Ajụjụ Ndị Nwere Mmasị Na-ajụkarị
Ọ bụrụ na Chineke bụ ịhụnanya, n’ihi gịnị ka o ji kwere ka ajọ omume dịrị?
CHINEKE kwere ka ajọ omume dịrị, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa makwa ụma na-eme ya. Dị ka ihe atụ, ha na-alụ agha, na-atụ ụmụaka bọmbụ, na-ebibi ụwa, ma na-akpata ụnwụ. Ọtụtụ nde mmadụ na-ese siga ma na-enweta ọrịa cancer akpa ume, na-akwa iko ma na-ebute ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, na-aṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè ma na-enweta ọrịa cirrhosis imeju, tinyere ihe ndị ọzọ. Ndị dị otú ahụ achọghị n’ezie ka a kwụsị ajọ omume nile. Nanị ihe ha chọrọ bụ ka e wepụ ntaramahụhụ ha na-akpata. Mgbe ha ghọtara mkpụrụ ha kụrụ, ha na-eti, “Gịnị ka m mere?” Ha na-atakwa Chineke ụta, dị ka Ilu 19:3 na-ekwu: “Nzuzu nke mmadụ na-ebibi ndụ ya, mgbe ahụkwa ọ na-eweso ONYENWE ANYỊ iwe.” (The New English Bible) A sịkwa na Chineke akwụsị ihe ọjọọ ha, ha ga-eme mkpesa na a napụrụ ha nnwere onwe ha ime ya!
Isi ihe mere Jehova ji kwere ka ihe ọjọọ dịrị bụ iji zaghachi ịma aka Setan. Setan bụ́ Ekwensu kwuru na Chineke agaghị etinyeli ụmụ mmadụ n’ụwa bụ́ ndị ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Ya n’ule. (Job 1:6-12; 2:1-10) Jehova kwere ka Setan dịrị ndụ iji nwee ohere ịnwapụta ịma aka ya. (Ọpụpụ 9:16) Setan nọgidere na-eweta ahụhụ ugbu a iji mee ka ndị mmadụ gbakụta Chineke azụ, ka ọ na-agbalị ịnwapụta ịma aka ya. (Mkpughe 12:12) Otú ọ dị, Job guzosiri ike n’ezi ihe. Otú ahụkwa ka ọ dị Jisọs. Ezi ndị Kraịst na-emekwa otú ahụ ugbu a.—Job 27:5; 31:6; Matiu 4:1-11; 1 Pita 1:6, 7.
Ọ ga-amasị m ikwere na paradaịs elu ala ebe ndị mmadụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ma nke ahụ ó sighị ike ikweta na ọ ga-eme?
Ọ bụghị dị ka Bible si kwuo. O yiri ihe siri nnọọ ike nkweta nanị n’ihi na ihe a kpọrọ mmadụ amarawo ihe ọjọọ ruo ọtụtụ narị afọ. Jehova kere ụwa ma gwa ihe a kpọrọ mmadụ ka ha were ndị ikom na ndị inyom bụ ndị ezi omume mejupụta ya, ndị ga-elekọta ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ dị na ya ma chekwaa ịma mma ya kama ibibi ya. (Lee peeji nke 12 na nke 17.) Kama Paradaịs ahụ e kwere ná nkwa ịbụ ihe siri nnọọ ike nkweta na ọ ga-abịa, ọnọdụ dị mwute nke dị ugbu a dị nnọọ oké njọ ịdịrị gawa. Paradaịs ga-anọchi ya.
Olee otú m pụrụ isi zaa ndị na-akwa emo ma na-ekwu na Bible bụ akụkọ ifo nakwa ihe na-ekwekọghị na nkà mmụta sayensị?
Inwe okwukwe ná nkwa ndị a abụghị ikwenye n’ihe n’ajụghị ase. “Okwukwe si n’ọnụnụ pụta.” Site n’ịmụ Okwu Chineke, amamihe dị na ya na-abịa doo anya, okwukwe na-amụbakwa.—Ndị Rom 10:17; Ndị Hibru 11:1.
Nkà mmụta ihe ochie banyere Bible na-akwado izi ezi nke ihe dị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke Bible. Ezi nkà mmụta sayensị na Bible kwekọrọ. Isi ihe ndị na-esonụ dị n’ime Bible ogologo oge tupu ndị ọkà mmụta nke ụwa achọpụta ha: usoro ndị ụwa gabigara mgbe ọ na-amalite, na ụwa dị gburugburu, na ọ dịghị ihe e kokwasịrị ya n’elu ya, nakwa na nnụnụ na-eme njem site n’otu obodo gaa n’ọzọ.—Jenesis isi 1; Aịsaịa 40:22; Job 26:7; Jeremaịa 8:7.
Amụma ndị mezuworonụ na-egosi na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ. Daniel buru amụma banyere mbili na ọdịda nke ike ọchịchị ụwa dị iche iche tupu o mee, tinyere mgbe Mesaịa ga-apụta na mgbe a ga-egbu ya. (Daniel isi nke 2, 8; 9:24-27) Taa, amụma ndị ọzọ ka na-emezu, na-eme ka a mata oge a dị ka “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5; Matiu isi 24) Ibu ụzọ mara ihe n’ụzọ dị otú ahụ karịrị ike mmadụ. (Aịsaịa 41:23) Iji nwetakwuo ihe nkwado, lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? na Is There a Creator Who Cares About You?, ndị Watchtower Bible and Tract Society bipụtara.
Olee otú m pụrụ isi mụta ịza ajụjụ ndị dabeere na Bible?
Ị ghaghị ịmụ Bible ma tụgharịa uche na ya ma rịọ maka mmụọ Chineke iduzi gị. (Ilu 15:28; Luk 11:9-13) “Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe,” ka Bible na-ekwu, “ya rịọ n’aka Chineke, Onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a ga-ewerekwa ya nye ya.” (Jemes 1:5) Ọzọkwa, e nwere ihe ndị e ji amụ Bible, bụ́ ndị e kwesịrị inyocha. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ na-adịkwa mkpa inweta enyemaka site n’aka ndị ọzọ, dị ka mgbe Filip mụọrọ onye Etiopia ihe. (Ọrụ 8:26-35) Ndịàmà Jehova na-eduziri ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible n’ebe obibi ha n’efu. Nwere onwe gị ịrịọ maka nke a.
N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji emegide Ndịàmà Jehova ma na-agwa m ka m ghara iso ha mụọ ihe?
E megidere nkwusa Jisọs, o kwukwara na a ga-emegide ụmụazụ ya. Mgbe izi ihe Jisọs masịrị ụfọdụ, ndị mmegide bụ́ ndị okpukpe jiri iwe kwuo, sị: “È duhiewokwa unu onwe unu? Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti ndị isi, ma ọ bụ n’etiti ndị Farisii, kwere na Ya?” (Jọn 7:46-48; 15:20) Ma ọ́ bụghị na ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-adụ gị ọdụ ka ị ghara iso Ndịàmà mụọ ihe amaghị banyere ha ọ bụrụ na ha nwere ajọ mbunobi. Soro Ndịàmà mụọ ihe ma lee n’onwe gị ma nghọta i nwere banyere Bible ọ ga-amụba ka ọ bụ na ọ gaghị amụba.—Matiu 7:17-20.
N’ihi gịnị ka Ndịàmà ji akpọtụrụ ndị nwere okpukpe nke ha?
N’ime nke a, ha na-agbaso ihe nlereanya Jisọs. O jekwuuru ndị Juu. Ndị Juu nwere okpukpe nke ha, ma n’ọtụtụ ụzọ, o siwo n’ebe Okwu Chineke dị pụọ. (Matiu 15:1-9) Mba nile nwere ụdị okpukpe nke ha, ma ọ bụ nke a sịrị na ọ bụ nke ndị Kraịst ma ọ bụ nke na-abụghị nke ndị Kraịst. Ọ dị oké mkpa ka ndị mmadụ nwee nkwenkwe ndị kwekọrọ n’Okwu Chineke kpọmkwem, mgbalị Ndịàmà na-emekwa inyere ha aka ime nke a bụ ngosipụta nke ịhụnanya ha n’ebe ndị agbata obi ha nọ.
Ndịàmà hà kweere na ọ bụ nanị okpukpe ha bụ nke ziri ezi?
Onye ọ bụla ji okpukpe ya kpọrọ ihe kwesịrị iche na ọ bụ ya bụ nke ziri ezi. Ma ọ́ bụghị ya, n’ihi gịnị ka ọ ga-eji nọrọ na ya? A dụrụ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Na-anwanụ ihe nile; jidesienụ ihe ọma ike.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Mmadụ kwesịrị ijide n’aka na Akwụkwọ Nsọ pụrụ ịkwado nkwenkwe ya, n’ihi na e nwere nanị otu ezi okpukpe. Ndị Efesọs 4:5 na-akwado nke a, na-ehota ‘otu Onyenwe anyị, otu okwukwe, otu baptism.’ Jisọs ekwenyeghị n’echiche ịnabata ihe nile e nwere n’oge a nke bụ́ na e nwere ọtụtụ ụzọ, ọtụtụ okpukpe, ndị na-edujecha ná nzọpụta. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” Ndịàmà Jehova kweere na ha achọtawo ya. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-achọwa okpukpe ọzọ.—Matiu 7:14.
Hà kweere na ọ bụ nanị ha ka a ga-azọpụta?
Ee e. Ọtụtụ nde ndị dịworo ndụ na narị afọ ndị gara aga, ndị na-abụghịkwa Ndịàmà Jehova, ga-abịa ná mbilite n’ọnwụ ma nwee ohere nke ịdị ndụ. Ọtụtụ ndị dị ndụ ugbu a ka nwere ike ịnakwere eziokwu ahụ ma na-eme ezi omume tupu “mkpagbu ukwu” ahụ abịa, ha ga-enwetakwa nzọpụta. Ọzọkwa, Jisọs sịrị na anyị ekwesịghị ịdị na-ekpe ibe anyị ikpe. Anyị na-ele anya n’ọdịdị elu ahụ; Chineke na-ele obi. Ọ na-ahụ ihe n’ụzọ ziri ezi, na-ekpekwa ikpe n’ebere. O nyefewo ikpe n’aka Jisọs, ọ bụghị n’aka anyị.—Matiu 7:1-5; 24:21; 25:31.
Onyinye ego dị aṅaa ka a na-atụ anya ya n’aka ndị na-eje nzukọ Ndịàmà Jehova?
N’ihe banyere onyinye ego, Pọl onyeozi sịrị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) N’Ụlọ Nzukọ Alaeze na n’ụlọ mgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, a dịghị anakọta ụtụ ma ọlị. A na-edebe igbe ka o wee dịrị onye ọ bụla chọrọ inye onyinye mfe ime otú ahụ. Ọ dịghị onye na-ama ihe ndị ọzọ na-enye ma ọ bụ ma ndị ọzọ ha nyere. Ụfọdụ nwere ike inye karịa ndị ọzọ; ọ pụkwara ịbụ na ụfọdụ agaghị enwe ike inye ihe ọ bụla. Jisọs gosiri echiche ziri ezi mgbe o kwuru okwu banyere igbe onyinye dị n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem na ndị na-atụnye onyinye: Ọ bụ ihe mmadụ nwere ike inye na mmụọ e ji nye ya bụ ihe dị mkpa, ọ bụghị ego ole e nyere.—Luk 21:1-4.
Ọ bụrụ na m ghọọ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova, à ga-atụ anya ka m na-eme nkwusa dị ka ha na-eme?
Mgbe mmadụ nwere ihe ọmụma dị ukwuu banyere Paradaịs elu ala ahụ e kwere ná nkwa n’okpuru Alaeze Kraịst, onye ahụ na-achọ isoro ndị ọzọ kerịta ya. Gị onwe gị ga-achọkwa ime otú ahụ. Ọ bụ ozi ọma!—Ọrụ 5:41, 42.
Ime nke a bụ ụzọ dị mkpa isi gosi na ị bụ onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. N’ime Bible, a kpọrọ Jisọs “Onyeàmà ahụ Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke bụkwa Onye eziokwu.” Mgbe ọ nọ n’elu ala, o mere nkwusa, na-asị: “Alaeze eluigwe dị nso,” o zipụkwara ndị na-eso ụzọ ya ime otu ihe ahụ. (Mkpughe 3:14; Matiu 4:17; 10:7) Mgbe e mesịrị, Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha [ihe].” O bukwara amụma na tupu ọgwụgwụ ihe nile eruo, “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.”—Matiu 24:14; 28:19, 20.
E nwere ọtụtụ ụzọ isi kwusaa ozi ọma a. Iso ndị enyi na ndị mmadụ maara na-enwe mkparịta ụka, ọtụtụ mgbe, na-emepe ụzọ maka ime otú ahụ. Ụfọdụ na-eme ya site n’ide akwụkwọ ozi ma ọ bụ site n’ịkpọ mmadụ na telifon. Ndị ọzọ na-ezipụ akwụkwọ ndị nwere ihe ọmụma ha chere na ndị ha maara ga-enwe mmasị na ha karịsịa. N’ihi ọchịchọ ha bụ́ ka a ghara ịhapụ onye ọ bụla, Ndịàmà na-eji ozi ahụ aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ.
Bible na-akpọ òkù a na-ekpo ọkụ, sị: “Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Ịgwa ndị ọzọ banyere ụwa Paradaịs na ngọzi ya dị iche iche bụ nke a ga-eme site n’ọchịchọ obi, site n’obi jupụtara n’ọchịchọ ikerịta ozi ọma a.
Anyị ji n’aka na i nwere ajụjụ ndị ọzọ banyere Ndịàmà Jehova na nkwenkwe ha. Ma eleghị anya, isiokwu ụfọdụ n’onwe ha na-akpata arụmụka. Ọ ga-amasị anyị ịza ajụjụ gị. Ohere dị na broshuọ a dị ntakịrị, n’ihi ya anyị na-akpọ gị òkù ịjụ ya Ndịàmà nọ n’ógbè unu. Ị pụrụ ime nke ahụ ná nzukọ ha na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ mgbe ha letara gị n’ụlọ gị. Ma ọ bụ ị pụrụ izigara Watch Tower ajụjụ gị, na-eji adres kwesịrị ekwesị e depụtara n’okpuru.