ISI NKE 37
Jehova Gwara Samuel Okwu
Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ịlaị nwere ụmụ nwoke abụọ. Ụmụ ya abụọ a bụ ndị nchụàjà. Ha na-eje ozi n’ụlọikwuu. Aha ha bụ Họfnaị na Finihas. Ha anaghị erubere Jehova isi. Ha na-emesi ndị mmadụ ike. Ọ na-abụ ndị Izrel weta anụ ha ga-eji chụọrọ Jehova àjà, Họfnaị na Finihas na-ewere ebe kacha mma na ha. Ịlaị nụrụ ihe ụmụ ya na-eme, ma ọ gbachiri ha nkịtị. Jehova ọ̀ ga-ekwe ka ihe a nọgide na-eme?
Ọ bụ eziokwu na Họfnaị na Finihas tọgburu Samuel atọgbu, ma o meghị ka ha. Ihe a Samuel mere tọrọ Jehova ụtọ. Otu abalị Samuel na-ehi ụra, ọ nụrụ olu nọ na-akpọ ya. O biliri gakwuru Ịlaị ma gwa ya, sị: ‘Lekwa m.’ Ma Ịlaị sịrị ya: ‘Akpọghị m gị. Gaa dinara ala.’ Samuel gakwara dinara ala. Ọ nụkwara olu ahụ ọzọ. Mgbe Samuel nụrụ olu ahụ nke ugboro atọ ya, Ịlaị matara na ọ bụ Jehova na-akpọ Samuel. Ọ gwara Samuel na ọ bụrụ na ọ nụ olu ahụ ọzọ, ka ọ sị: ‘Jehova, kwuwe. Ohu gị na-ege ntị.’
Samuel gakwara dinara ọzọ. Ọ nụrụ olu ahụ ọzọ. Olu ahụ sịrị: ‘Samuel! Samuel!’ Ọ zara, sị: ‘Kwuwe, ohu gị na-ege ntị.’ Jehova gwara ya, sị: ‘Gwa Ịlaị na m ga-ata ya na ezinụlọ ya ahụhụ. Ọ ma na ụmụ ya na-eme ihe ọjọọ n’ụlọikwuu m, ma ọ gbachiri ha nkịtị.’ N’ụtụtụ echi ya, Samuel meghere ụzọ ụlọikwuu otú o si emebu. Ụjọ tụrụ ya ịgwa nnukwu onye nchụàjà ihe Jehova kwuru. Ma, Ịlaị kpọrọ ya, jụọ ya, sị: ‘Nwa m, gịnị ka Jehova gwara gị? Gwa m ihe niile.’ N’ihi ya, Samuel gwara Ịlaị ihe niile.
Ka Samuel na-eto, Jehova ahapụghị ya. Ọ bịara doo ndị Izrel niile anya na Jehova ahọrọla Samuel ka ọ bụrụ onye amụma na onyeikpe.
“Cheta Onye Ukwu kere gị n’oge ị na-eto eto.”—Ekliziastis 12:1