Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ò Nwere Ebe Mmadụ Na-aga ma Ọ Nwụọ?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
    • ISI NKE ISII

      Ò Nwere Ebe Mmadụ Na-aga ma Ọ Nwụọ?

      1-3. Olee ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ ma mmadụ nwụọ, oleekwanụ ihe okpukpe ụfọdụ na-aza ha?

      BAỊBỤL gwara anyị na otu ụbọchị, “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Anyị mụtara n’Isi nke Ise na ihe mgbapụta Jehova nyere anyị mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ma, ndị mmadụ ka na-anwụ anwụ. (Ekliziastis 9:5) N’ihi ya, otu n’ime ajụjụ ndị na-echu ndị mmadụ ụra bụ, Ò nwere ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ?

      2 Anyị na-achọkarị ịmata azịza ajụjụ a ma mmadụ nwụnahụ anyị. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee ebe ọ gara? Ọ̀ na-ahụ anyị? Ò nwere ike inyere anyị aka? Ò nwere mgbe anyị ga-ahụ ya ọzọ?’

      3 Ihe okpukpe dị iche iche na-aza ma a jụọ ha ajụjụ ndị a anaghị abụ otu. Ụfọdụ na-akụzi na ọ bụrụ na ezigbo mmadụ anwụọ, ọ na-aga eluigwe. Ma ajọ mmadụ nwụọ, ya agaa ọkụ ala mmụọ. Ụfọdụ na-asị na mmadụ nwụọ, ya aghọọ mmụọ ma lakwuru ndị ikwu ya nwụrụla anwụ. Ndị ọzọ na-asị na mmadụ nwụọ, ya alọ ụwa.

      4. Olee otú ihe ọtụtụ okpukpe na-akụzi gbasara ndị nwụrụ anwụ si yie?

      4 E nwere ike ịsị na ihe okpukpe dị iche iche na-akụzi abụghị otu. Ma, o nwere otú ihe ọtụtụ n’ime ha na-akụzi si yie ibe ha. Ha na-akụzi na mmadụ nwụọ, e nwere ihe na-esi onye ahụ n’ime pụọ gaa dịrị ndụ ebe ọzọ. Ma, ọ̀ bụ eziokwu?

      GỊNỊ NA-EME MMADỤ MA Ọ NWỤỌ?

      5, 6. Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

      5 Jehova ma ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. Ọ gwara anyị na mmadụ nwụọ, onye ahụ anọkwaghị ndụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ naghị aga ebe ọzọ biri, nọrọ ebe ahụ na-echeta ihe ndị mere ya tupu ya anwụọ.a Mmadụ nwụọ, ọ naghị ahụ ụzọ, ọ naghị anụ ihe, ọ naghịkwa eche echiche.

      6 Eze Sọlọmọn dere na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Ha enweghị ike ịhụ mmadụ n’anya ma ọ bụ kpọọ mmadụ asị. O kwukwara na “ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol [ya bụ, Ili].” (Gụọ Ekliziastis 9:5, 6, 10.) Baịbụl gwakwara anyị n’Abụ Ọma 146:4, na mmadụ nwụọ, “echiche ya” alaala n’iyi.

      IHE JIZỌS KWURU GBASARA ỌNWỤ

      Ebe di na nwunye nọ n’otu ebe mara mma na-ekiri okooko osisi

      Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi

      7. Gịnị ka Jizọs kwuru gbasara ọnwụ?

      7 Mgbe ezigbo enyi Jizọs bụ́ Lazarọs nwụrụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra.” Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na Lazarọs na-ezu ike nkịtị. Jizọs gwaziri ha na “Lazarọs anwụwo.” (Jọn 11:11-14) Jizọs na-ekwu na ọnwụ yiri ebe mmadụ nọ n’ụra. O kwughị na Lazarọs nọ n’eluigwe ma ọ bụ na ọ lakwuuru ndị ikwu ya nwụrụla anwụ. O kwughịkwa na Lazarọs nọ na-ata ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ma ọ bụ na ọ ga-alọ ụwa ka mmadụ ma ọ bụ anụmanụ. Kama, Lazarọs dị ka onye nọ n’oké ụra. Amaokwu ndị ọzọ na Baịbụl gosiri na ọnwụ dị ka ebe mmadụ nọ n’oké ụra. Baịbụl kwuru na mgbe e gburu Stivin na “ọ dara n’ụra ọnwụ.” (Ọrụ Ndịozi 7:60) Pọl onyeozi dekwara na ụfọdụ Ndị Kraịst “adawo n’ụra ọnwụ.”—1 Ndị Kọrịnt 15:6.

      8. Olee otú anyị si mara na Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ?

      8 Mgbe Chineke kere Adam na Iv, ò bu n’obi na ha ga-emecha nwụọ? Mbanụ! Jehova kere ha ka ha dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, obi ana-atọ ha ụtọ, ahụ́ agbasiekwa ha ike. Mgbe Jehova kere ụmụ mmadụ, o kere ha ka ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na-agụ ha agụụ. (Ekliziastis 3:11) Ndị mụrụ ụmụ anaghị achọ ka ụmụ ha kaa nká ma nwụọ. Otú ahụkwa ka Jehova na-achọghị ka anyị kaa nká ma nwụọ. Ma, ọ bụrụ na Chineke kere anyị ka anyị dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, gịnị mere anyị ji anwụ anwụ?

      GỊNỊ MERE NDỊ MMADỤ JI ANWỤ ANWỤ?

      9. Gịnị mere o ji bụrụ na iwu Jehova nyere Adam na Iv esighị ike?

      9 Jehova gwara Adam n’ogige Iden, sị: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:9, 16, 17) Iwu a Jehova nyere Adam esighị ike. Jehova rukwara eru ịgwa ya na Iv ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ha erubere ya isi, ha ga-egosi na ha ghọtara na o ruru eru ịgwa ha ihe ha ga-eme. Ha ga-esikwa otú ahụ kelee ya maka ihe niile o nyere ha.

      10, 11. (a) Olee otú Setan si mee ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi? (b) Gịnị mere na o nweghị ezigbo ihe mere Adam na Iv ga-eji nupụrụ Chineke isi?

      10 Ọ dị mwute na Adam na Iv họọrọ inupụrụ Jehova isi. Setan jụrụ Iv, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?” Iv agwa ya, sị: “Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a. Ma, a bịa n’iri mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a, Chineke sịrị: ‘Unu erila mkpụrụ si na ya, ee e, unu emetụla ya aka ka unu ghara ịnwụ.’”—Jenesis 3:1-3.

      11 Setan gwaziri Iv, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị. N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:4-6) Setan chọrọ ka Iv chewe na ọ bụ ya kwesịrị ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ ghakwaara Iv ụgha mgbe ọ gwara ya na ọ gaghị anwụ ma o nupụrụ Jehova isi. N’ihi ya, Iv riri mkpụrụ osisi ahụ, nyekwa di ya, ya erie. Adam na Iv ma na Jehova gwara ha ka ha ghara iri mkpụrụ osisi ahụ. Mkpụrụ osisi ahụ ha riri gosiri na ha kpachaara anya nupụ isi n’iwu na-esighị ike Jehova nyere ha. O gosikwara na o nweghị ihe ha ji Nna ha nke eluigwe kpọrọ, bụ́ onye hụrụ ha n’anya. O doro anya na o nweghị ezigbo ihe mere ha ga-eji nupụrụ Chineke isi.

      12. Gịnị mere ọ ga-eji ewute Jehova na Adam na Iv nupụụrụ ya isi?

      12 Ọ dị mwute na nne na nna anyị mbụ akwanyereghị Onye kere ha ùgwù. Olee otú obi ga-adị gị ma ị gbachaa mbọ zụọ nwa gị, ya enupụrụ gị isi mee ihe ị sị ya emela? Ọ̀ bụ na obi agaghị agbawa gị?

      Oge e kere Adam

      E si n’ájá kee Adam, ọ laghachikwara n’ájá

      13. Mgbe Jehova gwara Adam na ‘ọ bụ n’ájá ka ọ ga-alaghachi,’ gịnị ka ihe ahụ ọ gwara ya pụtara?

      13 Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, ha tụfuru ohere ha nwere ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Jehova gwara Adam, sị: “N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.” (Gụọ Jenesis 3:19.) Ihe a ọ gwara Adam pụtara na Adam ga-abụghachi ájá. (Jenesis 2:7) Adam mechara nwụọ n’ihi mmehie o mere. Ọ dịghịzi adị.

      14. Gịnị mere anyị ji anwụ anwụ?

      14 A sị na Adam na Iv rubeere Chineke isi, ha gaara anọ ndụ taa. Ma, ebe ha nupụụrụ Chineke isi ma mee mmehie, ha mechara nwụọ. Mmehie yiri ọrịa ọjọọ anyị butere n’aka nne na nna anyị mbụ. A mụrụ anyị niile ná mmehie, ọ bụ ya mere anyị ji na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 5:12) Ma, ọ bụghị ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Ọ chọghị ka ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ọnwụ “onye iro.”—1 Ndị Kọrịnt 15:26.

      EZIOKWU NA-EME KA ANYỊ NWERE ONWE ANYỊ

      15. Olee otú eziokwu Baịbụl gwara anyị gbasara ndị nwụrụ anwụ si eme ka anyị nwere onwe anyị?

      15 Eziokwu Baịbụl kụziiri anyị na–eme ka anyị nwere onwe anyị, ya bụ, ka anyị ghara ikweta ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu. Baịbụl na-akụziri anyị na ihe anaghị ewute ndị nwụrụ anwụ, ihe anaghịkwa afụ ha ụfụ. Anyị enweghị ike ịgwa ha okwu, ha enweghịkwa ike ịgwa anyị okwu. Anyị enweghị ike inyere ha aka, ha enweghịkwa ike inyere anyị aka. Ha enweghị ike imerụ anyị ahụ́. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ha ụjọ. Ma, ọtụtụ okpukpe na-ekwu na o nwere ebe ndị nwụrụ anwụ gara nọrọ ndụ, na anyị ga-enyere ndị ahụ nwụrụ anwụ aka ma anyị nye ndị ụkọchukwu ego. Ma, anyị mata ihe bụ́ eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ, anyị agaghị ekweta ụgha a ndị okpukpe na-agha.

      16. Olee ụgha ọtụtụ okpukpe na-aghara ndị mmadụ gbasara ndị nwụrụ anwụ?

      16 Setan na-eji okpukpe ụgha aghara ndị mmadụ ụgha. O ji ya eme ka ndị mmadụ chee na ndị nwụrụ anwụ ka nọ ndụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ okpukpe na-akụzi na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, o nwere ihe na-esi n’ime ya apụ gaa dịrị ndụ ebe ọzọ. Ọ̀ bụ ihe okpukpe ma ọ bụ chọọchị ị na-aga na-akụzi? Ka ọ̀ na-akụziri gị ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị nwụrụ anwụ? Setan na-eji ụgha eme ka ndị mmadụ ghara ife Jehova.

      17. Olee otú o si bụrụ na ndị na-akụzi na Jehova na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ na-akparị Jehova?

      17 Ihe a na-akụzi n’ọtụtụ okpukpe na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-akụzi na ndị ajọ omume ga-aga ọkụ ala mmụọ na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Ndị na-akụzi ụgha a na-akparị Jehova. O mekataghị kwe ka ndị mmadụ taa ụdị ahụhụ ahụ. (Gụọ 1 Jọn 4:8.) Olee otú obi ga-adị gị ma ị hụ ebe mmadụ weere aka nwa ya tinye n’ọkụ sị na ọ na-ata ya ahụhụ maka ihe ọjọọ o mere? Ọ̀ bụ na ị gaghị asị na obi fere onye ahụ azụ? O doro anya na ị gaghị achọ ka gị na ya bụrụ enyi. Ọ bụ otú ahụ ka Setan chọrọ ka anyị si na-ele Jehova anya.

      18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ?

      18 Ụfọdụ okpukpe na-akụzi na ndị mmadụ nwụọ, ha aghọọ mmụọ. Ha na-ekwu na anyị kwesịrị ịna-akwanyere ndị mmụọ ahụ ùgwù, na-atụkwa ha ụjọ n’ihi na ha nwere ike bụrụ ezigbo ndị enyi anyị ma ọ bụ ezigbo ndị iro anyị. Ọtụtụ ndị kwetara ụgha a. Ha na-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Ọ bụ ya mere ha ji efe ha kama ife Jehova. Cheta na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, n’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ha ụjọ. Ọ bụ Jehova kere anyị. Ọ bụ ya bụ ezi Chineke, ọ bụkwa naanị ya ka anyị kwesịrị ife.—Mkpughe 4:11.

      19. Olee otú ịmata ihe bụ́ eziokwu gbasara ndị nwụrụ anwụ si enyere anyị aka?

      19 Anyị mata ihe bụ́ eziokwu gbasara ndị nwụrụ anwụ, o nweghị onye ga-eji ụgha ndị okpukpe na-agha duhie anyị. Eziokwu a na-enyere anyị aka ịghọta nkwa ọma Jehova kwere anyị banyere ndụ anyị na otú ihe ga-adịrị anyị n’ọdịnihu.

      20. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-esonụ?

      20 Ogologo oge gara aga, otu nwoke fere Chineke aha ya bụ Job jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?” (Job 14:14) Ndị nwụrụ anwụ hà nwere ike ịdị ndụ ọzọ n’eziokwu? Ihe Chineke zara anyị na Baịbụl na-eme anyị obi ụtọ. Anyị ga-amụ banyere ya n’isiokwu na-esonụ.

      a Ụfọdụ ndị kweere na mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ anaghị anwụ ma mmadụ nwụọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata nke bụ́ eziokwu, gụọ ihe nke 17 na nke 18 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

      NCHỊKỌTA

      EZIOKWU NKE MBỤ: MMADỤ NWỤỌ, ONYE AHỤ ANỌKWAGHỊ NDỤ

      “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”—Ekliziastis 9:5

      Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

      • Abụ Ọma 146:3, 4; Ekliziastis 9:6, 10

        Mmadụ nwụọ, ọ naghị ahụ ụzọ, ọ naghị anụ ihe, ọ naghịkwa eche echiche.

      • Jọn 11:11-14

        Jizọs kwuru na ọnwụ yiri ebe mmadụ nọ n’ụra.

      EZIOKWU NKE ABỤỌ: JEHOVA ACHỌGHỊ KA ỤMỤ MMADỤ NA-ANWỤ ANWỤ

      “Erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.”—Jenesis 2:17

      Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ?

      • Jenesis 3:1-6

        Setan ghaara Iv ụgha gbasara ihe ga-eme ya ma o nupụrụ Chineke isi. Ebe Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi ma mee mmehie, ha mechara nwụọ.

      • Jenesis 3:19

        Mgbe Adam nwụrụ, ọ dịghịzi adị.

      • Ndị Rom 5:12

        Mmehie yiri ọrịa ọjọọ anyị butere n’aka nne na nna anyị mbụ. A mụrụ anyị niile n’ime mmehie, ọ bụ ya mere anyị ji na-anwụ anwụ.

      • 1 Ndị Kọrịnt 15:26

        Baịbụl kpọrọ ọnwụ onye iro.

      EZIOKWU NKE ATỌ: EZIOKWU BAỊBỤL KỤZIIRI ANYỊ BANYERE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ NA-EME KA ANYỊ NWERE ONWE ANYỊ

      “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ? M ga-echere . . . ruo mgbe a ga-eme ka m nwere onwe m.”—Job 14:14

      Olee otú ịmụta eziokwu Baịbụl kụziiri anyị gbasara ndị nwụrụ anwụ si eme ka anyị nwere onwe anyị?

      • 1 Jọn 4:8

        Ndị na-akụzi na ndị ajọ omume ga-aga ọkụ ala mmụọ na-akparị Jehova. O mekataghị kwe ka ndị mmadụ taa ụdị ahụhụ ahụ.

      • Mkpughe 4:11

        Ọtụtụ ndị na-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Ọ bụ ya mere ha ji efe ha kama ife Jehova. Jehova bụ ezi Chineke, ọ bụkwa naanị ya ka anyị kwesịrị ife.

  • A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
    • ISI NKE ASAA

      A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ

      1-3. Gịnị ji anyị niile eji ka ndị a tụrụ mkpọrọ, oleekwa otú Jehova ga-esi atọhapụ anyị?

      WEREGODỊ ya na a tụrụ gị nga mkpụrụ ọka mgbe ọ na-enweghị ihe ọjọọ i mere. I nwetụdịghị olileanya na a ga-atọhapụ gị. O nwekwanụghị ihe i nwere ike ime ka i nwere onwe gị. Ma, mgbe i chere na olileanya adịkwaghị, gị achọpụta na o nwere onye ga-atọhapụli gị, nụkwa na o kwere nkwa inyere gị aka. Olee otú obi ga-adị gị?

      2 E nwere ike ikwu na ọnwụ ji anyị niile eji ka ndị a tụrụ mkpọrọ. Ihe ọ sọkwara anyị mee, anyị agaghị apụtali. Ma, Jehova nwere ikike ịtọhapụ anyị n’aka ọnwụ. O kwere anyị nkwa na ọ ga-eme ka “onye iro ikpeazụ,” bụ́ ọnwụ, “ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrịnt 15:26.

      3 Chegodị otú obi ga-esi ruo gị ala mgbe ị na-agakwaghị na-atụ ụjọ na ị ga-anwụ. Ọ bụghị naanị na Jehova ga-ewepụ ọnwụ, ọ ga-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. O kwere nkwa na “ndị na-adịghị ndụ” ga-adị ndụ ọzọ. (Aịzaya 26:19) Ọ bụ ya ka Baịbụl kpọrọ mbilite n’ọnwụ.

      MGBE MMADỤ NWỤNAHỤRỤ ANYỊ

      4. (a) Gịnị ga-akasi anyị obi ma onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ enyi anyị nwụọ? (b) Olee mmadụ atọ bụ́ ezigbo ndị enyi Jizọs?

      4 Ọ bụrụ na onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị anwụọ, ọ na-ewute anyị nke ukwuu. Anyị anaghịkwa ama ihe anyị ga-eme eme. O nweghị ihe anyị nwere ike ime ka onye ahụ dịghachi ndụ. Ma, Baịbụl na-akasi anyị obi. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.) Ka anyị leba anya n’ihe mere n’oge Jizọs nke gosiri na ọ na-agụsi Jehova na Jizọs agụụ ike ime ka ndị nwụnahụrụ anyị dịghachi ndụ. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-agakarị n’ụlọ Lazarọs na ụmụnne ya nwaanyị abụọ, bụ́ Meri na Mata. Ha atọ bụ ezigbo ndị enyi Jizọs. Baịbụl sịrị na “Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị na Lazarọs n’anya.” Otu ụbọchị, Lazarọs nwụrụ.—Jọn 11:3-5.

      5, 6. (a) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ka ụmụnne Lazarọs na ndị ọzọ na-ebe ákwá? (b) Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike ma anyị mata na otú obi na-adị anyị ma mmadụ nwụnahụ anyị bụkwa otú ọ na-adị Jizọs?

      5 Jizọs gawara ịkasi Meri na Mata obi. Mgbe Mata nụrụ na Jizọs na-abịa, ọ gawara izute ya. Obi dị ya ụtọ mgbe ọ hụrụ Jizọs. Ma, ọ gwara Jizọs, sị: “A sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Mata chere na Jizọs bịara mgbe ihe mebicharala. Mgbe Jizọs hụrụ ka Meri na ndị ọzọ na-ebe ákwá, o wutere ya, anya mmiri gbakwara ya. (Jọn 11:21, 33, 35) O wutere ya otú ahụ o si ewute anyị ma mmadụ nwụnahụ anyị.

      6 Ịmata na otú obi na-adị anyị ma mmadụ nwụnahụ anyị bụkwa otú ọ na-adị Jizọs na-eme ka obi sie anyị ike. Jizọs dị nnọọ ka Nna ya. (Jọn 14:9) Jehova nwere ike ọ ga-eji wepụ ọnwụ kpamkpam. Ọ ga-emekwa ya n’oge na-adịghị anya.

      “LAZARỌS, PỤTA!”

      7, 8. Gịnị mere Mata achọghị ka a kwapụ nkume a dọchiri n’ọnụ ili Lazarọs, ma gịnị ka Jizọs mere?

      7 Mgbe Jizọs rutere n’ebe e liri Lazarọs, ọ hụrụ na e ji nkume buru ibu dọchie ọnụ ili ya. Jizọs sịrị: “Kwapụnụ nkume ahụ.” Ma, Mata achọghị ka ha kwapụ ya n’ihi na o meela abalị anọ Lazarọs nọ n’ili. (Jọn 11:39) Ọ maghị na Jizọs chọrọ ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ.

      Mgbe Jizọs kpọlitere Lazarọs, ụmụnne ya na ndị enyi ha enwee obi ụtọ

      Chegodị otú obi si tọọ ụmụnne Lazarọs na ndị enyi ha ụtọ mgbe a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ.—Jọn 11:38-44

      8 Jizọs sịrị Lazarọs: “Pụta!” Ihe Meri na Mata hụrụ juru ha anya. “Nwoke ahụ nwụrụ anwụ wee buru ákwà e kere ya n’ụkwụ na n’aka pụta.” (Jọn 11:43, 44) Lazarọs malitekwara ịdị ndụ. Ya na ụmụnne ya na ndị enyi ya amalitekwa imekọrịta ihe. Ha nweziri ike ịmakụ ya, imetụ ya aka, na ịgwa ya okwu. Mkpọlite Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ bụ nnukwu ọrụ ebube.

      “NWATA NWAANYỊ, ANA M ASỊ GỊ, BILIE!”

      9, 10. (a) Ònye nyere Jizọs ike o ji kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? (b) Gịnị mere ihe Baịbụl kọrọ gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ ji baara anyị uru?

      9 Jizọs ò ji ike nke ya kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? Mba. Tupu Jizọs akpọlite Lazarọs n’ọnwụ, o kpegaara Jehova ekpere, Jehova enye ya ike o ji kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. (Gụọ Jọn 11:41, 42.) Ọ bụghị naanị Lazarọs ka Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Baịbụl gwara anyị banyere nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ ahụ́ na-adịghị. Nna ya, bụ́ Jeirọs, chọsiri ike ka nwa ya gbakee. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jizọs ka ọ gwọọ nwa ya. Ọ bụ naanị nwa o nwere. Ka ọ nọ na-agwa Jizọs okwu, ụfọdụ ụmụ nwoke bịara sị ya: “Nwa gị nwaanyị anwụọla! Gịnị mere ị ka ji na-enye onye ozizi nsogbu?” Ma Jizọs gwara Jeirọs, sị: “Atụla egwu, naanị nwee okwukwe, a ga-azọpụta ya.” Ya na Jeirọs gawaziri n’ụlọ Jeirọs. Ka ha na-erute nso, Jizọs hụrụ ka ndị mmadụ na-akwa ákwá. Jizọs gwara ha, sị: “Kwụsịnụ ịkwa ákwá, n’ihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ na-ehi ụra.” Nne na nna nwa ahụ nwere ike ịna-eche ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara. Jizọs chụpụrụ ndị niile nọ ebe ahụ n’èzí ma kpọrọ nne na nna nwa ahụ banye n’ebe nwa ahụ dina. Jizọs seere nwatakịrị ahụ n’aka, sị ya: “Nwata nwaanyị, ana m asị gị, Bilie!” Chegodị otú obi dị ndị mụrụ nwa ahụ ozugbo nwa ha biliri ma malite ịga ije. Jizọs akpọlitela nwa ha nwaanyị n’ọnwụ. (Mak 5:22-24, 35-42; Luk 8:49-56) Malite n’ụbọchị ahụ gawa, ha hụ nwa ha nwaanyị, ha echeta ihe Jehova si n’aka Jizọs meere ha.a

      10 Ndị niile Jizọs kpọlitere n’ọnwụ mechara nwụọ. Ma, ihe Baịbụl kọrọ gbasara ha baara anyị uru n’ihi na o mere ka anyị nwee olileanya. Ọ na-egosi na ọ na-agụ Jehova agụụ ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ, ọ ga-emekwa ya.

      IHE AKỤKỌ NDỊ A KPỌLITERE N’ỌNWỤ NA-AKỤZIRI ANYỊ

      Mgbe Pita kpọlitere Dọkas n’ọnwụ ndị nọ mgbe ahụ ana-ekiri ihe na-emenụ

      Pita onyeozi kpọlitere otu Onye Kraịst aha ya bụ Dọkas n’ọnwụ.—Ọrụ Ndịozi 9:36-42

      Ebe nwaanyị di ya nwụrụ na-amakụ nwa ya nwoke mgbe Ịlaịja kpọlitechara nwa ahụ n’ọnwụ

      Ịlaịja kpọlitere nwa otu nwaanyị di ya nwụrụ.—1 Ndị Eze 17:17-24

      11. Gịnị ka ihe e dere n’Ekliziastis 9:5 na-akụziri anyị banyere Lazarọs?

      11 Baịbụl kwuru hoo haa na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Lazarọs mgbe ọ nwụrụ. (Ekliziastis 9:5) Ọ dị ka onye nọ n’ụra otú ahụ Jizọs kwuru. (Jọn 11:11) Mgbe Lazarọs nọ n’ili, ọ ‘maghị ihe ọ bụla ma ọlị.’

      12. Olee ihe gosiri na a kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ n’eziokwu?

      12 Ọtụtụ ndị hụrụ mgbe Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. Ndị iro Jizọs makwa na Jizọs rụrụ ọrụ ebube a. Lazarọs malitekwara ịdị ndụ, ya edoo onye ọ bụla anya na a kpọlitere ya n’ọnwụ n’eziokwu. (Jọn 11:47) Ọtụtụ ndị gakwara hụ Lazarọs ma kweta na ọ bụ Chineke zitere Jizọs. Ihe a merenụ adịghị ndị iro Jizọs mma, n’ihi ya, ha kpara nkata igbu Jizọs na Lazarọs.—Jọn 11:53; 12:9-11.

      13. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?

      13 Jizọs kwuru na a ga-akpọlite “ndị niile nọ n’ili ncheta.” (Jọn 5:28) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova ga-akpọlite ndị niile ọ na-echeta. Ma, tupu Jehova akpọlite mmadụ, ọ ga-echeta ihe niile gbasara onye ahụ. Jehova ò nwerenụ ike icheta ihe niile gbasara ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ? Cheta na e nwere ọtụtụ ijeri kpakpando n’eluigwe. Ma, Baịbụl kwuru na Jehova maara aha kpakpando niile. (Gụọ Aịzaya 40:26.) Ebe o nwere ike icheta aha kpakpando nke ọ bụla, o doro anya na ọ ga-echetali ihe niile gbasara ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ. Nke ka nke bụ na ọ bụ Jehova kere ihe niile, n’ihi ya, o doro anyị anya na o nwere ike ọ ga-eji kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

      14, 15. Gịnị ka ihe Job kwuru na-akụziri anyị banyere mbilite n’ọnwụ?

      14 Otu nwoke fere Jehova n’oge ochie aha ya bụ Job kwetara na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?” Ọ gwaziri Jehova, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.” N’eziokwu, Job ma na ọ dị Jehova ka oge ruwe eruwe ka ọ kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Job 14:13-15.

      15 Olee otú obi dị gị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ? I nwere ike na-eche, sị, ‘Oleekwanụ maka ndị ikwu na ibe m nwụrụ anwụ? À ga-akpọlite ha?’ Obi dị anyị ụtọ ịmara na Jehova chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ka anyị hụ ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ na ebe ha ga-ebi ma a kpọlite ha.

      HA “GA-ANỤ OLU YA WEE PỤTA”

      16. Olee otú ihe ga-adị n’ụwa mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?

      16 Ndị niile a kpọlitere n’ọnwụ n’oge ochie mechara gakwuru ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha n’ụwa ebe a. Ọ bụkwa ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma nke ga-eme n’ọdịnihu ga-aka mma. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’oge ahụ ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi, gharazie ịnwụ ọzọ. Ha ga-ebi n’ụwa na-adịghị ka nke a anyị bi na ya taa. Agha, ime mpụ, na ọrịa agakwaghị adị.

      17. Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?

      17 Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ? Jizọs sịrị na “ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya.” (Jọn 5:28, 29) Mkpughe 20:13 gwara anyị, sị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis [ya bụ, ili] hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” N’eziokwu, a ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ. Pọl onyeozi kwuru na a ga-akpọlite “ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15.) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

      Na paradaịs, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-agakwuru ndị ikwu na ibe ha, ha ebidokwa ịnọrị

      Na paradaịs, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ha na ndị ikwu na ibe ha anọwakwa

      18. Ole ndị bụ “ndị ezi omume” a ga-akpọlite n’ọnwụ?

      18 Ụfọdụ n’ime “ndị ezi omume” ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ bụ ndị fere Jehova tupu Jizọs abịa n’ụwa. A ga-akpọlite ndị dị ka Noa, Ebreham, Sera, Mozis, Rut, na Esta ka ha dịrị ndụ n’ụwa. I nwere ike ịgụ gbasara ụfọdụ n’ime ha ná Ndị Hibru isi iri na otu. Oleekwanụ maka ndị fere Jehova nwụrụ n’oge anyị a? Ha bụkwa “ndị ezi omume,” n’ihi ya, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.

      19. Ole ndị bụ “ndị ajọ omume” a ga-akpọlite n’ọnwụ? Olee ohere Jehova ga-enye ha?

      19 “Ndị ajọ omume” a ga-akpọlite n’ọnwụ bụ ọtụtụ ijeri mmadụ nwụrụ anwụ bụ́ ndị na-enweghị ohere ịmata onye Jehova bụ. N’agbanyeghị na ha anwụọla, Jehova echefubeghị ha. Ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha enwee ohere ịmụta banyere ya ma na-efe ya.

      20. Gịnị mere na ọ bụghị ndị niile nwụrụ anwụ ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?

      20 Nke a ọ̀ pụtara na a ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ n’ọnwụ? Mba. Jizọs kwuru na a gaghị akpọlite ụfọdụ ndị n’ọnwụ. (Luk 12:5) Ònye ga-ekpebi ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ na ndị a na-agaghị akpọlite? Ọ bụ Jehova bụ Onyeikpe ga-ekpebi ihe niile. Ma, o nyere Jizọs ikike ka ọ bụrụ “onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.” (Ọrụ Ndịozi 10:42) A gaghị akpọlite onye ajọ omume ọ bụla e kpebiri na o nweghị nchegharị.—Gụọ ihe nke 19 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

      NDỊ A GA-AKPỌLITE N’ỌNWỤ HA AGAA ELUIGWE

      21, 22. (a) Gịnị ka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ga-abụ? (b) Ònye bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe?

      21 Baịbụl gwakwara anyị na a ga-akpọlite ụfọdụ ndị n’ọnwụ ha agaa eluigwe. A kpọlite mmadụ n’ọnwụ ya agaa eluigwe, ọ gakwaghị enwe ahụ́ mmadụ. Ọ ga-abụzi mmụọ.

      22 Ọ bụ Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe. (Jọn 3:13) Abalị atọ e gbuchara Jizọs, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ Ndịozi 13:34, 35) Jizọs abụkwaghị mmadụ mgbe a kpọlitere ya. Pita onyeozi kwuru na “e mere ka [Jizọs] nwụọ n’anụ ahụ́, ma e mere ka ọ dị ndụ na mmụọ.” (1 Pita 3:18) Jizọs ghọrọ mmụọ dị ike mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:3-6) Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụghị naanị ya ka a ga-akpọlite n’ọnwụ ya aghọọ mmụọ.

      23, 24. Ole ndị bụ “ìgwè atụrụ nta” Jizọs kwuru okwu ha? Ole ka ha dị?

      23 Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ezigbo ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M na-aga ịkwadebere unu ebe.” (Jọn 14:2) Nke a pụtara na a ga-akpọlite ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya n’ọnwụ ka ha soro ya biri n’eluigwe. Ole ka ha ga-adị? Jizọs gosiri na ha ga-adị ntakịrị. Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ha “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) E gosiri Jọn onyeozi ole ha dị n’ọhụụ. O kwuru na ọ hụrụ ka Jizọs “guzo n’Ugwu Zayọn [nke dị n’eluigwe], ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.”—Mkpughe 14:1.

      24 Olee mgbe a ga-akpọlite otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ n’ọnwụ? Baịbụl gwara anyị na ọ ga-abụ mgbe Kraịst malitechara ịchị n’eluigwe. (1 Ndị Kọrịnt 15:23) Ọ bụ n’oge anyị a ka Kraịst malitere ịchị n’eluigwe. A kpọlitekwala ọtụtụ n’ime otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ n’ọnwụ ha agaa eluigwe. Ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha ka nọ́ n’ụwa anwụọ n’oge anyị a, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ozugbo ha nwụrụ, ha agaa eluigwe. Ma, a ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ha ebiri na paradaịs a ga-enwe n’ụwa ebe a.

      25. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

      25 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-atọhapụ mmadụ niile n’aka ọnwụ, ọnwụ alaa kpamkpam. (Gụọ Aịzaya 25:8.) Ma, gịnị ka ndị ga-aga eluigwe ga-eme n’eluigwe? Baịbụl kwuru na ha na Jizọs ga-achị n’Alaeze Chineke. Anyị ga-amụ gbasara Alaeze Chineke n’isiokwu na-eso nke a.

      a E nwere ebe ndị ọzọ Baịbụl kọrọ banyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ, ma ụmụaka ma ndị torola eto, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ma ndị Izrel ma ndị na-abụghị ndị Izrel. I nwere ike ịgụ banyere ha ná 1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:32-37; 13:20, 21; nakwa na Matiu 28:5-7; Luk 7:11-17; 8:40-56; Ọrụ Ndịozi 9:36-42; 20:7-12.

      NCHỊKỌTA

      EZIOKWU NKE MBỤ: JEHOVA GA-EWEPỤ ỌNWỤ

      “Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrịnt 15:26

      Olee otú ihe Baịbụl kwuru si akasi anyị obi ma mmadụ nwụọ?

      • 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4

        Ọ bụrụ na onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị anwụọ, anyị anaghị ama ihe anyị ga-eme eme. Ma, Baịbụl na-akasi anyị obi.

      • Aịzaya 25:8; 26:19

        Jehova nwere ike ọ ga-eji wepụ ọnwụ kpamkpam. Ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

      EZIOKWU NKE ABỤỌ: ANYỊ KWESỊRỊ INWE OKWUKWE NA A GA-AKPỌLITE NDỊ MMADỤ N’ỌNWỤ

      “Nwata nwaanyị, ana m asị gị, Bilie!”—Mak 5:41

      Gịnị mere anyị ji kwesị inwe okwukwe na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ?

      • Jọn 11:1-44

        Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ.

      • Mak 5:22-24, 35-42

        Jizọs kpọlitere otu nwata nwaanyị n’ọnwụ.

      • Jọn 11:41, 42

        Ọ bụ Jehova nyere Jizọs ike o ji kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ.

      • Jọn 12:9-11

        Ọtụtụ ndị hụrụ mgbe Jizọs kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ. Ndị iro Jizọs ma n’eziokwu na Jizọs kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ.

      EZIOKWU NKE ATỌ: JEHOVA GA-AKPỌLITE ỌTỤTỤ IJERI MMADỤ N’ỌNWỤ

      “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.”—Job 14:13-15

      Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?

      • Jọn 5:28, 29

        Jehova ga-akpọlite ndị niile ọ na-echeta.

      • Ọrụ Ndịozi 24:15

        A ga-akpọlite ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.

      • Aịzaya 40:26

        Jehova nwere ike icheta aha kpakpando nke ọ bụla. N’ihi ya, ọ ga-echetali ihe niile gbasara ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ.

      EZIOKWU NKE ANỌ: A GA-AKPỌLITE ỤFỌDỤ NDỊ N’ỌNWỤ KA HA GAA DỊRỊ NDỤ N’ELUIGWE

      “M na-aga ịkwadebere unu ebe.”—Jọn 14:2

      Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe?

      • 1 Pita 3:18

        Ọ bụ Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe.

      • Luk 12:32

        Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ga-adị ntakịrị.

      • Mkpughe 14:1

        Jehova họọrọ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ka ha gaa eluigwe.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya