Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 4 p. 3
  • Akụkọ Dị́ Ezigbo Mkpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akụkọ Dị́ Ezigbo Mkpa
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka
    Teta!: Otú Baịbụl Si Rute Anyị Aka
  • A3 Otú Anyị Si Nweta Baịbụl
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Chineke Na-agwa Anyị Banyere Nzube Ya Nile
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • À Gbanweela Ihe Ndị E Dere n’Okwu Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 4 p. 3

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?

Akụkọ Dị́ Ezigbo Mkpa

Ebe otu nwoke ji Baịbụl na-ele anya ka onye ihe gbagwojuru anya

N’ime akwụkwọ okpukpe niile dị n’ụwa, e nweghị nke dị ka Baịbụl. N’akwụkwọ niile dịterela aka ka Baịbụl, o nweghị nke ọtụtụ ndị ka kweere ihe o kwuru otú ha si kwere n’ihe Baịbụl kwuru. Ma, e nwebeghị akwụkwọ a gbarala ụkwụ otú e si gbaa Baịbụl.

Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị gụrụ oké akwụkwọ echeghị na ihe ndị e dere na Baịbụl ndị e nwere taa na ihe ndị mbụ dere Baịbụl dere bụ otu. Otu prọfesọ nke gụrụ gbasara okpukpe kwuru, sị: “Anyị ejighị n’aka na ndị sí na Baịbụl mbụ sụgharịa Baịbụl ndị anyị nwere taa sụgharịtara ya. E nwere ọtụtụ ihe ndị ha na-asụgharịtaghị. A sụgharịkwara ọtụtụ n’ime ha ọtụtụ narị afọ e dechara Baịbụl mbụ. Ihe ndị e dekwara na ha dị ezigbote iche.”

E nwekwara ndị ji maka ihe ndị a kụziiri ha n’okpukpe ha kwere na ihe ndị dị na Baịbụl ndị e nwere taa abụghị eziokwu. Otu nwoke aha ya bụ Faizal kwuru na ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst kụziiri ya na Baịbụl bụ akwụkwọ nsọ, mana a gbanweela ihe e dere na ya. O kwuru na o meziri ka ya na-enyo onye ọ bụla chọrọ ịgwa ya ihe dị na Baịbụl enyo. O kwukwara na a sịdị kwuwe, Baịbụl onye ahụ ji abụghị nke ezigbo ya, kama, ọ bụ nke adịgboroja.

Ọ̀ dị mkpa ka mmadụ chọpụta ma à gbanweela ihe e dere na Baịbụl ma ọ bụ na a gbanwebeghị ya? E nwere ajụjụ abụọ ga-enyere anyị aka ịma ma ọ̀ dị mkpa. Ha bụ: Ọ bụrụ na ị maghị ma ihe ọma ndị Baịbụl anyị na-agụ taa kwuru na Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu hà bụ ihe Baịbụl mbụ kwuru, obi ọ̀ ga-esi gị ike na ha ga-emezu? (Ndị Rom 15:4) Ọ bụrụ na ihe e dere na Baịbụl ndị e nwere taa dị iche n’ihe e dere na Baịbụl mbụ, ị̀ ga-eji ya na-ekpebi ụdị ọrụ ị ga-arụ, otú ihe ga-esi na-aga n’ezinụlọ gị, ma ọ bụkwanụ otú ị ga-esi na-efe Chineke?

Ọ bụ eziokwu na akwụkwọ ndị dere Baịbụl ná mmalite ji dee ya adịghịzi, anyị ka nwere ike ịhụ ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ndị e ji aka depụtaghachi n’oge ochie. Olee otú akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ndị ahụ si dịrị ruo taa n’agbanyeghị na ha nwere ike irekasị, na e nwekwara ndị na-achọghị ka ha dịrị, nweekwa ndị chọrọ ịgbanwe ihe e dere na ha? Oleekwa otú otú a ha si dịrị ruo taa ga-esi mee ka obi sie gị ike na ihe e dere na Baịbụl ndị anyị nwere taa na ihe e dere na Baịbụl mbụ bụ otu? Gụọ isiokwu na-eso nke a ka ị mata azịza ajụjụ ndị a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya