ISIOKWU NDỊ ỌZỌ
Ikele Ọkọlọtọ, Ịtụ Vootu, na Ịrụ Ọrụ Na-abụghị Ọrụ Agha
Ikele Ọkọlọtọ. Ndịàmà Jehova kweere na ịkpọrọ ọkọlọtọ isiala ma ọ bụ ikele ya, nke a na-emekarị mgbe a na-abụ abụ e ji eto mba, bụ ife ya ofufe. Ha ghọtara na ime otú ahụ bụ ụzọ e si ekwu na nzọpụta dị n’aka obodo ma ọ bụ ndị ndú ya, ọ bụghị n’aka Chineke. (Aịzaya 43:11; 1 Ndị Kọrịnt 10:14; 1 Jọn 5:21) Otu n’ime ndị ndú dị otú ahụ bụ Eze Nebukadneza, onye chịrị Babịlọn oge ochie. Eze ahụ dị ike chọrọ ime ka ndị mmadụ mata na ya bụ eze ukwu nakwa na ya ji okpukpe ya kpọrọ ihe. N’ihi ya, o guzobere otu nnukwu ihe ọ kpụrụ ma nye ndị ọ na-achị iwu ka ha kpọọrọ ihe ahụ isiala mgbe a na-akụ egwú yiri abụ e ji eto mba. Ma, ndị Hibru atọ, bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego, ekweghị akpọrọ ihe ahụ isiala, n’agbanyeghị na e kwuru na a ga-egbu ha.—Daniel, isi nke 3.
N’oge anyị a, otu ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Carlton Hayes, dere, sị: “Ọkọlọtọ bụ ihe bụ́ isi e ji amata ndị kweere n’ịhụ mba n’anya, bụrụkwa ihe bụ́ isi ha na-efe ofufe. Ndị ikom na-ekpupụ okpu ha ma e jiri ọkọlọtọ na-agafe; ndị na-ede abụ na-ede abụ e ji eto ọkọlọtọ. Ụmụaka na-abụkwa abụ e ji eto ya.” O kwuru na ịhụ mba n’anya yiri okpukpe nwere “ụbọchị nsọ,” dị ka abalị anọ n’ọnwa asaa bụ ụbọchị nsọ n’obodo United States. O kwukwara na o nwere “ndị dike” a na-efe ofufe dị ka ndị nsọ, na ihu arụsị e weere na ọ bụ “ụlọ nsọ.” N’otu ememme ọhaneze e mere na Brazil, onyeisi ndị agha kwuru, sị: “A na-asọpụrụ ọkọlọtọ ma na-efe ya ofufe . . . otú ahụ anyị si efe ala nna anyị.” N’eziokwu, otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru otu mgbe, sị: “Ọkọlọtọ dị nsọ otú ahụ obe dị nsọ.”
Akwụkwọ ahụ kwuru n’oge na-adịbeghị anya na ‘ihe a na-abụ n’abụ e ji eto mba bụ ịhụ mba n’anya. A na-ejikarị ya arịọ Chineke ka o duzie ma chebe ndị mmadụ ma ọ bụ ndị na-achị ha.’ Ya mere, ndị ohu Jehova adịghị iberiibe mgbe ha kwuru na ememme ịhụ mba n’anya, bụ́ oge ndị mmadụ na-ekele ọkọlọtọ ma na-abụ abụ e ji eto mba, bụ ife ofufe. N’eziokwu, mgbe otu akwụkwọ ndị America na-ekwu ihe mere ụmụaka Ndịàmà Jehova ji jụ ikele ọkọlọtọ ma ọ bụ ịbụ abụ e ji eto mba n’ụlọ akwụkwọ dị na United States, o kwuru, sị: “N’ikpe dị iche iche Ụlọ Ikpe Kacha Elu kpere, ha emechaala kweta na ikele ọkọlọtọ na ịbụ abụ e ji eto mba bụ ife ofufe.”
Ọ bụ ezie na ndị Jehova anaghị eso eme ememme ha ghọtara na o megidere Akwụkwọ Nsọ, ha anaghị egbochi ndị mmadụ ime ya. Ha na-akwanyere ọkọlọtọ ùgwù dị ka ihe na-anọchi anya mba. Ha na-erubekwara “ndị ọchịchị” isi, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka “ndị ozi Chineke.” (Ndị Rom 13:1-4) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova na-erube isi n’iwu Chineke nyere ka ha na-ekpe ekpere “maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá dị elu.” Ma ihe mere anyị ji eme ya bụ “ka anyị wee na-ebi ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ ná nsọpụrụ Chineke zuru ezu na iji ihe kpọrọ ihe.”—1 Timoti 2:2.
Ịtụ vootu mgbe a na-ahọpụta ndị ọchịchị. Ezi Ndị Kraịst anaghị egbochi ndị ọzọ ịtụ vootu. Ha anaghị emegide ntụliaka ọchịchị, ha na-asọpụkwara ndị ọchịchị. Ma ha anaghị etinye aka ma otu ma otu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo. (Matiu 22:21; 1 Pita 3:16) Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o bi n’obodo ebe a na-amanye mmadụ ịtụ vootu ma ọ bụ n’obodo a na-ele ndị na-agaghị ebe a na-atụ vootu anya ọjọọ gafee ókè? Cheta na Shedrak, Mishak, na Abednego gara na mbara ala Dura. N’otu aka ahụ, Onye Kraịst nwere ike kpebie ịga ebe ahụ a na-atụ vootu ma ọ bụrụ na akọnuche ya anabata ya. Otú ọ dị, ọ ga-akpachara anya ka ọ ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. O kwesịrị ichebara ụkpụrụ isii ndị a echiche:
Ndị na-eso ụzọ Jizọs “abụghị nke ụwa.”—Jọn 15:19.
Ndị Kraịst na-anọchite anya Kraịst na Alaeze ya.—Jọn 18:36; 2 Ndị Kọrịnt 5:20.
Ọgbakọ Ndị Kraịst kweere n’otu ihe, ọ bụkwa ịhụnanya yiri nke Kraịst jikọtara ha niile.—1 Ndị Kọrịnt 1:10; Ndị Kọlọsi 3:14.
Ihe onye ọchịchị mere dị ndị tụnyeere ya vootu n’isi.—Cheta ihe mere e ji kwuo ihe ahụ e dere na 1 Samuel 8:5, 10-18 na 1 Timoti 5:22.
Mgbe ndị Izrel chọrọ ka e nye ha eze a na-ahụ anya, Jehova kwuru na ihe ahụ ha rịọrọ gosiri na ha ajụla Ya.—1 Samuel 8:7.
Ndị Kraịst kwesịrị inwe nkwuwa okwu mgbe ha na-agwa ndị mmadụ banyere ọchịchị Alaeze Chineke n’agbanyeghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ahụ nọ.—Matiu 24:14; 28:19, 20; Ndị Hibru 10:35.
Ịrụ Ọrụ Na-abụghị Ọrụ Agha. N’obodo ụfọdụ, ndị ọchịchị na-enye iwu na ndị jụrụ ịga agha ga-arụ ọrụ na-abụghị ọrụ agha ruo oge ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyị achọọ ime mkpebi n’ụdị ihe ahụ, anyị kwesịrị ikpe ekpere banyere ya. Anyị nwekwara ike ịgwa ya Onye Kraịst ibe anyị tozuru okè ma jirizie akọnuche anyị kpebie ihe anyị ga-eme, dabere n’ihe anyị ghọtara.—Ilu 2:1-5; Ndị Filipaị 4:5.
Okwu Chineke gwara anyị ka anyị ‘na-erubere ọchịchị na ikike dị iche iche isi dị ka ndị na-achị achị, ka anyị dịkwa njikere ịrụ ezi ọrụ ọ bụla, ka anyị nweekwa ezi uche.’ (Taịtọs 3:1, 2) Anyị nwere ike iburu nke ahụ n’uche jụọ onwe anyị, sị: ‘Ọ bụrụ na m kweta ịrụ ọrụ ahụ, ọ̀ ga-eme ka m tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’okpukpe ụgha?’ (Maịka 4:3, 5; 2 Ndị Kọrịnt 6:16, 17) ‘Ịrụ ọrụ a ọ̀ ga-eme ka o siere m ike ịrụ ọrụ dịịrị m dị ka Onye Kraịst ma ọ bụ gbochie m ịrụtụdị ya arụ?’ (Matiu 28:19, 20; Ndị Efesọs 6:4; Ndị Hibru 10:24, 25) ‘N’aka nke ọzọ, ịrụ ọrụ ahụ ọ̀ ga-enye m ohere ịrụkwu ọrụ Ndị Kraịst, ma eleghị anya, ịbanye n’ozi oge niile?’—Ndị Hibru 6:11, 12.
Ọ bụrụ na akọnuche Onye Kraịst ekwe ya ka ọ rụọ ọrụ na-abụghị ọrụ agha kama ịga mkpọrọ, Ndị Kraịst ibe ya ekwesịghị inye ya nsogbu. (Ndị Rom 14:10) Ma, ọ bụrụ na o kpebiri na ya agaghị arụ ọrụ ahụ, ndị ọzọ ekwesịghịkwa inye ya nsogbu.—1 Ndị Kọrịnt 10:29; 2 Ndị Kọrịnt 1:24.