Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Alụmdi na Nwunye Bụ Onyinye Chineke Nwere Ịhụnanya Nyere Anyị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
    • Di na nwunye obi dị ụtọ

      ISI NKE IRI

      Alụmdi na Nwunye Bụ Onyinye Chineke Nwere Ịhụnanya Nyere Anyị

      “Ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ, a pụghị ịdọbi ya ngwa ngwa.”—EKLIZIASTIS 4:12.

      1, 2. (a) N’ihe gbasara ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ, gịnị ka anyị nwere ike iche echiche banyere ya mgbe ụfọdụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’Isi nke Iri a?

      Ọ̀ NA-ATỌ gị ụtọ ịga agbamakwụkwọ? Ọ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ, n’ihi na ememme ndị dị otú ahụ na-atọ ezigbo ụtọ. Ị ga-ahụ nwoke na nwaanyị chọrọ ịgba akwụkwọ ebe ha yi uwe mara mma. I lee ha anya n’ihu, ị ga-ahụ na obi dị ha ụtọ. N’ụbọchị ahụ, ha na-achị naanị ọchị, ya eyie ka ha agaghị enwe nsogbu ọ bụla n’ọdịnihu.

      2 N’agbanyeghị nke ahụ, o doro anya na alụmdi na nwunye nọ n’ọgba aghara taa n’ọtụtụ ụzọ. Ọ bụ ezie na anyị na-atụ anya ka ihe dịrị ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ mma, anyị nwere ike iche echiche mgbe ụfọdụ, sị: ‘À ga-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye a? Alụmdi na nwunye a ọ̀ ga-adịgide?’ Azịza nke ajụjụ ndị ahụ ga-adabere ma di na nwunye ahụ hà tụkwasịrị Chineke obi ma na-eji ndụmọdụ o nyere banyere alụmdi na nwunye na-ebi ndụ. (Ilu 3:5, 6) Ha kwesịrị ime otú ahụ ma ọ bụrụ na ha ga-anọrọ n’ịhụnanya Chineke. Ka anyị lekwasị anya ugbu a n’otú Baịbụl si zaa ajụjụ anọ ndị a: Gịnị mere ị ga-eji lụọ di ma ọ bụ nwunye? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ònye ka ị ga-alụ? Olee otú ị ga-esi akwadebe maka ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Gịnị ga-enyere di na nwunye aka ịna-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha?

      GỊNỊ MERE E JI ALỤ DI MA Ọ BỤ NWUNYE?

      3. Gịnị mere o ji bụrụ ihe na-abaghị uru ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’ihi ihe na-enweghị isi na ọdụ?

      3 Ụfọdụ ndị kweere na ọ bụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ—na mmadụ agaghị enwe obi ụtọ ma ọ bụ ọṅụ ná ndụ ya, ọ gwụla ma ọ̀ lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Nke ahụ bụ okpookpo ụgha! Jizọs, bụ́ nwoke na-alụghị nwaanyị, kwuru na alụghị di ma ọ bụ nwunye bụ onyinye. Ọ gbakwara ndị ga-emeli ya ume ka ha mee otú ahụ. (Matiu 19:11, 12) Pọl onyeozi kwukwara uru alụghị di ma ọ bụ nwunye bara. (1 Ndị Kọrịnt 7:32-38) Ma Jizọs ma Pọl enyeghị iwu ka mmadụ nọrọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye; n’ezie, ‘ịmachibido ịlụ di na nwunye iwu’ so ‘n’ozizi ndị mmụọ ọjọọ.’ (1 Timoti 4:1-3) N’agbanyeghị nke ahụ, alụghị di ma ọ bụ nwunye na-eme ka mmadụ nwee ohere buru ibu ijere Jehova ozi n’enweghị ihe ga-adọpụ ya uche. N’ihi ya, ọ gaghị abara mmadụ uru ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’ihi ihe na-enweghị isi na ọdụ, di ka ịlụ n’ihi na ndị ọgbọ ya alụọla.

      4. Olee ntọala ezigbo alụmdi na nwunye na-atọ maka ịzụlite ụmụaka?

      4 N’aka nke ọzọ, è nwere ezi ihe mere anyị ga-eji lụọ di ma ọ bụ nwunye? Ee. Alụmdi na nwunye bụkwa onyinye Chineke nwere ịhụnanya nyere anyị. (Jenesis 2:18) N’ihi ya, ọ bara uru, nweekwa ike ime ka mmadụ nweta obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, ezigbo alụmdi na nwunye bụ ntọala kasị mma maka ndụ ezinụlọ. Ụmụaka chọrọ ezigbo ebe obibi na nne na nna ndị ga-azụlite ha, hụ ha n’anya, nye ha ọzụzụ ma duzie ha. (Abụ Ọma 127:3; Ndị Efesọs 6:1-4) Ma, ịzụlite ụmụaka abụghị naanị ihe mere mmadụ ga-eji lụọ di ma ọ bụ nwunye.

      5, 6. (a) Dị ka e kwuru n’Ekliziastis 4:9-12, olee ụfọdụ uru ndị a na-ahụ anya mmadụ na mmadụ ịbụ ezigbo enyi bara? (b) Olee otú alụmdi na nwunye si yie ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ?

      5 Chee echiche banyere amaokwu Baịbụl isiokwu a dabeere na ya nakwa ihe a na-ekwu maka ya, nke bụ́: “Abụọ dị mma karịa otu, n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike ha. N’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya. Ma olee otú ọ ga-adịrị otu onye nke ọ bụ naanị ya, bụ́ onye dara mgbe a na-enweghị onye ọzọ ga-ekulite ya? Ọ bụrụkwa na mmadụ abụọ edinakọọ, ahụ́ ga-ekporo ha ọkụ; ma olee otú ahụ́ ga-esi kporo naanị otu onye ọkụ? Ọ bụrụkwa na mmadụ pụrụ imeri onye ọ bụ naanị ya, mmadụ abụọ gbakọrọ aka pụrụ iguzogide ya. Ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ, a pụghị ịdọbi ya ngwa ngwa.”—Ekliziastis 4:9-12.

      6 Isi ihe a na-ekwu banyere ya n’ebe ahụ bụ uru ịbụ enyi bara. N’ezie, ọ dịghị ịbụ enyi karịrị alụmdi na nwunye. Dị ka amaokwu ndị ahụ gosiri, njikọ ahụ nwere ike ime ka mmadụ nweta enyemaka, nkasi obi na nchebe. Alụmdi na nwunye na-esi ike karịchaa ma ọ bụrụ na ọ bụghị njikọ nke naanị mmadụ abụọ. Dị ka amaokwu Baịbụl a si kwuo, e nwere ike ịdọbi ụdọ abụọ a tụkọtara ọnụ. Ma, ọ ga-esi ike karị ịdọbi ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ. Ọ bụrụ na ime ihe dị Jehova mma bụ ihe dị di na nwunye oké mkpa, alụmdi na nwunye ha ga-adị ka ụdọ atọ ahụ a tụkọtara ọnụ. Jehova bụ onye nke atọ n’alụmdi na nwunye ahụ, n’ihi ya, ọ ga-esi nnọọ ike.

      7, 8. (a) Olee ndụmọdụ Pọl dere maka Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, bụ́ ndị ha na agụụ mmekọahụ na-alụ? (b) Olee otú Baịbụl si gosi na alụmdi na nwunye abụghị agwọ e ji akpụka mma egbu?

      7 Ọ bụ naanị n’alụmdi na nwunye ka mmadụ nwere ike inwe mmekọahụ kwesịrị ekwesị nke na-agụ ya. N’alụmdi na nwunye, a na-ele mmekọahụ anya n’ezie dị ka ihe na-enye obi ụtọ. (Ilu 5:18) Mgbe onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye gaferela ihe Baịbụl kpọrọ “oge ntoju ntorobịa,” ya bụ, mgbe agụụ mmekọahụ na-amalite ịgụsi ya ike, o nwere ike ịbụ na ya na agụụ mmekọahụ ka na-alụ. Ọ bụrụ na o jideghị onwe ya, agụụ dị otú ahụ nwere ike iduba ya n’omume na-adịghị ọcha ma ọ bụ n’omume na-ezighị ezi. E nyere Pọl ike mmụọ nsọ ide ndụmọdụ a maka ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, sị: “Ọ bụrụ na ha enweghị njide onwe onye, ka ha lụọ di ma ọ bụ nwunye, n’ihi na ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwunye kama ịbụ onye agụụ mmekọahụ na-agụgbu.”—1 Ndị Kọrịnt 7:9, 36; Jems 1:15.

      8 N’agbanyeghị ihe mere mmadụ ji kpebie ịlụ di ma ọ bụ nwunye, o kwesịrị ịma na ọ bụghị agwọ e ji akpụka mma egbu. Dị ka Pọl si kwuo ya, ndị lụrụ di na nwunye “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Ndị Kọrịnt 7:28) Ndị lụrụ di na nwunye na-enwe nsogbu ndị na-alụghị di na nwunye na-anaghị enwe. Ma, ọ bụrụ na ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, olee otú ị ga-esi belata nsogbu ị ga-enwe n’alụmdi na nwunye ma nwetakwuo obi ụtọ? Otu n’ime ihe ị ga-eme bụ ịsa anya na mmiri họrọ onye ị ga-alụ.

      OLEE OTÚ Ị GA-ESI AMATA ONYE GA-ABỤ EZIGBO DI MA Ọ BỤ NWUNYE?

      9, 10. (a) Olee ihe atụ Pọl ji gosi nsogbu mmadụ ga-enwe ma ọ lụọ onye na-ekweghị ekwe? (b) Gịnị ka ileghara ndụmọdụ Chineke nyere anya ka anyị ghara ịlụ onye na-ekweghị ekwe na-akpatakarị?

      9 E nyere Pọl ike mmụọ nsọ ide ụkpụrụ dị mkpa onye na-achọ onye ọ ga-alụ kwesịrị iso. O dere, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ.” (2 Ndị Kọrịnt 6:14) Ihe o ji mee ihe atụ ahụ bụ ihe a na-eme n’ịkọ ugbo. Ọ bụrụ na e jikọta anụmanụ abụọ na-ahaghị n’ibu na n’ike na-akọ ugbo, ha abụọ ga-ahụsi anya. N’otu aka ahụ, o doro anya na ọ bụrụ na e jikọta onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe n’alụmdi na nwunye, ọ ga-abụ ọgụ na mgba. Ọ bụrụ na otu n’ime ha achọọ ịnọrọ n’ịhụnanya Jehova, ma onye nke ọzọ achọdịghị ịma, ihe ha na-ebute ụzọ ná ndụ agaghị abụ otu, o nwere ike ime ka ahụ́ na-agbakasị ha. Ọ bụ ya mere Pọl ji gbaa Ndị Kraịst ume ka ha lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrịnt 7:39.

      10 Mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-ekpebi na nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ ga-aka owu na-ama ha ugbu a mma. Ụfọdụ na-ekpebi ileghara ndụmọdụ Baịbụl anya ma gaa lụọ onye na-anaghị efe Jehova. Mgbe mgbe, ọ na-aghọ ha ahịa. Ndị dị otú ahụ na-aga lụọ ndị ha na ha na-enweghị ike ikwurịta ihe kacha mkpa ná ndụ. Owu nke na-ama ha mgbe ha lụchara nwere ike ịkarị nnọọ nke na-ama ha mgbe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụ ihe obi ụtọ na e nwere ọtụtụ puku Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye tụkwasịrị obi na ndụmọdụ Chineke nyere n’okwu a ma nọsie ike na ya. (Abụ Ọma 32:8) Ọ bụ ezie na ha na-atụ anya na otu ụbọchị, ha ga-alụ di ma ọ bụ nwunye, ha na-anọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ruo mgbe ha ga-achọta onye ha ga-alụ n’etiti ndị na-efe Jehova Chineke.

      11. Olee ihe ga-enyere gị aka ịsa anya na mmiri chọta onye ị ga-alụ? (Gụọ igbe dị na peeji nke 114.)

      11 N’ezie, ọ bụghị onye ọ bụla bụ́ ohu Jehova ga-abụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, chọọ onye àgwà ya na ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ya na nke gị bụ otu, onye hụkwara Chineke n’anya otú ị hụrụ ya. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ebipụtala ọtụtụ akwụkwọ kọwara isiokwu a. Ọ ga-abakwara gị uru ma i jiri ekpere tụlee ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ dị otú ahụ ma kwe ka o duzie gị mgbe ị na-eme mkpebi a dị mkpa.a—Abụ Ọma 119:105.

      12. Olee omenala e nwere n’ọtụtụ mba, oleekwa ihe atụ dị na Baịbụl ga-eduzi anyị?

      12 N’ọtụtụ mba, ọ bụ omenala na ọ bụ nne na nna ga-achọtara nwa ha onye ọ ga-alụ. N’omenala ndị ahụ, ndị mmadụ kweere na ọ bụ nne na nna nwere amamihe na ahụmahụ a na-eji eme ụdị mkpebi ahụ dị mkpa karịa ụmụ ha. Mmadụ ịlụ onye ndị mụrụ ya chọtaara ya na-enwekarị ihe ịga nke ọma, dị ka e mere n’oge Baịbụl. Ndị nne na nna, bụ́ ndị nwere ike ịhọtara nwa ha onye ọ ga-alụ taa, kwesịrị ịmụta ihe n’ihe atụ Baịbụl nyere banyere Ebreham, bụ́ onye zigara ohu ya ka ọ chọtara Aịzik nwaanyị. Ihe bụ́ mkpa Ebreham abụghị ego na ọkwá. Kama nke ahụ, ọ gbalịsiri ike ịchọtara Aịzik nwunye n’etiti ndị na-efe Jehova.b—Jenesis 24:3, 67.

      OLEE ÀGWÀ M NA-ATỤ ANYA KA ONYE M CHỌRỌ ỊLỤ NWEE?

      Ụkpụrụ: “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.”—Matiu 19:5.

      Ajụjụ ụfọdụ ị ga-ajụ onwe gị

      • Gịnị mere o ji dị mkpa ka mmadụ gafee “oge ntoju ntorobịa” tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye?—1 Ndị Kọrịnt 7:36; 13:11; Matiu 19:4, 5.

      • Ọ bụ ezie na etoruola m ịlụ di ma ọ bụ nwunye, olee otú m ga-esi erite uru n’ịnọtụkwu n’alụghị di ma ọ bụ nwunye?—1 Ndị Kọrịnt 7:32-34, 37, 38.

      • Ọ bụrụ na mụ ekpebie ịlụ di ma ọ bụ nwunye, gịnị mere o ji dị mkpa ka onye m ga-alụ bụrụ onye jeerela Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ? —1 Ndị Kọrịnt 7:39.

      • Olee otú amaokwu Baịbụl ndị a ga-esi enyere nwanna nwaanyị aka ịmata àgwà onye ọ ga-alụ kwesịrị inwe?—Abụ Ọma 119:97; 1 Timoti 3:1-7.

      • Olee otú Ilu 31:10-31 ga-esi enyere nwanna nwoke aka iji amamihe họrọ onye ọ ga-alụ?

      OLEE OTÚ Ị GA-ESI KWADEBE MAKA ALỤMDI NA NWUNYE GA-ENWE IHE ỊGA NKE ỌMA?

      13-15. (a) Olee otú ụkpụrụ dị n’Ilu 24:27 ga-esi enyere nwa okorobịa na-eche echiche ịlụ nwaanyị aka? (b) Gịnị ka nwa agbọghọ ga-eme iji jikere maka ịlụ di?

      13 Ọ bụrụ na ị na-echesi echiche ike banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye, i kwesịrị ịjụ onwe gị, sị, ‘M̀ jikerela n’ezie?’ Ihe bụ́ azịza ya adabereghị naanị n’ihe i bu n’obi banyere ịhụnanya, mmekọahụ, mkpakọrịta nwoke na nwaanyị, ma ọ bụ ịzụ ụmụ. Kama nke ahụ, e nwere ihe mgbaru ọsọ onye ga-abụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ichebara echiche.

      14 Nwa okorobịa nke na-achọ onye ọ ga-alụ kwesịrị iche echiche nke ọma banyere ụkpụrụ bụ́: “Kwadebe ọrụ gị n’èzí, kwadebekwara ya onwe gị n’ubi. E mesịa, wulitekwa ezinụlọ gị.” (Ilu 24:27) Olee ihe nke a pụtara? N’oge ochie, ọ bụrụ na nwoke chọrọ ‘iwulite ezinụlọ ya,’ ma ọ bụ inwe ezinụlọ site n’ịlụ nwaanyị, o kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ jikerela ilekọta nwunye m na ụmụ ọ bụla anyị nwere ike ịmụta ka oge na-aga?’ Ọ ga-ebu ụzọ rụọ ọrụ, lekọta ubi ya, ma ọ bụ ihe ọ kụrụ. Otú ahụkwa ka ọ dị taa. Nwoke nke chọrọ ịlụ nwaanyị kwesịrị ịkwadebe maka ọrụ dịịrị ya. Ọ bụrụhaala na ahụ́ dị ya, o kwesịrị ịna-arụ ọrụ. Okwu Chineke gosiri na nwoke na-adịghị egboro ezinụlọ ya mkpa anụ ahụ́ na nke ime mmụọ ha, nke na-adịghịkwa eme ka obi dị ha mma, jọkarịrị onye na-ekweghị ekwe ná njọ!—1 Timoti 5:8.

      15 N’otu aka ahụ, nwaanyị nke kpebiri ịlụ di ekwerela ịrụ ọtụtụ ọrụ dị oké mkpa dịịrị onye bụ́ nwunye. Baịbụl kwuru okwu ọma banyere ụfọdụ nkà na àgwà nwunye kwesịrị inwe ka ọ na-enyere di ya aka ma na-elekọta ezinụlọ ya. (Ilu 31:10-31) Ndị nwoke na ndị nwaanyị bụ́ ndị ji ọsọ gbaba n’alụmdi na nwunye n’ebughị ụzọ kwadebe maka ịrụ ọrụ ndị dị n’ịlụ di na nwunye na-achọ naanị ọdịmma onwe ha, n’ihi na ha echeghị echiche banyere ihe ha ga-emere onye ha ga-alụ. Ma, nke ka nke, ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ijikere irube isi n’ụkpụrụ Chineke.

      16, 17. Olee ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-akwadebe ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịtụgharị uche na ha?

      16 Ijikere maka ịlụ di ma ọ bụ nwunye pụtara ịtụgharị uche n’ọrụ Chineke nyere di na nwunye. Nwoke kwesịrị ịmata ihe ịbụ onyeisi n’ezinụlọ Ndị Kraịst pụtara. Ọrụ a enyeghị ya ikike ịchị ọchịchị aka ike. Kama nke ahụ, o kwesịrị iṅomi otú Jizọs si abụ onyeisi. (Ndị Efesọs 5:23) N’otu aka ahụ, nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịghọta ọrụ dị ùgwù Chineke nyere nwunye. Ọ̀ ga-adị njikere ịnọ n’okpuru “iwu nke di ya”? (Ndị Rom 7:2) Ọ nọrọlarị n’okpuru iwu Jehova na nke Kraịst. (Ndị Galeshia 6:2) Ikike di ya nwere n’ezinụlọ nọchiri anya iwu ọzọ. Ò nwere ike ịkwado nwoke na-ezughị okè ma na-erubere ya isi mgbe a sịrị ya nọrọ n’okpuru ya? Ọ bụrụ na ọ gaghị adị ya mma ime otú ahụ, ọ ga-akara ya mma ka ọ ghara ịlụ di.

      17 Ihe ọzọ bụ na di na nwunye kwesịrị ịdị njikere igbo mkpa pụrụ iche nke onye ọ bụla n’ime ha nwere. (Ndị Filipaị 2:4) Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.” Site n’ike mmụọ nsọ, Pọl ghọtara na mkpa pụrụ iche nwoke nwere bụ ka nwunye ya na-akwanyere ya ùgwù nke ukwuu. Mkpa pụrụ iche nwaanyị nwekwara bụ ka di ya hụ ya n’anya.—Ndị Efesọs 5:21-33.

      N’oge ndị chọrọ ịlụ di na nwunye ji ele àgwà ibe ha, ọtụtụ n’ime ha na-eji amamihe akpọta ndị ga na-eso ha akpapụ

      18. Gịnị mere ndị chọrọ ịlụ di na nwunye kwesịrị iji jide onwe ha mgbe ha ka na-akpa akpa?

      18 Ya mere, oge ndị chọrọ ịlụ di na nwunye ji ele àgwà ibe ha abụghị naanị oge ha ga-eji na-atụrụ ndụ. Ọ bụ oge nwoke na nwaanyị ga-eji mụta otú ha ga-esi na-emeso ibe ha ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, iji hụ ma hà kwesịrị ịlụ. Ọ bụkwa oge ha kwesịrị ijide onwe ha! O nwere ike ịgụsi ha agụụ ike igosi ibe ha ịhụnanya n’ụzọ pụrụ iche—a sị ka e kwuwe, agụụ dị otú ahụ bụ ihe e bu pụta ụwa. Otú ọ dị, ndị hụrụ ibe ha n’anya n’ezie ga-ezere omume ọ bụla nwere ike imebi ofufe onye ha hụrụ n’anya na-efe Chineke. (1 Ndị Tesalonaịka 4:6) N’ihi ya, ọ bụrụ na gị na onye ị chọrọ ịlụ na-akpa, jide onwe gị; àgwà dị otú ahụ ga-abara gị uru ná ndụ gị niile, ma ị̀ lụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na ị lụbeghị.

      OLEE OTÚ Ị GA-ESI MEE KA ALỤMDI NA NWUNYE GỊ DỊGIDE?

      19, 20. Gịnị kwesịrị ịbụ ihe dị iche n’otú Onye Kraịst si ele alụmdi na nwunye anya na otú ọtụtụ ndị si ele ya anya n’ụwa taa? Nye ihe atụ.

      19 Ọ bụrụ na ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye chọrọ ka alụmdi na nwunye ha dịgide, ha kwesịrị ile nkwa ọlụlụ anya n’ụzọ ziri ezi. Ma n’akwụkwọ ọgụgụ ma na fim, ihe a na-ejikarị emechi akụkọ di na nwunye bụ ebe ha nwere obi ụtọ. Ọ na-agụkwa ndị mmadụ agụụ ka ha nweekwa obi ụtọ otú ahụ. Ma, n’eziokwu, alụmdi na nwunye abụghị akụkọ a na-emechi emechi; ọ bụ mmalite, ya bụ, ịmalite ihe Jehova bu n’obi ka ọ dịgide. (Jenesis 2:24) Ọ dị mwute na ọ bụghị otú ahụ ka ọtụtụ ndị si ele ya anya n’ụwa taa. N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ na-ekwu banyere alụmdi na nwunye dị ka “eriri e ji kee ngwugwu.” Ma eleghị anya, ha agaghị aghọta na ihe atụ ahụ kọwara nnọọ otú ọtụtụ ndị si ele alụmdi na nwunye anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ ezie na ezigbo eriri e ji kee ihe kwesịrị ijide ihe e ji ya kee, ihe ọzọ dị mkpa e ji mara eriri e ji kee ngwugwu bụ na ọ na-adị mfe ike ya na ịtọpụ ya.

      20 Ọtụtụ ndị taa na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka ihe na-anọ nwa oge. Ha na-abanye na ya n’egbughị oge n’ihi na ha chere na ọ ga-egboro ha mkpa ha, ma, ha na-atụ anya na ha ga-enwe ike isi na ya gbapụta ozugbo o yiri ka ò siela ike. Ma, cheta ihe atụ Baịbụl na-eji akọwa njikọ dị ka alụmdi na nwunye, ya bụ, ụdọ. A na-arụ ụdọ ma ọ bụ eriri ndị a rụnyere n’ụgbọ mmiri ndị nwere ákwà ifufe ka ha dịgide, ka ha ghara ịtọpụ atọpụ, ọbụna mgbe e nwere oké ifufe na-akpa ezigbo ike. N’otu aka ahụ, Chineke mere alụmdi na nwunye ka ọ dịgide. Cheta na Jizọs sịrị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:6) Ọ bụrụ na ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, i kwesịrị ile alụmdi na nwunye anya otú ahụ. Iji alụmdi na nwunye kpọrọ ihe otú ahụ ọ̀ na-eme ka ọ ghọọ ibu arọ? Mba.

      21. Olee otú di na nwunye kwesịrị isi na-ele ibe ha anya, gịnịkwa ga-enyere ha aka ime otú ahụ?

      21 Di na nwunye kwesịrị ịna-ele ibe ha anya n’ụzọ ziri ezi. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ha agbalịsie ike na-elekwasị anya n’àgwà ọma na mgbalị onye nke ọzọ na-eme, alụmdi na nwunye ha ga-abụ ihe na-enye ọṅụ na ihe na-eme ka ahụ́ ruo ha ala. Ọ̀ bara uru ka mmadụ na-elekwasị anya otú ahụ n’ebe di ya ma ọ bụ nwunye ya na-ezughị okè na-eme nke ọma? Jehova anaghị ele anyị anya dị ka ndị zuru okè, ma anyị tụkwasịrị ya obi na ọ ga na-ele anyị anya ọma. Ọbụ abụ jụrụ, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Di na nwunye kwesịrị ịna-ele ibe ha anya ọma otú ahụ, na-agbaghakwara ibe ha.—Ndị Kọlọsi 3:13.

      22, 23. Olee otú Ebreham na Sera si setịpụrụ ndị bụ́ di na nwunye taa ezi ihe nlereanya?

      22 E nwere ike inwetakwu obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ka ọ na-anọ ọtụtụ afọ. Baịbụl gwara anyị otú alụmdi na nwunye Ebreham na Sera dị mgbe ha mere agadi. Ọtụtụ ihe isi ike na nsogbu bịaara ha ná ndụ ha. Chegodị otú ọ dịịrị Sera, bụ́ nwaanyị dị ihe dị ka afọ iri isii na ụma, ịhapụ ebe ahụ́ ruru ya ala ha bi n’obodo Ọọ nke nwere akụnụba, ma gaa na-ebi n’ụlọikwuu ruo mgbe ọ nwụrụ. Ma, o doro onwe ya n’okpuru di ya. Ebe ọ bụ ezigbo onye inyeaka Ebreham na onye na-eme ka o zuo ezu, o ji nkwanye ùgwù nyere ya aka n’ime ka mkpebi ya gaa siriri werere. Ùgwù ọ na-akwanyere di ya abụghị nke elu ọnụ. Ọbụna “n’obi ya,” ọ na-akpọ di ya onyenwe ya. (Jenesis 18:12; 1 Pita 3:6) Ùgwù ọ na-akwanyere Ebreham si ya n’obi.

      23 N’ezie, nke ahụ apụtaghị na obi Ebreham na nke Sera na-abụ otu mgbe niile. Ọ dị mgbe Sera tụrụ aro “wutere nnọọ” Ebreham. Ma, Ebreham ji obi umeala gee nwunye ya ntị n’ihi ihe Jehova gwara ya. Nke ahụ mechara wetara ezinụlọ ha ngọzi. (Jenesis 21:9-13) Ndị bụ́ di na nwunye taa, ma ndị lụrụ kemgbe ọtụtụ afọ, nwere ike ịmụta ihe dị ukwuu n’aka di na nwunye a na-asọpụrụ Chineke.

      24. Olee ụdị alụmdi na nwunye na-ewetara Jehova Chineke nsọpụrụ, n’ihi gịnịkwa?

      24 N’ọgbakọ Ndị Kraịst, e nwere ọtụtụ puku alụmdi na nwunye na-enwe obi ụtọ, ya bụ, alụmdi na nwunye ebe nwunye na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu, ebe di hụrụ nwunye ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù, ha abụọ ejiri otu obi na-ebute ime uche Jehova ụzọ n’ihe niile ha na-eme. Ọ bụrụ na i kpebie ịlụ di ma ọ bụ nwunye, saa anya na mmiri họrọ onye ị ga-alụ, kwadebe nke ọma maka ịlụ di ma ọ bụ nwunye, gbalịsie ike ka alụmdi na nwunye gị bụrụ nke udo na ịhụnanya dị na ya iji wetara Jehova Chineke nsọpụrụ. I mee otú ahụ, alụmdi na nwunye gị ga-enyere gị aka n’ezie ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke.

      a Gụọ isi nke abụọ n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

      b Ụfọdụ ndị nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi lụrụ karịa otu nwaanyị. Mgbe Jehova na ndị nna ochie nakwa Izrel anụ ahụ́ mekọrọ ihe, o kwere ka ha na-alụ karịa otu nwaanyị. Ọ bụghị ya malitere ya, ma o nyere iwu duziri ya. Otú ọ dị, Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’obi na Jehova ekwekwaghị ka ndị na-efe ya na-alụ karịa otu nwaanyị.—Matiu 19:9; 1 Timoti 3:2.

  • “Ka Alụmdi na Nwunye Bụrụ Ihe Kwesịrị Nsọpụrụ”
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
    • Ebe di na nwunye na-agụkọ Baịbụl ọnụ

      ISI NKE IRI NA OTU

      “Ka Alụmdi na Nwunye Bụrụ Ihe Kwesịrị Nsọpụrụ”

      ‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa.’—ILU 5:18.

      1, 2. Olee ajụjụ anyị ga-atụle, n’ihi gịnịkwa?

      Ị̀ LỤỌLA di ma ọ bụ nwunye? Ọ bụrụ na ị lụọla, alụmdi na nwunye gị ọ̀ na-eme gị obi ụtọ, ka ùnu na-enwe nsogbu ndị tara akpụ? Ịhụnanya unu ọ̀ jụọla oyi? Ị̀ na-edi alụmdi na nwunye gị, kama inwe obi ụtọ na ya? Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na ọ na-ewute gị na obi ụtọ ị na-enwebu n’alụmdi na nwunye gị efunyụọla anya. Ebe ị bụ Onye Kraịst, ị chọrọ n’ezie ka alụmdi na nwunye gị na-ewetara Jehova bụ́ Chineke ị hụrụ n’anya otuto. N’ihi ya, ọnọdụ ị nọ na ya ugbu a nwere ike ịna-echu gị ụra ma na-agbawa gị obi. N’agbanyeghị nke ahụ, biko, echela na ọnọdụ gị enweghị ngwọta.

      2 Taa, e nwere ọtụtụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị o nwere mgbe ha na-aza na ha lụrụ di na nwunye, ma ha na-eme ihe iche iche. N’agbanyeghị nke ahụ, ha mere ka alụmdi na nwunye ha sie ike. I nwekwara ike inwetakwu obi ụtọ n’alụmdi na nwunye gị. Olee otú ị ga-esi eme ya?

      BỊARUKWUO CHINEKE NA ONYE Ị LỤRỤ NSO

      3, 4. Gịnị mere di na nwunye ga-eji nọrọ ibe ha nso ma ọ bụrụ na ha na-agbalịsi ike ịbịarukwu Chineke nso? Nye ihe atụ.

      3 Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-abịarukwu ibe unu nso ma ọ bụrụ na unu na-agbalịsi ike ịbịarukwu Chineke nso. N’ihi gịnị? Chee echiche banyere ihe atụ a: Ka e were ya na otu nwoke na otu nwaanyị chọrọ ịrịgo n’ọnụ ọnụ otu ugwu. Nke nwoke si n’otu akụkụ ugwu ahụ, nke nwaanyị esi n’akụkụ ya nke ọzọ. Ha abụọ amalite ịrị ugwu ahụ. Ná mmalite, ha abụọ ga-anọ ibe ha n’ebe dị ezigbo anya. Ma, ka onye ọ bụla n’ime ha na-agbalị ịrịgo n’ọnụ ọnụ ugwu ahụ, ha abụọ ga na-abịaru ibe ha nso. Ị̀ ghọtara ihe ihe atụ a na-akụzi?

      4 E nwere ike iji otú i si na-agbalịsi ike ijere Jehova ozi tụnyere mgbalị a na-etinye n’ịrị ugwu. Ebe ọ bụ na ị hụrụ Jehova n’anya, e nwere ike ikwu na ị na-agbalịsi ike ịrị ugwu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme ihe iche iche, o yiri ka onye ọ bụla n’ime unu ò si n’akụkụ dị iche na-arị ugwu ahụ. Ma, gịnị ga-eme ma unu rịrị ugwu ahụ na-aga? N’eziokwu, unu abụọ agaghị anọ ibe unu nso ná mmalite. N’agbanyeghị nke ahụ, ka unu na-agbalịkwu ịbịaru Chineke nso, na-arịgokwu n’ugwu ihe atụ ahụ, otú ahụ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-anọkwu ibe unu nso. N’ezie, ịbịarukwu Chineke nso bụ isi ihe ga-eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nọrọ ibe unu nso. Ma, olee otú unu ga-esi eme ya?

      Ọ bụrụ na i jiri ihe ọmụma Baịbụl mee ihe, ọ ga-eme ka alụmdi na nwunye gị sie ike

      5. (a) Olee otu n’ime ụzọ mmadụ ga-esi bịarukwuo Jehova na di ma ọ bụ nwunye ya nso? (b) Olee otú Jehova si ele alụmdi na nwunye anya?

      5 E nwere ike ikwu na otu n’ime ụzọ dị mkpa unu abụọ ga-esi na-arị ugwu ahụ bụ irube isi na ndụmọdụ Okwu Chineke nyere di na nwunye. (Abụ Ọma 25:4; Aịzaya 48:17, 18) Ya mere, chee echiche banyere otu ndụmọdụ doro anya Pọl onyeozi nyere. Ọ sịrị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile.” (Ndị Hibru 13:4) Gịnị ka ọ pụtara? Okwu ahụ bụ́ “kwesịrị nsọpụrụ” pụtara ihe e ji kpọrọ ihe ma ọ bụ ihe bara oké uru. Otú ahụ ka Jehova si ele alụmdi na nwunye anya, ya bụ, o ji ya kpọrọ ihe dị ka ihe bara oké uru.

      IHE GA-AKPALI GỊ BỤ EZIGBO ỊHỤNANYA I NWERE N’EBE JEHOVA NỌ

      6. Gịnị ka ihe ndị ọzọ Pọl kwuru mgbe o nyere ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye na-egosi, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka i buru ya n’uche?

      6 N’ezie, ebe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị bụ ndị ohu Chineke, unu amatala na alụmdi na nwunye dị oké ọnụ ahịa, dịrịkwa nsọ. Ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye. (Matiu 19:4-6) Otú ọ dị, ọ bụrụ na i nwere nsogbu ugbu a n’alụmdi na nwunye gị, ihe ga-akpali gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị iji ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-emeso ibe unu ihe abụghị naanị ịmata na alụmdi na nwunye bụ ihe kwesịrị nsọpụrụ. Gịnịzi ga-akpali gị ime otú ahụ? Buru n’obi nke ọma otú Pọl si kwuo okwu banyere ịsọpụrụ alụmdi na nwunye. Ọ sịghị, “alụmdi na nwunye bụ ihe kwesịrị nsọpụrụ”; kama, ọ sịrị, “ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ.” Ihe Pọl na-akọwa abụghị ihe ọ hụrụ ndị mmadụ na-eme; ọ bụ ndụmọdụ ka ọ na-enye.a Iburu nke ahụ n’uche nwere ike inyere gị aka ịhụ ihe ọzọ ga-akpali gị ime ka ị maliteghachi iji di gị ma ọ bụ nwunye gị kpọrọ ihe. N’ihi gịnị?

      7. (a) Olee iwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ anyị na-erube isi na ha, n’ihi gịnị? (b) Olee ihe ọma na-esi n’irube isi apụta?

      7 Chetụdị echiche banyere otú i si ele iwu ndị ọzọ e nyere n’Akwụkwọ Nsọ anya, dị ka iwu ime ndị na-eso ụzọ ma ọ bụ ndụmọdụ izukọta maka ofufe. (Matiu 28:19; Ndị Hibru 10:24, 25) N’ezie, irube isi n’iwu ndị ahụ nwere ike isi ike mgbe ụfọdụ. Ndị ị na-ezi ozi ọma nwere ike ghara inwe mmasị, ma ọ bụ, ọrụ ị na-arụ nwere ike ime ka ike gwụ gị, nke ga-eme ka ịga ọmụmụ ihe bụrụ ọgụ na mgba. N’agbanyeghị nke ahụ, ị ka na-ezisa ozi ọma Alaeze Chineke, na-agakwa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ọ dịghị onye ga-akwụsịli gị—ọbụnadị Setan! N’ihi gịnị? N’ihi na ezigbo ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ na-akpali gị irube isi n’iwu ya. (1 Jọn 5:3) Olee ihe ọma na-esi na ya apụta? Ịga ozi ọma na ịga ọmụmụ ihe na-eme ka obi ruo gị ala, na-emekwa ka i nwee ezigbo ọṅụ n’ihi na ị ma na ị na-eme uche Chineke. Otú ahụ obi na-adị gị na-eme ka i nwee ume. (Nehemaya 8:10) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị?

      8, 9. (a) Gịnị ga-eme ka anyị rube isi na ndụmọdụ bụ́ ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ihe abụọ anyị ga-atụle ugbu a?

      8 Dị nnọọ ka ezigbo ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ na-eme ka ị na-erube isi n’iwu o nyere ka a na-ekwusa ozi ọma ma na-aga ọmụmụ ihe n’agbanyeghị ihe isi ike, otú ahụ ka ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ ga-eme ka ị na-erube isi na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ “ka alụmdi na nwunye [gị] bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ,” ọbụna mgbe o yiri ka ò siri ike. (Ndị Hibru 13:4; Abụ Ọma 18:29; Ekliziastis 5:4) Ihe ọzọkwa bụ na, dị nnọọ ka otú i si na-agbalịsi ike ikwusa ozi ọma na ịga ọmụmụ ihe na-eme ka ị na-enweta ọtụtụ ngọzi Chineke, otú ahụ ka Jehova ga-ahụ otú i si na-agbalịsi ike ime ka alụmdi na nwunye gị bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ọ ga-agọzikwa gị.—1 Ndị Tesalonaịka 1:3; Ndị Hibru 6:10.

      9 Ya mere, olee otú ị ga-esi eme ka alụmdi na nwunye gị bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ? I kwesịrị izere omume nwere ike imebi alụmdi na nwunye gị. I kwesịkwara ime ihe ndị ga-eme ka alụmdi na nwunye gị bụrụ a kwaa a kwụrụ.

      ZERE OKWU NA OMUME NDỊ NA-EMEBI ALỤMDI NA NWUNYE

      10, 11. (a) Olee omume ndị na-emebi alụmdi na nwunye? (b) Olee ajụjụ anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị kwesịrị ịtụle?

      10 Otu nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwuru n’oge gara aga, sị: “Ekpekuru m Jehova ekpere ka o nye m ike m ga-eji die ya.” Die gịnị? O kwuru, sị: “Di m na-eji ọnụ apịa m ụtarị. Ọ bụ eziokwu na o nweghị ebe o merụrụ m ahụ́, ma okwu ọjọọ ọ na-agwa m mgbe niile na-agbawa m obi. Ọ na-asị m, ‘Ị bụ akpa nsogbu!’ ma ọ bụ ‘O nweghị uru ị bara!’” Nwaanyị a kwuru ihe dị oké mkpa e kwesịrị ichebara echiche, ya bụ, okwu mkparị di na nwunye na-agwa ibe ha.

      11 Ọ dị nnọọ mwute ma ọ bụrụ na di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-agwa ibe ha okwu ọjọọ, na-akpata obi mgbawa nke na-anaghị adị mfe ngwọta! O doro anya na alụmdi na nwunye e ji okwu ọjọọ mara ekwesịghị nsọpụrụ. Olee otú alụmdi na nwunye gị dị? Otu n’ime ụzọ ị ga-esi chọpụta bụ iji obi umeala jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị, sị, “Olee otú okwu m na-agwa gị na-adị gị n’obi?” Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị echee na ọtụtụ mgbe okwu gị na-agbawa ya obi, i kwesịrị ịgbanwe àgwà gị iji mee ka alụmdi na nwunye gị ka mma.—Ndị Galeshia 5:15; Ndị Efesọs 4:31.

      12. Olee otú ofufe mmadụ na-efe Chineke ga-esi bụrụ ihe efu n’anya Chineke?

      12 Buru n’obi na otú i si eji ire gị agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu na-emetụta mmekọrịta gị na Jehova. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chere na ya na-efe Chineke n’ụzọ ziri ezi ma ọ dịghị achịkwa ire ya, kama na-aghọgbu obi ya, ụdị ofufe onye a na-efe bụ ihe efu.” (Jems 1:26) Okwu gị adịghị iche n’ofufe ị na-efe Chineke. Baịbụl akwadoghị echiche ahụ bụ́ na ihe ọ bụla nke mere n’ezinụlọ mmadụ adịghị ihe o mere ma ọ bụrụhaala na onye ahụ sịrị na ya na-efe Chineke. Biko, aghọgbula onwe gị. Ihe a abụghị okwu egwuregwu. (1 Pita 3:7) O nwere ike ịbụ na i nwere nkà ma na-anụ ọkụ n’obi, ma ọ bụrụ na ị kpachara anya na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu na-agbawa obi, ị na-emebi alụmdi na nwunye gị, Chineke nwekwara ike ile ofufe ị na-efe ya anya dị ka ihe efu.

      13. Olee otú mmadụ nwere ike isi mee ka obi gbawaa di ya ma ọ bụ nwunye ya?

      13 Di na nwunye kwesịkwara ilezi anya ka ha ghara isi n’ụzọ ndị ọzọ na-eme ihe ga na-agbawa ibe ha obi. Chegodị echiche banyere ihe atụ abụọ a: Otu nne naanị ya na-azụ ụmụ na-akpọkarị otu nwanna nwoke lụrụ nwaanyị nọ n’ọgbakọ ya n’ekwe ntị ka ọ tụọrọ ya aro, ha na-anọte aka ná mkparịta ụka ha; otu nwanna nwoke na-alụbeghị nwaanyị na otu nwanna nwaanyị lụrụ di na-arụ kwa izu ruo ogologo oge ma ha gaa ozi ọma. O nwere ike ịbụ na mmadụ abụọ a bụ́ ndị lụrụ di na nwunye n’ihe atụ abụọ a enweghị ihe ọjọọ ha bu n’obi; n’agbanyeghị nke ahụ, olee otú omume ha si emetụta di ha ma ọ bụ nwunye ha? Otu nwunye nke nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ sịrị: “Ọ na-ewute m ịhụ na di m na nwanna nwaanyị ọzọ nọ n’ọgbakọ anyị na-akpachi anya. Ọ na-adị m ka abaghị m uru.”

      Ebe di na nwunye bi nʼudo ji ibe ha aka na-akpagharị

      14. (a) Olee ọrụ dịịrị di na nwunye e kwuru banyere ya na Jenesis 2:24? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

      14 O doro anya na ihe ahụ na-ewute ma nwaanyị ahụ ma ndị ọzọ nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ n’alụmdi na nwunye ha. Di ha ma ọ bụ nwunye ha na-eleghara ndụmọdụ bụ́ isi Chineke nyere di na nwunye anya, nke bụ́: ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya.’ (Jenesis 2:24) N’ezie, ndị lụrụ di na nwunye ka ga na-akwanyere nne ha na nna ha ùgwù; otú ọ dị, Chineke kwuru na onye mbụ ha ga-elebara anya bụ di ha ma ọ bụ nwunye ha. N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst hụrụ ndị kwere ekwe ibe ha n’anya nke ukwuu; ma, onye mbụ ha kwesịrị ịhụ n’anya bụ di ha ma ọ bụ nwunye ha. N’ihi ya, mgbe Ndị Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nwunye na ndị kwere ekwe ibe ha na-akpachi anya gabiga ókè, karịsịa ha na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, ha na-akpata nsogbu n’alụmdi na nwunye ha. Ọ̀ ga-abụ ya kpatara nsogbu unu na-enwe n’alụmdi na nwunye unu? Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-ewepụtara di m ma ọ bụ nwunye m oge m kwesịrị iwepụtara ya n’ezie, na-elebara ya anya ma na-ahụ ya n’anya otú m kwesịrị ịhụ ya?’

      15. Dị ka e kwuru na Matiu 5:28, gịnị mere Ndị Kraịst lụrụ di ma ọ bụ nwunye na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha na-ekwesịghị ịkpachi anya gabiga ókè?

      15 Ndị Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nwunye, ndị ha na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-akpachi anya gabiga ókè, na-akpatara onwe ha nsogbu n’echeghị echiche. Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ di ma ọ bụ nwunye enweela mmasị na-ezighị ezi n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha ha na ha na-akpachi anya gabiga ókè nọ. (Matiu 5:28) N’ihi ya, mmasị dị otú ahụ ha nwere emeela ka ha mee omume na-emebikwu alụmdi na nwunye ha. Chee echiche ihe Pọl onyeozi kwuru banyere nke a.

      ‘KA IHE NDINA ALỤMDI NA NWUNYE GHARA ỊBỤ IHE E MERỤRỤ EMERỤ’

      16. Olee iwu Pọl nyere banyere alụmdi na nwunye?

      16 Ozugbo Pọl nyechara ndụmọdụ “ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ,” ọ dọkwara aka ná ntị, sị: “Ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) Pọl kpọrọ mmekọahụ “ihe ndina alụmdi na nwunye.” Mmekọahụ dị otú ahụ abụghị “ihe e merụrụ emerụ,” nke o ji abụ omume rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na ọ bụ naanị di na nwunye nwere ya. Ya mere, Ndị Kraịst na-ege ntị n’okwu ahụ e si n’ike mmụọ nso kwuo, nke bụ́: ‘Ṅụrịa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa.’—Ilu 5:18.

      17. (a) Gịnị mere Ndị Kraịst ekwesịghị ịmụta otú ụwa si ele ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye anya? (b) Olee otú anyị ga-esi soro ihe nlereanya Job setịpụrụ?

      17 Ndị ha na onye na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ anaghị akwanyere iwu Chineke nyere banyere omume ọma ùgwù ma otu ma otu. N’eziokwu, ọtụtụ ndị taa na-ewere ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye dị ka ihe na-adịghị njọ. Ma, otú ndị ọzọ si ele ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye anya ekwesịghị ịgbanwe otú Ndị Kraịst si ele ya anya. Ha ghọtara na n’ikpeazụ, ọ bụ “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe,” ọ bụghị mmadụ. (Ndị Hibru 10:31; 12:29) N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst na-ele ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya anya. (Ndị Rom 12:9) Cheta na nna ochie bụ́ Job sịrị: “Mụ na anya m agbawo ndụ.” (Job 31:1) N’ezie, iji zere ọbụna ihe ọ bụla nke nwere ike ime ka mmadụ kwaa iko, ezi Ndị Kraịst na-achịkwa anya ha, ha anaghịkwa ele nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha anya gabiga ókè.—Gụọ isiokwu dị na peeji 219-221.

      18. (a) Olee otú ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye jọruru ná njọ n’anya Jehova? (b) Olee otú ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye na ikpere arụsị si yie?

      18 Olee otú ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye jọruru ná njọ n’anya Jehova? Iwu Mozis na-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova si ele ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye anya. N’Izrel, ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye na ikpere arụsị so n’ihe ọjọọ ndị ọ bụ mmadụ mee, e gbuo ya. (Levitikọs 20:2, 10) Olee otú ha abụọ si yie? Onye Izrel nke kpeere arụsị emebiela ọgbụgba ndụ ya na Jehova. N’otu aka ahụ, onye Izrel nke lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma kwaa iko emebiela ọgbụgba ndụ ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya gbara. Mmadụ abụọ ahụ ghọrọ aghụghọ. (Ọpụpụ 19:5, 6; Diuterọnọmi 5:9; Malakaị 2:14) Ya mere, ha abụọ mere ihe jọgburu onwe ya n’anya Jehova, bụ́ Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi.—Abụ Ọma 33:4.

      19. Gịnị nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye kpebisikwuo ike na ya agaghị akwa iko, n’ihi gịnịkwa?

      19 N’ezie, Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis. Ma, ọ bụrụ na Ndị Kraịst echeta na ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye bụ ihe jọgburu onwe ya n’Izrel oge ochie, ọ ga-eme ka ha kpebisikwuo ike na ha agaghị eme ya. N’ihi gịnị? Chee echiche banyere ihe atụ a: Ị̀ ga-anọkata banye n’ụlọ chọọchị, gbuo ikpere n’ala n’ihu ihe a kpụrụ akpụ ma kpee ekpere? Ị ga-asị, ‘Mbanụ!’ Ma, ị̀ ga-achọ ime ya ma ọ bụrụ na e nye gị ego buru ibu? Ị ga-asịkwa, ‘Tụfịakwa!’ N’ezie, ọ na-asọ ezi Onye Kraịst oyi ichetụdị echiche imejọ Jehova site n’ikpere arụsị. N’otu aka ahụ, o kwesịrị ịsọ Ndị Kraịst oyi ichetụdị echiche imejọ Chineke ha bụ́ Jehova, nakwa di ha ma ọ bụ nwunye ha, site n’ịkwa iko—n’agbanyeghị ihe e nwere ike iji nwaa ha ọnwụnwa. (Abụ Ọma 51:1, 4; Ndị Kọlọsi 3:5) Anyị ekwesịghị ime ihe ga-eme ka Setan ṅụrịa ọṅụ ma anyị emechuo Jehova ihu nke ukwuu, merụọkwa alụmdi na nwunye dị nsọ.

      OTÚ Ị GA-ESI MEE KA ALỤMDI NA NWUNYE GỊ SIKWUO IKE

      An older married couple holding hands

      20. Olee ihe na-eme n’ụfọdụ alụmdi na nwunye? Nye ihe atụ.

      20 E wezụga izere omume na-emebi alụmdi na nwunye, olee ihe ndị ị ga-eme iji na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù? Iji zaa ajụjụ ahụ, were ya na alụmdi na nwunye bụ ụlọ. Werekwa ya na okwu ọma, omume ọma, na ihe ndị na-egosi na mmadụ na-akwanyere di ya ma ọ bụ nwunye ya ùgwù bụ ihe ndị e ji achọ ụlọ mma. Ọ bụrụ na unu na-akpachi anya, alụmdi na nwunye unu yiri ụlọ e ji ihe dị iche iche chọọ mma, nke mere ka ọ maa mma ma na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala. Ọ bụrụ na ịhụnanya unu ajụwala oyi, ihe ndị ahụ e ji chọọ ya mma ga-eji nwayọọ nwayọọ funyụọ anya ma mee ka alụmdi na nwunye unu ghara ịma mma, dị ka ụlọ a na-achọghị mma. Ebe ọ bụ na ị chọrọ irube isi n’iwu Chineke nke bụ́ “ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ,” ọ ga-emetụ gị n’obi imezi alụmdi na nwunye gị. A si ka e kwuwe, e kwesịrị imezi ihe dị oké ọnụ ahịa nakwa ihe kwesịrị nsọpụrụ. Olee otú ị ga-esi eme ya? Okwu Chineke sịrị: “A ga-eji amamihe wulite ezinụlọ, a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike. A ga-ejikwa ihe ọmụma mee ka ihe dị oké ọnụ ahịa na ihe ọma niile bara uru jupụta n’ime ime ụlọ.” (Ilu 24:3, 4) Chee echiche otú ihe a e kwuru si gbasa alụmdi na nwunye gị.

      21. Olee otú anyị ga-esi jiri nwayọọ nwayọọ mee ka alụmdi na nwunye anyị sie ike? (Gụọ igbe dị na peeji nke 131.)

      21 Ụfọdụ n’ime “ihe dị oké ọnụ ahịa” na-adị n’ezinụlọ nwere obi ụtọ bụ àgwà ndị dị ka ezi ịhụnanya, ịtụ egwu Chineke, na okwukwe siri ike. (Ilu 15:16, 17; 1 Pita 1:7) Ihe ndị a na-eme ka alụmdi na nwunye sie ike. Ma, ị̀ ghọtara ihe e ji mee ka ihe dị oké ọnụ ahịa jupụta n’ụlọ ahụ e kwuru banyere ya n’Ilu 24:3, 4? Ọ bụ “ihe ọmụma.” N’ezie, ọ bụrụ na e jiri ihe ọmụma dị na Baịbụl mee ihe, ọ ga-agbanwe otú ndị mmadụ si eche echiche ma mee ka ha hụ ibe ha n’anya. (Ndị Rom 12:2; Ndị Filipaị 1:9) N’ihi ya, mgbe ọ bụla gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nọkọrọ ọnụ ma jiri nwayọọ gụọ otu ebe na Baịbụl, dị ka mgbe unu na-agụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ma ọ bụ isiokwu si na Baịbụl e dere n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta! banyere alụmdi na nwunye, ọ dị nnọọ ka ùnu na-atụle ihe mara mma e nwere ike iji chọọ ụlọ unu mma. Ọ bụrụ na ịhụnanya ị hụrụ Jehova emee ka i rube isi na ndụmọdụ ahụ unu ka tụlechara n’alụmdi na nwunye unu, ọ dị nnọọ ka ùnu na-ewebata ihe e ji achọ ụlọ mma “n’ime ime ụlọ” unu. Ọ ga-eme ka alụmdi na nwunye unu maa mma otú ọ maburu, na-atọkwa ụtọ otú ọ na-atọbu.

      22. Olee obi ụtọ anyị ga-enwe ma ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ime ihe anyị kwesịrị ime iji mee ka alụmdi na nwunye anyị sie ike?

      22 N’ezie, iji nwayọọ nwayọọ weghachi ihe ndị ga-eme ka alụmdi na nwunye gị maa mma nwere ike iwe oge buru ibu na ezigbo mgbalị. Ma, ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike ime ihe i kwesịrị ime, ị ga-enwe ezigbo obi ụtọ ịmara na ị na-erube isi n’iwu Baịbụl bụ́: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10; Abụ Ọma 147:11) Nke ka nke bụ na otú i si na-agbalịsi ike ime ka alụmdi na nwunye gị bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ ga-eme ka ị nọrọ n’ịhụnanya Chineke.

      a Ihe ndị ọzọ Pọl kwuru gosiri na ndụmọdụ o nyere banyere alụmdi na nwunye bụ otu n’ime agbamume ndị o nyere.—Ndị Hibru 13:1-5.

      OLEE OTÚ M GA-ESI EME KA ALỤMDI NA NWUNYE M KA MMA?

      Ebe di buteere nwunye ya tii iji gosi na ọ hụrụ ya nʼanya

      Ụkpụrụ: “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.”—Ndị Efesọs 5:33.

      Ajụjụ ụfọdụ ị ga-ajụ onwe gị

      • Olee àgwà ọma di m ma ọ bụ nwunye m nwere, oleekwa otú m ga-esi egosi na anaghị m eji di m ma ọ bụ nwunye m egwuri egwu?—Ilu 14:1; 31:29; 1 Pita 3:1, 6; 4:8.

      • M̀ na-akwanyere di m ma ọ bụ nwunye m ùgwù site n’ịgbalị ịghọta echiche ya na otú obi dị ya?—Ndị Filipaị 2:4.

      • M̀ dị njikere ileghara ebe di m ma ọ bụ nwunye m na-anaghị emezi emezi anya?—Matiu 6:14, 15.

      • Olee mgbe ikpeazụ m gwara di m ma ọ bụ nwunye m na m hụrụ ya n’anya?—Abụ Sọlọmọn 2:9-14.

      • Olee ihe mgbaru ọsọ ndị metụtara ofufe Chineke anyị na-agbalị iru?—Matiu 6:33, 34; 1 Ndị Kọrint 9:24-27.

      • Gịnị ka m ga-eme iji gbaa di m ma ọ bụ nwunye m ume ka mụ na ya gụọ Baịbụl na ihe mmụta dịịrị ụbọchị?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya