ISIOKWU NDỊ ỌZỌ
Olee Mgbe Nwaanyị Kwesịrị Ikpuchi Isi Ya, n’Ihi Gịnịkwa?
Olee mgbe nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ikpuchi isi ya n’ihe metụtara ofufe Chineke, n’ihi gịnịkwa? Ka anyị leba anya n’ihe Pọl onyeozi dere site n’ike mmụọ nsọ banyere okwu a. Ọ na-enye anyị nduzi ga-enyere anyị aka ime ezi mkpebi ndị ga-ewetara Chineke otuto. (1 Ndị Kọrịnt 11:3-16) Pọl kwuru ụzọ ihe atọ anyị kwesịrị ilebara anya: (1) ihe nwaanyị na-eme nke ga-achọ ka o kpuchie isi ya, (2) ebe ọ nọ nke ga-eme ka o kpuchie isi ya, nakwa (3) ihe o bu n’obi nke ga-eme ka o kpuchie isi ya.
Ihe ọ na-eme. Pọl kwuru ụzọ ihe abụọ ga-eme ka nwaanyị kpuchie isi ya, ya bụ, ikpe ekpere na ibu amụma. (Amaokwu nke 4, 5) N’ezie, ekpere bụ okwu anyị na-agwa Jehova dị ka onye anyị na-efe ofufe. Taa, ibu amụma bụ ozizi ọ bụla sitere na Baịbụl nke Onye Kraịst na-akụziri mmadụ. Ma, okwu Pọl ọ̀ pụtara na nwaanyị kwesịrị ikpuchi isi ya mgbe ọ bụla ọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ mgbe ọ na-akụzi eziokwu Baịbụl? Mbanụ. Ebe nwaanyị nọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-akụzi ihe ga-ekpebi ma ọ̀ ga-ekpuchi isi ya ma ọ bụ na ọ gaghị ekpuchi isi ya.
Ebe ọ nọ. Pọl kwuru ụzọ ebe abụọ, ya bụ, n’ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ. O kwuru, sị: ‘Nwoke bụ isi nke nwaanyị. Nwaanyị ọ bụla nke na-ekpuchighị isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere.’ (Amaokwu nke 3, 5) N’ezinụlọ, Jehova mere ka di bụrụ onyeisi nwunye ya. Ọ bụrụ na nwaanyị akwanyereghị di ya ùgwù, ọ ga-emenye di ya ihere ma ọ́ rụọ ọrụ Jehova nyere di ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ ga-anọ n’ihu di ya duzie ọmụmụ Baịbụl, ọ ga-ekpuchi isi ya iji kwanyere di ya ùgwù. Ọ ga-eme otú ahụ ma è meela di ya baptizim ma ọ bụ na e mebeghị ya, ebe ọ bụ onyeisi ezinụlọ.a Ọ bụrụ na ọ ga-anọ n’ihu nwa ya nwoke dị ntakịrị nke e merela baptizim kpee ekpere ma ọ bụ duzie ọmụmụ Baịbụl, ọ ga-ekpuchikwa isi ya, ọ bụghị n’ihi na nwatakịrị ahụ bụ onyeisi ezinụlọ, kama n’ihi ikike e nyere ndị nwoke e merela baptizim n’ọgbakọ Ndị Kraịst.
Pọl kwuru banyere ọgbakọ, sị: “Ọ bụrụ na o yiri ka onye ọ bụla na-arụ ụka n’ihi omenala ọ bụla ọzọ, anyị enweghị omenala ọzọ, ọgbakọ Chineke enweghịkwa.” (Amaokwu nke 16) N’ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ bụ ndị ikom e mere baptizim ka e mere ndị na-edu ndú. (1 Timoti 2:11-14; Ndị Hibru 13:17) Ọ bụ naanị ndị ikom ka a na-ahọpụta ịbụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, ndị Chineke nyere ọrụ ilekọta ìgwè atụrụ ya. (Ọrụ 20:28) Ma, mgbe ụfọdụ, e nwere ọnọdụ ndị nwere ike ime ka a gwa nwaanyị bụ́ Onye Kraịst ka ọ rụọ ọrụ nwanna nwoke e mere baptizim kwesịrị ịrụ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịdị mkpa ka o duzie nzukọ ozi ubi n’ihi na nwanna nwoke e mere baptizim anọghị ya. Ma ọ bụkwanụ, o nwere ike ịnọ n’ihu nwanna nwoke e mere baptizim duzie ọmụmụ Baịbụl ebe obibi e yiri eyi. Ebe ọ bụ na ihe ndị ahụ bụcha ọrụ ọgbakọ Ndị Kraịst na-arụ, ọ ga-ekpuchi isi ya iji gosi na ihe ọ na-arụ bụ ọrụ nwanna nwoke kwesịrị ịrụ.
N’aka nke ọzọ, e nwere ọtụtụ ihe a na-eme n’ofufe Ndị Kraịst ndị ọ na-agaghị adị mkpa ka nwanna nwaanyị kpuchie isi ya. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị mkpa ka o kpuchie isi ya mgbe ọ na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, mgbe ya na di ya ma ọ bụ nwanna nwoke ọzọ e mere baptizim na-ezi ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma ọ bụkwanụ mgbe ya na ụmụ ya a na-emebeghị baptizim na-amụ ihe ma ọ bụ na-ekpe ekpere. N’ezie, e nwere ike inwe ajụjụ ndị ọzọ. Ma ọ bụrụ na ọ dị ihe na-edoghị nwanna nwaanyị anya, o nwere ike imekwu nchọnchọ.b Ọ bụrụ na o mechaa nchọnchọ, ma o doghị ya anya, ọ bụrụkwa na o kpebie ikpuchi isi ya n’ihi akọnuche ya dị ka e gosiri na foto dị na peeji a, ọ bụghị ihe ọjọọ.
Ihe o bu n’obi. N’amaokwu nke 10, e kwuru ihe abụọ mere Onye Kraịst bụ́ nwaanyị kwesịrị iji kpuchie isi ya: ‘Nwaanyị kwesịrị inwe ihe àmà n’isi ya, nke na-egosi na ọ nọ n’okpuru ndị ikom, n’ihi ndị mmụọ ozi.’ Buru ụzọ cheta ihe e kwuru, bụ́, ‘ihe àmà na-egosi na ọ nọ n’okpuru ndị ikom.’ Nwaanyị ikpuchi isi ya na-egosi na ọ nabatara ikike Jehova nyere ndị ikom e mere baptizim nọ n’ọgbakọ. Ya mere, ọ na-egosi na ọ hụrụ Jehova Chineke n’anya, na-erubekwara ya isi. Anyị ga-ahụ ihe nke abụọ mere ọ ga-eji ekpuchi isi ya n’ihe ọzọ e kwuru, bụ́, “n’ihi ndị mmụọ ozi.” Olee otú isi nwaanyị kpuchiri si gbasa ndị mmụọ ozi dị ike?
Ọ na-atọ ndị mmụọ ozi ụtọ ịhụ na ndị nọ ná nzukọ Jehova na-erubere Chineke isi, ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ihe nlereanya ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-abakwara ha uru n’okwu banyere irube isi. A sị ka e kwuwe, ndị mmụọ ozi kwesịkwara irube isi ná ndokwa Jehova. Nke ahụ bụ ule ọtụtụ ndị mmụọ ozi dara n’oge gara aga. (Jud 6) Ndị mmụọ ozi nwere ike ịhụ nwaanyị bụ́ Onye Kraịst maara ihe ma nwee ahụmahụ na ihe ọmụma karịa nwoke e mere baptizim n’ọgbakọ; n’agbanyeghị nke ahụ, ya egosi na ya na-edo onwe ya n’okpuru nwoke ahụ. Mgbe ụfọdụ, nwaanyị ahụ nwere ike ịbụ Onye Kraịst e tere mmanụ nke ga-emecha bụrụ otu n’ime ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe. Nwaanyị dị otú ahụ ga-emecha rụọ ọrụ karịrị nke ndị mmụọ ozi ma soro Kraịst chịa n’eluigwe. Nke ahụ bụ ezi ihe nlereanya ndị mmụọ ozi na-ahụ ugbu a! N’eziokwu, ụmụnna nwaanyị niile nwere ihe ùgwù iji obi umeala gosi na ha na-erube isi site n’ido onwe ha n’okpuru ndị ikom n’ihu ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi!
a Onye Kraịst bụ́ nwunye anaghị ekpepụta ekpere ya ekpepụta mgbe ọ nọ n’ihu di ya bụ́ Onye Kraịst, ọ gwụla ma ọ̀ dị ihe mere di ya, dị ka mgbe ọrịa mere ka ọ ghara ịna-ekwu okwu.
b Ị chọọ ịgụkwu banyere isiokwu a, biko gụọ Ụlọ Nche July 15, 2002, peeji nke 26-27, na nke October 1, 1977, peeji nke 598-601.