Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 2/1 p. 6
  • Chineke Ò Nwere Aha?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ò Nwere Aha?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • Gịnị Bụ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Ị̀ Ma Aha Chineke? Ị̀ Na-akpọkwa Ya Aha Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-akpọ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 2/1 p. 6

Chineke Ò Nwere Aha?

Ihe ndị mmadụ na-azakarị:

▪ “Aha ya bụ Chineke.”

▪ “Aha ya karịrị akarị.”

Olee ihe Jizọs kwuru?

▪ “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’” (Matiu 6:9) Jizọs kweere na Chineke nwere aha.

▪ “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.” (Jọn 17:26) Jizọs mere ka a mara aha Chineke.

▪ “Unu agaghị ahụ m ma ọlị ruo mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzi na-adịrị onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova.’” (Luk 13:35; Abụ Ọma 118:26) Jizọs kpọrọ aha Chineke.

CHINEKE ji aka ya gwa anyị aha ya. E dere na o kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m.”a (Aịzaya 42:8, Bible Nsọ nke Union Version) Aha ahụ bụ́ Jehova bụ otú kacha mma ndị Igbo si akpọ aha Hibru ahụ Chineke gụrụ onwe ya. O nwere ike ịtụ gị n’anya na aha Hibru ahụ pụrụ iche pụtara ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl n’oge a na-ede ya. Ọ pụtara ọtụtụ ugboro karịa aha ọ bụla ọzọ dị na Baịbụl.

A jụọ ụfọdụ ndị “Gịnị bụ aha Chineke?” ha nwere ike ịza na “aha Chineke karịrị akarị,” na “aha ya bụ Alfa na Omega.” Ndị ọzọ na-asị na “aha ya bụ Chineke.” Ma ihe ndị a bụ utu aha ndị na-egosi ụdị onye Chineke bụ. O nweghị nke ọ bụla n’ime ha zatara ajụjụ ahụ, n’ihi na ihe ndị ahụ abụghị aha.

Olee ihe mere Chineke ji gwa anyị aha ya? Ọ bụ ka anyị nwee ike ịmatakwu onye ọ bụ. Iji maa atụ, e nwere ike ịkpọ mmadụ Maazị, Ọga, Papa, ma ọ bụ Papa Ukwu. Utu aha ndị a nwere ihe ha na-ekwu banyere onye a na-akpọ ha. Ma, aha onye ahụ na-echetara anyị ihe niile anyị maara banyere ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka utu aha bụ́ Onyenwe anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, Nna, na Onye Okike na-echetara anyị ọrụ dị iche iche Chineke na-arụ. Ma, ọ bụ naanị aha ya, bụ́ Jehova, na-echetara anyị ihe niile anyị maara banyere ya. Ị̀ ga-asịnụ na ị maara Chineke ma ọ bụrụ na ị maghị aha ya?

Ọ dị mkpa ịmata aha ahụ, dịkwa mkpa ịkpọ ya akpọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Baịbụl gwara anyị, sị: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”—Ndị Rom 10:13; Joel 2:32.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ihe aha Chineke pụtara nakwa ihe mere aha ahụ adịghị ná nsụgharị Baịbụl ụfọdụ, gụọ peeji nke 195 ruo nke 197 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 6]

E nwere ike ịkpọ mmadụ Maazị, Ọga, Papa, ma ọ bụ Papa Ukwu. Ma, aha onye ahụ na-echetara anyị ihe niile anyị maara banyere ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya