Abụ nke 128
Ọnọdụ Ụwa A Na-agbanwe Agbanwe
Nke E Biri Ebi
1. Jaa nyer’anyị Ọkpara ya
K’ọ zọpụt’anyị n’aka ọnwụ,
K’anyị nweekwa olil’anya.
Onyinye ahụ pụr’iche.
(KORỌS)
Ọnọd’ụwa nke a
n’agbanwe ugbu a,
Chineke n’eme ndokwa
Ịgọzi el’igwe n’ụwa.
2. Ụw’anyị bi nọ ná nsogbu.
Ike agwụla ụw’ọjọ’a.
A’yị n’eto ọchịchị Chineke;
A mụọla Al’eze ya.
(KORỌS)
Ọnọd’ụwa nke a
n’agbanwe ugbu a,
Chineke n’eme ndokwa
Ịgọzi el’igwe n’ụwa.
(Gụọkwa Ọma 115:15, 16; Rom 5:15-17; 7:25; Mkpu. 12:5.)