Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Disemba p. 28-30
  • Ì Jikerela ‘Iketa Ụwa’?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Jikerela ‘Iketa Ụwa’?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • DỊ NJIKERE ILEKỌTA ỤWA
  • DỊ NJIKERE ILEKỌTA NDỊ A GA-AKPỌLITE N’ỌNWỤ
  • DỊ NJIKERE ỊKỤZIRI NDỊ A GA-AKPỌLITE N’ỌNWỤ IHE
  • A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Olee Ndị A Ga-akpọlite n’Ọnwụ? Ebee Ka Ha Ga-ebi?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Nkebi nke 10
    Gee Chineke Ntị
  • Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Disemba p. 28-30
Ebe ndị mmadụ na-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Ụfọdụ na-ekpofu ihe, ụfọdụ ana-arụ ụlọ, e nweekwa ndị na-elekọta okooko osisi.

Ì Jikerela ‘Iketa Ụwa’?

ANYỊ niile na-atụ anya mgbe nkwa a Jizọs kwere ga-emezu, nke bụ́: “Ndị dị nwayọọ n’obi na-enwe obi ụtọ, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Mat. 5:5) Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-eketa ụwa mgbe ha ga-abụ ndị eze n’eluigwe ma soro Jizọs na-achị ụwa. (Mkpu. 5:10; 20:6) Ma, ọtụtụ nde ezigbo Ndị Kraịst taa ga-eketa ụwa mgbe ha ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-ezu okè, obi eruo ha ala, ha ana-enwekwa obi ụtọ. Iji mee ka ihe a kwe omume, e nwere ọrụ ndị dị mkpa ha ga-arụ. Legodị atọ n’ime ha. Ha ga-elekọta ụwa, hụ na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ nwetara ihe ndị dị ha mkpa, kụziekwara ndị a kpọlitere n’ọnwụ ihe. Cheekwa banyere ihe ndị ị ga na-eme ugbu a iji gosi na ị chọrọ iso mee ihe ndị ahụ.

DỊ NJIKERE ILEKỌTA ỤWA

Mgbe Jehova nyere ụmụ mmadụ iwu ka ha ‘ju n’ụwa, na-elekọtakwa ya,’ ihe o kwuru gosiri na ụwa niile ga-emecha ghọọ paradaịs. (Jen. 1:28) Ụmụ mmadụ ndị ga-eketa ụwa ga-eme ihe ahụ Jehova chọrọ ka e mee. Ụwa agaghị abụ paradaịs ná mmalite n’ihi na ogige Iden adịghịzi. Amagedọn gachaa, anyị ga-enwe ọtụtụ ọrụ anyị ga-arụ iji mezie ebe ndị e mebiri emebi n’ụwa. Ọ ga-abụ nnukwu ọrụ.

Ihe a na-echetara anyị ọrụ ụmụ Izrel rụrụ mgbe ha si Babịlọn lọta. E nweghị onye bi n’ala ha ruo afọ iri asaa. Ma, Aịzaya buru amụma na Jehova ga-enyere ha aka ha emee ka ala ahụ maa mma ọzọ. Aịzaya buru amụma, sị: “Ọ ga-eme ka ala ịkpa ya dị ka Iden, meekwa ka ọzara ya dị ka ubi Jehova.” (Aịza. 51:3) Jehova nyeere ndị Izrel aka ha emee ka ala ha maakwa mma ọzọ. Jehova ga-enyekwara ndị ga-eketa ụwa aka ime ka ụwa bụrụ paradaịs. E nwekwara ihe ndị i nwere ike ịna-eme ugbu a ga-egosị na ị chọrọ iso rụọ ọrụ ahụ a ga-arụ.

Otu n’ime ihe ndị i nwere ike ịna-eme ugbu a bụ ịgba mbọ na-edebe ụlọ gị na gburugburu ebe i bi ọcha, haziekwa ha ahazie. I kwesịrị ịna-eme otú ahụ ọ bụrụgodị na ndị agbata obi gị anaghị eme ya. I nwekwara ike ịna-enye aka edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ ọcha ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ha. I nwere ike idejupụta akwụkwọ maka iso na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị omume. Ị ga-esi otú ahụ gosi na ị chọrọ ịna-enyere ụmụnna gị aka ma nsogbu bịara ha. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ nwere ike ịmụta nkà m ga-eji arụ ọrụ ma ọ bụrụ na Jehova emee ka m soro ná ndị ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi?’

Ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya.

DỊ NJIKERE ILEKỌTA NDỊ A GA-AKPỌLITE N’ỌNWỤ

Ozugbo Jizọs kpọlitechara ada Jaịrọs n’ọnwụ, Jizọs kwuru ka e nye nwata ahụ ihe ka o rie. (Mak 5:42, 43) Ọ ga-abụ na o sighị ike ilekọta nwata nwaanyị ahụ dị afọ iri na abụọ. Ma, cheedị gbasara ụdị nnukwu ọrụ ga-adị mgbe Jizọs ga-emezu nkwa ya bụ́ na “ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl akọwaraghị anyị ihe niile, ma anyị ma na e kwesịrị inyere ha aka ka ha nweta nri, ebe ha ga-ebi, na uwe. Ì nwere ike igosi ugbu a na ị chọrọ ịdị njikere inye aka? Legodị ụfọdụ ajụjụ i nwere ike ichebara echiche.

Gịnị ka i nwere ike ime ugbu a iji gosi na ị dị njikere iketa ụwa?

Ebe ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ n’ọdụ ụgbọelu na-anabata ndị bịara mgbakọ mba niile na Paris.

E kwuo na onye nlekọta sekit na-abịa ileta ọgbakọ unu, ì nwere ike ikwu ka ọ bịa n’ụlọ gị rie nri? Ọ bụrụ na a gbanweere nwanna na-arụbu na Betel ọrụ ya, gwa ya ka o jewe ozi n’ọgbakọ unu ma ọ bụ n’ebe unu bi, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na onye nlekọta sekit kwụsịrị ọrụ ya, ì nwere ike inye aka chọtara ya ebe ọ ga-ebi? Ọ bụrụ na a ga-enwe mgbakọ ukwu ma ọ bụ mgbakọ pụrụ iche n’ebe i bi, ì nwere ike iwepụta onwe gị ịrụ ọrụ tupu mgbakọ ebido ma ọ bụ mgbe a gbasara ma ọ bụkwanụ gị esoro nabata ndị ga-abịa?

DỊ NJIKERE ỊKỤZIRI NDỊ A GA-AKPỌLITE N’ỌNWỤ IHE

N’ihi ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 24:15, anyị na-atụ anya na a ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ n’ọnwụ. Ọtụtụ n’ime ha ga-abụ ndị na-amataghị gbasara Jehova tupu ha anwụọ. A ga-enye ha ohere ịmụta gbasara Jehova ma a kpọlitechaa ha n’ọnwụ.a Ọtụtụ ndị ohu Jehova jeerela ya ozi ruo ọtụtụ afọ ga-enye aka kụziere ha ihe. (Aịza. 11:9) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Charlotte na-atụ anya ka oge ahụ ruo eruo. O kwusaala ozi ọma na Yurop, Saụt Amerịka, nakwa n’Afrịka. O ji obi ụtọ kwuo, sị: “M na-atụ anya ịkụziri ndị mmadụ ihe ma a kpọlite ha n’ọnwụ. M gụọ banyere onye dịrị ndụ n’oge gara aga, m na-asịkarị onwe m: ‘A sị na onye a maara Jehova, ndụ ya gaara adị iche.’ Ọ dị m ka oge ahụ ruo eruo ka m kụziere ndị a kpọlitere n’ọnwụ banyere Jehova ma mee ka ha ghọta otú ife Jehova ga-esi mee ka ndụ ha ka mma.”

Ndị ohu Jehova dịrị ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa ga-enwekwa ọtụtụ ihe ha ga-amụta. Chegodị otú obi ga-esi tọọ anyị ụtọ nakwa ụdị ihe ọma ọ ga-abụ ya meere anyị ịkọwara Daniel amụma ndị ahụ o dere ọ na-aghọtaghị. (Dan. 12:8) Cheekwa otú ọ ga-adị gị inyere Rut na Neomi aka ka ha mata na e si n’ezinụlọ ha mụta Mezaya. Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ ịkụziri ndị mmadụ ihe n’ụwa niile n’oge ahụ a na-agaghị enwe nsogbu na ihe ndị na-emegharị mmadụ anya juru n’ụwa Ekwensu a.

Ebe nwanna nwaanyị na-enye onye na-asa ákwà traktị.

Olee otú i nwere ike isi gosi ugbu a na ị dị njikere iso kụziere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ihe? Otu ihe ị ga-eme ugbu a bụ ịgba mbọ na-akụzi ihe nke ọma, na-ekwusakwa ozi ọma mgbe niile. (Mat. 24:14) Ọ bụrụgodị na nká ma ọ bụ ihe ọzọ emee ka ị ghara ịna-ekwusa ozi ọma otú ị chọrọ n’oge a, mbọ ị na-agba ga-egosi na ị dị njikere ịkụziri ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ihe.

Ajụjụ dị mkpa bụ, Ị̀ na-atụ anya iketa ụwa? Ị̀ na-atụ anya mgbe ị ga-eso na-elekọta ụwa, na-enyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ aka, na-akụzikwara ha ihe? Ị ga-egosi na ị dị njikere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ma i soro ugbu a na-arụ ọrụ ndị yiri ndị nke ahụ ị ga-arụ mgbe ị ga-eketa ụwa.

a Gụọ isiokwu bụ́ “Inyere Ọtụtụ Ndị Aka Ka Ha Bụrụ Ndị Ezi Omume,” nke gbara n’Ụlọ Nche Septemba afọ 2022.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya