imekọ ihe n’eseghị okwu. Otú ọ dị, ná mgbakọ nke Ndịàmà Jehova, ndị si n’ọtụtụ ebo dị iche iche, na-erikọ ihe, ehikọ ụra, na-efekọkwa ofufe ọnụ n’ịdị n’otu zuru ezu na ná mmekọrịta ịhụnanya. Ọ na-eju ndị gọọmenti anya mgbe ha hụrụ nke a. Akwụkwọ akụkọ New York bụ́ Amsterdam News nke August 2, 1958, kọrọ otu ihe atụ nke mmetụta ịdị n’otu nke ezi Iso Ụzọ Kraịst nwere. Ihe kpaliri okwu a bụ mgbe e kirichara mgbakọ mba nile, nke a kpọtụrụ uche na mbụ, bụ́ ebe ihe karịrị Ndịàmà 250,000 gbakọtara na New York City.

“N’ebe nile, ndị isi ojii, ndị ọcha na ndị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, bụ́ ndị sitere n’ọkwá nile ná ndụ na n’akụkụ nile nke ụwa, na-emekọ ihe ọnụ n’ọṅụ, n’enweghị ihe mgbochi. . . Ndịàmà ahụ na-efe ofufe bụ́ ndị sitere n’ala 120 ebikọwo ọnụ ma fekọọ ofufe ọnụ n’udo, na-egosi ndị America otú a pụrụ isi mee ya n’ụzọ dị mfe. . . . Mgbakọ ahụ bụ ihe atụ magburu onwe ya nke otú ndị mmadụ pụrụ isi rụkọọ ọrụ ma bikọọ ọnụ.”

Ọtụtụ ndị pụrụ ịsị na ụkpụrụ nke Iso Ụzọ Kraịst enweghị isi n’ụwa nke oge a. Otú ọ dị, olee ihe ọzọ dịworo irè ma ọ bụ ga-adị irè? Ụkpụrụ ndị Kraịst pụrụ ịba ezigbo uru ma e tinye ha n’ọrụ n’obodo gị ugbu a, ha ga-abụkwa ihe ndabere maka ime ka ‘mba nile, ebo nile, na ndị nile’ dị n’otu n’ụwa nile n’okpuru ịchịisi Alaeze Chineke n’elu ihe a kpọrọ mmadụ.—Mkpughe 7:9, 10.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]

Ndị si n’agbụrụ na ụcha akpụkpọ ahụ nile na-arụkọ ọrụ ọnụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

Iso Ụzọ Kraịst dị irè. Gịnị ọzọ dịworo irè?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya