Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Olee Ọrụ Ndị Okenye Na-arụ n’Ọgbakọ Anyị?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 15

      Olee Ọrụ Ndị Okenye Na-arụ n’Ọgbakọ Anyị?

      Okenye ya na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-akparịta ụka

      Finland

      Ebe okenye na-ezi ihe n’ọgbakọ

      Ha na-akụzi ihe

      Ebe ndị okenye na-agba ụmụnna ha ume

      Ha na-eleta anyị

      Okenye nọ n’ozi ọma

      Ha na-ezi ozi ọma

      Anyị enweghị ndị ụkọchukwu. Kama, anyị nwere ndị a na-akpọ ndị okenye. N’oge ndịozi Jizọs, a na-ahọpụta ụmụ nwoke ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru ka ha na-elekọta ma “na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.” Ọ bụkwa otú ahụ ka anyịnwa na-eme. (Ọrụ Ndịozi 20:28) Ndị okenye a na Chineke dị n’ezigbo mma. Ha ji obi ha dum na-azụ anyị, a naghị amanye ha amanye. Ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi elekọta atụrụ Chineke, ọ bụghị n’ihi na ha hụrụ uru aghụghọ n’anya. (1 Pita 5:​1-3) Olee ọrụ ha na-arụrụ anyị?

      Ha na-elekọta anyị. Ndị okenye na-eji Baịbụl agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ha na-enyekwara anyị aka ka anyị na Jehova dịrị ná mma. Ha ma na ọrụ a Chineke nyere ha dị mkpa. N’ihi ya, ha anaghị eji aka ike emeso anyị ihe. Kama, ha na-agbalị ịhụ na obi dị anyị mma. (2 Ndị Kọrịnt 1:24) Onye na-azụ atụrụ na-eleru atụrụ nke ọ bụla o nwere anya nke ọma. Otú ahụkwa ka ndị okenye na-eme. Ha na-agbalị ịma onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ anyị.​—⁠Ilu 27:⁠23.

      Ha na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eme uche Chineke. N’izu ọ bụla, ndị okenye na-akụziri anyị Okwu Chineke ma anyị gaa ọmụmụ ihe. Ihe ndị ahụ ha na-akụziri anyị na-eme ka okwukwe anyị nwere na Chineke sikwuo ike. (Ọrụ Ndịozi 15:32) Ha anaghị eji ozi ọma egwu egwu. Ha soro anyị na-aga ozi ọma, ha na-akụziri anyị otú dị iche iche e si ezi ozi ọma.

      Ha na-agba anyị ume. Ndị okenye na-enyere onye nke ọ bụla n’ime anyị aka ka ya na Chineke dịrị ná mma. Ka ha nwee ike ime ya, ha nwere ike leta mmadụ n’ụlọ ya. Ha nwekwara ike nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze jiri Baịbụl gbaa onye ahụ ume ma kasie ya obi.​—⁠Jems 5:​14, 15.

      Ọ bụghị naanị ọrụ ọgbakọ ka ndị okenye na-arụ. Ọtụtụ n’ime ha nwere ezinụlọ ha na-elekọta. Ha na-arụkwa ọrụ ha ji akpa afọ ezinụlọ ha. Ihe a niile na-eme ka ha ghara ịna-enwecha efe. N’eziokwu, ha na-arụsị ọrụ ike, anyị kwesịkwara ịna-akwanyere ha ezigbo ùgwù.​—⁠1 Ndị Tesalonaịka 5:​12, 13.

      • Olee ọrụ ndị okenye na-arụ n’ọgbakọ?

      • Olee ihe ndị okenye na-eme iji gosi na ha hụrụ anyị n’anya?

      IHE ỌZỌ Ị GA-EME

      Gịnị ka mmadụ ga-eme ka o nwee ike iru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi? Gụọ 1 Timoti 3:​1-10, 12, nakwa Taịtọs 1:​5-9 ka ị hụ ihe Baịbụl kwuru.

  • Olee Ọrụ Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 16

      Olee Ọrụ Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ?

      Ohu na-eje ozi na-enye ndị mmadụ Ụlọ Nche

      Mianmaa

      Ebe ohu na-eje ozi na-akụzi ihe

      Ha na-akụzi ihe

      Ebe ohu na-eje ozi na-ekwu ihe e nwere ike izi mmadụ n’ozi ọma

      Ha na-ahazi ndị pụtara ozi ọma

      Ebe ohu na-eje ozi na-aza Ụlọ Nzukọ Alaeze

      Ha na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha

      Baịbụl kwuru na e nwere ụzọ ndị nwoke abụọ na-arụrụ ọgbakọ ọrụ. Ha bụ “ndị nlekọta [ya bụ, ndị okenye] na ndị ohu na-eje ozi.” (Ndị Filipaị 1:⁠1) N’ọgbakọ ọ bụla, a na-enwekarị ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Olee ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ?

      Ha na-enyere ndị okenye aka. Ndị ohu na-eje ozi na Jehova dị n’ezigbo mma. Ha kwesịrị ntụkwasị obi, dịrịkwa uchu. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto, ụfọdụkwa abụrụ ndị torola eto. Ha na-arụ ọrụ ndị dị mkpa n’ọgbakọ, bụ́ ndị na-eme ka ihe na-aga siriri werere. Ọrụ ha na-abụkarịkwa ọrụ e ji ọkpụkpụ aka arụ. Ọrụ ndị a ha na-arụ na-eme ka ndị okenye nwee ike ilekwasị anya n’ịkụzi ihe na ilekọta ọgbakọ.

      Ha na-arụ ọrụ ndị bara uru. Ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi bụ ndị atendantị. Ha na-anabata ndị bịara ọmụmụ ihe. Ndị ọzọ na-elekọta ígwè e ji ekwu okwu. E nwekwara ndị nke na-ahụ maka akwụkwọ anyị, nweekwa ndị nke na-ahụ maka ego ọgbakọ. Ụfọdụkwa na-ahụ maka ebe ọgbakọ na-aga ekwusa ozi ọma. Ndị ohu na-eje ozi na-enyekwa aka edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. Ndị okenye nwere ike gwa ụfọdụ n’ime ha ka ha gaa na-enyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ aka. N’eziokwu, ha na-eji obi ha niile arụ ụdị ọrụ ọ bụla a gwara ha rụọ. Ọ bụ ya mere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ji akwanyere ha ùgwù.​—⁠1 Timoti 3:⁠13.

      Ha na-akpa àgwà e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. Ihe mere e ji ahọpụta ndị ohu na-eje ozi bụ na ha na-akpa àgwà ọma ndị e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. Ha na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike ma ha na-ezi anyị ihe n’ọgbakọ. Otú ha si agachi ozi ọma anya na-eme ka anyị jiri ịga ozi ọma kpọrọ ihe. Ha anaghị agba ihe ndị okenye kwuru ụkwụ. Nke a na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, ndị nọ na ya ana-enwekwa obi ụtọ. (Ndị Efesọs 4:16) Ka oge na-aga, hanwa nwekwara ike ịbụ ndị okenye.

      • Olee ụdị ndị ndị ohu na-eje ozi bụ?

      • Olee otú ndị ohu na-eje ozi si enye aka eme ka ihe na-aga siriri werere n’ọgbakọ?

      IHE ỌZỌ Ị GA-EME

      Ị gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, gbalịa mata otu okenye ma ọ bụ otu ohu na-eje ozi. Na-eme otú a ruo mgbe ị matachara ma ha ma ndị ezinụlọ ha.

  • Gịnị Bụ Ọrụ Ndị Nlekọta Sekit?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 17

      Gịnị Bụ Ọrụ Ndị Nlekọta Sekit?

      Onye nlekọta sekit na nwunye ya

      Malawi

      Ebe onye nlekọta sekit na-ahazi ndị pụtara ozi ọma

      Ha na-ahazi ndị pụtara ozi ọma

      Onye nlekọta sekit nọ ozi ọma

      Ha na-eso anyị aga ozi ọma

      Onye nlekọta sekit na ndị okenye ọgbakọ na-enwe nnọkọ

      Ha na ndị okenye na-enwe nnọkọ

      N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e kwuru ọtụtụ ihe gbasara Banabas na Pọl onyeozi. Ha bụ ndị okenye, ndị na-aga eleta ọgbakọ ndị e nwere n’oge ahụ. Gịnị mere ha ji aga eleta ha? Ọ bụ maka na ha chọrọ ka ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ na Chineke na-adị ná mma. Pọl gwara Banabas ka ha “laghachi gaa leta ụmụnna,” ka ha hụ otú ha mere. Ha abụọ kwo maka ileta ụmụnna ha gaa ebe ndị dị ezigbo anya. N’ọgbakọ ọ bụla ha ruru, ha agbaa ụmụnna ha ume ma mee ka okwukwe ha sikwuo ike. (Ọrụ Ndịozi 15:36) Ọ bụkwa otu ihe ahụ mere ndị anyị na-akpọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ji aga eleta ọgbakọ anyị taa.

      Ha na-abịa agba anyị ume. Onye nlekọta sekit ọ bụla na-aga eleta ihe dị ka ọgbakọ iri abụọ. Ọ na-eleta ọgbakọ nke ọ bụla ugboro abụọ n’afọ. Ọ na-anọkwa otu izu ma ọ gaa ileta ha. Anyị na-amụta ọtụtụ ihe n’aka ha nakwa n’aka ndị nwunye ha, ma ọ bụrụ na ha lụrụ nwaanyị. Ha na ndị nwunye ha na-agbalị ịmata ma ndị na-eto eto ma ndị agadi nọ n’ọgbakọ. Ha na-esokwa anyị aga ozi ọma. Ha na-eso ndị okenye aga eleta ụmụnna ndị e kwesịrị inyere aka. Ihe ndị ha na-akụziri anyị ma ha bịa ileta anyị na ihe ha na-akụzi ma anyị gaa mgbakọ na-agba anyị ume.​—⁠Ọrụ Ndịozi 15:⁠35.

      Ha hụrụ mmadụ niile nọ n’ọgbakọ n’anya. Ha na-enyere ọgbakọ aka ka ha na-eme nke ọma n’ofufe Chineke. Ha bịa ileta ọgbakọ, ha na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-anọkọ leba anya n’otú ihe si na-aga. Ha na-agwakwa ha ihe ndị ha ga-eme ka ha nwee ike na-arụkwu ọrụ ha nke ọma. Ha na-agwa ndị ọsụ ụzọ ihe ndị ga-enyere ha aka ịna-aga ozi ha nke ọma. Ha na-agbakwa mbọ mata ndị ọhụrụ na-abịa ọmụmụ ihe anyị ma chọpụta otú ha si na-eme n’ọgbakọ. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eji obi ha niile arụ ọrụ ha. Baịbụl kpọrọ ha ndị ọrụ ‘ibe anyị maka ọdịmma anyị.’ (2 Ndị Kọrịnt 8:23) Anyị kwesịrị iṅomi okwukwe ha.​—⁠Ndị Hibru 13:⁠7.

      • Gịnị mere ndị nlekọta sekit ji aga eleta ọgbakọ?

      • Olee ihe i nwere ike ime ka ọbịbịa ha baara gị uru?

      IHE ỌZỌ Ị GA-EME

      Chọpụta ụbọchị onye nlekọta sekit ga-abịa. Gaa na kalenda gị kaa akara n’ụbọchị ahụ, ka i nwee ike icheta gaa gere okwu ọ ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka yanwa ma ọ bụ nwunye ya soro onye gị na ya na-amụ ihe bịa mụọrọ gị ihe n’izu ahụ, gwa onye ahụ gị na ya na-amụ ihe.

  • Olee Otú Anyị Si Agbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka ma Ha Nwee Ọdachi?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 18

      Olee Otú Anyị Si Agbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka ma Ha Nwee Ọdachi?

      Ebe Ndịàmà Jehova na-enyere ụmụnna ha aka mgbe e nwere ọdachi na Dọminikan Ripọblik

      Dọminikan Ripọblik

      Ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe e nwere ọdachi na Japan

      Japan

      Onyeàmà Jehova na-akasi mmadụ obi mgbe e nwechara ọdachi na Heiti

      Heiti

      E nwee ọdachi n’obodo, Ndịàmà Jehova na-agbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka ozugbo. Ihe a anyị na-eme na-egosi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya n’eziokwu. (Jọn 13:​34, 35; 1 Jọn 3:​17, 18) Olee otú anyị si enyere ụmụnna anyị aka?

      Anyị na-atụkọtara ha ego. N’oge ndịozi Jizọs, e nwere mgbe ụnwụ kpara obodo Judia aka ọjọọ. Ndị Kraịst nọ n’Antiọk atụkọta ego, zigara ụmụnna ha nọ na Judia. (Ọrụ Ndịozi 11:​27-30) Taakwa, anyị nụ na ihe na-esiri ụmụnna anyị nọ n’obodo ọzọ ike, anyị na-atụkọta ihe n’ọgbakọ anyị dị iche iche, zigara ha.​—⁠2 Ndị Kọrịnt 8:​13-15.

      Anyị na-ewepụta onwe anyị rụọrọ ha ọrụ. Ndị okenye ndị nọ n’obodo ahụ njinji jiri na-agba mbọ mata ebe ụmụnna niile nọ nakwa otú ha mere. A na-ahọpụta ụmụnna ndị ga na-ekesa nri, mmiri ọṅụṅụ, uwe, na ọgwụ ndị e ziteere ụmụnna anyị. Ha na-ahụkwa na ndị nke na-enwekwaghị ụlọ nwere ebe ha ga-ebi. Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị nwere aka ọrụ na-eji ego ha gbaa ụgbọ gaa ebe ahụ e nwere ọdachi. Ha ruo, ha esoro na-ekesa onyinye ndị e zitere, nyekwa aka na-arụziri ha ụlọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe mere ọ naghị esiri anyị ike ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka ngwa ngwa bụ na anyị dị n’otu. O teekwala anyị mewere ya. Ọ bụ eziokwu na anyị na-enyere ụmụnna anyị aka ma ha nwee ọdachi, anyị na-agbalịkwa nyere ndị na-abụghị ụmụnna anyị aka.​—⁠Ndị Galeshia 6:⁠10.

      Anyị na-eji Baịbụl akasi ha obi. Onye nwere ọdachi na-achọkarị ka a kasie ya obi. Ya mee ụmụnna anyị, Jehova na-enye ha ike idi ya n’ihi na ọ bụ “Chineke nke nkasi obi niile.” (2 Ndị Kọrịnt 1:​3, 4) Anyịnwakwa na-aga echetara ha nkwa Baịbụl kwere na Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu niile ụmụ mmadụ na-enwe kwụsị.​—⁠Mkpughe 21:⁠4.

      • Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị egbu oge agbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka ma ha nwee ọdachi?

      • Olee otú anyị si eji Baịbụl akasi ndị na-eru uju obi?

  • Ònye Bụ Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 19

      Ònye Bụ Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?

      Ebe Jizọs na-agwa ụmụazụ ya okwu
      Onyeàmà Jehova na-amụ Baịbụl

      Ihe ohu ahụ na-akụziri anyị na-abara anyị uru

      Ụmụnna abụọ so n’òtù na-achị isi nke Ndịàmà Jehova

      Obere oge tupu e gbuo Jizọs, ya na Pita, Jems, Jọn, na Andru kpara nkata. Ná nkata ahụ, ha jụrụ Jizọs ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ usoro ihe a. Mgbe ọ na-aza ya, ya ajụọ otu ajụjụ dị ezigbo mkpa. Ọ jụrụ, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?” (Matiu 24:​3, 45; Mak 13:​3, 4) Ihe Jizọs ji ajụjụ ahụ na-ekwu bụ na yanwa, bụ́ nna ha ukwu, ga-ahọpụta “ohu” ga na-enye ndị na-eso ụzọ ya nri ime mmụọ n’oge ikpeazụ a. “Ohu” ahụ abụghị naanị otu onye. Oleezi ndị ha bụ?

      Ha bụ Ndị Kraịst ole na ole Chineke ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ọ bụ ha bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ha na-enye Ndị Kraịst ibe ha nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. Ọ bụ hanwa na-enye anyị ‘nri ga-ezuru anyị n’oge kwesịrị ekwesị.’​—⁠Luk 12:⁠42.

      Ha na-elekọta ezinụlọ Chineke. (1 Timoti 3:15) Jizọs gwara ha ka ha na-elekọta ọgbakọ Jehova n’ụwa. Ha ga na-ahụ maka ihe ndị dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ na alaka ụlọ ọrụ dị iche iche e nwere n’ụwa. Ha ga na-ahụkwa gbasara ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa, na-ahazikwa ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe n’ọgbakọ. “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụtara anyị akwụkwọ dị iche iche anyị ji aga ozi ọma. Ọ bụkwa ha na-ahụ maka ihe ndị anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ọ bụ ụzọ ndị a ka ha si na-enye anyị nri ime mmụọ dị anyị mkpa n’oge kwesịrị ekwesị.

      Ohu ahụ na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl, ha jikwa ọrụ ikwusa ozi ọma Jizọs nyere ha kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị na ha kwesịrị ntụkwasị obi. Jizọs kwukwara na ha nwere uche. Nke a gosiri na ha na-akpachapụ anya elekọta ihe niile o nwere n’ụwa. (Ọrụ Ndịozi 10:42) Taa, Jehova na-enyere ọtụtụ ndị aka ka ha bata n’ọgbakọ ya. Ọ na-enyekwara ohu ahụ aka ka ha na-enye ha niile nri ime mmụọ ga-ezuru ha.​—⁠Aịzaya 60:22; 65:⁠13.

      • Olee ndị Jizọs họpụtara ka ọ na-enye ndị na-eso ụzọ ya nri ime mmụọ?

      • Olee otú o si bụrụ na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ma nwee uche?

  • Olee Ọrụ Òtù Na-achị Isi Na-arụ Taa?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 20

      Olee Ọrụ Òtù Na-achị Isi Na-arụ Taa?

      Òtù na-achị isi e nwere n’oge ndịozi

      Òtù na-achị isi e nwere n’oge ndịozi

      Ebe Ndị Kraịst oge ochie na-agụ akwụkwọ ozi òtù na-achị isi ziteere ha

      Ọ na-agụpụta akwụkwọ ozi òtù na-achị isi detaara ọgbakọ

      N’oge ndịozi Jizọs, ọ bụ “ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem” bụ òtù na-achị isi. Ọ bụ ha na-ekpebi otú ihe si aga n’ọgbakọ ndị e nwere n’oge ahụ. (Ọrụ Ndịozi 15:⁠2) Ihe na-enyere ha aka iji otu olu na-ekpebi ihe a ga-eme bụ na ha na-atụle ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, na-ekwekwa ka mmụọ nsọ na-eduzi ha. (Ọrụ Ndịozi 15:25) Ọ bụ otu ihe ahụ ka Òtù Na-achị Isi e nwere taa na-eme.

      Chineke si n’aka ha na-eme uche ya. Ọ bụ ụmụnna nwoke ndị Chineke ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ Òtù Na-achị Isi taa. Ha anaghị eji Okwu Chineke egwu egwu. Ha ma otú e kwesịrị isi na-ahazi ozi ọma anyị na-ekwusa na otú e si aza ajụjụ ndị gbasara Baịbụl. Ha na-ezukọ kwa izu tụlee otú ihe ga-esi na-aga n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile. Tupu ha ekwuo ihe a ga-eme n’ọgbakọ, ha na-atụle ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ha tụlechaa ya, ha edegara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi ma ọ bụkwanụ si n’aka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị gwa anyị ihe anyị ga-eme. Otú a ha si eme ka òtù na-achị isi mere n’oge ndịozi. Nke a na-eme ka Ndịàmà Jehova dịrị n’otu ma n’otú ha si eche echiche ma n’otú ha si akpa àgwà. (Ọrụ Ndịozi 16:​4, 5) Ọ bụ Òtù Na-achị Isi na-ahụ maka nri ime mmụọ a na-enye anyị taa. Ha na-agbakwa mmadụ niile ume ka ha jiri ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụkwa ha na-ekwu otú a ga-esi na-ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi.

      Mmụọ Chineke na-edu ha. Tupu Òtù Na-achị Isi emee ihe ọ bụla, ha na-atụle ihe Jehova na Jizọs kwuru. Ị manụ na Chineke bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ala, Jizọs abụrụ Isi nke ọgbakọ Chineke. (1 Ndị Kọrịnt 11:3; Ndị Efesọs 5:23) Òtù Na-achị Isi anaghị ewere onwe ha ka ndị isi anyị. Ha na ndị ọzọ Chineke ji mmụọ nsọ tee mmanụ “na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.” (Mkpughe 14:⁠4) Obi na-adị ha ụtọ ma anyị na-echeta ha n’ekpere.

      • Ole ndị so n’òtù na-achị isi e nwere n’oge ndịozi?

      • Olee otú mmụọ Chineke si na-edu Òtù Na-achị Isi e nwere n’oge a?

      IHE ỌZỌ Ị GA-EME

      Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:​1-35. Ị ga-ahụ otú Akwụkwọ Nsọ na mmụọ nsọ si nyere òtù na-achị isi e nwere n’oge ndịozi aka ikwu ihe a ga-eme gbasara ibi úgwù.

  • Gịnị Bụ Betel?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 21

      Gịnị Bụ Betel?

      Ndịàmà Jehova abụọ a na-arụ ọrụ na Betel. Ha na-arụ ná Ngalaba na-ahụ maka ihe a na-ese n’akwụkwọ anyị

      Ngalaba na-ahụ maka ihe a na-ese n’akwụkwọ anyị. Ọ dị n’Amerịka

      Onyeàmà Jehova na-arụ ọrụ na Betel dị na Jamanị, n’ebe a na-ebi akwụkwọ

      Jamanị

      Onyeàmà Jehova a na-arụ ọrụ n’ebe a na-asa ákwà, na Betel dị na Kenya

      Kenya

      Ndị na-edozi ebe a na-anọ eri nri na Betel dị na Kolombia

      Kolombia

      Betel bụ okwu Hibru. Ọ pụtara “ụlọ Chineke.” (Jenesis 28:​17, 19) Ihe a ka a na-akpọ ebe niile Ndịàmà Jehova na-anọ ebi akwụkwọ ha ma na-ahazi otú ọrụ ikwusa ozi ọma ha na-arụ ga-esi na-aga. Aha a dabara adaba n’ihi na ihe niile a na-eme ebe ahụ bụ gbasara ofufe Chineke. Òtù Na-achị Isi nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Niu Yọk nke Amerịka. Ha na-anọ ebe ahụ ekwu otú ihe ga-esi na-aga n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche e nwere n’ụwa. A na-akpọ ma ndị na-arụ n’isi ụlọ ọrụ anyị ma ndị na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị ndị ezinụlọ Betel. Ihe mere e ji akpọ ha ezinụlọ bụ na ha bi otu ebe, na-arụkọkwa ọrụ ọnụ. Ha na-anọ otu ebe eri nri, na-amụkọkwa Baịbụl ọnụ.​—⁠Abụ Ọma 133:⁠1.

      Ọ bụ ebe pụrụ iche ndị mmadụ na-eji obi ha niile arụkọ ọrụ ọnụ. Ị gaa na Betel, ị ga-ahụ ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ha ji obi ha niile na-eme uche Chineke. Ha jikwa oge ha niile na-arụ ọrụ gbasara Alaeze Chineke. (Matiu 6:33) A naghị akwụ ha ụgwọ ọnwa, kama, a na-enye ha ego mmachi akpa. A na-enyekwa ha nri na ụlọ ha ga-ebi. Onye ọ bụla nọ na Betel nwere ọrụ ọ na-arụ. E nwere ndị na-arụ n’ọfịs, nweekwa ndị na-arụ n’ebe a na-esi nri, ma ọ bụ n’ebe a na-anọ eri nri. Ụfọdụ na-arụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ, ndị ọzọ ana-arụ n’ebe a na-asa ákwà. E nwekwara ndị na-edowe ụlọ ọcha nakwa ndị na-emezi ihe ndị mebiri emebi.

      Ọ bụ ebe a na-arụ ọrụ gbasara Alaeze Chineke. Ọrụ bụ́ isi a na-arụ na Betel bụ ọrụ gbasara ịkụziri ndị mmadụ Okwu Chineke. Akwụkwọ a i ji bụ otu n’ime ihe ndị e ji akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke. Ọ bụ Òtù Na-achị Isi kpebiri ihe e dere na ya, e jirizie kọmputa zigara ya ọtụtụ ndị nsụgharị e nwere n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche. Mgbe ha sụgharịchara ya, e jiri ígwè na-ebipụta ọtụtụ akwụkwọ n’otu ntabi anya bipụta ya. Mgbe e bichara ya, e bugaara ya ọgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile. Ha dị ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ na puku iri. Ihe a niile ndị ezinụlọ Betel mere bụ iji kwado ọrụ kacha mkpa anyị na-arụ. Ọrụ ahụ bụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.​—⁠Mak 13:⁠10.

      • Ole ndị na-arụ na Betel? Oleekwa otú e si elekọta ha?

      • Olee ọrụ dị mkpa onye ọ bụla nọ na Betel na-akwado?

  • Gịnị Ka A Na-eme n’Alaka Ụlọ Ọrụ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 22

      Gịnị Ka A Na-eme n’Alaka Ụlọ Ọrụ?

      Ndị na-ahazi ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Sọlọmọn Aịlands

      Sọlọmọn Aịlands

      Onyeàmà Jehova na-arụ ọrụ na Betel dị na Kanada

      Kanada

      Ụgbọala e ji ebugara ụmụnna akwụkwọ anyị

      Saụt Afrịka

      Ndị ezinụlọ Betel na-arụ ọrụ na ngalaba dị iche iche. Ọrụ niile ha na-arụ bụ maka ozi ọma a na-ekwusa ná mba ebe alaka ụlọ ọrụ ahụ dị ma ọ bụkwanụ ná mba ndị ọ na-elekọta. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nsụgharị, ndị ọzọ na-arụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ. O nwekwara ndị na-arụ n’ebe a na-ebusa akwụkwọ, nwee ndị nke na-arụ n’ebe a na-emepụta ma vidio ma siidi ndị a na-egere egere. O nwere ndị ọrụ ha bụ ịhụ maka nsogbu ọ bụla e nwere n’ebe alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta.

      Kọmitii Alaka na-elekọta ya. O nwere ndị Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta n’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla ka ha na-ahụ maka ọrụ niile a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. A na-akpọ ha Kọmitii Alaka. Ha na-adị ndị okenye atọ ma ọ bụ karịa. Ọ bụ ha na-agwa Òtù Na-achị Isi otú ihe si na-aga ná mba ahụ nakwa ná mba ndị ọzọ ha na-elekọta. E nweekwa nsogbu ọ bụla, ha agwa ha. Ihe ndị ahụ ha na-agwa Òtù Na-achị Isi na-enyere ha aka ịma ihe a ga-ebipụta n’akwụkwọ anyị. Ọ na-enyekwara ha aka ikpebi ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ anyị dị iche iche. O nwere ndị Òtù Na-achị Isi na-eziga ka ha gaa leta alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. Ha bịa n’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla, ha agwa Kọmitii Alaka ihe ndị ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha nke ọma. (Ilu 11:14) N’alaka ụlọ ọrụ ọ bụla onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị bịara, a na-eme ndokwa ka ọ gwa ụmụnna okwu pụrụ iche ga-agba ha ume.

      A na-anọ na ya ahazi otú ihe ga-esi na-aga n’ọgbakọ. N’alaka ụlọ ọrụ, o nwere ndị e nyere ọrụ ka ha na-ehiwe ọgbakọ ọhụrụ. Ọ bụ ụmụnna ndị a na-ahụ maka ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi ala ọzọ na ndị nlekọta sekit e nwere n’ebe niile alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta. Ha na-agwa ọgbakọ mgbe ha ga-aga mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu. O nwere ụmụnna ndị na-ahụ maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, nwee ndị na-ahụ maka ibugara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ. Ọrụ niile a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ na-enye aka eme ka ọrụ ikwusa ozi ọma na-aga n’usoro.​—⁠1 Ndị Kọrịnt 14:​33, 40.

      • Olee otú Kọmitii Alaka si enyere Òtù Na-achị Isi aka?

      • Olee ọrụ ndị a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ?

      IHE ỌZỌ Ị GA-EME

      Ị chọọ ịga legharịa anya n’alaka ụlọ ọrụ anyị ọ bụla, i nwere ike ịga malite n’ụbọchị Mọnde ruo ụbọchị Fraịdee. Ị gaa, e nwere onye ga-akpọ gị gagharịa ka ị hụ otú e si arụ ọrụ ebe ahụ. Ị chọọ ịga, jie ejiji dị mma otú ahụ i si eji ma ị gawa ọmụmụ ihe. Ihe ị ga-ahụ ebe ahụ ga-eme ka okwukwe i nwere na Chineke sikwuo ike.

  • Olee Otú E Si Ede Akwụkwọ Anyị? Oleekwa Otú E Si Asụgharị Ha?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 23

      Olee Otú E Si Ede Akwụkwọ Anyị? Oleekwa Otú E Si Asụgharị Ha?

      Onye na-arụ ná Ngalaba Ide Ihe dị n’Amerịka

      Ngalaba Ide Ihe dị n’Amerịka

      Ndị nsụgharị na-arụ ọrụ na Betel dị na Saụt Koria

      Saụt Koria

      Nwoke onye Aminia ji akwụkwọ Ndịàmà Jehova sụgharịrị

      Aminia

      Nwa agbọghọ onye Buruundi ji akwụkwọ Ndịàmà Jehova sụgharịrị

      Buruundi

      Nwaanyị onye Sri Lanka ji Ụlọ Nche na Teta! Ndịàmà Jehova sụgharịrị

      Siri Lanka

      Anyị na-ezi ndị “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” ozi ọma Alaeze Chineke. Ihe na-enyere anyị aka ime ya bụ akwụkwọ anyị na-ebipụta n’ihe karịrị narị asụsụ asaa na iri ise. (Mkpughe 14:⁠6) Ibi akwụkwọ n’asụsụ dị iche iche abụghị obere ọrụ. Ma, gịnị na-enyere anyị aka? Anyị nwere ndị ọrụ ha bụ ide ihe, nweekwa ọtụtụ ndị nsụgharị n’ụwa niile. Ma ndị na-ede ihe ma ndị na-asụgharị ya bụcha Ndịàmà Jehova.

      A na-ebu ụzọ ede ha n’asụsụ Bekee. N’isi ụlọ ọrụ anyị, e nwere ngalaba a na-akpọ Ngalaba Ide Ihe. Òtù Na-achị Isi na-elekọta ya. Ọrụ ha bụ ide ihe. Ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ na ya na-anọ n’isi ụlọ ọrụ anyị ede ihe, ndị ọzọ anọrọ n’ụfọdụ alaka ụlọ ọrụ anyị. Ma, ọ bụ ngalaba a na-agwa onye nke ọ bụla isiokwu ọ ga-ede. Ọ na-abụ onye dechaa, ya ezigara Ngalaba Ide Ihe ihe o dere. Otú a ha si nọrọ ná mba dị iche iche na-ede ihe mere ka ihe a na-ede n’akwụkwọ anyị na-abara mmadụ niile uru n’agbanyeghị omenala ha.

      A na-ezigara ha ndị nsụgharị. E dechaa ihe a chọrọ ibi n’akwụkwọ anyị, e nye ya ndị ga-agụgharị ya ma dezie ihe ọ bụla e dejọrọ. E mechaa, Ngalaba Ide Ihe esi na kọmputa zigara ya ndị nsụgharị. Ndị nsụgharị sụgharịchaa, ha elee ma ihe ha sụgharịrị na ihe Bekee kwuru ọ̀ bụ otu ihe. Ha mechaa, ha agụgharịa ya. Ndị nsụgharị na-eji ‘okwu ziri ezi na nke bụ́ eziokwu’ asụgharị ihe e dere otú ndị ga-agụ ya ga-aghọta ya.​—⁠Ekliziastis 12:⁠10.

      A na-eji kọmputa eme ka ọrụ a na-aga aga. Kọmputa anaghị arụ ọrụ ndị na-ede ihe na ndị na-asụgharị ihe na-arụ. Ma, ha na-eji ya arụ ọrụ ha ngwa ngwa. Na kọmputa ndị nsụgharị ji arụ ọrụ, e nwere akwụkwọ ọkọwa okwu, nweekwa ngwá ọrụ ndị ọzọ na-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha nke ọma. O nwere ihe Ndịàmà Jehova mepụtara a na-akpọ MEPS. Ọ na-enyere ndị nsụgharị aka ide mkpụrụ akwụkwọ ndị e nwere n’asụsụ dị iche iche. Ha sụgharịchaa, e tinye foto n’ebe ndị e kwesịrị itinye ha, mezie ya otú ọ ga-adịrị ígwè na-ebiri anyị akwụkwọ mfe ibi ya.

      Gịnị mere anyị ji agba mbọ a niile? Gịnị mere anyị ji na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ ndị na-agụ ha bụ naanị puku mmadụ ole na ole? Ọ bụ maka na uche Jehova bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”​—⁠1 Timoti 2:​3, 4.

      • Olee otú e si ede ihe ndị a na-ebi n’akwụkwọ anyị?

      • Gịnị mere anyị ji asụgharị akwụkwọ anyị n’ọtụtụ asụsụ?

  • Olee Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Na-arụ Ọrụ Ikwusa Ozi Ọma n’Ụwa Niile?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 24

      Olee Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Na-arụ Ọrụ Ikwusa Ozi Ọma n’Ụwa Niile?

      Onye na-etinye ego n’igbe onyinye
      Ndịàmà Jehova nọ ozi ọma

      Nipọl

      Ndịàmà Jehova na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Togo

      Togo

      Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Briten

      Briten

      Kwa afọ, anyị na-ebipụta nde kwuru nde akwụkwọ na Baịbụl, na-ekesara ha ndị mmadụ. Anyị na-ewepụtakwa ihe ndị dị ka vidio. Ma, o nweghị nke n’ime ha anyị na-ere ere. Anyị na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na alaka ụlọ ọrụ n’obodo dị iche iche, na-arụzikwa ihe ọ bụla mebiri na ha. Anyị na-elekọtakwa ndị na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ na ndị ozi ala ọzọ. E nweekwa ọdachi ná mba ọ bụla, anyị na-agbatara ụmụnna anyị ndị bi ebe ahụ ọsọ enyemaka. Ma, olee otú anyị si enweta ego anyị ji eme ihe a niile?

      Anyị anaghị ana ụtụ ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ iri. Ọ bụ eziokwu na ọrụ ikwusa ozi ọma anyị na-arụ na-efu anyị ezigbo ego, anyị anaghị eke ụtụ ma ọ bụ na-ebugharị efere. Anyị anaghịkwa arịọ ego. Mgbe anyị malitere ibi magazin anyị a na-akpọ Ụlọ Nche, anyị kwuru ná mbipụta ya nke abụọ na obi siri anyị ike na Jehova ga na-akwado anyị. Anyị kwukwara na anyị agaghị arịọ ndị mmadụ ego. Ruokwa taa, o nwebeghị onye anyị rịọrọ arịrịọ.​—⁠Matiu 10:⁠8.

      E ji onyinye si ndị mmadụ n’obi akwado ọrụ anyị. Ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ, ha na-enyekwa anyị onyinye. Anyịnwakwa na-eji obi ụtọ ewepụta oge na ike anyị arụ ọrụ a. Anyị na-enyekwa onyinye iji kwadoo ya. (1 Ihe E Mere 29:⁠9) N’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’ala mgbakọ anyị, e nwere igbe ndị ọ ga-abụ onye chọọ, ya agaa tinye ego ọ chọrọ inye n’onyinye. Mmadụ nwekwara ike isi n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig zite onyinye ya. Ego a na-enweta n’igbe ndị ahụ na-abụkarị ego ndị dara ogbenye ji obi ha niile nye. Ha na-eme ihe ahụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye mere n’oge Jizọs. N’agbanyeghị na ego o tinyere n’igbe onyinye bụ mkpụrụ ego abụọ ga-azụtali ihe dị ntakịrị, Jizọs jara ya mma. (Luk 21:​1-4) N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị na-ewepụta ihe ọ ga-enye n’onyinye. Ma, ọ na-abụ “dị ka o kpebiri n’obi ya.”​—⁠1 Ndị Kọrịnt 16:2; 2 Ndị Kọrịnt 9:⁠7.

      Obi siri anyị ike na Jehova ga-eme ka ndị chọrọ iji ‘ihe ha ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ ya’ na-enye onyinye maka ọrụ ozi ọma a anyị na-arụ. Anyị ga-arụgide ya ruo mgbe Chineke ga-asị na o zuola.​—⁠Ilu 3:⁠9.

      • Gịnị mere ọgbakọ Ndịàmà Jehova ji dị iche na chọọchị ndị e nwere taa?

      • Olee ihe anyị ji onyinye ndị mmadụ nyere eme?

  • Gịnị Mere Anyị Ji Arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze? Oleekwa Otú E Si Enweta Ego E Ji Arụ Ha?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 25

      Gịnị Mere Anyị Ji Arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze? Oleekwa Otú E Si Enweta Ego E Ji Arụ Ha?

      Ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Bolivia

      Bolivia

      Otú Ụlọ Nzukọ Alaeze a dị na Naịjirịa dị tupu a rụgharịa ya
      Otú Ụlọ Nzukọ Alaeze a dị na Naịjirịa dịzi mgbe a rụgharịrị ya

      Naịjirịa, otú ọ dị mbụ na otú ọ dị ugbu a

      Ebe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Tehiti

      Tehiti

      Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe anyị na-anọ efe Jehova. Ihe bụ́ isi e ji Baịbụl akụziri anyị ebe ahụ bụ Alaeze Chineke. Ọ bụ alaeze ahụ ka Jizọs ji mere isiokwu ozi ọma ya mgbe ọ nọ n’ụwa.​—⁠Luk 8:⁠1.

      A na-anọ ebe ahụ ahazi ozi ọma anyị na-ezi. Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe Ndịàmà Jehova na-anọ ahazi ozi ọma ha na-ezi n’obodo ha. (Matiu 24:14) Ha niile anaghị aha otu, e nwekwara otú dị iche iche e si arụ ha. Ma, o nweghị nke n’ime ha na-ebu oké ibu. Ihe karịrị otu ọgbakọ na-amụkwa ihe n’ọtụtụ n’ime ha. Anyị arụọla ọtụtụ puku Ụlọ Nzukọ Alaeze na nso nso a n’ihi otú e si na-enwe ọtụtụ ọgbakọ ọhụrụ. A na-arụ ihe dị ka ise n’otu ụbọchị. Olee otú anyị si enweta ego anyị ji arụ ha?​—⁠Matiu 19:⁠26.

      E ji ego e nyere n’onyinye arụ ha. A na-ezigara alaka ụlọ ọrụ ego ọ bụla a hụrụ n’ime ya. Ha ga-ejizi ya nyere ọgbakọ ọ bụla chọrọ ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka ma ọ bụkwanụ nyere ndị nke chọrọ ịrụzi nke ha mebiri emebi aka.

      Ọ bụ ndị ọrụ a na-anaghị akwụ ụgwọ na-arụ ha. N’ọtụtụ mba, e nwere ndị a na-akpọ Ìgwè Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị a nwere aka ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha si n’ezinụlọ nwere ego, ụfọdụ esiri n’ezinụlọ ndị ogbenye. Ha na-aga ọtụtụ ebe ná mba ha, na-arụrụ ọgbakọ dị iche iche Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha na-agadị n’ime ime obodo. Ná mba ndị ọzọ, e nwere ụmụnna ndị na-ahụ maka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ịrụzi ndị nke mebiri emebi. A na-agwa ha ebe ha ga na-arụ ọrụ. N’agbanyeghị na ọtụtụ ụmụnna ndị nwere aka ọrụ na-ewepụta onwe ha nye aka n’ebe ọ bụla a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ bụ ụmụnna ndị a na-arụrụ ya na-aka ná ndị ọrụ. Otú ha si eji obi ha niile arụ ọrụ na-eme ka ha rụchaa ọrụ ahụ. Mmụọ Jehova na-enyekwara ha aka.​—⁠Abụ Ọma 127:1; Ndị Kọlọsi 3:⁠23.

      • Gịnị mere anyị ji akpọ ebe anyị na-anọ amụ ihe Ụlọ Nzukọ Alaeze?

      • Olee otú anyị si enweta ego anyị ji ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụwa niile?

  • Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Ụlọ Nzukọ Alaeze Anyị Na-adị Mma n’Anya?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 26

      Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Ụlọ Nzukọ Alaeze Anyị Na-adị Mma n’Anya?

      Ndịàmà Jehova na-ehicha Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Estonia

      Estonia

      Ndịàmà Jehova na-ehicha Ụlọ Nzukọ Alaeze na Zimbabwe

      Zimbabwe

      Onyeàmà Jehova na-arụzi ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Mongolịa

      Mongolịa

      Onyeàmà Jehova na-ete ágbá n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Puweto Riko

      Puweto Riko

      Ebe ọ bụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe anyị na-anọ efe Jehova, anyị kwesịrị ime ka ọ dị ọcha, dịkwa mma n’anya. Anyị kwesịkwara ịrụzi ihe ọ bụla mebiri na ya n’ihi na ọ bụ otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị si efe Chineke. Anyị ekwesịghị iji ọrụ a gwuo egwu. Onye ọ bụla kwesịkwara iso na-arụ ya.

      A gbasaa ọmụmụ ihe, nye aka mee ka ebe niile dị ọcha. A gbasaa ọmụmụ ihe n’ụbọchị ọ bụla, ụmụnna na-eji obi ụtọ nye aka zachaa Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu ugbo n’ọnwa, ọgbakọ na-abịakwa dewe ya ọcha. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ga-ahụ maka ọrụ a ga-arụ n’ụbọchị ahụ. Ọ ga-ahụ na e mere ihe niile e kwesịrị ime. Ụfọdụ ga-aza Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụfọdụ ejiri ákwà hichasịa ala ya, ụfọdụ ehichasịa oche ma hazie ha. E nwekwara ndị ga-eji ncha saa ebe a na-anyụ mamịrị ma wụọ ya ọgwụ na-egbu nje. A na-agwakwa ụfọdụ ka ha hichasịa windo na enyo, ndị ọzọ ekpofuo ahịhịa ma ọ bụkwanụ wepụsịa ọnyà ududo. A na-ewepụtakwa otu ụbọchị n’afọ ọ bụla, jiri ya hichaa Ụlọ Nzukọ Alaeze ma rụzie ihe niile e kwesịrị ịrụzi. Mgbe ọ bụla a ga-arụ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụmụ anyị na-eso anyị aga arụ ọrụ. Nke a na-eme ka ha mata na ebe ahụ bụ ebe a na-efe Chineke, ọ bụghị ebe a na-egwu egwu.​—⁠Ekliziastis 5:⁠1.

      Nye aka rụzie ihe ndị e kwesịrị ịrụzi. N’afọ ọ bụla, a na-enwe ndị a na-eziga ka ha gaa lee otú Ụlọ Nzukọ Alaeze niile e nwere dị. Ha lechaa, ha agwa ọgbakọ na-anọ na ya amụ ihe ihe ha kwesịrị ime ka ọ na-adị mma n’anya. Nke a na-eme ka ha ghara ịna-emefusị ego ha ga-eji mee ihe ọzọ. (2 Ihe E Mere 24:13; 34:10) Ebe anyị na-anọ efe Jehova kwesịrị ịbụ ebe dị ọcha ma dị mma n’anya. Ọ bụrụ na anyị niile enye aka na-edewe ya ọcha, anyị na-egosi na anyị ejighị ya egwu egwu. O gosikwara na anyị hụrụ Jehova n’anya. (Abụ Ọma 122:⁠1) Ọ na-enyekwa anyị aha ọma n’obodo anyị.​—⁠2 Ndị Kọrịnt 6:⁠3.

      • Gịnị mere anyị ekwesịghị ileghara Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị anya?

      • Olee ihe anyị na-eme iji hụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị ọcha?

  • Olee Uru Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Baara Anyị?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 27

      Olee Uru Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Baara Anyị?

      Onye na-ewere akwụkwọ n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze

      Izrel

      Nwanna na-enyere nwanna ọzọ aka ime nchọnchọ

      Chek Ripọblik

      Nwata nwaanyị na-ede aha ya n’akwụkwọ abụ ya

      Benin

      Onye ji Watchtower Library eme nchọnchọ

      Keman Aịlands

      Ò nwere ihe ụfọdụ ị ga-achọ ịmatakwu na Baịbụl? Ò nwere amaokwu Baịbụl ị na-amachaghị otú ị ga-esi akọwa ya? È nwere onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl ị ga-achọ ịmatakwu ihe gbasara ya? Ò nwere ebe a kpọrọ aha na Baịbụl ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kwuru na Baịbụl ị chọrọ ịmakwu gbasara ya? Ò nwere ihe na-enye gị nsogbu n’obi ị ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka ịma ihe ị ga-eme? Ọ bụrụ na e nwere, gaa n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

      Akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ na-adị na ya. O nwere ike, i nweghị akwụkwọ niile Ndịàmà Jehova bipụtara n’asụsụ Igbo. Ma, ị gaa n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị ga-ahụ akwụkwọ anyị ndị e bipụtara n’oge na-adịchabeghị anya. I nwekwara ike ịhụ Baịbụl ndị ọzọ na-abụghị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, hụkwa akwụkwọ ọkọwa okwu na akwụkwọ ndị ọzọ e ji eme nchọnchọ. I nwere ike iji ha mee nchọnchọ tupu a malite ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ mgbe ọmụmụ ihe gbasara. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere kọmputa, e nwere ike itinye Watchtower Library nke Igbo n’ime ya. Ọtụtụ akwụkwọ anyị dị na Watchtower Library. Otú e si eji ya achọ ihe anaghị ara ahụ́. I nwere ike denye isiokwu, mkpụrụ okwu ma ọ bụkwanụ amaokwu Baịbụl ka ọ chọtara gị ebe niile ọ gbara n’akwụkwọ anyị.

      Ọ na-abara ndị na-eme ihe omume n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ uru. Ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-abara gị uru mgbe ị na-akwado ihe omume gị. Ọ bụ onye nlekọta ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ na-ahụ maka ọ́bá akwụkwọ na-adị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ya ka ọ dị n’aka ịhụ na e tinyere akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla n’ebe ahụ. Ọ na-ahụkwa na e dewere ha n’usoro n’usoro. O nwere ike igosi gị otú ị ga-esi achọta ihe ị chọrọ ịchọ ma ọ bụkwanụ onye gị na ya na-amụ Baịbụl egosi gị ya. Ma, o nweghị onye kwesịrị iwere akwụkwọ ọ bụla dị ebe ahụ laa. Onye ọ bụla ji akwụkwọ dị ebe ahụ na-achọ ihe kwesịrị ijizi ya ejizi, o kwesịghịkwa ịka ya ihe.

      Baịbụl kwuru na onye chọrọ inwe “ihe ọmụma Chineke” kwesịrị ịchọ ya “dị ka akụ̀ zoro ezo.” (Ilu 2:​1-5) Ị ga-ejili ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze chọta ihe ọmụma Chineke.

      • Olee ihe ndị na-adị n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

      • Ònye ga-enyere gị aka ịma otú e si eji akwụkwọ ndị dị na ya achọ ihe?

      IHE ỌZỌ Ị GA-EME

      Ọ bụrụ na ị chọrọ inwe ọ́bá akwụkwọ nke gị, gaa lee akwụkwọ ndị dị n’ebe a na-ewere akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Onye gị na ya na-amụ Baịbụl nwere ike ịgwa gị ndị nke ị ga-ebu ụzọ were.

  • Gịnị Ka Ị Ga-ahụ ma Ị Gaa Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 28

      Gịnị Ka Ị Ga-ahụ ma Ị Gaa Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet?

      Nwaanyị ji kọmputa ya na-eme nchọnchọ

      Frans

      Nna na nwa ya na-achọ ihe na kọmputa ha

      Pọland

      Nwaanyị na-ele fim ndị ogbi n’Ịntanet

      Rọshịa

      Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Matiu 5:16) Ọ bụ ihe a Jizọs kwuru mere anyị ji eji ihe ụfọdụ nkà na ụzụ na-ewepụta na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Otu n’ime ha bụ Ịntanet. Anyị nwere ebe anyị na-edewe ihe na ya. Adres ya bụ jw.org/ig. Ebe a bụ ebe ị ga-aga n’Ịntanet mata nke bụ́ eziokwu banyere ihe anyị kweere na ọrụ anyị na-arụ. Olee ihe ị ga-ahụ ma ị gaa ebe ahụ?

      Ị ga-ahụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị na otú e si jiri Baịbụl zaa ha. O nwere ọtụtụ ajụjụ ndị dị mkpa ụmụ mmadụ na-ajụ taa. Ị gaa n’ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet, ị ga-ahụ ebe e ji Baịbụl zaa ụfọdụ n’ime ha. A zara isii n’ime ha na traktị bụ́ Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị? na Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ? N’Ịntanet, anyị nwere traktị ndị a n’ihe karịrị narị asụsụ isii. Ị ga-ahụkwa Baibụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ. E nwekwara akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baibụl Na-akụziri Anyị?, nweekwa Ụlọ Nche na Teta! ndị ọhụrụ n’ọtụtụ asụsụ. I nwere ike ịgụ ọtụtụ n’ime ha n’Ịntanet ma ọ bụkwanụ gị egere ha egere. Ị chọọkwa, i nwere ike tinye ha n’ihe dị ka ekwentị. E nweekwa onye ị ma ga-achọ ịgụ nke ọ bụla n’ime ha, i nwedịrị ike isi ebe ahụ bipụtara ya nke e dere n’asụsụ ọ na-asụ. N’Ịntanet, ị ga-ahụ ọtụtụ akwụkwọ anyị n’asụsụ ndị ogbi. I nwekwara ike isi ebe ahụ were ihe ndị a na-egere egere, ndị dị ka ihe nkiri na abụ ndị ga na-eme gị obi ụtọ.

      Ị ga-ahụ ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara anyị. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ebe a kọrọ gbasara otú ọrụ anyị si na-aga n’ụwa dum na otú anyị si agbatara ndị nwere ọdachi ọsọ enyemaka. Ị ga-ahụkwa ihe ndị ọzọ a kọrọ gbasara anyị. E nwekwara vidio ndị ga-egosi gị ihe a na-ekwu. Ihe ọzọ ị ga-ahụ bụ ebe ndị a ga-enwe mgbakọ dị iche iche na otú i nwere ike isi kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche.

      Anyị na-eji ihe ndị a eme ka ìhè Okwu Chineke na-enwu n’ebe ndị dị anya n’ụwa. Ndị mmadụ n’ebe niile na-anụ ozi ọma Alaeze Chineke, ma ndị bi n’Antaktika, bụ́ ebe oyi kacha atụ n’ụwa. Ekpere anyị bụ ka ‘okwu Jehova na-aga n’ihu ọsọ ọsọ’ ruo n’ụwa niile. Anyị chọkwara ka o wetara Chineke otuto.​—⁠2 Ndị Tesalonaịka 3:⁠1.

      • Olee otú anyị si eji ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet enyere ndị mmadụ aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi?

      • Olee ihe ị ga-achọ ịhụ n’ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet?

      EBE ANYỊ GA-AKPACHARA ANYA:

      N’Ịntanet, e nwere ụfọdụ ebe ndị iro anyị wepụtara. Ihe ha na-anọ ebe ahụ eme bụ ịkọ ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara anyị. Ha achọghị ka ndị mmadụ na-efe Jehova. Anyị ekwesịghị ịga ebe ndị ahụ.​—⁠Abụ Ọma 1:1; 26:4; Ndị Rom 16:⁠17.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya