“Hụnụ Òtù Ụmụnna Dum n’Anya”
E dere ihe a Baịbụl kwuru ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. (1 Pita 2:17) Ma, ugbu a ka anyị kwesịrị ime ihe a Baịbụl kwuru karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Olee otú anyị ga-esi hụ ụmụnna anyị nọ n’ụwa dum n’anya? Gịnị ga-enyere anyị aka ịhụ ha n’anya mgbe niile n’ụwa a ịhụnanya na-adịghị? (Mat. 24:12) Kirie vidio bụ́ Ụmụnna Anyị Nọ n’Ụwa Dum ka ị mata azịza ajụjụ ndị a.
(1) Olee mgbe mmadụ na-aghọ Onyeàmà Jehova? (2) Gịnị bụ ihe atọ ụmụnna anyị na-eme n’ụwa dum? (3) Olee mbọ ụmụnna anyị na-agba ka ha nwee ike izi ozi ọma (a) n’Alaska, (b) n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị́ na Yurop, nakwa (ch) na Peruu? (4) Gịnị mere anyị ji kwesị iji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe? (5) Nye ihe atụ ndị na-egosi na Ndịàmà Jehova na-agbatara ibe ha ọsọ enyemaka ma e nwee (a) ala ọma jijiji, (b) ajọ ifufe, ma ọ bụkwanụ (ch) n’oge agha. (6) Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi na-egosi na ya hụrụ ụmụnna ya n’anya, nke bụ́ àgwà e ji mara Ndịàmà Jehova n’ụwa niile? (Jọn 13:35) (7) Olee uru dị́ n’ụmụnna ịgbakọ aka ọnụ arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze? (8) Olee otú ụmụnna ndị nọ́ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop na Rọshịa si jisie ike na-efe Chineke n’oge a machibidoro ha iwu? (9) Olee otú ọtụtụ ụmụnna si agba mbọ ka ha nwee ike ịga mgbakọ? Oleekwa ihe mere ha ji agba ụdị mbọ ndị ahụ? (10) Olee otú vidio a sirila mee ka i kpebie (a) iso ụmụnna ndị ọzọ na-efe Jehova n’ọmụmụ ihe, (b) inyere ndị nọ́ ná mkpa aka, (ch) ịna-ekwusasi ozi ọma ike otú ọ ga-agara gị were were? (11) Olee otú anyị ga-esi jiri vidio a na-ezi ozi ọma? Oleekwa mgbe ọ ga-adị mma ka anyị gosi ya ndị mmadụ?
Ihe mere anyị ji ghọọ Ndịàmà Jehova bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụ ịhụnanya a mere anyị ji amụ gbasara ya ma na-akụziri ndị mmadụ gbasara ya. Ndị anyị hụrụ n’anya bụ ndị Jehova hụrụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị enyere ha aka ma ha nọrọ ná mkpa, anyị agaghị atụ anya ka Jehova kelee anyị. Kama, anyị na-ekele ya n’ihi na ụmụnna anyị bụ onyinye magburu onwe ya o nyere anyị. Ka ụwa a ịhụnanya na-adịghị na-agba egwú ụla, ọ ga-adị mma ka anyị gbaa mbọ mgbe niile na-eme ihe na-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya.