-
Bible Pụrụ Inyere Alụmdi na Nwunye Gị AkaỤlọ Nche—2003 | Septemba 15
-
-
Bible Pụrụ Inyere Alụmdi na Nwunye Gị Aka
ALỤMDI NA NWUNYE—nye ọtụtụ ndị, okwu ahụ na-enye obi ụtọ. Nye ndị ọzọ, ọ na-eweta obi mgbawa. “Ọ na-adị m ka m bụ onye a gbara alụkwaghịm,” ka otu nwunye kwara n’arịrị. “Ọ na-adị m mgbe nile ka m bụ onye e leghaara anya na onye owu na-ama.”
Gịnị na-eme ka mmadụ abụọ kweburu nkwa na ha ga-ahụ onwe ha n’anya ma na-elekọta onwe ha ghọọ nnọọ ndị na-ahụkwaghị onwe ha n’anya? Otu ihe kpatara ya bụ na ha amụtaghị ihe alụmdi na nwunye gụnyere. “Anyị na-abanye n’alụmdi na nwunye n’enwetatụghị ọzụzụ,” ka otu odeakụkọ ihe metụtara ahụ́ ike kwuru.
Otu nchọpụta nke Ngalaba Atụmatụ Alụmdi na Nwunye Mba, bụ́ òtù nnyocha nke Mahadum Rutgers dị na New Jersey, U.S.A., mere, na-egosi na ọ bụ mmadụ ole na ole nwere ihe ọmụma banyere alụmdi na nwunye. “Ọ bụ ndị nne na nna na-enweghị obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha ma ọ bụ ndị gbara alụkwaghịm zụlitere ọtụtụ n’ime ndị e ji mee nnyocha a,” ka ndị duziri nnyocha ahụ kwuru. “Ha maara n’ezie ihe alụmdi na nwunye na-adịghị enye obi ụtọ bụ, ma ha ejichaghị n’aka ihe alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ bụ. Ụfọdụ pụrụ nanị ịkọwa alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ dị ka ‘ihe dị iche na nke ndị mụrụ m.’”
À gụpụrụ Ndị Kraịst ná nsogbu ndị a na-enwe n’alụmdi na nwunye? Ee e. N’ezie, ọ dị ụfọdụ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ mkpa ka e nye ha ndụmọdụ a kapịrị ọnụ ka ha “kwụsị ịchọ ntọhapụ” n’alụmdi na nwunye ha. (1 Ndị Kọrint 7:27) N’ụzọ doro anya, alụmdi na nwunye nke mmadụ abụọ na-ezughị okè ga-enwerịrị nsogbu nke ya, ma anyị nwere ihe inyeaka. Ndị di na ndị nwunye pụrụ ime ka mmekọrịta ha ka mma site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.
N’eziokwu, Bible abụghị akwụkwọ nduzi alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na o sitere n’aka Onye malitere ndokwa alụmdi na nwunye, anyị pụrụ ịtụ anya na ụkpụrụ ndị dị na ya ga-enye aka. Jehova Chineke kwuru site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:17, 18.
Ịhụnanya dịbu n’etiti gị na onye òtù ọlụlụ gị ọ̀ malitewo ịjụ oyi? Ọ̀ na-adị gị ka ị tọrọ atọ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ? Otu onye bụworo nwunye ruo afọ 26 kwuru, sị: “Ọ pụrụ isi nnọọ ike ịkọwa ihe mgbu a na-enweta n’ụdị mmekọrịta a. Ọ dịghị akwụsị akwụsị.” Kama ịnakwere alụmdi na nwunye na-adịghị enye obi ụtọ, gịnị ma i kpebie ime ihe banyere ya? Isiokwu na-esonụ ga-egosi ndị di na ndị nwunye otú ụkpụrụ Bible pụrụ isi nyere ha aka n’alụmdi na nwunye ha n’otu akụkụ kpọmkwem—nke bụ́ mkpebi siri ike.
-
-
Ụzọ Isi Mee Ka Alụmdi na Nwunye Gị Sikwuo IkeỤlọ Nche—2003 | Septemba 15
-
-
Ụzọ Isi Mee Ka Alụmdi na Nwunye Gị Sikwuo Ike
CHEEDỊ echiche banyere otu ụlọ nke e leghaara anya. Ágbá ya na-ekpepụsị ekpepụsị, gbamgbam ya emebiela, ọbụnakwa ahịhịa etochiwo ụlọ ahụ. O doro anya na oké mmiri ozuzo amakwasịwo ụlọ a ruo ọtụtụ afọ, e legharawokwa ya anya. È kwesịrị ịkwatu ya? Ọ dịchaghị mkpa ime otú ahụ. Ọ bụrụ na ntọala ya siri ike, ide ji ụlọ ahụ aka siekwa ike, o yiri ka a pụrụ ịrụzi ụlọ ahụ.
Ọnọdụ ụlọ ahụ ọ̀ na-echetara gị alụmdi na nwunye gị? N’afọ ndị gafeworonụ, ọ pụrụ ịbụ na oké mmiri ozuzo, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, akpawo mmekọrịta alụmdi na nwunye gị aka ọjọọ. Ọ pụrụ ịbụ na otu onye n’ime unu ma ọ bụ unu abụọ elegharawo alụmdi na nwunye unu anya ruo n’ókè ụfọdụ. Ị pụrụ inwe ụdị mmetụta Sandy nwere. Ka ọ lụworo di ihe dị ka afọ 15, o kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ jikọrọ anyị ma ọ bụghị na anyị bụ di na nwunye. Nke ahụ ezughịkwa.”
Ọ bụrụgodị na alụmdi na nwunye gị eruwo n’ọnọdụ dị otú a, adịla ngwa ikpebi na e kwesịrị itisa ya. O yikarịrị ka a pụrụ idozi nsogbu alụmdi na nwunye gị. Ọ dabeere n’ụzọ dị ukwuu ná mkpebi siri ike gị na onye òtù ọlụlụ gị mere. Mkpebi siri ike dị otú ahụ pụrụ ime ka alụmdi na nwunye gị kwụsie ike n’oge nsogbu. Gịnị bụ mkpebi siri ike? Olee otú Bible pụrụ isi nyere gị aka ime ka mkpebi a sikwuo ike?
Mkpebi Siri Ike Na-agụnye Ibu Ọrụ
Mkpebi siri ike na-ezo aka n’ọnọdụ ma ọ bụ mmetụta nke ịbụ onye nwere ibu ọrụ ma ọ bụ onye iwu ji ime ihe. Mgbe ụfọdụ, a na-eji okwu ahụ eme ihe n’ihe na-abụghị mmadụ, dị ka ná nkwekọrịta azụmahịa. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị onye na-ewu ụlọ ka iwu ò ji ya iwuzu ụlọ o kwere nkwa iwu. O nwere ike ọ maghịdị onye nwe ọrụ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-enwe mkpali nke imezu ihe o kwuru.
Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye abụghị nkwekọrịta achụmnta ego nke mmetụta na-adịghị na ya, mkpebi siri ike ọ chọrọ na-agụnye ibu ọrụ. Ma eleghị anya, gị na onye òtù ọlụlụ gị ekwewo nkwa siri ike n’ihu Chineke na mmadụ ibikọ ọnụ, n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Jizọs sịrị: “Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwanyị wee sị, ‘N’ihi nke a, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya.’” Jizọs gbakwụnyere, sị: “Ya mere, ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:4-6) N’ihi ya, mgbe nsogbu bilitere, gị na onye òtù ọlụlụ gị kwesịrị ikpebisi ike ịkwanyere mkpebi ahụ siri ike unu mere ùgwù.a Otu nwunye kwuru, sị: “Ọ bụ nanị mgbe anyị kwụsịrị ile ịgba alụkwaghịm anya dị ka otu n’ime ihe ndị anyị pụrụ ime ka ihe malitere dịwa mma.”
-