ISI NKE 36
Na-akwụwa Aka Ọtọ n’Ihe Niile
Anyị niile chọrọ ka ndị na-akwụwa aka ọtọ bụrụ ndị enyi anyị. Jehova chọkwara ka ndị enyi ya na-akwụwa aka ọtọ. Ma, ịkwụwa aka ọtọ adịghị mfe n’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ. Ma olee uru ịkwụwa aka ọtọ n’ihe niile bara?
1. Olee ihe kacha bụrụ ihe mere anyị ji akwụwa aka ọtọ?
Ọ bụrụ na anyị ana-akwụwa aka ọtọ mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, anyị na-egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù. Cheta na Jehova ma ihe niile anyị na-eche na ihe niile anyị na-eme. (Ndị Hibru 4:13) Ọ na-ahụ anyị oge ọ bụla anyị kwụwara aka ọtọ, obi na-atọkwa ya ụtọ. Baịbụl kwuru na “Jehova kpọrọ onye aghụghọ asị, ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.”—Ilu 3:32.
2. Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị?
Jehova chọrọ ka anyị ‘na-agwa ibe anyị eziokwu.’ (Zekaraya 8:16, 17) Gịnị ka ịgwa ibe anyị eziokwu pụtara? Ma ànyị na-agwa ndị ezinụlọ anyị okwu ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị ma ọ bụ ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị na-anọchite anya ndị ọchịchị, anyị ekwesịghị ịghara ha ụgha ma ọ bụkwanụ gwa ha ihe na-abụchaghị eziokwu. Ndị na-akwụwa aka ọtọ anaghị ezu ohi, ha anaghịkwa egwu ndị ọzọ wayo. (Gụọ Ilu 24:28 na Ndị Efesọs 4:28.) Ha na-atụkwa ụtụ isi niile ha kwesịrị ịtụ. (Ndị Rom 13:5-7) Ihe a bụ ole na ole n’ime ụzọ dị iche iche anyị si egosi na anyị na-akwụwa “aka ọtọ n’ihe niile.”—Ndị Hibru 13:18.
3. Olee uru dị iche iche ịkwụwa aka ọtọ bara?
Ndị ọzọ mara na anyị na-akwụwa aka ọtọ, ha ga-atụkwasị anyị obi. Ọ ga-emezi ka obi ruo onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ala, ya adị ka ànyị si n’otu ezinụlọ. Obi anyị agaghịkwa na-ama anyị ikpe. Ọ bụrụ na anyị ana-akwụwa aka ọtọ, anyị “na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma,” na-emekwa ka ndị ọzọ nwee mmasị ịbata n’ọgbakọ ma soro anyị na-efe Jehova.—Taịtọs 2:10.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta otú Jehova si ele ịkwụwa aka ọtọ anya na uru ịkwụwa aka ọtọ ga-abara gị. Chọpụtakwa otú ị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ndị ị na-eme ná ndụ.
4. Ịkwụwa aka ọtọ na-eme Jehova obi ụtọ
Gụọnụ Abụ Ọma 44:21 na Malakaị 3:16. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
A sị gị kwuo, gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na o nwere ihe anyị ga-ezochiri Jehova?
Olee otú i chere obi na-adị Jehova mgbe ọ bụla anyị kwuru eziokwu, a sịgodị na o siiri anyị ike?
Ụmụaka na-eme nne na nna ha obi ụtọ ma ha na-ekwu eziokwu.Anyị na-emekwa Jehova obi ụtọ ma anyị na-ekwu eziokwu
5. Na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile
Ọtụtụ ndị chere na ịkwụwa aka ọtọ mgbe niile adịghị mfe. Ma, chegodị gbasara ihe mere anyị kwesịrị iji na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile. Kpọnyenụ VIDIO a.
Gụọnụ Ndị Hibru 13:18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’otú anyị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ . . .
n’ezinụlọ anyị.
n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ.
n’ihe ndị ọzọ.
6. Ịkwụwa aka ọtọ na-abara anyị uru
O nwere ike ịdị ka ịkwụwa aka ọtọ ọ̀ na-eme ka ihe siere mmadụ ike. Ma, ọ bụ ya bụ ihe kacha mma i kwesịrị ime. Gụọnụ Abụ Ọma 34:12-16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ịkwụwa aka ọtọ si eme ka ndụ gị ka mma?
Di na nwunye na-adịkwu ná mma ma ha na-akwụwa aka ọtọ n’ezinụlọ ha
Mmadụ na-akwụwa aka ọtọ, onye ọ na-arụrụ ọrụ ga-atụkwasị ya obi
Ndị na-anọchite anya ndị ọchịchị na-akwanyere ndị na-akwụwa aka ọtọ ùgwù
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ịgha obere ụgha abụghị ihe ọjọọ.
Gịnị mere i ji kweta na Jehova kpọrọ ụdị ụgha niile asị?
NCHỊKỌTA
Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ọ bụla ha na-ekwu nakwa n’ihe ọ bụla ha na-eme.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi na anyị na-akwụwa aka ọtọ?
Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na o nwere ihe anyị ga-ezochiri Jehova?
Gịnị mere i kwesịrị iji na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi kụziere ụmụ ha ka ha na-akwụwa aka ọtọ?
Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-emezu nkwa anyị kwere?
Chọpụta ma ànyị kwesịrị ịna-atụ ụtụ isi anyị a sịgodị na e jighị ya eme ihe e kwesịrị iji ya eme.
“Ọ̀ Bụ Iwu Na Ị Ga-atụ Ụtụ Isi?” (Ụlọ Nche, Septemba 1, 2011)
Gịnị mere otu nwoke na-anabughị akwụwa aka ọtọ ji gbanwee malite ịkwụwa aka ọtọ?
“Ọ Bịara Doo M Anya na Jehova Na-eme Ebere ma Na-agbaghara Mmehie” (Ụlọ Nche, Mee 1, 2015)