Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 39
  • Otú Chineke Si Ele Ọbara Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Chineke Si Ele Ọbara Anya
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Irighiri Ihe Ndị Si n’Ọbara na Otú E Si Awa Mmadụ Ahụ́
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Bụrụ Onye Chineke Ahụ Dị Ndụ Na-eduzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 39
Isi nke 39. Otú ọbara na-adị ma e jiri onyokomita lee ya.

ISI NKE 39

Otú Chineke Si Ele Ọbara Anya

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

Ọbara dị ezigbo mkpa. E wezụga ya, o nweghị onye n’ime anyị ga-adị ndụ. Ebe ọ bụ Chineke kere anyị, ọ bụ ya ka ọ dị n’aka ịgwa anyị ihe anyị ga-eji ọbara eme. È nweela ihe o kwuru gbasara ọbara? Iri ọbara ma ọ bụ ịmịnye ya n’ahụ́ ọ̀ dị mma? Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme n’okwu gbasara ọbara?

1. Olee otú Jehova si ele ọbara anya?

N’oge a na-ede Baịbụl, Jehova gwara ndị na-efe ya, sị: “Ndụ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla bụ ọbara ya.” (Levitikọs 17:14) N’anya Jehova, ọbara bụ ndụ. Ebe ọ bụ na ndụ bụ onyinye dị nsọ Chineke nyere anyị, ọ pụtara na ọbara dịkwa nsọ.

2. Olee ihe Chineke nyere iwu ka anyị ghara iji ọbara na-eme?

Tupu ehiwe ọgbakọ Ndị Kraịst, Jehova nyere ndị na-efe ya iwu ka ha ghara iri ọbara. (Gụọ Jenesis 9:4 na Levitikọs 17:10.) Mgbe e hiwechara ọgbakọ Ndị Kraịst, Jehova nyeghachiri iwu ahụ. Òtù na-achị isi gwara Ndị Kraịst ka ha “ghara iri ọbara.”​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:28, 29.

Gịnị ka iwu a bụ́ ka anyị ghara iri ọbara pụtara? O doro anya na ị ga na-agbara mmanya na-aba n’anya ọsọ ma ọ bụrụ na dọkịta gwara gị ka ị kwụsị ịṅụ ya. Ma, ị̀ ga-eri nri e tinyere ya ma ọ bụ kwe ka e si n’akwara mịba gị ya n’ahụ́? Mbanụ. Otú ahụkwa ka iwu Chineke nyere anyị ka anyị ghara iri ọbara pụtara na anyị ekwesịghị ịṅụ ọbara nakwa na anyị ekwesịghị ịta anụ a na-egbupụghị ọbara. Ọ pụtakwara na anyị ekwesịghị iri nri ọ bụla e tinyere ọbara.

Olee maka iji ọbara agwọ ọrịa? Iwu Chineke kagburu ụzọ ụfọdụ e si agwọ ọrịa. Dị ka ihe atụ, ọ kagburu ịmịnye mmadụ ọbara ma ọ bụ ihe anọ bụ́ isi dị n’ọbara, ya bụ, mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie, mkpụrụ ndụ na-acha ọcha, mkpụrụ ndụ na-eme ka ọbara kwụsị ịgba, nakwa mkpụrụ ndụ bụ́ mmiri dị n’ọbara. Ma, e nwere ike inwe ụzọ ụfọdụ e si agwọ ọrịa iwu Chineke na-ekwughị ma hà dị njọ. Dị ka ihe atụ, e nwere ụdị ịgwọ ọrịa ndị a na-eji irighiri ihe ndị dị n’isi ihe anọ dị n’ọbara agwọ mmadụ. E nwekwara ụdị ndị nke a na-eji ọbara onye na-arịa ọrịa eme ihe ụfọdụ mgbe a na-agwọ ya. Ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-echebara ụdị ịgwọ ọrịa ndị a echiche ma kpebie ma ọ̀ ga-anabata ha.a​—Ndị Galeshia 6:5.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-anabata ka e si gwọọ gị ma e nwee ihe a chọrọ iji ọbara eme mgbe a na-agwọ gị.

3. Ka otú ị nabatara ka e si gwọọ gị ọrịa mee Jehova obi ụtọ

Gịnị ga-enyere gị aka ikpebi otú a ga-esi agwọ gị ọrịa ka ọ daba n’otú Chineke si ele ihe anya? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ihe mere na anyị ekwesịghị iji ime ihe ndị a egwu egwu.

VIDIO: Ihe Ga-enyere Gị Aka Ikpebi Otú A Ga-esi Agwọ Gị Ọrịa ma Ọ Gbasa Ọbara (5:47)

  • Ikpe ekpere rịọ Chineke ka o nye anyị amamihe.​—Jems 1:5.

  • Ịchọpụta ihe dị iche iche Baịbụl kwuru na otú ha si gbasa ihe anyị chọrọ ime.​—Ilu 13:16.

  • Ịchọpụta otú e si agwọ ọrịa ebe anyị bi.

  • Ịchọpụta otú e si agwọ ọrịa nke anyị na-emekataghị nabata.

  • Ijide n’aka na ihe anyị kpebiri ime agaghị eme ka obi anyị na-ama anyị ikpe.​—Ọrụ Ndịozi 24:16.b

  • Ịghọta na e nweghị onye kwesịrị ikpebiri anyị ihe anyị ga-eme n’okwu onye ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya, ma ọ bụ di ma ọ bụ nwunye anyị, ma ọ bụ okenye, ma ọ bụ onye anyị na ya na-amụ Baịbụl.​—Ndị Rom 14:12.

  • Ide ihe anyị kpebiri ede.

Foto atọ na-egosi ebe otu nwoke na-ekpebi otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya. 1. Ebe ọ na-ekpe ekpere. 2. Ebe o ji Baịbụl, akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na kọmputa na-eme nchọnchọ. 3. Ebe ya na dọkịta na-ekwurịta okwu.

4. Ndịàmà Jehova na-achọ ka e si otú kacha mma e si agwọ ọrịa gwọọ ha

A ga-agwọli mmadụ ọrịa n’emebighị iwu Chineke gbasara ọbara. A ga-esili otú kacha mma e si agwọ ọrịa gwọọ mmadụ n’amịnyeghị ya ọbara. Kpọnyenụ VIDIO a.

VIDIO: Ajụjụ Ọnụ A Gbara Prọfesọ Massimo P. Franchi, M.D. (1:36)

Gụọnụ Taịtọs 3:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Mgbe anyị na ndị dọkịta na-akparịta ụka, gịnị mere anyị kwesịrị iji kwanyere ha ùgwù, jirikwa obi nwayọọ gwa ha okwu?

Ebe e tinyere ọbara n’ihe e ji enyocha ya, isi ihe anọ dị n’ọbara anọrọchaa iche, edeekwa ha A, B, CH, na D.

Ndị Onye Kraịst ga-ajụ

Ndị Onye Kraịst ga-ekpebi

A. Mkpụrụ ndụ bụ́ mmiri dị n’ọbara

Irighiri ihe ndị si na ya

B. Mkpụrụ ndụ na-acha ọcha

Irighiri ihe ndị si na ya

CH. Mkpụrụ ndụ na-eme ka ọbara kwụsị ịgba

Irighiri ihe ndị si na ya

D. Mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie

Irighiri ihe ndị si na ya

5. Ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ irighiri ihe ndị si n’ọbara

E nwere isi ihe anọ dị n’ọbara. Ha bụ, mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie, mkpụrụ ndụ na-acha ọcha, mkpụrụ ndụ na-eme ka ọbara kwụsị ịgba, nakwa mkpụrụ ndụ bụ́ mmiri dị n’ọbara. Isi ihe anọ a nwere irighiri ihe ndị ọzọ dị na ha.c A na-eji ụfọdụ irighiri ihe ndị ahụ arụpụta ọgwụ ndị na-alụso nje ọgụ ma ọ bụ ndị na-akwụsị ọbara ịgba mmadụ.

A bịa n’irighiri ihe ndị si n’isi ihe anọ dị n’ọbara, ọ bụ Onye Kraịst ga-eji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebie ihe ọ ga-eme. Ụfọdụ Ndị Kraịst nwere ike ikpebi na ha agaghị ekwe ka e jiri irighiri ihe ndị si n’ọbara gwọọ ha. Ndị ọzọ nwere ike iche na akọnuche ha agaghị enye ha nsogbu ma e jiri irighiri ihe ndị si n’ọbara gwọọ ha.

I kpebiwe ihe ị ga-eme, chebara ajụjụ a echiche:

  • Olee otú m ga-esi kọwaara dọkịta ihe mere m ji kwuo ka a ghara iji irighiri ihe ndị si n’ọbara gwọọ m ma ọ bụkwanụ ihe mere m ji nabata ya?

MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere na ịmịnye mmadụ ọbara adịghị mma.

  • Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?

NCHỊKỌTA

Jehova chọrọ ka anyị were ọbara ka ihe dị nsọ.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere Jehova ji ele ọbara anya ka ihe dị nsọ?

  • Olee otú anyị si mara na mmịnye ọbara sokwu n’iwu ahụ Chineke nyere anyị ka anyị ghara iri ọbara?

  • Gịnị ga-enyere gị aka ikpebi ihe dị mma ma a bịa n’ihe gbasara iji ọbara agwọ ọrịa?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Olee ihe ndị ga-enyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme n’ihe gbasara iji ọbara eme ihe ụfọdụ mgbe a na-agwọ gị ọrịa?

“Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” (Ụlọ Nche, Ọktoba 15, 2000)

Olee ihe i kwesịrị ichebara echiche tupu gị ekpebie ma ị̀ ga-anabata ka e jiri irighiri ihe ndị si n’ọbara gwọọ gị ka ọ̀ bụ na ị gaghị anabata?

“Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” (Ụlọ Nche, Jun 15, 2004)

Gịnị mere otu dọkịta ji mechaa kweta na otú Jehova si ele ọbara anya dị mma?

“Anakweere M Echiche Chineke Banyere Ọbara” (Teta!, December 8, 2003)

Chọpụta otú ndị so na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ si enyere ụmụnna ha aka.

Jehova Na-akwado Ndị Ọrịa (10:23)

a Gụọ Isi nke 35. Isiokwu ya bụ “Otú Anyị Ga-esi Na-ekpebi Ime Ihe Dị Mma.”

b Gụọ isiokwu nta nke 5 bụ́ “Ihe Ị Ga-eme ma Ọ Bụrụ Irighiri Ihe Ndị Si n’Ọbara,” na Ihe nke 3 E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A, nke isiokwu ya bụ “Ụdị Ịgwọ Ọrịa Ndị Gbasara Ọbara” nakwa Ozi Alaeze Anyị nke Disemba 2006, peeji nke 3-6.

c Ụfọdụ ndị dọkịta na-ekwu na isi ihe anọ ahụ dị n’obara so n’irighiri ihe ndị si n’ọbara. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka ị kọwaara ha na i kpebiri na ị gaghị anabata ka a mịnye gị ọbara n’onwe ya ma ọ bụ isi ihe anọ ahụ dị n’ọbara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya