Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 6 p. 16
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke ọ̀ na-aza ekpere niile?
  • Ò nwere otú pụrụ iche anyị kwesịrị ịnọ mgbe anyị na-ekpe ekpere?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • M Kpee Ekpere Chineke Ọ̀ Ga-aza M?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 6 p. 16
Ebe otu nwaanyị na-ekpe ekpere

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Chineke ọ̀ na-aza ekpere niile?

Ị̀ GA-ASỊ NA Ọ NA-AZA EKPERE . . .

  • Onye ọ bụla

  • Ụfọdụ ndị

  • Ka ị̀ ga-asị na ọ naghị aza onye ọ bụla?

IHE BAỊBỤL KWURU

“Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu.”—Abụ Ọma 145:18.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

  • Chineke anaghị aza ndị na-enupụrụ ya isi ekpere. (Aịzaya 1:15) Ma, ha na Chineke nwere ike ‘ikpezi’ ma ọ bụrụ na ha agbanwee otú ha si ebi ndụ.—Aịzaya 1:18.

  • Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-aza anyị ekpere, anyị kwesịrị ịna-ekpe ya ka ọ daba n’ihe Baịbụl kwuru bụ́ uche ya.—1 Jọn 5:14.

Ò nwere otú pụrụ iche anyị kwesịrị ịnọ mgbe anyị na-ekpe ekpere?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na mgbe ọ bụla ha na-ekpe ekpere na ha na-egbunye ikpere n’ala, hulata isi, ma ọ bụkwanụ jikọta aka ha ọnụ. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na e nweela ndị Chineke zara ekpere ha. Ụfọdụ n’ime ha ‘nọdụrụ ala,’ ma ọ bụ ‘bilie ọtọ’ mgbe ha na-ekpe ekpere. E nwekwara ndị nke ‘gbatịrị onwe ha n’ala,’ nweekwa ndị “gburu ikpere n’ala.” (1 Ihe E Mere 17:16; 2 Ihe E Mere 30:27; Ezra 10:1; Ọrụ Ndịozi 9:40) E nweghị otú o kwuru anyị kwesịrị ịnọ ma anyị kpewe ekpere.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

  • Chineke na-aza ndị dị́ umeala n’obi ekpere.—Abụ Ọma 138:6.

  • I nwere ike ikpe ekpere n’asụsụ ọ bụla ma ọ bụdị kpee ya n’ime obi gị.—2 Ihe E Mere 6:32, 33; Nehemaya 2:1-6.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 17 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ a.

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya