Malite Ịgụ Baịbụl
Ịgụ Baịbụl nwere ike ịna-atọ gị ụtọ. Lee otú i nwere ike isi malite ịgụ ya. Họrọ isiokwu masịrị gị n’ime isiokwu ndị dị ebe a, gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị dị n’okpuru ya.
Akụkọ Dị Iche Iche na Ndị A Kọrọ Gbasara Ha
Noa na Iju Mmiri: Jenesis 6:9–9:19
Ihe Mosis mere n’Oké Osimiri Uhie: Ọpụpụ 13:17–14:31
Rut na Naomi: Rut isi 1-4
Devid na Golayat: 1 Samuel isi 17
Abigel: 1 Samuel 25:2-35
Mgbe Daniel nọ n’olulu ọdụm: Daniel isi 6
Elizabet na Meri: Luk isi 1-2
Amamihe Anyị Ga-eji Na-ebi Ndụ Kwa Ụbọchị
Ihe gbasara ezinụlọ: Ndị Efesọs 5:28, 29, 33; 6:1-4
Ihe gbasara ndị enyi: Ilu 13:20; 17:17; 27:17
Ihe gbasara ekpere: Abụ Ọma 55:22; 62:8; 1 Jọn 5:14
Ihe Jizọs Nọ n’Elu Ugwu Kụzie: Matiu isi 5-7
Ihe gbasara ọrụ: Ilu 14:23; Ekliziastis 3:12, 13; 4:6
Ị Chọọ Ihe Ga-enyere Gị Aka Mgbe . . .
Ị dara mbà: Abụ Ọma 23; Aịzaya 41:10
Ị na-eru uju: 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4; 1 Pita 5:7
Obi gị na-ama gị ikpe: Abụ Ọma 86:5; Ezikiel 18:21, 22
Ị Chọọ Ịma Ihe Baịbụl Kwuru . . .
Gbasara mgbe ikpeazụ: Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5
Ga-eme ka anyị nwee olileanya: Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Mkpughe 21:3, 4
ARO: Ị chọọ ịghọta amaokwu ndị e dere ebe a nke ọma, gụchaa isi nke ọ bụla amaokwu ndị ahụ e depụtara dị na ya. Ị gụchaa isi nke ọ bụla, gị akatụ ya ihe. Jiri chaatị dị ná ngwụcha akwụkwọ a na-akatụ ya. Isiokwu ya bụ “Katụ Ihe n’Ebe Ị Kwụsịrị n’Ọgụgụ Baịbụl Gị.” Gbaa mbọ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị.