Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 10/1 p. 6
  • “Anyị Ahụwo Mesaya Ahụ”!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Anyị Ahụwo Mesaya Ahụ”!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ha Nọ Na-atụ Anya Mesaya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Mesaya Ahụ Bụ Onye Chineke Ga-esi n’Aka Ya Zọpụta Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 10/1 p. 6

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ?

“Anyị Ahụwo Mesaya Ahụ”!

Ihe dị ka narị afọ anọ e dechara akwụkwọ ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, amụma ahụ Maịka buru gbasara Mesaya ahụ mezuru, ya bụ, a mụrụ Jizọs na Betlehem. Ihe dị ka afọ iri atọ a mụchara ya, ya bụ, n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst, ihe mbụ Daniel buru n’amụma gbasara Mesaya ahụ a na-atụ anya ya mezuru. E mere Jizọs baptizim n’afọ ahụ, Chineke ejiri mmụọ nsọ tee ya mmanụ. Ihe ndị a mere kpọmkwem n’oge e buru n’amụma na Mkpụrụ ahụ, bụ́ Mesaya, ga-abịa.

Jizọs bidoro ozi ya ozugbo ahụ, “na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 8:1) Jizọs dị obiọma, dịrị nwayọọ ma hụ ndị mmadụ n’anya otú ahụ e buru n’amụma na ọ ga-adị. Ihe ọ kụziiri ndị mmadụ baara ha uru, gosikwa na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ gwọrọ ndị mmadụ “ụdị ọrịa ọ bụla” ha na-arịa. Ihe niile a o mere gosiri na Chineke nọnyeere ya. (Matiu 4:23) Ndị mmadụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, bịakwutere Jizọs. Ha kwuru na ha “ahụwo Mesaya ahụ”!—Jọn 1:41.

Jizọs buru amụma na tupu Alaeze ya amalite ịchị ụwa, a ga-enwe agha, ala ọma jijiji, na ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ. Ọ gwara mmadụ niile ka ha ‘na-eche nche.’—Mak 13:37.

Jizọs zuru okè, o rubekwaara Chineke isi. Ma, o nwere ọtụtụ ndị iro, ha mechakwara gbuo ya. Ọnwụ ya ghọrọ àjà zuru okè nke a ga-eji mee ka anyị nwetaghachi ihe ahụ Adam na Iv tufuru, ya bụ, olileanya ịdị ndụ na paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.

Ọnwụ Jizọs na mkpọli Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ ụbọchị atọ ọ nwụchara mezuru amụma e buru na Baịbụl. Mgbe a kpọlitechara Jizọs, ọ ghọrọ mmụọ dị ike. Ma tupu ya alaghachi n’eluigwe, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị mmadụ ise bụ́ ndị na-eso ụzọ ya ma gwa ha ka kwusaara “ndị mba niile” ozi ọma banyere ya na Alaeze ya. (Matiu 28:19) Hà rụrụ ọrụ ahụ nke ọma otú Jizọs gwara ha?

​—Ihe a kọrọ n’isiokwu a si na Matiu, Mak, Luk, Jọn, 1 Ndị Kọrịnt.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya