Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
    • IHE ỌMỤMỤ NKE 4

      Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ

      Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

      Gụọ ihe, kwuokwa okwu n’ụzọ nke na okwu gị na echiche dị na ya ga na-apụta n’enweghị ihe mgbochi. Mgbe a na-ekwu okwu n’ụzọ na-aga were were n’ọnụ, okwu adịghị akpọ ọgwụ n’ọnụ ma ọ bụ na-ewe ogologo oge tupu a kpọpụta ya, a dịghịkwa akpọhie okwu ma laghachi azụ ma ọ bụ na-eche ihe a ga-ekwu.

      Gịnị mere o ji dị mkpa?

      Mgbe okwu na-adịghị aga ọkà okwu were were n’ọnụ, uche ndị na-ege ntị pụrụ ịdị na-awagharị awagharị; a pụrụ inye echiche na-ezighị ezi. Ihe a na-ekwu nwere ike ọ gaghị enwe ike ime ka e kwenye.

      MGBE ị na-agụpụta ihe, ị̀ na-akpọhie okwu ụfọdụ ma laghachi azụ? Ma ọ bụ mgbe i biliri ọtọ n’ihu ndị na-ege ntị iji kwuo okwu, ị̀ na-achọpụta na ọtụtụ mgbe ị na-achọkarị okwu kwesịrị ekwesị achọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na i nwere nsogbu nke okwu ịga were were n’ọnụ. Onye okwu na-aga were were n’ọnụ na-agụ ihe ma na-ekwu okwu n’ụzọ nke na okwu na echiche okwu na-apụta n’ụzọ dị nnọọ mfe n’enweghị ihe mgbochi. Nke a apụtaghị na ọ na-ekwu okwu mgbe nile, na ọ na-ekwu okwu ngwa ngwa, ma ọ bụ na ọ na-ekwu okwu n’echeghị echiche. Okwu ya na-adị ụtọ ná ntị. A na-elebara okwu ịga were were n’ọnụ anya n’ụzọ pụrụ iche n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

      Ọtụtụ ihe pụrụ ime ka okwu ghara ịdị na-aga mmadụ were were n’ọnụ. Ọ̀ dị mkpa ka i chebara nke ọ bụla n’ihe ndị na-esonụ echiche n’ụzọ pụrụ iche? (1) Mgbe ị na-agụpụtara ndị ọzọ ihe, amachaghị okwu ụfọdụ pụrụ ime ka ị na-egbu oge n’ikwu okwu. (2) Ntakịrị nkwụsịtụ n’ọtụtụ ebe gabiga ókè pụrụ ịkpata ikwu okwu n’ụzọ na-akpọ ọgwụ n’ọnụ. (3) Emeghị nkwadebe pụrụ iso kpata nsogbu ahụ. (4) N’ikwu okwu n’ihu ìgwè mmadụ, otu ihe na-akpatakarị ekwughị okwu n’ụzọ na-aga were were bụ ahazighị ihe ị ga-ekwu n’ụzọ ezi uche dị na ya. (5) Enweghị ọtụtụ okwu a pụrụ iji mee ihe pụrụ ime ka mmadụ na-egbu oge ka ọ nọ na-eche okwu ndị kwesịrị ekwesị. (6) Ọ bụrụ na e mesie ọtụtụ okwu ike, ọ pụrụ ime ka okwu ghara ịga were were n’ọnụ. (7) Amachaghị iwu ndị na-achị ụtọ asụsụ pụrụ iso kpata nsogbu ahụ.

      Ọ bụrụ na okwu adịghị aga gị were were n’ọnụ, ndị na-ege gị ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze agaghị ebili ọtọ pụọ, ma obi ha pụrụ ịkpapụ. N’ihi ya, ihe ka ukwuu n’ihe ị na-ekwu pụrụ ifu ọhịa.

      N’aka nke ọzọ, a ghaghị ilezi anya ka okwu e zubere ka o nwee mmetụta dị ike ma na-aga were were n’ọnụ ghara ịghọ nke iti iwu, ikekwe ọbụna nke na-emenye ihere. Ọ bụrụ na n’ihi ọdịiche ndị e nwere n’ọdịbendị ndị mmadụ si na ha na ndị mmadụ ewere ụzọ i si ekwu okwu dị ka nke akọ na-adịghị na ya ma ọ bụ nke na-esighị n’ezi obi, nke ahụ ga-emebi ebumnobi gị. Ọ bụ ihe e kwesịrị ịrịba ama na Pọl onyeozi, ọ bụ ezie na ọ bụ ọkà okwu nweworo ahụmahụ, gwara ndị Kọrint okwu “n’adịghị ike na n’egwu na n’oké ịma jijiji” ka o wee ghara ịdọrọ uche n’ụzọ na-adịghị mkpa gaa n’ebe ya onwe ya nọ.—1 Kọr. 2:3.

      Omume Ndị A Ga-ezere. Ọ bụ ihe maara ọtụtụ ndị ahụ́ ịgbakwụnye okwu ndị dị ka “eem eem” mgbe ha na-ekwu okwu. Ndị ọzọ na-ejikarị “ya mere” amalite echiche okwu, ma ọ bụ ha na-agbakwụnye nkebi ahịrịokwu bụ́ “ọzọkwa” ma ọ bụ “ya bụ” n’ihe ọ bụla ha na-ekwu. Ikekwe ị maghị ugboro ole ị na-eji okwu ndị dị otú ahụ eme ihe. Ị pụrụ ịgbalị ka i nwee nnọkọ mmụgharị ihe mgbe onye ọzọ ga-ege gị ntị ma kwughachi okwu ndị a mgbe ọ bụla i kwuru ha. Ọ pụrụ iju gị anya.

      Ụfọdụ ndị na-agụghachi ihe ndị ha gụrụ ma ọ bụ kwughachi ihe ndị ha kwuru ọtụtụ ugboro. Ya bụ, ha na-amalite otu ahịrịokwu ma kwụsị n’etiti ụzọ wee kwughachi, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ihe ha kwuworo.

      Ndị ọzọkwa na-ekwu okwu ọsọ ọsọ otú o kwesịrị, ma ha na-amalite ikwu otu ihe, mgbe ha ruziri n’etiti ahịrịokwu, ha amafere n’ihe ọzọ. Ọ bụ ezie na okwu na-apụta nnọọ n’enweghị nsogbu, ịgbanwe echiche okwu na mberede na-eme ka okwu ghara ịga were were n’ọnụ.

      Ụzọ Isi Meziwanye Ihe. Ọ bụrụ na nsogbu gị bụ na ọtụtụ mgbe ị na-adị na-eche okwu kwesịrị ekwesị, ọ dị gị mkpa ime ezigbo mgbalị ịmụtakwu okwu ndị e ji eme ihe n’asụsụ gị. Rịba okwu ndị ị na-amaghị dị n’Ụlọ Nche, Teta!, na ná mbipụta ọzọ ọ pụrụ ịbụ ya ka ị na-agụ ama. Chọọ ha n’akwụkwọ ọkọwa okwu, lee otú e si akpọ ha na ihe ha pụtara, webatakwa ụfọdụ n’ime okwu ndị a n’okwu ndị i ji eme ihe. Ọ bụrụ na ị pụghị inweta akwụkwọ ọkọwa okwu ọ bụla, gwa onye na-asụ asụsụ ahụ nke ọma ka o nyere gị aka.

      Ime ka ọ mara gị ahụ́ ịgụpụta ihe agụpụta mgbe nile ga-eso nyere gị aka ime nke ọma karị. Rịba okwu ndị siri ike ama, kpọpụtakwa ha akpọpụta ọtụtụ ugboro.

      Iji na-agụ ihe n’ụzọ na-aga were were, ọ dị mkpa ịghọta otú okwu si agakọ n’ahịrịokwu. Ọ na-adịkarị mkpa ịgụ okwu n’ìgwè n’ìgwè iji wepụta echiche onye dere ya na-ewepụta. Rịba ìgwè okwu ndị a ama nke ọma. Ọ bụrụ na ọ ga-enyere gị aka, kanye akara na ha. Ebumnobi gị abụghị nanị ịgụzi okwu agụzi, kamakwa iwepụta echiche dị na ha n’ụzọ doro anya. Mgbe ị tụlesịworo otu ahịrịokwu, gafere n’ọzọ ruo mgbe ị mụsịrị paragraf ahụ dum. Mata otú e si wepụta echiche dị na ya. Mgbe ahụ mụgharịa ịgụpụta ihe agụpụta. Gụọ paragraf ahụ ugboro ugboro ruo mgbe ị pụrụ ịgụ ya n’agụhieghị ihe ma laghachi azụ, n’akwụsịghịkwa n’ebe ndị na-ekwesịghị ekwesị. Mgbe ahụ gafere na paragraf ndị ọzọ.

      Mgbe ahụ, gụọ ya ọsọ ọsọ karị. Ọ bụrụ na ị ghọtawo otú okwu ndị dị n’otu ahịrịokwu si agakọ, ị ga-enwe ike ịhụ ihe karịrị otu okwu n’otu mgbe nakwa ịtụ anya ihe kwesịrị isochi. Nke a ga-atụnye ụtụ dị ukwuu n’ịdị irè nke ịgụ ihe gị.

      Ime ka ọ bụrụ omume gị mgbe nile ịdị na-agụpụta ihe ozugbo i lere ya anya pụrụ ịbụ ọzụzụ bara uru. Dị ka ihe atụ, n’ebughị ụzọ mee nkwadebe, gụpụta ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nkọwa ya; na-emechi ya anya. Ka ọ mara gị ahụ́ ikwe ka anya gị na-ahụ okwu dị ka ìgwè dị iche iche ndị na-ewepụta echiche okwu zuru ezu kama ịdị na-ahụ nanị otu okwu n’otu oge.

      Ná mkparịta ụka, okwu ịga were were n’ọnụ na-achọ na ị ga-eche echiche tupu i kwuo okwu. Mee ka ọ bụrụ ihe ị na-eme kwa ụbọchị. Kpebie ihe ndị ị chọrọ ikwupụta na usoro ị ga-eji kwuo ha; mgbe ahụ malite ikwu okwu. Ekwula ya ngwa ngwa. Gbalịa ikwupụta otu echiche zuru ezu n’akwụsịghị akwụsị ma ọ bụ n’agbanweghị echiche ị na-ewepụta n’etiti ụzọ. Ị pụrụ ịchọpụta na ọ na-enye aka iji ahịrịokwu ndị dị mfe ma dị nkenke na-eme ihe.

      Okwu kwesịrị ịdị na-abịara onwe ha ma ọ bụrụ na ị maara kpọmkwem ihe ị chọrọ ikwu. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ dịghị mkpa ka ị họrọ mkpụrụ okwu ndị ị ga-ekwu. N’ezie, ná mmụgharị ihe, ọ ka mma ijide nnọọ n’aka na ị ghọtara ihe ị chọrọ ikwu nke ọma na ichewazi okwu ị ga-eji mee ihe mgbe ị na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ bụrụkwa na i mee ka uche gị dịrị n’echiche dị n’okwu ahụ kama ịdị ná mkpụrụ okwu ndị ị na-ekwupụta, okwu ga na-abịara onwe ha, ị ga-ekwupụtakwa echiche gị otú ọ dị gị n’obi. Ma ozugbo ị malitere iche banyere mkpụrụ okwu kama echiche dị n’okwu, okwu gị nwere ike ọ gaghị aga were were n’ọnụ. Site n’ime ya ugboro ugboro, ị ga-enwe ike ịzụlite okwu ịga were were n’ọnụ, bụ́ nkà dị mkpa n’ikwu okwu na ịgụ ihe n’ụzọ dị irè.

      Mgbe e nyere ya ọrụ ịnọchite anya Jehova n’ihu mba Izrel na n’ihu Fero nke Ijipt, Mozis nwere mmetụta na ya erughị eru. N’ihi gịnị? Ọ bụghị onye na-ekwu okwu were were; ọ pụrụ ịbụ na o nwere nsogbu ikwu okwu. (Ọpụ. 4:10; 6:12) Mozis nyere ihe ngọpụ dị iche iche, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha Chineke nakweere. Jehova ziri Erọn ka o soro ya gaa ịbụ ọnụ na-ekwuru ya, ma O nyekwaara Mozis aka ikwu okwu. Ugboro ugboro nakwa n’ụzọ dị irè, Mozis gwara ọ bụghị nanị ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa ìgwè ndị dị ntakịrị okwu, kama mba ahụ dum. (Deut. 1:1-3; 5:1; 29:2; 31:1, 2, 30; 33:1) Ọ bụrụ na i mee ihe nile i nwere ike ime, na-atụkwasị Jehova obi, gị onwe gị kwa pụrụ iji okwu gị nye Chineke otuto.

      ỊNAGIDE ỊSỤ NSỤ

      Ọtụtụ ihe pụrụ iso kpata ịsụ nsụ. Usoro ọgwụgwọ nke nyeere ụfọdụ ndị aka nwere ike ọ gaghị adịcha irè nye ndị ọzọ. Ma iji nweta ọṅụ nke na-esite n’inwe ihe ịga nke ọma, ọ dị mkpa ịnọgide na-etinye mgbalị.

      Echiche ịza ajụjụ ná nzukọ ọ̀ na-eme ka egwu jide gị, ọbụna na-eme ka ahụ́ na-ama gị jijiji? Kpegara Jehova ekpere maka enyemaka ya. (Fil. 4:6, 7) Mee ka echiche gị dịkwasị n’inye Jehova nsọpụrụ na inyere ndị ọzọ aka. Atụla anya ka nsogbu ahụ laa kpam kpam, kama rịba ama otú e si enyere gị aka ịnagide ya. Ka ị na-enweta ngọzi Jehova na agbamume ụmụnna gị, ị ga-achọ imekwu ihe.

      Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enye gị ohere inwe ahụmahụ n’ikwu okwu n’ihu ìgwè mmadụ. Ọ pụrụ iju gị anya otú ị ga-emeru nke ọma n’ihu ìgwè dị ntakịrị nke na-akwado gị ma chọọ ka i nwee ihe ịga nke ọma. Nke a pụrụ inyere gị aka inweta obi ike ikwu okwu n’ọnọdụ ndị ọzọ.

      Ọ bụrụ na ị na-aga ikwu okwu, kwadebe nke ọma. Mee ka obi gị dịrị n’okwu gị. Jiri mmetụta kwesịrị ekwesị kwuo okwu. Ọ bụrụ na ị malite ịsụ nsụ mgbe ị na-ekwu okwu, mgbe ahụ, ruo n’ókè o kwere mee, mee ka ụda olu gị dajụọ, wetuokwa obi. Mee ka uru ahụ́ ndị dị gị n’agbà ghara ikwedo ekwedo. Na-ekwu okwu n’ahịrịokwu ndị dị nkenke. Belata ịdị na-agbakwụnye okwu ndị dị ka “eem” na “mmm.”

      Mgbe ha chọpụtara okwu ndị nyere ha nsogbu n’oge gara aga, ụfọdụ bụ́ ndị na-agbaso ịsụ nsụ mgba na-ezere ha, kamakwa iji ha na-eme ihe ha na-eji okwu ndị ọzọ pụtara otu ihe ahụ eme ihe. Ndị ọzọ na-ahọrọ ịchọpụta ụda okwu ndị kasị enye ha nsogbu ma mụgharịa ha ugboro ugboro.

      Ọ bụrụ na ị na-asụ nsụ mgbe gị na mmadụ na-enwe mkparịta ụka, adala mbà ná mgbalị ị na-eme inwe nkwurịta okwu. Ị pụrụ ịgba onye nke ọzọ ume ịga n’ihu na-ekwu okwu ruo mgbe ị ga-enwe ike ịga n’ihu. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, nanị deere ya ihe n’akwụkwọ, ma ọ bụ gosi onye ahụ ihe e dere ede.

      ỤZỌ ISI META YA

      • Mgbe ị na-agụ magazin na akwụkwọ dị iche iche, kanye akara n’okwu ndị ọhụrụ, chọpụta kpọmkwem ihe ha pụtara, mgbe ahụ jiri ha mee ihe.

      • Ma ọ dịkarịa ala jiri minit ise ruo iri mụgharịa ịgụpụta ihe agụpụta kwa ụbọchị.

      • Kwadebe nke ọma maka ihe omume ịgụ ihe. Rịba nnọọ ìgwè okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu ama nke ọma. Mata otú e si wepụta echiche okwu.

      • Ná mkparịta ụka gị kwa ụbọchị, mụta ibu ụzọ chee echiche mgbe ahụzi ikwu ahịrịokwu zuru ezu n’akwụsịghị akwụsị.

      IHE OMUME: Jiri nlezianya tụlee Ndị Ikpe 7:1-25, na-amụ ya paragraf na paragraf. Jide n’aka na ị ghọtara ihe ọ na-ekwu. Jiri akwụkwọ ọkọwa okwu lee okwu ndị ị na-amaghị. Kpọpụta ahaaka ọ bụla akpọpụta. Mgbe ahụ gụpụta paragraf ahụ; lezie anya ka ị gụzie ya agụzi. Mgbe i nwere afọ ojuju n’otú i si gụọ paragraf ahụ, gafere n’ọzọ, nakwa ná ndị ọzọ. Mgbe ahụ gụọ isiakwụkwọ ahụ dum. Gụghachi ya, na nke ugbu a gụtụ ya ọsọ ọsọ karị. Gụghachi ya ọzọ, na-agụkwu ya ọsọ ọsọ ọbụna karị n’ebe ndị kwesịrị ekwesị—ma agụla ya oké ọsọ ọsọ nke na ị ga-akpọhie okwu wee laghachi azụ.

  • Nkwụsịtụ Kwesịrị Ekwesị
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
    • IHE ỌMỤMỤ NKE 5

      Nkwụsịtụ Kwesịrị Ekwesị

      Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

      Kwụsị kpam kpam n’ebe ndị kwesịrị ekwesị n’okwu gị. Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ịkwụsịtụ nwa oge ma ọ bụ nanị kwe ka ụda olu gị dalatatụ. Nkwụsịtụ ahụ kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na o mezuo nzube bara uru.

      Gịnị mere o ji dị mkpa?

      Ịkwụsịtụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụ otu ihe dị mkpa n’okwu a pụrụ ịghọta ngwa ngwa. Nkwụsịtụ na-emekwa ka isi ihe dị mkpa guzopụ iche.

      N’OKWU, nkwụsịtụ ndị e mere n’ebe ndị kwesịrị ekwesị dị mkpa. Nke a bụ eziokwu ma ị̀ na-agwa ìgwè mmadụ ma ọ bụ otu onye okwu. Ọ bụrụ na nkwụsịtụ ndị dị otú ahụ adịghị, ihe a na-ekwu pụrụ ịdị na-ada ka ikwugheri ọnụ kama ịbụ ikwupụta echiche dị n’okwu n’ụzọ doro anya. Nkwụsịtụ kwesịrị ekwesị na-enye aka eme ka okwu gị doo anya. A pụkwara iji ya mee ihe n’ụzọ ga-eme ka isi ihe ị na-ekwu nwee mmetụta na-adịte aka.

      Olee otú ị pụrụ isi mata mgbe i kwesịrị ịkwụsịtụ? Nkwụsịtụ ò kwesịrị ịha aṅaa n’ogologo?

      Kwụsịtụ Iji Kebie Okwu. Akara edemede aghọwo akụkụ dị mkpa nke asụsụ a na-ede ede. Ọ pụrụ igosi ebe okwu ma ọ bụ ajụjụ kwụsịrị. N’asụsụ ụfọdụ, a na-eji ya egosi okwu ndị e hotara ehota. Akara edemede ụfọdụ na-egosi njikọ dị n’agbata otu akụkụ nke ahịrịokwu na akụkụ ndị ọzọ. Onye na-agụpụtara onwe ya ihe pụrụ ịhụ akara edemede ndị ahụ. Ma mgbe ọ na-agụpụta ihe maka abamuru nke ndị ọzọ, ụda olu ya aghaghị iwepụta ihe akara edemede ọ bụla dị n’ihe odide ahụ pụtara. (Iji nwetakwuo nkọwa, lee Ihe Ọmụmụ nke 1, “Ịgụzi Ihe Agụzi.”) Akwụsịtụghị mgbe akara edemede chọrọ ka e mee otú ahụ pụrụ ime ka o siere ndị ọzọ ike ịghọta ihe ị na-agụ ma ọ bụ o nwere ike ọbụna ịgbanwe echiche dị n’ihe ị na-agụ.

      Tụkwasị n’akara edemede, otú e si wepụta echiche okwu n’ahịrịokwu ga-ekpebi ebe ndị e kwesịrị ịkwụsịtụ. Otu onye a ma ama na-eti egwú kwuru n’otu oge, sị: “Adịghị m akpọta akara ụda egwú karịa ọtụtụ ndị na-akpọ piano. Ma, ị hụla, ịkwụsịtụ n’agbata otu akara ụda egwú na ọzọ, bụ ebe a chọrọ iji nkà eme ihe.” Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ikwu okwu. Ịkwụsịtụ n’ebe ndị kwesịrị ekwesị ga-eme ka okwu gị makwuo mma ma mee ka okwu ị kwadebere nke ọma nwekwuo ihe mmụta.

      N’ịkwadebe ịgụ ihe n’ihu ọha, ị pụrụ ịchọpụta na ọ na-enye aka ịkanye akara n’ihe odide ị ga-agụpụta. Kanye otu obere akara kwụ ọtọ n’ebe ị ga-akwụsịtụ nke nta, ikekwe n’ebe ị ga-echeretụ nanị nke nta. Kanye akara abụọ chiri anya ndị kwụ ọtọ n’ebe ị ga-akwụsịtụ ruo ogologo oge karị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na otú e si hazie okwu ụfọdụ adịghị aga gị were were n’ọnụ nakwa na ị na-akwụsịtụ ugboro ugboro n’ebe na-ekwesịghị ekwesị, jiri pensịl kanye akara na ha iji jikọta okwu nile dị ná nkebi ahịrịokwu ahụ nke siri ike ọgụgụ. Mgbe ahụ gụọ nkebi ahịrịokwu ahụ n’akwụsịtụghị akwụsịtụ site ná mmalite ruo ná njedebe ya. Ọtụtụ ndị ọkà okwu nwere ahụmahụ na-eme nke a.

      Ịdị na-akwụsịtụ ná mkparịta ụka a na-enwe kwa ụbọchị adịghị enyekarị nsogbu n’ihi na ị maara echiche ndị ị chọrọ iwepụta. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ maara gị ahụ́ ịdị na-akwụsịtụ ugboro ugboro n’agbanyeghị ihe echiche okwu chọrọ, okwu gị agaghị na-akpali akpali, ọ gaghịkwa edo anya. A tụrụ aro maka imeziwanye ihe n’Ihe Ọmụmụ nke 4, “Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ.”

      Nkwụsịtụ Maka Mgbanwe Echiche Okwu. Mgbe i si n’otu isi ihe na-agafere n’ọzọ, nkwụsịtụ pụrụ inye ndị na-ege gị ntị ohere iche echiche, ịhazigharị uche ha, ịmata mgbanwe nke echiche okwu, nakwa ịghọta nke ọma karị echiche ọzọ a na-ewepụta. Ọ dị mkpa ka ị kwụsịtụ mgbe i si n’otu echiche na-agafere n’ọzọ dịkwa ka ọ na-adị mkpa ka ị kwụsịlata mgbe i ji ụgbọala chọọ isi n’otu okporo ámá banye n’ọzọ.

      Otu ihe mere ndị ọkà okwu ụfọdụ ji esi n’otu echiche amafere n’ọzọ n’akwụsịtụghị bụ na ha na-anwa ikwu ihe buru oké ibu. Nye ụfọdụ ndị, omume ahụ na-egosi otú ha si ekwu okwu kwa ụbọchị. Ikekwe ndị nile nọ ha nso na-ekwu okwu otú ahụ. Ma nke ahụ adịghị eduga n’izi ihe n’ụzọ dị irè. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ikwu, nke kwesịrị ka a nụ ya ma cheta ya, mgbe ahụ wepụta oge zuru ezu iji mee ka echiche ahụ pụta ìhè nke ọma. Ghọta na nkwụsịtụ dị mkpa n’okwu nke a na-ewepụta echiche okwu dị na ya nke ọma.

      Ọ bụrụ na ị ga-ekwu okwu nke dabeere n’ihe ndepụta, ị kwesịrị ịhazi ihe ọmụma gị n’ụzọ ga-eme ka ebe ị ga-akwụsịtụ n’agbata otu isi ihe na ọzọ doo anya. Ọ bụrụ na ọ bụ okwu a ga-agụ agụ ka ị gaje ikwu, kanye akara n’ebe ndị e si n’otu isi ihe gbanwee gaa n’ọzọ.

      Nkwụsịtụ maka iji gbanwee echiche na-adịkarị ogologo karịa nkwụsịtụ n’ihi akara edemede—otú ọ dị, ọ gaghị adị ogologo nke na ọ ga-eme ka okwu ahụ jụọ oyi. Ọ bụrụ na ha adị oké ogologo, ha ga-eme ka e chee na ị kwadoghị nke ọma nakwa na ị na-anwa ikpebi ihe ọzọ ị ga-ekwu.

      Nkwụsịtụ Iji Mesie Okwu Ike. Nkwụsịtụ e ji emesi okwu ike na-adịkarị ịrịba ama, ya bụ, ọ na-ebute ụzọ ma ọ bụkwanụ na-esochi okwu e kwuru ma ọ bụ ajụjụ a jụrụ n’ụzọ kpotụrụ ọkụ. Nkwụsịtụ dị otú ahụ na-enye ndị na-ege ntị ohere ịtụgharị uche n’ihe a ka kwupụrụ, ma ọ bụ ọ na-eme ka a tụọ anya ihe ga-esochi. Ha abụghị otu ihe ahụ. Kpebie ụzọ kwesịrị ekwesị isi mee ya. Ma buru n’obi na e kwesịrị inwe nkwụsịtụ ndị e ji emesi okwu ike nanị maka okwu ndị dị mkpa n’ezie. Ma ọ bụghị otú ahụ, uru okwu ndị ahụ bara ga-efu ọhịa.

      Mgbe Jizọs gụpụtara ihe site n’Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret, o ji nkwụsịtụ mee ihe n’ụzọ dị irè. O bu ụzọ gụpụta ihe bụ́ ọrụ ya n’akwụkwọ mpịakọta nke Aịzaịa onye amụma. Otú ọ dị, tupu ọ kọwaa ya, ọ fụkọtara akwụkwọ mpịakọta ahụ, nyeghachi ya onye na-eje ozi wee nọdụ ala. Mgbe ahụ, ka ndị nile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ legidesiri ya anya ike, ọ sịrị: “Taa ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ a nke unu ka nụpụrụ mezuru.”—Luk 4:16-21.

      Nkwụsịtụ Mgbe Ọnọdụ Chọrọ Ya. Mgbe ụfọdụ mkpọtụ pụkwara ime ka ị kwụsịtụ okwu gị. Mkpọtụ nke ụgbọala na-agafe agafe ma ọ bụ nwatakịrị na-ebe ákwá pụrụ ime ka ọ dị mkpa na ị ga-akwụsịtụ mkparịta ụka gị na onye nwe ụlọ na-enwe, bụ́ onye i zutere n’ozi ubi. Ọ bụrụ na ụzụ e nwere n’ebe a na-enwe mgbakọ agabigaghị ókè, i nwere ike iwelikwu olu gị elu ma gaa n’ihu. Ma ọ bụrụ na ụzụ ahụ na-emesi ike ma dịtee aka, ị ghaghị ịkwụsịtụ. Ndị na-ege gị ntị agadịghị na-aṅa ntị. N’ihi ya, jiri nkwụsịtụ mee ihe n’ụzọ dị irè, iji nyere ndị na-ege gị ntị aka irite uru zuru ezu n’ezi ihe ndị ị chọrọ ịgwa ha.

      Kwụsịtụ Iji Nye Ohere Maka Nzaghachi: Ọ bụ ezie na ị pụrụ ịdị na-ekwu okwu nke na-enyeghị ohere ka ndị na-ege ntị na-etinye ọnụ na ya, ọ dị mkpa ka i kwe ka ndị na-ege ntị zaghachi, ọ bụghị ikwupụta ya ekwupụta, kama n’uche ha. Ọ bụrụ na ị jụọ ajụjụ ndị kwesịrị ime ka ndị na-ege gị ntị chee echiche ma ị kwụsịtụghị ruo otú o kwesịrị, ihe dị ukwuu n’abamuru nke ajụjụ ndị ahụ ga-efu ọhịa.

      Otú ọ dị, ọ dị mkpa ịkwụsịtụ, ọ bụghị nanị mgbe a nọ n’ikpo okwu na-ekwu okwu, kamakwa mgbe a na-agbara ndị ọzọ àmà. Ụfọdụ ndị yiri ka ha adịghị akwụsịtụ akwụsịtụ ma ọlị. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ nsogbu gị, mee ezigbo mgbalị iji zụlite nkà okwu a. Ị ga-eme ka nkwurịta okwu gị na ndị ọzọ ka mma, meekwa ka ozi gị n’ubi dịkwuo irè. Nkwụsịtụ bụ mkpirikpi oge nke idere duu, e kwuwokwa n’ụzọ bụ́ eziokwu na idere duu na-ekebi okwu, na-emesi ya ike, na-adọta uche, na-eme ka ntị dịghachi njikere ịnụ ihe.

      Mkparịta ụka a na-enwe kwa ụbọchị bụ mmadụ na mmadụ ịgwarịta ibe ha echiche ha. Ndị ọzọ na-enwe mmasị karị ige gị ntị ma ọ bụrụ na i gee ha ntị ma gosi mmasị n’ihe ha na-ekwu. Nke a na-achọ ka ị kwụsịtụ otú kwesịrị ekwesị iji nye ha ohere ikwu obi ha.

      N’ozi ubi, àmà anyị na-agba na-akakarị adị irè mgbe a gbara ya n’ụdị mkparịta ụka. Mgbe e kelerịtasịrị ekele, ọtụtụ Ndịàmà na-ahụ na ọ dị mma ikwu isiokwu ha, mgbe ahụzi jụọ otu ajụjụ. Ha na-akwụsịtụ iji nye onye nke ọzọ ohere ịzaghachi, mgbe ahụzi ha ekelee onye nwe ụlọ maka ihe o kwuru. Ná nkwurịta okwu ahụ, ha pụrụ inye onye nwe ụlọ ọtụtụ ohere ikwu okwu. Ha maara na, dị ka ọ na-adịkarị, ha pụrụ inyere mmadụ aka karị ma ọ bụrụ na ha mata ihe bụ́ echiche ya n’ihe ha na-ekwurịta.—Ilu 20:5.

      Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile ga-aza ajụjụ n’ụzọ dị mma. Ma nke ahụ egbochighị Jizọs ịkwụsịtụ otú kwesịrịnụ iji nye ọbụna ndị na-emegide ya ohere ikwu okwu. (Mak 3:1-5) Inye onye nke ọzọ ohere ikwu okwu ga-agba ya ume iche echiche, n’ihi nke ahụkwa, ọ pụrụ ikpughe ihe dị ya n’obi. N’eziokwu, otu n’ime nzube nke ozi anyị bụ ịkpasu ndị mmadụ iji obi ha zaghachi site n’iche n’ihu ha okwu ndị dị mkpa sitere n’Okwu Chineke bụ́ ndị ha na-aghaghị ime mkpebi na ha.—Hib. 4:12.

      Iji nkwụsịtụ kwesịrị ekwesị eme ihe n’ozi anyị bụ nkà n’ezie. Mgbe a na-akwụsịtụ n’ụzọ dị irè, a na-ekwupụta echiche okwu nke ọma karị, ọtụtụ mgbe a na-echetakwa ha ruo ogologo oge karị.

      ỤZỌ ISI MEE YA

      • Leruo anya n’ụzọ pụrụ iche n’akara edemede mgbe ị na-agụpụta ihe.

      • Ṅaa ndị ọkà okwu ruru eru ntị nke ọma, rịbakwa ama ebe ha na-akwụsịtụ na otú ha na-akwụsịru.

      • Mgbe i kwusịrị ihe ị chọrọ n’ezie ka ndị ọzọ cheta, kwụsịtụ ka ọ bamie ha n’obi.

      • Ná mkparịta ụka, gwa ndị ọzọ ka ha kwuo uche ha, mgbe ahụkwa ṅaa ntị ná nzaghachi ha. Chere ka ha kwuchaa. Anapụla ha okwu n’ọnụ.

      IHE OMUME: Gụpụta Mak 9:1-13; kwụsịtụ n’ebe ndị kwesịrị ekwesị n’ihi akara edemede dị iche iche. Adọla ihe ọgụgụ ahụ adọ. Mgbe ị mụgharịsịworo ya, gwa mmadụ ka o gee gị ntị ma tụọrọ gị aro iji meziwanye ihe n’otú i si akwụsịtụ.

  • Imesi Echiche Okwu Ike n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
    • IHE ỌMỤMỤ NKE 6

      Imesi Echiche Okwu Ike n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

      Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

      Mesie okwu na nkebi ahịrịokwu ike n’ụzọ ga-eme ka ọ dịrị ndị na-ege ntị mfe ịghọta echiche ndị a na-ewepụta.

      Gịnị mere o ji dị mkpa?

      Imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-enyere ọkà okwu aka ime ka ndị na-ege ya ntị nọgide na-ege ntị nakwa ime ka ha kwenye ma ọ bụ kpalie ha ime ihe.

      MGBE ị na-ekwu okwu ma ọ bụ na-agụpụta ihe, ọ dị mkpa, ọ bụghị nanị ka ị kpọzie mkpụrụ okwu akpọzi, kamakwa ka i mesie okwu ndị bụ́ isi na okwu ndị na-ewepụta echiche okwu ike n’ụzọ ga-ewepụta echiche dị na ha nke ọma.

      Imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-agụnye ihe karịrị imesikwu mkpụrụ okwu ole na ole ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ okwu ike. A ghaghị imesi okwu ndị kwesịrị ekwesị ike. Ọ bụrụ na e mesie okwu ndị na-ekwesịghị ekwesị ike, ihe okwu gị pụtara nwere ike ọ gaghị edo ndị na-ege gị ntị anya, bụ́ ndị pụkwara ikwe ka uche ha kpapụ gaa n’ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ihe ọmụma a na-ewepụta pụrụ ịdị mma, okwu a na-emesighị echiche okwu ike na ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị agaghị adịcha irè n’ịkpali ndị na-ege ntị.

      A pụrụ imesikwu okwu ike n’ọtụtụ ụzọ, bụ́ ndị a na-ejikarị ihe karịrị otu n’ime ha eme ihe n’otu oge ahụ: site n’iwelikwu olu elu, site n’ikpokwu ọkụ, site n’iji nnọọ nwayọọ kwuo okwu, site n’ịkwụsịtụ tupu ma ọ bụ mgbe e kwusịrị okwu (ma ọ bụ ha abụọ), site n’imegharị ahụ́ na ọdịdị ihu. N’asụsụ ụfọdụ, a pụkwara imesi okwu ike site n’iwetulata ụda olu ma ọ bụ iweli ọdịdị ụda olu elu. Tụlee ihe omume gị na ọnọdụ ndị dịnụ iji kpebie nke ga-akasị kwesị ekwesị.

      Mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-emesi ike, tụlee ihe ndị na-esonụ. (1) N’ahịrịokwu ọ bụla, ihe na-ekpebi okwu ndị e kwesịrị imesikwu ike abụghị nanị ihe ndị ọzọ e kwuru n’ahịrịokwu ahụ kamakwa ihe ndị e kwuru gburugburu ya. (2) A pụrụ iji imesi echiche okwu ike mee ka mmalite nke echiche ọhụrụ pụta ìhè, ma ọ̀ bụ isi ihe ma ọ bụ nanị mgbanwe echiche okwu. Ọ pụkwara ịdọrọ uche gaa ná ngwụsị nke otu arụmụka. (3) Ọkà okwu nwere ike imesi echiche okwu ike iji gosi ihe ọ na-eche banyere otu okwu. (4) A pụkwara imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji mee ka isi ihe ndị dị n’okwu pụta ìhè.

      Iji mesie echiche okwu ike n’ụzọ ndị a, ọkà okwu ma ọ bụ onye na-agụpụta ihe n’ihu ọha aghaghị ịghọta ihe omume ya nke ọma ma chọsie ike ka ndị na-ege ya ntị ghọta ya. Banyere ntụziaka e nyere n’oge Ezra, Nehemaịa 8:8 na-ekwu, sị: “Ha wee gụọ n’akwụkwọ ahụ, bụ́ n’iwu Chineke, gụpụta ya nke ọma, wee mee ka a mata isi ya, ha wee ghọta ọgụgụ ya.” O doro anya na ndị gụrụ ma kọwaa Iwu Chineke n’oge ahụ ghọtara mkpa ọ dị inyere ndị na-ege ha ntị aka ịghọta ihe ihe a gụrụ pụtara, icheta ya, na iji ya mee ihe.

      Ihe Pụrụ Ịkpata Nsogbu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-enwe ike eme ka ihe ha bu n’obi doo anya ná mkparịta ụka ha na-enwe kwa ụbọchị. Otú ọ dị, mgbe ha gụwara ihe onye ọzọ dere, ịmata okwu ha ga-emesi ike pụrụ isiri ha ike. Ọgwụ ya bụ ịghọta ihe omume ahụ nke ọma. Nke ahụ na-achọ iji nlezianya mụọ ihe e dere. Ya mere, ọ bụrụ na a gwa gị ka ị gụpụta ihe ná nzukọ ọgbakọ, i kwesịrị ịkwadebe nke ọma.

      Ụfọdụ ndị na-eme ihe a pụrụ ịkpọ “mmesi okwu ike site n’oge ruo n’oge” kama imesi echiche okwu ike. Ha na-emesi okwu ike n’ime ogologo oge a kapịrị ọnụ kpọmkwem ma imesi okwu ike dị otú ahụ ọ̀ bara uru ma ọ bụ na ọ baghị uru. Ndị ọzọ na-emesi mkpụrụ okwu ụfọdụ ike, ikekwe na-emesi mbuụzọ na okwu njikọ ike gabiga ókè. Mgbe imesi okwu ike na-adịghị enye aka n’ime ka echiche okwu doo anya, n’ụzọ dị mfe ọ na-aghọ àgwà maara mmadụ ahụ́ nke na-adọpụ uche.

      Ná mgbalị iji mesie echiche okwu ike, ndị ọkà okwu ụfọdụ na-eweli olu ha elu n’ụzọ pụrụ ime ka ndị na-ege ntị chee na a na-abara ha mba. Otú ọ dị, nke ahụ adịghị arụpụtakebe ihe dị mma. Ọ bụrụ na imesi echiche okwu ike adịghị otú o kwesịrị, ọ pụrụ ime ka e chee na ọkà okwu na-eleda ndị na-ege ya ntị anya. Lee ka ọ ga-esi ka nnọọ mma iji ịhụnanya kpalie ha ma nyere ha aka ịhụ na ihe a na-ekwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, bụrụkwa ihe ezi uche dị na ya!

      Ụzọ Isi Meziwanye Ihe. Ọtụtụ mgbe, onye imesi echiche okwu ike na-esiri ike adịghị ama. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka onye ọzọ gwa ya banyere ya. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i meziwanye ihe na nke a, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ gị ga-enyere gị aka. Ọzọ, i nweere onwe gị ịgwa onye ọzọ bụ́ ezi ọkà okwu ka o nyere gị aka. Gwa ya ka o gee ntị nke ọma n’ọgụgụ ihe gị na n’okwu gị nakwa ka ọ tụọrọ gị aro iji meziwanye ihe.

      Iji malite, onye ndụmọdụ gị pụrụ ịtụ aro ka i jiri otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche nwee mmụgharị ihe. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-agwa gị ka ị tụlee ahịrịokwu dị iche iche n’otu n’otu iji mata okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ndị dị mkpa ka e mesie ike iji mee ka ihe ọ pụtara dị mfe nghọta. Ọ pụrụ ichetara gị ka i leruo okwu ụfọdụ e dere n’aka akwụkwọ dị iche anya nke ọma. Cheta na mkpụrụ okwu ndị dị n’otu ahịrịokwu na-agakọ ọnụ. Mgbe mgbe, ọ bụ ìgwè okwu ka e kwesịrị imesi ike, ọ bụghị nanị otu mkpụrụ okwu. N’asụsụ ụfọdụ, a pụrụ ịgba ndị mmụta ume iji nlezianya lebakwuoro ihe akara ụda olu na-egosi banyere imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị anya.

      Dị ka nzọụkwụ ọzọ n’ịmụta ihe e kwesịrị imesi ike, onye ndụmọdụ gị pụrụ ịgba gị ume ka i chebara ihe gbara ya gburugburu echiche, bụ́ nke sara mbara karịa ahịrịokwu ahụ n’onwe ya. Olee echiche bụ́ isi a na-ewepụta na paragraf ahụ dum? Olee otú nke ahụ kwesịrị isi metụta ihe ị ga-emesi ike n’ahịrịokwu nke ọ bụla? Lee anya n’isiokwu ahụ nakwa n’isiokwu nta e dere n’aka akwụkwọ gbara okpotokpo bụ́ nke ihe ị na-agụ dị n’okpuru ya. Olee otú ha si emetụta okwu ndị ị ga-ahọrọ imesi ike? Ihe ndị a nile bụ ihe a ga-echebara echiche. Ma lezie anya ka ị ghara imesi ọtụtụ okwu ike karịa otú o kwesịrị.

      Ma ị̀ ga-ekwu okwu n’agụghị ya agụ ma ị ga-agụ ihe, onye ndụmọdụ gị pụkwara ịgba gị ume ka i mee ka ọ bụrụ arụmụka ị na-ewepụta ga-ekpebi echiche okwu ị na-emesi ike. Ọ dị mkpa ka ị mara ebe otu arụmụka jedebere ma ọ bụ ebe ihe omume ahụ si n’otu echiche dị mkpa gafere n’ọzọ. Ọ ga-amasị ndị na-ege gị ntị ma ọ bụrụ na okwu gị emee ka ha mara ebe ndị a. A pụrụ ime nke a site n’imesi okwu ndị dị ka nke mbụ, ọzọ, n’ikpeazụ, otú a, na n’ụzọ ezi uche dị na ya, ike.

      Onye ndụmọdụ gị ga-adọrọkwa uche gị gaa n’echiche okwu ndị i kwesịrị iji mmetụta pụrụ iche kwuo. Iji mee nke a, ị pụrụ imesi okwu ndị dị ka nnọọ, n’ezie, ọ dịghị ma ọlị, ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche, dị mkpa, na mgbe nile, ike. Gị ime otú ahụ pụrụ inwe mmetụta n’ihe ndị na-ege gị ntị na-eche banyere ihe ị na-ekwu. A ga-ekwukwu okwu banyere nke a n’Ihe Ọmụmụ nke 11, “Jiri Mmetụta Kwuo Okwu.”

      Ka i wee mee ka otú i si emesi echiche okwu ike ka mma, a ga-agbakwa gị ume iburu n’uche nke ọma isi ihe ndị ị chọrọ ka ndị na-ege gị ntị cheta. A ga-atụlekwu nke a n’ihe metụtara ịgụ ihe n’ihu ọha n’Ihe Ọmụmụ nke 7, “E Mesiri Echiche Ndị Bụ́ Isi Ike,” nakwa n’ihe metụtara ikwu okwu, n’Ihe Ọmụmụ nke 37, “E Mere Ka Ihe Ndị Bụ́ Isi Ihe Pụta Ìhè.”

      Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ime ka ozi ubi gị ka mma, lebara otú i si agụ Akwụkwọ Nsọ anya nke ọma. Mee ka ọ mara gị ahụ́ ịjụ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere m ji na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ a?’ Nye onye na-ezi ihe, nanị ịkpọ okwu otú kwesịrị ekwesị adịghị ezu mgbe nile. Ọbụna iji mmetụta gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ nwere ike ọ gaghị ezu. Ọ bụrụ na ị na-aza ajụjụ mmadụ jụrụ ma ọ bụ na-akụzi otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, ọ dị mma imesi mkpụrụ okwu ma ọ bụ ahịrịokwu ndị na-akwado ihe a na-atụle bụ́ ndị dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ike. Ma ọ́ bụghị ya, onye ị na-agụrụ ihe nwere ike ọ gaghị aghọta isi ihe ị na-ekwu.

      Ebe imesi echiche okwu ike na-agụnye imesikwu okwu na nkebi ahịrịokwu ụfọdụ ike, ọkà okwu na-enwebeghị ahụmahụ pụrụ imesi okwu na nkebi ahịrịokwu ndị ahụ ike gabiga ókè. Ihe ndị ga-esi na ya pụta ga-eyitewe ụda nke onye ka malitere ịmụ otú e si akpọ ngwá egwú amụ na-akpọpụta. Otú ọ dị, ọ mụtụkwuo ya, “ụda” nke ọ bụla ga-eso bụrụ “egwú” dị ụtọ.

      Mgbe ị mụtaworo ụfọdụ ihe ndị bụ́ isi, ị ga-enwe ike irite uru site n’ileru ndị ọkà okwu nweworo ahụmahụ anya. N’oge na-adịghị anya, ị ga-abịa ghọta ihe a pụrụ iji ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche nke imesi okwu ike rụzuo. Ị ga-aghọtakwa uru ọ bara bụ́ imesi okwu ike n’ụzọ dịgasị iche iche iji mee ka ihe ihe a na-ekwu pụtara doo anya. Ịzụlite nkà nke imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-eme ka ihe ọgụgụ na okwu gị dịkwuo irè nke ukwuu.

      Amụtala imesi echiche okwu ike nanị iji lafere. Iji na-ekwu okwu n’ụzọ dị irè, nọgide na-arụ ọrụ na ya ruo mgbe ị mụtara imesi echiche okwu ike nke ọma, nweekwa ike iji ya na-eme ihe n’ụzọ ga na-ada ná ntị ndị ọzọ ka otú i si ekwu okwu.

      ỤZỌ ISI ZỤLITE YA

      • Mụọ otú e si achọpụta okwu na ìgwè okwu ndị bụ́ isi dị n’ahịrịokwu. Chebara ime nke a echiche n’ụzọ pụrụ iche dabere n’ihe a na-ekwu maka ya.

      • Nwalee iji imesi okwu ike gosi (1) mgbanwe nke echiche okwu (2) ihe ị na-eche banyere ihe ị na-ekwu.

      • Mgbe ị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, mee ka ọ mara gị ahụ́ imesi ike okwu ndị na-akwado kpọmkwem ihe mere i ji zoo aka n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ.

      IHE OMUME: (1) Họrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ ị na-ejikarị eme ihe n’ozi ubi. Kpebie ihe ị na-agba mbọ iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ọ bụla gosipụta. Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ n’ụzọ ga-emesi okwu ma ọ bụ ìgwè okwu ndị na-akwado isi ihe ndị ahụ ike. (2) Mụọ Ndị Hibru 1:1-14. Gịnị mere a na-aghaghị iji mesie okwu bụ́ “ndị amụma” (Hib 1 amaokwu nke 1), “Ọkpara” (Hib 1 amaokwu nke 2), na “ndị mmụọ ozi” (Hib 1 amaokwu nke 4, 5) ike n’ụzọ pụrụ iche iji wepụta echiche dị n’isiakwụkwọ a n’ụzọ doro anya? Mụgharịa iji imesi echiche okwu ike nke ga-eme ka echiche ahụ pụta ìhè gụpụta isiakwụkwọ ahụ.

  • E Mesiri Echiche Ndị Bụ́ Isi Ike
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
    • IHE ỌMỤMỤ NKE 7

      E Mesiri Echiche Ndị Bụ́ Isi Ike

      Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

      Mgbe ị na-agụpụta ihe, mesie echiche ndị bụ́ isi n’ihe ahụ dum ị na-agụ ike, ọ bụghị nanị ahịrịokwu dị iche iche n’otu n’otu.

      Gịnị mere o ji dị mkpa?

      Ọ ga-aka mfe icheta ozi gị ma ọ bụrụ na i mesie echiche ndị bụ́ isi ike.

      ONYE na-agụ ihe nke ọma na-ele anya gabiga ahịrịokwu ahụ ọ na-agụ, ọbụna gabiga paragraf ọ dị na ya. Mgbe ọ na-agụ ihe, ọ na-eburu echiche ndị bụ́ isi dị n’ihe ahụ dum ọ na-agụ n’uche. Nke a na-emetụta okwu ọ na-emesi ike.

      Ọ bụrụ na a gbasoghị usoro a, a gaghị enwe ihe ndị kwesịrị ịrịba ama dị n’okwu ahụ. Ọ dịghị ihe ga-apụta ìhè nke ọma. E mesịa ihe omume ahụ, ọ pụrụ isi ike icheta ihe ọ bụla dị ka ihe kwesịrị ịrịba ama.

      Ichebara imesi echiche ndị bụ́ isi ike echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụrụ ọtụtụ mgbe ịtụnye ụtụ dị ukwuu n’ime ka ọgụgụ nke otu ihe ndekọ Bible ka mma. Mmesi okwu ike dị otú ahụ pụrụ ime ka a gụpụta paragraf dị iche iche n’ọmụmụ Bible ebe obibi ma ọ bụ ná nzukọ ọgbakọ n’ụzọ ga-ekwe nghọta. Ọ dịkwa mkpa karịsịa mgbe mmadụ na-ekwu okwu a na-agụ agụ, dị ka a na-eme mgbe ụfọdụ ná mgbakọ anyị.

      Ụzọ Isi Mee Ya. N’ụlọ akwụkwọ, a pụrụ ikenye gị ịgụ otu akụkụ na Bible. Gịnị ka e kwesịrị imesi ike? Ọ bụrụ na e nwere echiche bụ́ isi ma ọ bụ ihe dị mkpa merenụ bụ́ ihe ihe ị ga-agụ hiwere isi na ya, ọ ga-ekwesị ekwesị ime ka ọ pụta ìhè.

      Ma akụkụ ị ga-agụ ọ̀ bụ abụ uri ma ọ bụ ihe ọgụgụ nkịtị, ilu ma ọ bụ akụkọ, ndị na-ege gị ntị ga-erite uru ma ị gụọ ya nke ọma. (2 Tim. 3:16, 17) Iji mee nke a, ị ghaghị ichebara ma ebe ndị ị gaje ịgụ ma ndị ga-ege gị ntị echiche.

      Ọ bụrụ na ị gaje ịgụpụta ihe dị n’akwụkwọ n’oge a na-enwe ọmụmụ Bible ma ọ bụ ná nzukọ ọgbakọ, olee echiche ndị bụ́ isi ndị ọ dị mkpa ka i mesie ike? Were azịza nke ajụjụ ndị e biri ebi dịịrị ọmụmụ dị ka echiche ndị bụ́ isi. Ọzọkwa, mesie echiche ndị metụtara isiokwu nta e dere n’aka akwụkwọ gbara okpotokpo ike bụ́ nke ihe ị na-agụ dị n’okpuru ya.

      Ọ dịghị mma ime ka ọ mara gị ahụ́ iji ihe odide a na-agụ agụ wee na-ekwu okwu n’ọgbakọ. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ a na-enye ihe odide a na-agụ agụ maka okwu ụfọdụ a ga-ekwu ná mgbakọ ka e wee wepụta otu echiche ahụ n’otu ụzọ ahụ ná mgbakọ nile. Iji mesie echiche ndị bụ́ isi dị n’okwu dị otú ahụ a na-agụ agụ ike, ọkà okwu aghaghị ibu ụzọ nyochaa ihe ọgụgụ ahụ nke ọma. Olee ihe ndị bụ́ isi ihe? O kwesịrị inwe ike ịmata ha. Ihe ndị bụ́ isi ihe abụghị nanị echiche ndị o chere na ha na-akpali mmasị. Ha bụ echiche ndị gbara ọkpụrụkpụ ndị ihe ọgụgụ ahụ na-akọwapụta. Mgbe ụfọdụ, a na-ekwu okwu dị nkenke nke na-ewepụta echiche bụ́ isi dị n’okwu ahụ a ga-agụ agụ ná mmalite nke otu akụkọ ma ọ bụ arụmụka. Ọtụtụ mgbe, a na-ekwu okwu gbara ọkpụrụkpụ mgbe e nyesịworo ihe àmà na-akwado ya. Mgbe a mataworo isi ihe ndị a, ọkà okwu kwesịrị ịkanye akara na ha n’ihe odide ahụ ọ ga-agụ. Ha na-adịkarị ole na ole, ma eleghị anya ha agaghị akarị anọ ma ọ bụ ise. Ọzọ, ọ dị ya mkpa ịmụgharị ịgụ ya n’ụzọ ga-eme ka ndị ga-ege ntị mata ha ngwa ngwa. Ha bụ ihe ndị bụ́ isi n’okwu ahụ. Ọ bụrụ na e jiri mmesi okwu ike kwesịrị ekwesị kwuo okwu ahụ, o yikarịrị ka a ga-echeta echiche ndị a bụ́ isi. Nke ahụ kwesịrị ịbụ ihe mgbaru ọsọ ọkà okwu.

      E nwere ọtụtụ ụzọ ọkà okwu pụrụ isi mesie okwu ike, bụ́ nke dị mkpa iji nyere ndị na-ege ntị aka ịmata ihe ndị bụ́ isi ihe. O nwere ike iji ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu, mgbanwe n’otú o si ekwu okwu ọsọ ọsọ, itinyekwu mmetụta, ma ọ bụ mmegharị ahụ́ kwesịrị ekwesị, mee ihe, ka anyị kpọọ nanị ole na ole.

      ISI IHE NDỊ A GA-EBURU N’UCHE

      • Nyochaa ihe ahụ e biri ebi iji mata echiche ndị bụ́ isi o hiwere isi na ya. Kanye ha akara.

      • Mgbe ị na-agụpụta ihe, mee ka echiche ndị ahụ bụ́ isi pụta ìhè site n’itinye ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu, ijirikwu nwayọọ, ma ọ bụ itinyekwu mmetụta, dị ka o si kwesị ekwesị.

      IHE OMUME: Họpụta paragraf ise n’isiokwu Ụlọ Nche e dokwara maka ọmụmụ. Kanye akara n’okpuru azịza nke ajụjụ ndị dịịrị ọmụmụ na paragraf ndị ahụ. Gụpụta paragraf ndị ahụ agụpụta n’ụzọ ga-eme ka ọ dịrị onye na-ege ntị mfe ịmata azịza ha.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya