-
Gịnị Bụ Shiol na Hedis?Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
-
-
IHE ODIDE NTỤKWASỊ
Gịnị Bụ Shiol na Hedis?
N’ASỤSỤ ndị mbụ e jiri dee Bible, e ji okwu Hibru bụ́ sheʼohlʹ na okwu Grik ya na ya kwekọrọ bụ́ haiʹdes mee ihe ihe karịrị ugboro 70. Ọ dị ihe jikọtara okwu abụọ ahụ na ọnwụ. Ná nsụgharị ụfọdụ nke Bible, a sụgharịrị ha ịbụ “ala mmụọ.” Nke a abụghị nsụgharị ziri ezi. Otú ọ dị, n’ihe ka n’ọtụtụ asụsụ, e nweghị okwu ndị na-enye kpọmkwem echiche okwu Hibru na Grik ndị a na-enye. N’ihi ya, New World Translation jiri okwu ndị ahụ bụ́ “Shiol” na “Hedis” mee ihe. Gịnị ka okwu ndị a pụtara n’ezie? Ka anyị rịba ama otú e si jiri ha mee ihe n’akụkụ dị iche iche nke Bible.
Eklisiastis 9:10 na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Shiol], ebe gị onwe gị na-ala.” Nke a ọ̀ pụtara na Shiol na-ezo aka n’otu ili kpọmkwem, bụ́ ebe ọ pụrụ ịbụ na anyị liri onye anyị hụrụ n’anya? Ee e. Mgbe Bible na-ezo aka n’otu ebe kpọmkwem e liri mmadụ, ma ọ bụ n’ili, ọ na-eji okwu Hibru na Grik ndị ọzọ eme ihe, ọ bụghị sheʼohlʹ na haiʹdes. (Jenesis 23:7-9; Matiu 28:1) Bible ejighịkwa okwu ahụ bụ́ “Shiol” mee ihe maka ili e liri ọtụtụ mmadụ na ya, dị ka ili ezinụlọ.—Jenesis 49:30, 31.
Oleezi ụdị ebe “Shiol” na-ezo aka na ya? Okwu Chineke na-egosi na “Shiol,” ma ọ bụ “Hedis,” na-ezo aka n’ihe karịrị nnọọ ili e liri ọtụtụ mmadụ na ya. Dị ka ihe atụ, Aịsaịa 5:14 na-ekwu na “[Shiol] emewo ka ọchịchọ mkpụrụ obi ya saa mbara, ọ saghebigawokwa ọnụ ya ókè.” Ọ bụ ezie na Shiol eloworị ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ na-eyikarị ka ọ̀ na-achọkwu ndị ọzọ ọ ga-elo. (Ilu 30:15, 16) N’adịghị ka ebe nkịtị a na-eli mmadụ, bụ́ nke a pụrụ ili ozu ole na ole na ya, “afọ adịghị eju [Shiol] na ebe ịla n’iyi.” (Ilu 27:20) Shiol adịghị eju eju. Afọ adịghị eju ya. Ya mere, Shiol, ma ọ bụ Hedis, abụghị ebe a pụrụ ịhụ anya. Kama, ọ bụ ili nke ihe a kpọrọ mmadụ, ebe ihe atụ, bụ́ ebe ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ na-ehi ụra ọnwụ.
Ihe Bible kụziri banyere mbilite n’ọnwụ na-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe “Shiol” na “Hedis” pụtara. Okwu Chineke na-eji Hedis eme ihe maka ụdị ọnwụ a ga-enwe mbilite n’ọnwụ na ya.a (Ọrụ 2:31) Okwu Chineke na-egosikwa na ndị nọ na Hedis, na-agụnye, ọ bụghị nanị ndị jewooro Jehova ozi, kamakwa ọtụtụ ndị na-ejereghị ya ozi. (Mkpughe 20:13) N’ihi ya, Bible na-akụzi na a ga-enwe “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15.
a N’ụzọ dị iche, e kwuru na ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ nọ, ọ bụghị na Shiol, ma ọ bụ Hedis, kama “na Gehena.” (Matiu 5:30; 10:28; 23:33) Dị ka Shiol na Hedis, Gehena abụghị ebe a na-ahụ anya.
-
-
Ụbọchị Ikpe—Gịnị Ka Ọ Bụ?Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
-
-
IHE ODIDE NTỤKWASỊ
Ụbọchị Ikpe—Gịnị Ka Ọ Bụ?
OLEE ihe na-agbata gị n’uche ma ị nụ banyere Ụbọchị Ikpe? Ọtụtụ ndị na-eche na ọtụtụ ijeri mmadụ ga-abịa otu otu n’ihu ocheeze Chineke. Ha rute n’ebe ahụ, e kpee onye nke ọ bụla ikpe. A ga-eji ndụ eluigwe dị ụtọ kwụọ ụfọdụ ndị ụgwọ, a ga-amakwa ndị ọzọ ikpe ịta ahụhụ ebighị ebi. Otú ọ dị, ihe Bible na-akọwa banyere oge ahụ dị nnọọ iche. Okwu Chineke na-akọwa ya dị ka oge olileanya na nke mweghachi, ọ bụghị dị ka oge na-emenye egwu.
Ná Mkpughe 20:11, 12, anyị na-agụ otú Jọn onyeozi si kọwaa Ụbọchị Ikpe: “M wee hụ otu nnukwu ocheeze ọcha na onye na-anọkwasị na ya. Eluigwe na ala gbapụrụ n’ihu ya, ọ dịghịkwa ebe a hụrụ maka ha. M wee hụ ndị nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ, e meghekwara akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Ma e meghere akwụkwọ mpịakọta ọzọ; ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke ndụ. E kpekwara ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe ndị ahụ e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ dị ka omume ha si dị.” Ònye bụ onyeikpe a kọwara n’ebe a?
Jehova Chineke bụ Onyeikpe kasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, a bịa n’ọrụ ikpe ahụ n’onwe ya, o nyefere ya onye ọzọ. Dị ka Ọrụ Ndị Ozi 17:31 si kwuo, Pọl onyeozi kwuru na Chineke ‘esetịpụwo otu ụbọchị nke ọ na-ezube ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtaworo.’ Onyeikpe a a họpụtara bụ Jizọs Kraịst. (Jọn 5:22) Otú ọ dị, olee mgbe Ụbọchị Ikpe ga-amalite? Ogologo oge hà aṅaa ka ọ ga-ewe?
Akwụkwọ Mkpughe na-egosi na Ụbọchị Ikpe ga-amalite mgbe agha Amagedọn gasịrị, bụ́ mgbe a ga-ebibi usoro ihe nke Setan nwere n’ụwa.a (Mkpughe 16:14, 16; 19:19–20:3) Mgbe Amagedọn gasịrị, a ga-atụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya mkpọrọ n’ime abis ruo otu puku afọ. N’oge ahụ, 144,000 ahụ, bụ́ ndị ha na Kraịst ga-eketakọ ihe n’eluigwe, ga-abụ ndị ikpe, ha ga-esorokwa “Kraịst ahụ chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.” (Mkpughe 14:1-3; 20:1-4; Ndị Rom 8:17) Ụbọchị Ikpe ahụ abụghị ihe omume a ga-eme ọkụ ọkụ nke ga-ewe nanị awa 24. Ọ ga-ewe otu puku afọ.
N’ime otu puku afọ ahụ, Jizọs Kraịst ‘ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.’ (2 Timoti 4:1) “Ndị dị ndụ” ga-abụ “oké ìgwè mmadụ” ndị ga-alanarị Amagedọn. (Mkpughe 7:9-17) Jọn onyeozi hụkwara “ndị nwụrụ anwụ . . . ka ha na-eguzo n’ihu ocheeze” nke ikpe. Dị ka Jizọs kwere ná nkwa, ‘ndị nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Kraịst] wee pụta’ site n’ibilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ma gịnị ka a ga-adabere na ya kpee mmadụ nile ikpe?
Dị ka ọhụụ Jọn onyeozi hụrụ na-egosi, ‘e meghere akwụkwọ mpịakọta dị iche iche, kpeekwa ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe ndị ahụ e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ dị ka omume ha si dị.’ Akwụkwọ mpịakọta ndị a hà bụ ihe ndekọ nke ihe ndị mmadụ mere n’oge gara aga? Ee e, ikpe ahụ agaghị adabere n’ihe ndị mmadụ mere tupu ha anwụọ. Olee otú anyị si mara? Bible na-ekwu, sị: “A tọhapụwo onye nwụworo anwụ ná mmehie ya.” (Ndị Rom 6:7) N’ihi ya, ndị a kpọlitere n’ọnwụ agaghị enwe ntụpọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ya mere, ọ ghaghị ịbụ na akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ na-anọchi anya ihe ndị Chineke chọkwuru n’aka ụmụ mmadụ. Iji dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ndị lanarịrị Amagedọn nakwa ndị a kpọlitere n’ọnwụ aghaghị irube isi n’iwu Chineke, gụnyere ihe ọhụrụ ọ bụla Jehova ga-achọ n’aka ndị mmadụ, bụ́ ihe ndị ọ pụrụ ime ka a mata n’otu puku afọ ahụ. N’ihi ya, a ga-ekpe ndị mmadụ ikpe n’otu n’otu dabere n’ihe ha mere n’ime Ụbọchị Ikpe ahụ.
N’Ụbọchị Ikpe ahụ, ọtụtụ ijeri mmadụ ga-enwe ohere na nke mbụ ya ịmata banyere uche Chineke na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. Nke a pụtara na a ga-enwe ọrụ izi ihe dị ukwuu. N’ezie, ‘ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi ga-amụta.’ (Aịsaịa 26:9) Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile ga-adị njikere ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke. Aịsaịa 26:10 na-ekwu, sị: “A sị na e meere onye na-emebi iwu amara, ọ gaghị amụta ezi omume; n’ala nke izi ezi nile ọ ga-eme ajọ omume, ma ọ gaghị ahụ ịdị elu nke Jehova.” N’Ụbọchị Ikpe ahụ, a ga-egbu ndị ajọ omume a, ha agaghị enwekwa olileanya mbilite n’ọnwụ.—Aịsaịa 65:20.
Ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ nke Ụbọchị Ikpe ahụ, ndị lanarịrịnụ ‘ga-abịaworị dịrị ndụ’ n’ụzọ zuru ezu dị ka ndị zuru okè. (Mkpughe 20:5) N’ihi ya, n’Ụbọchị Ikpe ahụ, a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ zughachi okè dị ka ha zuru na mbụ. (1 Ndị Kọrint 15:24-28) Ule ikpeazụ ga-ewerezi ọnọdụ. A ga-atọhapụ Setan na mkpọrọ ma hapụ ya ka ọ gbalịa iduhie ihe a kpọrọ mmadụ na nke ikpeazụ ya. (Mkpughe 20:3, 7-10) Ndị guzogidere ya ga-ahụ mmezu zuru ezu nke nkwa Bible bụ́: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ee, Ụbọchị Ikpe ga-ewetara ihe nile a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ngọzi!
a Banyere Amagedọn, biko lee Ụlọ Nche nke May 15, 1990, peeji nke 3-7, nakwa isi nke 20 nke akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe, ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtachara ha.
-