Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 1 p. 10-15
  • Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Onye Ozizi Ukwu ahụ Jeere Ndị Ọzọ Ozi
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Gee Jehova Ntị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 1 p. 10-15

ISI NKE 1

Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu

IHE karịrị puku afọ abụọ gara aga, a mụrụ otu nwatakịrị nke pụrụ nnọọ iche, onye tolitere ghọọ nwoke kasị ukwuu nke dịtụworo ndụ. Ọ dịghị onye dị ndụ n’oge ahụ nke nwere ụgbọelu ma ọ bụ ụgbọala. E nweghị ihe ndị dị ka telivishọn, kọmputa, na redio.

A kpọrọ nwatakịrị ahụ Jizọs. Ọ ghọrọ nwoke kasị mara ihe nke dịtụworo ndụ n’ụwa. Jizọs ghọkwara onye ozizi kasị mma. Ọ kọwara ihe ndị siri ike n’ụzọ mere ka ha dị mfe nghọta.

Jizọs kụziiri ndị mmadụ ihe n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ha. Ọ kụziiri ha ihe n’ụsọ oké osimiri nakwa n’ime ụgbọ mmiri. Ọ kụziiri ha ihe n’ụlọ ha na mgbe ọ na-eme njem. Jizọs enweghị ụgbọala, ọ baghịkwa bọs ma ọ bụ ụgbọ okporo ígwè. Jizọs ji ụkwụ gaa ebe dị iche iche, na-ezi ndị mmadụ ihe.

Anyị na-amụta ọtụtụ ihe n’aka ndị ọzọ. Ma anyị pụrụ ịmụta ihe ndị kasị mkpa site n’aka Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs. Ọ bụ n’ime Bible ka ihe ndị Jizọs kwuru dị. Mgbe anyị na-anụ ihe ndị ahụ e kwuru n’ime Bible, ọ bụ otu ihe ahụ dị ka Jizọs ịgwa anyị okwu.

Gịnị mere Jizọs ji bụrụ Onye Ozizi Ukwu otú a? Otu ihe kpatara ya bụ na e ziri Jizọs n’onwe ya ihe. Ọ makwaara otú ige ntị dịruru ná mkpa. Ma, ònye ka Jizọs gere ntị? Ònye ziri ya ihe?— Ọ bụ Nna ya. Ọ bụkwa Chineke bụ Nna Jizọs.

Tupu ya abịa n’ụwa dị ka mmadụ, Jizọs na Chineke biri n’eluigwe. Ya mere, Jizọs dị iche ná ndị mmadụ ndị ọzọ n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọzọ bitụrụ n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa. N’eluigwe, Jizọs bụ ezigbo Nwa, onye gere Nna ya ntị. N’ihi ya, Jizọs nwere ike ịkụziri ndị mmadụ ihe ọ mụtara site n’aka Chineke. Site n’ige nne gị na nna gị ntị, ị pụrụ iṅomi Jizọs.

Ihe ọzọ mere Jizọs ji bụrụ Onye Ozizi Ukwu bụ na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ọ chọrọ inyere ndị mmadụ aka ịmụta banyere Chineke. Jizọs hụrụ ndị okenye n’anya, ma ọ hụkwara ụmụaka n’anya. Ụmụaka na-enwekwa mmasị iso Jizọs nọrọ n’ihi na ọ ga na-agwa ha okwu ma na-ege ha ntị.

[Foto dị na peeji nke 11]

Gịnị mere ụmụaka ji enwe mmasị ka ha na Jizọs nọrọ?

Otu ụbọchị, ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ kpọọrọ ụmụ ha bịakwute Jizọs. Ma ndị enyi ya chere na Onye Ozizi Ukwu ahụ enweghị ohere iso ụmụaka kwurịta okwu. Ya mere, ha gwara ha ka ha lawa. Ma, gịnị ka Jizọs kwuru?— Jizọs sịrị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu anwala igbochi ha.” Ee, Jizọs chọrọ ka ụmụaka ahụ bịakwute ya. Ya mere, n’agbanyeghị na ọ bụ nwoke maara ihe nakwa oké mmadụ, Jizọs wepụtara oge iji kụziere ụmụaka ihe.—Mak 10:13, 14.

Ị̀ ma ihe mere Jizọs ji kụziere ụmụaka ihe ma gee ha ntị? Otu ihe kpatara ya bụ na ọ chọrọ ime ka ha nwee obi ụtọ site n’ịkọrọ ha ihe dị iche iche banyere Chineke, bụ́ Nna ya nke eluigwe. Olee otú ị pụrụ isi mee ka ndị mmadụ nwee obi ụtọ?— Ọ bụ site n’ịkọrọ ha ihe ndị ị mụtaworo banyere Chineke.

N’otu oge, Jizọs ji otu obere nwa kụziere ndị enyi Ya otu ihe dị mkpa. Ọ kpọọrọ nwatakịrị ahụ wee kwụwa ya n’etiti ndị na-eso ụzọ Ya, bụ́ ụmụazụ Ya. Mgbe ahụ, Jizọs kwuru na ndị toruworo ogo mmadụ aghaghị ịgbanwe omume ha ma dịzie ka obere nwa a.

[Foto dị na peeji nke 12]

Olee ihe ụmụaka ndị tolitetụworonụ na ndị toruworo ogo mmadụ pụrụ ịmụta site n’aka obere nwa?

Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru nke a? Ị̀ ma otú dimkpa mmadụ, ma ọ bụ ọbụna nwata tolitetụworo etolite, kwesịrị isi dị ka obere nwa?— Obere nwa amarughị ihe ka onye toruworo ogo mmadụ, ọ na-adịkwa njikere ịmụta ihe. Ya mere, Jizọs na-ekwu na ọ dị mkpa ka ndị na-eso ụzọ ya dị umeala n’obi, otú obere ụmụaka dị. Ee, anyị nile pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site n’aka ndị ọzọ. Anyị nile kwesịkwara ịghọta na ihe ndị Jizọs kụziri dị mkpa karịa echiche nke anyị.—Matiu 18:1-5.

Ihe ọzọ mere Jizọs ji bụrụ Onye Ozizi Ukwu otú a bụ na ọ ma ụzọ isi mee ka ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ. Ọ kọwara ihe n’ụzọ dị mfe ma doo anya. O kwuru okwu banyere ụmụ nnụnụ na okooko osisi na ihe nkịtị ndị ọzọ iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe banyere Chineke.

Otu ụbọchị, mgbe Jizọs nọ n’akụkụ ugwu, ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Jizọs nọdụrụ ala ma gwa ha okwu dị ka ị pụrụ ịhụ n’ebe a. A na-akpọ okwu a Ozizi Elu Ugwu. Ọ sịrị: ‘Leenụ nnụnụ ndị na-efe n’eluigwe anya. Ha adịghị akụ mkpụrụ. Ha adịghị akwakọba ihe oriri n’ụlọ nkwakọba ihe. Ma Chineke nke bi n’eluigwe na-enye ha ihe oriri. Ọ̀ bụ na unu akarịghị ha?’

[Foto dị na peeji nke 13]

Olee ihe mmụta Jizọs nọ na-akụzi mgbe o kwuru okwu banyere ụmụ nnụnụ na okooko osisi?

Jizọs kwukwara, sị: ‘Mụtanụ ihe site n’okooko lili ndị dị n’ọhịa. Ha na-eto n’arụghị ọrụ. Lee otú ha si maa mma! Ọbụna Eze Solomọn bara ọgaranya eyighị uwe mara mma karịa okooko lili ndị dị n’ọhịa. Ya mere, ọ bụrụ na Chineke na-elekọta okooko osisi ndị na-etonụ, ọ̀ bụ na ọ gaghịkwa elekọta unu?’—Matiu 6:25-33.

Ị̀ ghọtara ihe mmụta dị n’ihe Jizọs na-akụzi?— Ọ chọghị ka anyị na-echegbu onwe anyị banyere ebe anyị ga-esi nweta ihe anyị ga-eri ma ọ bụ uwe anyị ga-eyi. Chineke ma na ihe ndị ahụ nile dị anyị mkpa. Jizọs asịghị na anyị ekwesịghị ịrụ ọrụ iji nweta ihe oriri na uwe. Kama ọ sịrị na anyị kwesịrị ikwe ka Chineke bute ụzọ. Ọ bụrụ na anyị emee nke ahụ, Chineke ga-ahụ na anyị nwetara ihe anyị ga-eri na uwe anyị ga-eyi. Ì kwere?—

Mgbe Jizọs kwusịrị okwu, gịnị ka ndị ahụ chere?— Bible na-ekwu na otú o si zie ha ihe juru ha anya. Ige ya ntị na-atọ ụtọ nke ukwuu. Ihe o kwuru nyeere ndị mmadụ aka ime ihe ziri ezi.—Matiu 7:28.

Ya mere, ọ dị oké mkpa ka anyị mụta ihe n’aka Jizọs. Ị̀ ma otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?— E detuuru anyị ihe ndị o kwuru n’otu akwụkwọ. Ị̀ ma akwụkwọ ọ bụ?— Ọ bụ Bible Nsọ. Nke a pụtara na anyị pụrụ ige Jizọs ntị site n’irube isi n’ihe ndị anyị na-agụta na Bible. N’ezie, Bible nwere akụkọ na-atọ ụtọ banyere otú Chineke n’onwe ya si gwa anyị ka anyị gee Jizọs ntị. Ka anyị lee ihe merenụ.

Otu ụbọchị, Jizọs kpọọrọ mmadụ atọ n’ime ndị enyi ya rịgoro n’elu otu ugwu. Aha ha bụ Jems, Jọn, na Pita. Ka oge na-aga, anyị ga-amụtakwu ọtụtụ ihe banyere ndị ikom a ebe ọ bụ na ha atọ bụcha ezigbo ndị enyi Jizọs. Ma, n’oge a pụrụ iche, ihu Jizọs malitere igbuke egbuke. Uwe ya malitekwara inwu enwu dị ka ìhè, dị ka ị pụrụ ịhụ n’ebe a.

[Foto dị na peeji nke 14]

“Onye a bụ Ọkpara m . . . Geenụ ya ntị”

Ka e mesịrị, Jizọs na ndị enyi ya nụrụ otu olu si n’eluigwe. Olu ahụ kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; geenụ ya ntị.” (Matiu 17:1-5) Ị̀ ma onye nwe olu ahụ?— Ọ bụ olu Chineke! Ee, ọ bụ Chineke kwuru na ha kwesịrị ige Ọkpara ya ntị.

Olee banyere anyị taa? Ànyị ga-erubere Chineke isi wee gee Ọkpara ya, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ ntị?— Nke ahụ bụ ihe ọ dị mkpa ka anyị nile mee. Ì chetara otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?—

Ee, anyị pụrụ ige Ọkpara Chineke ntị site n’ịgụ ihe ndekọ Bible banyere ndụ ya. E nwere ọtụtụ ihe magburu onwe ha Onye Ozizi Ukwu ahụ ga-akọrọ anyị. Ị ga-enwe obi ụtọ ịmụta ihe ndị a e dere n’ime Bible. Ị ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ bụrụ na ị kọọrọ ndị enyi gị ihe ọma ndị ị na-amụta.

Iji matakwuo ezi ihe ndị ọzọ na-abịa site n’ige Jizọs ntị, sapee Bible gị ma gụọ Jọn 3:16; 8:28-30; nakwa Ọrụ 4:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya