Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè
“Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.”—1 TIM. 4:15.
1, 2. Olee ihe anyị ma banyere Timoti mgbe ọ ka na-eto eto na ihe mere mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ?
NWA okorobịa bụ́ Timoti bi n’obodo Galeshia nke ndị Rom na-achị, nke dị n’ebe bụ Turkey ugbu a. E hiwere ọtụtụ ọgbakọ n’ebe ahụ mgbe ọtụtụ afọ gafere Jizọs nwụrụ. Ka oge na-aga, Timoti, nne ya, na nne nne ya, ghọrọ Ndị Kraịst ma na-eme nke ọma n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị ebe ahụ. (2 Tim. 1:5; 3:14, 15) Obi dị Timoti ụtọ mgbe ya na ndị ọ ma nọ. Ma, ihe malitere ịgbanwe ná mberede.
2 Nke a malitere mgbe Pọl onyeozi bịara ebe ahụ nke ugboro abụọ. O nwere ike ịbụ na Timoti dị ihe dị ka afọ iri abụọ mgbe ahụ. Ikekwe ọ bụ mgbe Pọl gara Listra ka ọ chọpụtara na ‘ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị dị ebe ahụ na-akọ akụkọ ọma banyere Timoti.’ (Ọrụ 16:2) Ọ ghaghị ịbụ na nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti gosiri na ya bụ dimkpa. Mmụọ nsọ duziri Pọl na ndị okenye nọ n’ọgbakọ Timoti nọ ka ha bikwasị ya aka n’isi wee họpụta ya ịrụ ọrụ pụrụ iche n’ọgbakọ.—1 Tim. 4:14; 2 Tim. 1:6.
3. Olee ihe ùgwù pụrụ iche Timoti nwere?
3 E nyere Timoti ọrụ ọ na-atụghị anya ya, ya bụ, iso Pọl onyeozi na-eje ozi ala ọzọ. (Ọrụ 16:3) Cheedị otú nke a ga-esi tụọ Timoti n’anya ma mee ya obi ụtọ. Ruo ọtụtụ afọ, Timoti ga na-eso Pọl, sorokwa ndị ọzọ mgbe ụfọdụ, na-arụ ọrụ dị iche iche ndịozi na ndị okenye nyere ha. Pọl na Timoti gara ebe dị iche iche wee gbaa ọtụtụ ụmụnna ha ume ma mee ka ha nọsie ike n’ọgbakọ. (Gụọ Ọrụ 16:4, 5.) Nke a mere ka ọtụtụ ụmụnna mara na Timoti na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Mgbe Timoti na Pọl rụkọrọ ọrụ ihe dị ka afọ iri, Pọl degaara ndị Filipaị akwụkwọ ozi, sị: “Enweghị m onye ọzọ nke nwere ụdị obi [Timoti] nwere, bụ́ onye ihe banyere unu ga-emetụ n’obi n’ezie. . . . Unu maara ihe àmà o nyere banyere onwe ya, na dị ka nwata ya na nna ya nọ, o so m bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma na-aga n’ihu.”—Fil. 2:20-22.
4. (a) Olee ọrụ dị ezigbo mkpa e nyere Timoti? (b) Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ banyere ihe Pọl kwuru na 1 Timoti 4:15?
4 N’oge ahụ Pọl degaara ndị Filipaị akwụkwọ, o nyere Timoti ọrụ dị ezigbo mkpa. O nyere ya ọrụ ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. (1 Tim. 3:1; 5:22) O doro anya na Timoti aghọọla okenye e nwere ike ịtụkwasị obi. N’agbanyeghị nke a, Pọl gbara Timoti ume n’otu akwụkwọ ozi ahụ o deere ya ka ‘o mee ka ọganihu ya pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.’ (1 Tim. 4:15) Ọ̀ bụ na Timoti emebeghị ka ọganihu ya pụta ìhè nke ọma? Oleezi ihe Pọl bu n’obi, oleekwa otú anyị nwere ike isi rite uru na ndụmọdụ o nyere Timoti?
Otú Mmadụ Si Eme Ka Ọganihu Ya Pụta Ìhè
5, 6. Olee ihe chọrọ ime n’ọgbakọ dị n’Efesọs, oleekwa otú Timoti ga-esi eme ihe maka ya?
5 Ka anyị tụlee okwu ndị ọzọ gbara 1 Timoti 4:15 gburugburu. (Gụọ 1 Timoti 4:11-16.) Pọl gara Masedonia tupu ya edegara Timoti akwụkwọ ozi a, ma ọ gwara Timoti ka ọ nọrọ n’Efesọs. N’ihi gịnị? Ụfọdụ ndị nọ n’Efesọs nọ na-akpata nkewa n’ọgbakọ site n’ịkụzi ozizi ụgha. Ọ chọrọ ka Timoti hụ na e jighị ozizi ụgha duhie ndị nọ n’ọgbakọ. Olee otú ọ ga-esi eme nke a? Otu n’ime ụzọ ọ ga-esi eme nke a bụ site n’isetịpụrụ ndị ọzọ ihe nlereanya.
6 Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Bụụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ihe nlereanya, n’ikwu okwu, n’omume, n’ịhụnanya, n’okwukwe, n’ịdị ọcha.” O kwukwara, sị: “Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.” (1 Tim. 4:12, 15) Ọganihu Pọl na-ekwu okwu ya ebe a bụ ka Timoti na-akpa àgwà ọma, ọ bụghị ka o nwekwuo ihe ùgwù. Nke a bụ ụdị ọganihu Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime ka ọ pụta ìhè.
7. Gịnị ka mmadụ niile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ime?
7 Taa, e nwere ihe ùgwù ije ozi dị iche iche n’ọgbakọ dị ka e nwere n’oge Timoti nọ n’ụwa. Ụfọdụ bụ ndị okenye, ndị ọzọ abụrụ ndị ohu na-eje ozi. E nwere ndị na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ oge niile. E nwekwara ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, nwee ndị na-eje ozi na Betel, nweekwa ndị ozi ala ọzọ. Ọtụtụ ndị okenye na-ezi ihe ná mgbakọ dị iche iche. Ma, Ndị Kraịst niile, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ma ndị na-eto eto, nwere ike ime ka àgwà ọma ha pụta ìhè. (Mat. 5:16) N’ezie, dị ka ọ dị na nke Timoti, Ndị Kraịst ndị nwere ihe ùgwù ije ozi pụrụ iche kwesịrị ime ka àgwà ọma ha pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.
Bụrụ Ihe Nlereanya n’Ikwu Okwu
8. Olee otú okwu ọnụ anyị si egosi ma ànyị na-efe Chineke nke ọma ka ọ̀ bụ na anyị anaghị efe ya?
8 Otu n’ime ebe Timoti ga-abụ ihe nlereanya bụ n’ikwu okwu. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ọganihu anyị pụta ìhè n’ikwu okwu? Ihe anyị na-ekwu n’ọnụ na-egosi ụdị mmadụ anyị bụ. Jizọs kwutere ya mgbe ọ sịrị: “Ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Mat. 12:34) Nwanne Jizọs bụ́ Jems ghọtara na ihe anyị na-ekwu n’ọnụ ga-egosi ma ànyị na-efe Chineke nke ọma ka ọ̀ bụ na anyị anaghị efe ya. O dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chere na ya na-efe Chineke n’ụzọ ziri ezi ma ọ dịghị achịkwa ire ya, kama na-aghọgbu obi ya, ụdị ofufe onye a na-efe bụ ihe efu.”—Jems 1:26.
9. Olee otú okwu ọnụ anyị kwesịrị isi bụrụ ihe nlereanya?
9 Ihe anyị na-ekwu n’ọnụ nwere ike igosi ndị nọ n’ọgbakọ anyị otú anyị nweruru ọganihu. N’ihi ya, kama ịna-ekwu okwu ndị rere ure na okwu ndị na-akụda mmụọ, ma ọ bụ ịkatọwa ndị ọzọ na imebi aha ha, Ndị Kraịst tozuru okè na-agbalị iwuli ndị ọzọ elu, ịkasi ha obi, ịgụgụ ha, na ịgba ha ume. (Ilu 12:18; Efe. 4:29; 1 Tim. 6:3-5, 20) Anyị na-egosi na anyị na-asọpụrụ Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ ime ka ndị ọzọ ghọta ihe mere anyị ji kwesị ịna-akpa àgwà dị iche iche Chineke chọrọ ka anyị na-akpa. (Rom 1:15, 16) Ndị nwere ezi obi ga-ahụ otú anyị si ekwu okwu, ha nwekwara ike iṅomi anyị.—Fil. 4:8, 9.
Bụrụ Ihe Nlereanya n’Omume na n’Ịdị Ọcha
10. Olee ihe mere anyị ji kwesị inwe okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọganihu anyị pụta ìhè?
10 Ọ bụghị naanị n’okwu ọnụ ka Onye Kraịst kwesịrị isetịpụ ezigbo ihe nlereanya. Ọ bụrụ na mmadụ na-ekwu ihe dị mma ma ọ naghị eme ihe dị mma, ọ bụ onye ihu abụọ. Pọl ma na ndị Farisii bụ ndị ihu abụọ, marakwa ihe ọjọọ omume ha na-akpata. Ọ gwara Timoti ihe karịrị otu ugboro ka o zere omume ihu abụọ. (1 Tim. 1:5; 4:1, 2) Ma, Timoti abụghị onye ihu abụọ. N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Timoti, ọ sịrị: “M na-echeta okwukwe ahụ nke dị n’ime gị, nke na-abụghị nke ihu abụọ ọ bụla.” (2 Tim. 1:5) N’agbanyeghị nke a, Timoti ka kwesịrị ime ka ndị ọzọ mara na ọ bụ ezigbo Onye Kraịst. O kwesịrị ịbụ ezigbo ihe nlereanya n’omume.
11. Gịnị ka Pọl gwara Timoti banyere akụnụba n’akwụkwọ o degaara ya?
11 N’akwụkwọ ozi abụọ Pọl degaara Timoti, ọ gwara ya ọtụtụ omume ndị ọ ga-ezere. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Timoti ka ọ ghara ịna-achụ ihe onwunwe. Pọl dere, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile. Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, e duhiewo ụfọdụ, ha wee dapụ n’okwukwe. Ha wee jiri ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.” (1 Tim. 6:10) Onye hụrụ ego n’anya na-egosi na ya ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ma, Ndị Kraịst obere ihe ha nwere, ya bụ, “ihe oriri na uwe,” juru afọ, na-enwe ọganihu.—1 Tim. 6:6-8; Fil. 4:11-13.
12. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ọganihu anyị pụta ihe ná ndụ anyị na-ebi kwa ụbọchị?
12 Pọl gwara Timoti mkpa ọ dị ka ụmụnna nwaanyị “jiri uwe dị mma n’anya na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.” (1 Tim. 2:9) Ndị inyom ndị na-emeru ihe n’ókè ma nwee uche zuru okè mgbe ha na-ahọrọ ụdị uwe ha ga-eyi, nakwa mgbe ha na-eme ihe ndị ọzọ ná ndụ, na-esetịpụ ezigbo ihe nlereanya. (1 Tim. 3:11) Nke a gbasakwara ụmụnna ndị nwoke. Pọl dụrụ ndị nlekọta ọdụ ka ha bụrụ ndị ‘na-emeru ihe n’ókè, ndị uche ha zuru okè, ndị na-eme ihe n’usoro.’ (1 Tim. 3:2) Ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ndị a kwa ụbọchị, ọganihu anyị ga-apụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.
13. Dị ka Timoti mere, olee otú anyị nwere ike isi bụrụ ihe nlereanya n’ịdị ọcha?
13 Timoti kwesịkwara ịbụ ihe nlereanya n’ịdị ọcha. E nwere kpọmkwem omume Pọl bu n’uche mgbe ọ na-ekwu banyere ịdị ọcha. Ọ bụ ihe banyere inwe mmekọahụ. Mgbe ọ kacha mkpa ka Timoti na-adị ọcha n’omume bụ mgbe ya na ndị inyom na-emekọ ihe. O kwesịrị imeso “ụmụ nwaanyị mere okenye dị ka ndị nne, na-emeso ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne [ya] ndị nwaanyị n’ịdị ọcha niile.” (1 Tim. 4:12; 5:2) Chineke madị onye mere omume rụrụ arụ ná nzuzo, ndị ọzọ na-emechakwa mara ya. Ma, ọrụ ọma Onye Kraịst na-arụ na-apụtakwa ìhè. (1 Tim. 5:24, 25) Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ohere ime ka ọganihu ha pụta ìhè n’omume na n’ịdị ọcha.
Ọ Dị Mkpa Ka Anyị Nwee Ịhụnanya na Okwukwe
14. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si kwusie okwu ike na ọ dị mkpa ka anyị hụ ibe anyị n’anya?
14 Ịhụnanya bụ isi ihe e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Olee otú anyị si egosi na anyị nwere ịhụnanya a? Okwu Chineke gwara anyị ka anyị ‘jiri ịhụnanya na-ediri ibe anyị ihe,’ gwa anyị ka anyị ‘nwee obiọma n’ebe ibe anyị nọ, ka anyị nwee obi ọmịiko, nakwa ka anyị na-agbaghara ibe anyị kpamkpam.’ Ọ gwakwara anyị ka anyị na-ele ọbịa. (Efe. 4:2, 32; Hib. 13:1, 2) Pọl onyeozi dere, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ.”—Rom 12:10.
15. Olee ihe mere anyị niile, karịchaa ndị nlekọta ọgbakọ, ji kwesị ịhụ ndị ọzọ n’anya?
15 Ọ bụrụ na Timoti dị aka ike, ma ọ bụkwanụ ghara inwe obiọma n’ebe ụmụnna ya nọ, nke a gaara emebi ihe ọma niile ọ na-eme n’izi ihe nakwa n’ilekọta ọgbakọ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:1-3.) Ma, ọ bụrụ na Timoti ahụ ụmụnna ya n’anya n’eziokwu, na-ele ha ọbịa, ma na-arụrụ ha ọrụ ọma, ọganihu ya ga-apụta ìhè. N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na n’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Timoti, ọ kpọrọ ịhụnanya aha kpọmkwem dị ka otu n’ime àgwà Timoti kwesịrị isetịpụ ihe nlereanya na ya.
16. Olee ihe mere Timoti ji kwesị inwe okwukwe siri ike?
16 Timoti zutere ule mgbe ọ nọ n’Efesọs. E nwere ndị nọ na-akụzi ihe na-ekwekọghị n’ozizi Ndị Kraịst. Ndị ọzọ nọ na-akọsa ‘akụkọ ụgha’ ma ọ bụ na-eme nnyocha n’ihe ndị na-enweghị uru ha ga-abara ọgbakọ. (Gụọ 1 Timoti 1:3, 4.) Pọl kwuru na ndị dị otú a bụ ndị ‘nganga na-afụli elu, ndị na-adịghị aghọta ihe ọ bụla, kama ha bụ ndị oké ajụjụ na ịrụ ụka banyere okwu dị iche iche na-agba ara.’ (1 Tim. 6:3, 4) Timoti ò kwesịrị ichebara ihe ndị a ụfọdụ ndị na-akụzi n’ọgbakọ echiche? O kwesịghị, n’ihi na Pọl gbara ya ume ka ọ “lụọ ezi ọgụ nke okwukwe” nakwa ka ọ gbakụta “okwu nzuzu ndị na-emerụ ihe dị nsọ azụ nakwa ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha nke a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha.” (1 Tim. 6:12, 20, 21) O doro anya na Timoti mere ihe a dị mma Pọl dụrụ ya n’ọdụ.—1 Kọr. 10:12.
17. Olee otú e nwere ike isi lee okwukwe anyị ule taa?
17 Ọ dị mma ịmara na Pọl gwara Timoti na “n’oge ikpeazụ, ụfọdụ ga-adapụ n’okwukwe, na-aṅa ntị n’okwu nduhie ndị si n’aka mmụọ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Tim. 4:1) Ndị niile nọ n’ọgbakọ, tinyere ndị nwere ihe ùgwù, kwesịrị inwe okwukwe siri ike ka Timoti. Ọ bụrụ na anyị agbadosie ụkwụ ike n’ala jụ ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akụzi, anyị nwere ike ime ka ọganihu anyị pụta ìhè ma bụrụ ihe nlereanya n’okwukwe.
Gbaa Mbọ Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè
18, 19. (a) Olee otú i nwere ike isi mee ka ọganihu gị pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ? (b) Olee ihe ọzọ anyị ga-atụle?
18 O doro anya na ihe e ji ama Onye Kraịst nwere ọganihu abụghị otú ọ dị n’anya, nkà ndị o nwere, ma ọ bụ otú o si bụrụ onye a ma ama. Ọ bụghịkwa afọ ole onye ahụ nọrọla n’ọgbakọ. Kama ihe ndị a, ihe na-egosi na anyị na-enwe ọganihu bụ ma ọ bụrụ na ihe anyị na-eche n’echiche, okwu ọnụ anyị, nakwa omume anyị na-egosi na anyị na-erubere Jehova isi. (Rom 16:19) Anyị kwesịkwara ịhụ ndị ọzọ n’anya ma nwee okwukwe siri ike dị ka a gwara anyị mee. Ya mere, ka anyị chebara ihe Pọl gwara Timoti echiche ma tinye uche na ya ka ọganihu anyị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.
19 Àgwà ọzọ anyị kwesịrị inwe iji gosi na anyị na-enwe ọganihu nakwa na anyị bụ Ndị Kraịst tozuru okè bụ ọṅụ, nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Gal. 5:22, 23) N’isiokwu na-eso, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi mụta inwe ọṅụ ma nọgide na-enwe ya mgbe ihe na-esiri anyị ike.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Olee ihe okwu ọnụ anyị na-agwa ndị ọzọ banyere anyị?
• Olee otú ọganihu anyị si apụta ìhè n’omume anyị nakwa n’ịdị ọcha anyị?
• Olee ihe mere Ndị Kraịst ji kwesị isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ịhụnanya nakwa n’okwukwe?
[Foto dị na peeji nke 11]
Nwa okorobịa bụ́ Timoti gosiri na ya bụ dimkpa
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Ọganihu gị ọ̀ na-apụta ìhè n’ebe ndị ọzọ nọ?