Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 1/1 p. 13
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Ọzụzụ Atụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 1/1 p. 13

Ị̀ MAARA?

Na Baịbụl, gịnị ka okwu bụ́ “ọnaozi” pụtara?

Onye ọnaozi ndị Asiria kpụrụ n’ahụ́ ájá

Onye ọnaozi ndị Asiria kpụrụ n’ahụ́ ájá

Mgbe ụfọdụ, a kpọọ mmadụ ọnaozi, ọ pụtara na onye ahụ bụ nwoke a pịrị amụ. N’oge a na-ede Baịbụl, a na-apị ụfọdụ ụmụ nwoke amụ. Ọ na-abụkarị ndị a chọrọ ịta ahụhụ, ndị e jidere n’agha, ma ọ bụkwanụ ndị e ji mere ohu ka a na-apị amụ. Ọ bụ ụmụ nwoke a pịrị amụ, bụ́ ndị a tụkwasịrị obi, na-elekọta ebe ụmụ nwaanyị na-ebi n’obí eze. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ndị ọnaozi abụọ aha ha bụ Hegaị na Sheashgaz na-elekọta ndị nwunye eze Peshia aha ya bụ Ahazuirọs na ndị iko ya. Ọ dị ka ọ̀ bụ eze a bụ Zaksis nke Mbụ.—Esta 2:3, 14.

Ma, ọ bụghị ndị niile Baịbụl kpọrọ ndị ọnaozi ka a pịrị amụ. Ndị ọkà mmụta kwuru na a na-akpọkwa onye na-arụ ọrụ n’obí eze ọnaozi. Ọ ga-abụ na ihe mere e ji kpọọ Ibed-melek, bụ́ onye ya na Jeremaya rụkọrọ ọrụ, ọnaozi bụ na ọ na-arụ ọrụ n’obí eze. Ọ ga-abụkwa ya mere e ji kpọọ otu nwoke Itiopia Filip ziri ozi ọma ọnaozi. O nwere ike ịbụ na Ibed-melek nọ n’ọkwá dị elu n’obí Eze Zedekaya n’ihi na ọ chọọ ịhụ eze a, ọ na-aga n’onwe ya ahụ ya. (Jeremaya 38:7, 8) Baịbụl kwukwara na nwoke Itiopia ahụ na-elekọta akụ̀ eze nwaanyị ndị Itiopia nakwa na “ọ gara Jeruselem ife Chineke.”—Ọrụ Ndịozi 8:27.

Gịnị mere ndị na-azụ atụrụ n’oge Baịbụl ji ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ?

Ebe onye ọzụzụ atụrụ du ewu na atụrụ ya

Mgbe Jizọs na-ekwu ihe ga-eme n’oge a ga-ekpe ndị mmadụ ikpe n’ọdịnihu, ọ sịrị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, . . . ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ.” (Matiu 25:​31, 32) Gịnị mere onye na-azụ ewu na atụrụ ga-eji ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ?

Ndị na-azụ ewu na atụrụ na-eduru ewu na atụrụ ha aga ebe ha ga-anọ taa ahịhịa. N’abalị, ha na-akpọba ha n’ụlọ a rụụrụ ha ka anụ ọhịa ghara ịtagbu ha, ka ndị ohi ghara izuru ha, ma ọ bụ ka oyi ghara ịtụgbu ha. (Jenesis 30:32, 33; 31:38-40) A na-edewe atụrụ iche n’ihi na ọ bụghị anụ siri ike, karịchaa, nne atụrụ na ndị nke a mụrụ ọhụrụ, ka ewu ghara imerụ ha ahụ́ n’ihi na ewu na-adị gara gara karịa atụrụ. Otu akwụkwọ aha ya bụ All Things in the Bible kwuru na ndị na-azụ atụrụ anaghị ekwe ka ewu na atụrụ nọkọta mgbe atụrụ ‘dị ime ma ọ bụ mgbe ọ na-akwado ịmụ nwa, mgbe a na-apịpụta mmiri ara ya, nakwa mgbe a na-akpacha ya ajị.’ Nke a gosiri na ndị Jizọs gwara okwu n’Izrel oge ochie mgbe o ji ewu na atụrụ mee ihe atụ a ghọtara ihe o kwuru n’ihi na ewu na atụrụ juru eju n’ebe ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya