Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 2/1 p. 15
  • “Mụ Onwe M Agaghị Echefu Gị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Mụ Onwe M Agaghị Echefu Gị”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Obi Ọmịiko nke Chineke Anyị”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Jehova—Nna Anyị nke Nwere Ọmịiko
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Chineke Bụ Ịhụnanya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ịhụnanya Nne Nwere n’Ebe Nwa Ya Nọ Na-egosi Ịhụnanya Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 2/1 p. 15

Bịaruo Chineke Nso

“Mụ Onwe M Agaghị Echefu Gị”

Ọ̀ BỤ eziokwu na Jehova hụrụ ndị na-efe ya n’anya? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú ọ hụruru ha n’anya? Ọ bụ naanị Chineke ga-azali anyị ajụjụ ndị a. Jehova si na Baịbụl mee ka anyị mata otú ọ hụruru anyị n’anya. Ka anyị leba anyị n’ihe e kwuru n’Aịzaya 49:15.

Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwuo ihe ga-eme ka anyị mata otú ọ hụruru ndị na-efe ya n’anya. Ihe o kwuru na-emetụ n’obi nke ukwuu. O bu ụzọ jụọ otu ajụjụ ga-eme ka mmadụ chee echiche. Ọ jụrụ, sị: “Nwaanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara, nke na ọ gaghị emere nwa ọ mụrụ ebere?” Ọ bụrụ na mmadụ echebaraghị ajụjụ a echiche, o nwere ike ịsị na azịza ya bụ mba. O nwere ike ịsị, ‘Oleekwanụ otú nwaanyị ga-esi chefuo nwa ya ka na-aṅụ ara ebe ọ bụ na nwa ahụ enweghị ike ilekọta onwe ya ma n’ehihie ma n’abalị?’ Naanị ihe nwata ka na-aṅụ ara na-eme bụ ibe ákwá mgbe ọ bụla ọ chọrọ ka mama ya bịa meere ya ihe. Ma, e nwere ihe ọzọ Jehova chọrọ iji ajụjụ ahụ kụziere anyị.

Gịnị mere nwaanyị ji enye nwa ya ara ma na-emere nwa ahụ ihe ọ bụla ọ chọrọ? Ọ̀ bụ naanị ka nwa ya kwụsị ibe ákwá? Mba. Nwaanyị ọ bụla na-emere “nwa ọ mụrụ ebere.” Okwu Hibru a sụgharịrị “ebere” n’amaokwu a pụtara inwere onye nọ ná mkpa ma ọ bụ onye nọ ná nsogbu ọmịiko. O nweghị ọmịiko karịrị ụdị ọmịiko nne na-enwere nwa ya ka na-aṅụ ara.

Ma, ọ dị mwute na ọ bụghị ụmụ nwaanyị niile na-emere ụmụ ha ka na-aṅụ ara ebere. Jehova kwuru, sị: “Ọbụna ndị inyom a nwere ike ichefu.” Anyị bi n’ụwa ebe ọtụtụ ndị bụ “ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ,” ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. (2 Timoti 3:1-5) Mgbe ụfọdụ, anyị na-anụ na e nwere ụmụ nwaanyị ndị na-anaghị elekọta ụmụ ha mụrụ ọhụrụ nke ọma na ndị na-ata ụmụ ha ahụhụ nakwa ndị nke na-ahapụ ụmụ ha tinye isi ebe masịrị ha. Otu akwụkwọ nke na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru banyere Aịzaya 49:15, sị: “Ụmụ nwaanyị bụkwa ndị na-ezughị okè, ụfọdụ n’ime ha nwere ike ichefu ụmụ ha ka na-aṅụ ara ebe ha na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Otú ọ sọkwara mmadụ ya hụ onye ọzọ n’anya, o nwere ike imecha kwụsị ịhụ onye ahụ n’anya.”

Ma Jehova gwara anyị ihe a na-emesi obi ike. Ọ sịrị, “Ma mụ onwe m agaghị echefu gị.” Ihe a Jehova kwuru emeela ka anyị malite ịghọta ihe mere o ji jụọ ajụjụ ahụ ọ jụrụ n’Aịzaya 49:15. Ihe ọ na-agwa anyị n’amaokwu ahụ bụ na ịhụnanya ya dị ezigbo iche na nke ụmụ mmadụ. Jehova adịghị ka ndị nne na-ezughị okè bụ́ ndị nwere ike ichefu ụmụ ha ka na-aṅụ ara. O nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara inwere ndị na-efe ya ọmịiko mgbe ha nọ ná mkpa ma ọ bụkwanụ chefuo ha. Ọ bụ ya mere akwụkwọ ahụ anyị kwuburu okwu ya ji kwuo banyere Aịzaya 49:15, sị: “N’Agba Ochie, o nwere ike ịbụ n’amaokwu a ka Chineke kacha gosi otú ọ hụruru ụmụ mmadụ n’anya.”

Ọ̀ bụ na ihe a ị mụtara banyere “obi ọmịiko nke Chineke anyị” anaghị eme gị obi ụtọ? (Luk 1:78) Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụta otú i nwere ike isi bịarukwuo Jehova nso? Chineke a, bụ́ onye hụrụ ndị na-efe ya n’anya, gwara ha okwu a na-emesi obi ike: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Febụwarị:

◼ Aịzaya 43-62

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya