Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 1 p. 3
  • Olee Uru Ịgụ Baịbụl Bara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Uru Ịgụ Baịbụl Bara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Baịbụl Baara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Ọgụgụ Bible Na-atọ Ụtọ Karị?
    Teta!—2001
  • Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịdị Na-agụ Ihe?
    Teta!—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 1 p. 3
Ebe otu nwaanyị na-ewere Baịbụl n’ọ́bá akwụkwọ

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Olee Uru Ịgụ Baịbụl Bara?

“Echere m na agaghị m aghọtali Baịbụl.”​—Jovy

“Ọ dịcha m ka ịgụ Baịbụl ga na-agwụ ike.”​—Queennie

“Ọ na-abụ m leechaa otú Baịbụl hà, ike ịgụ ya ana-agwụ m.”​—Ezekiel

È nwetụla mgbe ị chọrọ ịgụ Baịbụl, ya adị gị otú ọ dị otu n’ime ndị a? E nwere ndị ịgụ Baịbụl na-esiri ezigbo ike. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime ha, gị amata na Baịbụl nwere ike ime ka ndụ na-atọkwu gị ụtọ, olee ihe ị ga-eme? Ọ bụrụkwanụ na ị chọpụta na o nwere otú i nwere ike isi na-agụ Baịbụl, ya ana-atọkwu gị ụtọ, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịgụ ya? Gbalịanụ gụọ Baịbụl ka ị hụ ihe ndị o kwuru ga-abara gị uru.

Ka anyị legodị uru ụfọdụ ndị kwuru na ha ritere mgbe ha gụwara Baịbụl.

E nwere ihe otu nwa okorobịa aha ya bụ Ezekiel kwuru. Ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ. Ọ sịrị: “Na mbụ, m na-ebi ndụ ka onye bu ụgbọala na-aga n’enweghị ebe o bu n’uche ịga. Ma, mgbe m gụwara Baịbụl, ndụ m bịara nwee isi. Ihe e dere na Baịbụl na-enyere m aka kwa ụbọchi.”

E nwekwara ihe otu nwa agbọghọ dịkwa ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Frieda kwuru. Ọ sịrị: “M na-ewebu iwe ọkụ. Ma, ihe ndị m gụtara na Baịbụl emeela ka m na-ejide onwe m. O meekwala ka mụ na ndị mmadụ na-adịkwu ná mma.”

Otu nwaanyị aha ya bụ Eunice dị ihe dị ka afọ iri ise kwuru na Baịbụl na-enyere ya aka ịbụ ezigbo mmadụ, na-enyekwara ya aka ịgbanwe àgwà ndị na-adịchaghị mma ọ na-akpa.

Ihe a ndị a kwuru, nakwa ihe ọtụtụ ndị ọzọ gụrụla Baịbụl chọpụtara, gosiri na ịgụ Baịbụl nwere ike ime ka ndụ na-atọ gị ụtọ. (Aịzaya 48:17, 18) Ịgụ Baịbụl nwekwara ike inyere gị aka (1) ime mkpebi ndị dị mma, (2) imete ezigbo ndị enyi, (3) idi nsogbu, (4) nakwa ịmụta gbasara Chineke, bụ́ ihe kacha mkpa ná ndụ. E nweghị mgbe ime ihe Baịbụl kwuru ga-aghọ gị ahịa n’ihi na ọ bụ Chineke mere ka e dee ha. Chineke agaghị agwa gị mee ihe na-adịghị mma.

Ihe dị mkpa bụ ka i bidogodị gụwa Baịbụl. Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ime ka ịgụ Baịbụl gụwa gị agụụ, nakwa ka ọ na-atọ gị ụtọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya