-
Echiche Ụgha nke 1: Mkpụrụ Obi Anaghị Anwụ AnwụỤlọ Nche—2009 | Nọvemba 1
-
-
Echiche Ụgha nke 1: Mkpụrụ Obi Anaghị Anwụ Anwụ
Olee ebe echiche ụgha a si? “Ndị ọkà mmụta oge ochie bụ́ Ndị Kraịst nabatara ozizi mkpụrụ obi anwụghị anwụ nke ndị Gris na-ezi ma were mkpụrụ obi dị ka ihe Chineke kere ma tinye n’ahụ́ mmadụ mgbe a tụụrụ ime ya.”—The New Encyclopædia Britannica (1988), Nke 11, peeji nke 25.
Gịnị ka Baịbụl kwuru? “Mkpụrụ obi ọbụla mehierenụ ga-anwụ.”—Ezikiel 18:4, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.
Baịbụl kwuru banyere otú e si kee mmadụ mbụ bụ́ mkpụrụ obi, sị: “Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi [Hibru, neʹphesh] dị ndụ.”—Jenesis 2:7.
Okwu Hibru bụ́ neʹphesh, nke a sụgharịrị “mkpụrụ obi,” pụtara ‘ihe e kere eke na-eku ume.’ Mgbe Chineke kere nwoke mbụ, bụ́ Adam, O tinyeghị mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ n’ime ya, kama o tinyere ike ndụ nke iku ume na-eme ka ọ na-arụ ọrụ. Ya mere, na Baịbụl, ihe “mkpụrụ obi” pụtara bụ ihe dị ndụ, n’enweghị ihe a gụpụrụ n’ahụ́ ya. Ọ bụrụ na ike ndụ ahụ Chineke tinyere n’ime mmadụ ná mmalite adịkwaghị, mkpụrụ obi na-anwụ.—Jenesis 3:19; Ezikiel 18:20.
Ozizi mkpụrụ obi anwụghị anwụ akpatala ajụjụ ndị a: Olee ebe mkpụrụ obi na-aga mgbe mmadụ nwụrụ? Olee ihe na-eme mkpụrụ obi ndị ajọ omume? Mgbe Ndị Kraịst elu ọnụ nabatara echiche ụgha nke mkpụrụ obi anwụghị anwụ, o mere ka ha nabata echiche ụgha ọzọ, nke bụ́ ozizi ọkụ ala mmụọ.
Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Ekliziastis 3:19; Matiu 10:28; Ọrụ 3:23
NKE BỤ́ EZIOKWU:
Onye nwụrụ anwụ adịkwaghị ndụ
-
-
Echiche Ụgha nke 2: Ndị Ajọ Omume Na-ata Ahụhụ na HelỤlọ Nche—2009 | Nọvemba 1
-
-
Echiche Ụgha nke 2: Ndị Ajọ Omume Na-ata Ahụhụ na Hel
Olee ebe echiche ụgha a si? “N’ime ndị ọkà mmụta Gris oge ochie niile, onye ozizi ya kacha metụta ihe ndị mmadụ kweere banyere Hel bụ Plato.”—Histoire des enfers (Akụkọ Banyere Hel), nke Georges Minois dere, peeji nke 50.
“Malite n’etiti narị afọ nke abụọ AD, ọ malitere ịgụ Ndị Kraịst a kụzitụụrụ nkà ihe ọmụma Gris agụụ ịkụzi ihe ha kweere otú ọ ga-ekwekọ n’ihe a kụziiri ha . . . Nkà ihe ọmụma nke kacha masị ha bụ ozizi Plato.”—The New Encyclopædia Britannica (1988), Nke 25, peeji nke 890.
“Ozizi Chọọchị gosiri na e nwere hel nakwa na ọ na-adịru mgbe ebighị ebi. Ozugbo ndị mere njọ ogbugbu nwụrụ, mkpụrụ obi ha na-aga na hel, bụ́ ebe ha na-enweta ntaramahụhụ hel, bụ́ ‘ọkụ ebighị ebi.’ Ahụhụ kachanụ a na-ata mmadụ na hel bụ ikewapụ ya n’ebe Chineke nọ ruo mgbe ebighị ebi.”—Catechism of the Catholic Church, nke 1994, peeji nke 270.
Gịnị ka Baịbụl kwuru? “N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị, . . . n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol, ebe ị na-aga.”—Ekliziastis 9:5, 10.
A sụgharịrị okwu Hibru bụ́ Shiol, nke pụtara “ebe ndị nwụrụ anwụ nọ,” “hel” n’ụfọdụ nsụgharị Baịbụl. Olee ihe amaokwu ndị ahụ na-akụziri anyị banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Hà na-ata ahụhụ na Shiol iji kwụọ ụgwọ njọ ha? Mba, n’ihi na ha “amaghị ihe ọ bụla.” Ọ bụ ya mere na mgbe nna ochie bụ́ Job nọ n’oké ahụhụ n’ihi ajọ ọrịa rịara ya, ọ rịọrọ Chineke, sị: “Chebe m na hel [Hibru, Shiol].” (Job 14:13; nsụgharị Douay-Rheims Version) Olee uru arịrịọ a ga-abara ya ma a sị na Shiol bụ ebe a na-ata mmadụ ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi? Na Baịbụl, naanị ihe hel pụtara bụ ili nke ihe niile bụ́ mmadụ, bụ́ ebe a na-anaghị arụ ọrụ ọ bụla.
Ezi uche ọ́ kaghị dịrị n’otú a e si kọwaa hel, ó kwekọghịkwa n’Akwụkwọ Nsọ? Olee ụdị ihe ọjọọ mmadụ ga-eme, n’agbanyeghị otú ọ jọruru ná njọ, ga-eme ka Chineke nke hụrụ anyị n’anya mekpaa ya ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi? (1 Jọn 4:8) Ma, ọ bụrụ na ọkụ ala mmụọ bụ echiche ụgha, oleekwanụ maka eluigwe?
Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Abụ Ọma 146:3, 4; Ọrụ 2:25-27; Ndị Rom 6:7, 23
NKE BỤ́ EZIOKWU:
Chineke anaghị ata ndị mmadụ ahụhụ na hel
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 5]
Barrators—Giampolo/The Doré Illustrations For Dante’s Divine Comedy/Dover Publications Inc.
-
-
Echiche Ụgha nke 3: Ndị Ọma Niile Ga-aga EluigweỤlọ Nche—2009 | Nọvemba 1
-
-
Echiche Ụgha nke 3: Ndị Ọma Niile Ga-aga Eluigwe
Olee ebe echiche ụgha a si? Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, ná mbido narị afọ nke abụọ Oge Anyị, Ndị Nna Chọọchị oge gboo ghọrọ ndị a ma ama. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia (2003), Nke 6, peeji nke 687, kwuru banyere ozizi ha, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ime ha kụziri na ozugbo e mechara ka mkpụrụ obi onye nwụrụ anwụ dị ọcha otú o kwesịrị, a na-enye ya ohere ịga kporie ndụ n’eluigwe.”
Gịnị ka Baịbụl kwuru? “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.”—Matiu 5:5.
Ọ bụ ezie na Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ya ‘ga-akwadebere ha ebe’ n’eluigwe, Jizọs gosiri na ọ bụghị ndị ezi omume niile ga-aga ebe ahụ. (Jọn 3:13; 14:2, 3) Ọ̀ bụ na o kpeghị ekpere ka uche Chineke “meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe”? (Matiu 6:9, 10) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere olileanya abụọ onye ezi omume ọ bụla ga-enwe otu n’ime ha. Ole na ole n’ime ha ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 5:10.
Ka oge na-aga, chọọchị oge gboo gbanwere otú o si ele ihe bụ́ ọrụ ya n’ụwa anya. Gịnị si na ya pụta? Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Chọọchị ji nwayọọ nwayọọ nọchie anya Alaeze Chineke ahụ a na-atụ anya ya.” Chọọchị malitere inwetakwu ikike site n’itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, leghara ihe doro anya Jizọs kwuru anya, nke bụ́ na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19; 17:14-16; 18:36) Eze Ukwu Constantine nke Rom mere ka chọọchị gbanwee ụfọdụ n’ime ihe ha kweere, nke otu n’ime ha bụ banyere onye Chineke bụ.
Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Jọn 17:3; 2 Timoti 2:11, 12
NKE BỤ́ EZIOKWU:
Ihe ka ọtụtụ ná ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi—ọ bụghị n’eluigwe
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 6]
Art Resource, NY
-
-
Echiche Ụgha nke 4: Chineke Bụ Atọ n’Ime OtuỤlọ Nche—2009 | Nọvemba 1
-
-
Echiche Ụgha nke 4: Chineke Bụ Atọ n’Ime Otu
Olee ebe echiche ụgha a si? “Mmadụ nwere ike iche na ọ bụ nnọọ na narị afọ nke anọ ka a malitere izi ozizi Atọ n’Ime Otu. E nwere ike ikwu na nke a bụ eziokwu . . . Ozizi ‘Chukwu atọ dị n’ime otu Chukwu’ agbanyechaghị mgbọrọgwụ tupu ngwụcha narị afọ nke anọ, o dokwara anya na Ndị Kraịst anabatachaghị ya ná ndụ ha nakwa n’ozizi ha tupu mgbe ahụ.”—New Catholic Encyclopedia (1967), Nke 14, peeji nke 299.
“E nwere Nzukọ Nicaea na May 20, 325 [Oge Anyị]. Constantine n’onwe ya nọ n’isi oche, jiri ịnụ ọkụ n’obi duzie nkwurịta okwu ahụ, ma jiri aka ya tụpụta . . . ụkpụrụ ahụ dị mkpa nke gosiri ihe jikọrọ Kraịst na Chineke nke dị n’ozizi nzukọ ahụ wepụtara, nke bụ́ na ‘ya na Nna ahụ bụ otu.’ . . . N’ihi ụjọ ndị bishọp ahụ tụrụ eze ukwu ahụ, ha bịanyere aka n’ozizi ahụ, ma e wezụga naanị mmadụ abụọ, n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ha achọtụghị ime otú ahụ.”—Encyclopædia Britannica (1970), Nke 6, peeji nke 386.
Gịnị ka Baịbụl kwuru? “Ma Stivin, n’ihi na o jupụtara na Mmụọ Nsọ, lere anya n’eluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jizọs ka o guzoro n’aka nri Chineke. Ọ gwara ndị Juu ahụ okwu sị, ‘Lee! Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Jisọs Onye nzọpụta ka o guzo n’aka nri Chineke!’”—Ọrụ 7:55, 56, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
Olee ihe ọhụụ a na-egosi? Ebe Stivin jupụtara na mmụọ nsọ, ọ hụrụ Jizọs ka o “guzoro n’aka nri Chineke.” Ya mere, o doro anya na Jizọs aghọghachighị Chineke mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ ma laghachi n’eluigwe, kama nke ahụ, ọ bụ mmụọ dị iche n’ebe Chineke nọ. Ebe ahụ ekwughị na e nwere onye nke atọ nọ n’akụkụ Chineke. N’agbanyeghị mbọ niile a gbara inweta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị kwadoro ozizi Atọ n’Ime Otu, otu ụkọchukwu òtù Dominic bụ́ Marie-Émile Boismard dere n’akwụkwọ ya bụ́ À l’aube du christianisme—La naissance des dogmes (Mmalite Iso Ụzọ Kraịst—Mmalite Ozizi Dị Iche Iche), sị: “Ọ dịghị ebe a ga-agụta n’Agba Ọhụrụ . . . na e nwere chi atọ n’otu Chineke.”
Ihe mere e ji malite ozizi ahụ Constantine tụpụtara bụ iji kwụsị esemokwu e nwere na Chọọchị na narị afọ nke anọ. Ma, ọ kpatara nnọọ ajụjụ ọzọ bụ́: Meri, bụ́ nwaanyị mụrụ Jizọs, ọ̀ bụ “Nne nke Chukwu”?
Jiri amaokwu Baịbụl ndị a tụnyere ibe ha: Matiu 26:39; Jọn 14:28; 1 Ndị Kọrịnt 15:27, 28; Ndị Kọlọsi 1:15, 16
NKE BỤ́ EZIOKWU:
Ọ bụ ná ngwụcha narị afọ nke anọ ka a malitere izi ozizi Atọ n’Ime Otu
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 7]
Museo Bardini, Florence
-