Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Disemba p. 2-7
  • Anyị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • JEHOVA NA-ADỊRU EBIGHỊ EBI
  • E KERE ANYỊ KA ANYỊ DỊRỊ NDỤ EBIGHỊ EBI
  • NZUBE JEHOVA AGBANWEBEGHỊ
  • ỌDỊNIHU GA-AMAGBU ONWE YA
  • Olee Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighi Ebi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ndụ Ebighị Ebi Ọ̀ Ga-ekwe Omume n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Mmadụ Ò Nwere Ike Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ị̀ Chọrọ Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Disemba p. 2-7

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 49

Anyị Ga-adịli Ndụ Ebighị Ebi

“Onye ọ bụla kweere ga-enweta ndụ ebighị ebi.”—JỌN 6:47.

ABỤ NKE 147 Jehova Kwere Anyị Nkwa Ndụ Ebighị Ebi

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Gịnị ka iche banyere nkwa Jehova kwere anyị na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi ga-eme ka anyị mee?

JEHOVA kwere nkwa na ndị na-erubere ya isi ga-adị “ndụ ebighị ebi.” (Rom 6:23) Ọ bụrụ na anyị echee banyere nkwa a Jehova kwere, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. Chegodị ihe a: Ọ bụ otú Nna anyị nke eluigwe hụruru anyị n’anya mere o ji chọọ ka anyị dị ndụ ebighị ebi ka ihe ọ bụla ghara ikewa anyị na ya.

2. Olee otú nkwa ndụ ebighị ebi a Jehova kwere anyị si abara anyị uru?

2 Nkwa ndụ ebighị ebi a Chineke kwere anyị ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị na-enwe ugbu a. Ọ bụrụgodị na ndị iro anyị asị na ha ga-egbu anyị, anyị agaghị enupụrụ Chineke isi. N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na anyị nwụọ n’ihi na anyị na-erubere Jehova isi, ọ ga-akpọlite anyị n’ọnwụ, anyị enweekwa olileanya na anyị agaghị anwụ ọzọ. (Jọn 5:28, 29; 1 Kọr. 15:55-58; Hib. 2:15) Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na anyị nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi? Legodị ihe ụfọdụ kpatara ya.

JEHOVA NA-ADỊRU EBIGHỊ EBI

3. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jehova ga-emeli ka anyị dị ndụ ebighị ebi? (Abụ Ọma 102:12, 24, 27)

3 Ihe mere anyị ji mara na Jehova ga-emeli ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi bụ na ọ bụ ya na-enye ndụ, yanwa na-adịrukwa mgbe ebighị ebi. (Ọma 36:9) Legodị ebe ụfọdụ na Baịbụl gosiri na Jehova dị kemgbe nakwa na ọ ka ga-adịgide. Abụ Ọma 90:2 kwuru na Jehova dị “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Abụ Ọma nke 102 kwuru ụdị ihe ahụ. (Gụọ Abụ Ọma 102:12, 24, 27.) Habakọk onye amụma kwukwara gbasara Nna anyị nke eluigwe, sị: “Jehova, ọ́ bụghị kemgbe ebighị ebi ka ị dị? Chineke m, Onye Nsọ m, ị naghị anwụ anwụ.”—Hab. 1:12.

4. Ò kwesịrị ịna-echegbu anyị ma ọ bụrụ na anyị aghọtachaghị otú Jehova si dịrị kemgbe ebighị ebi? Kọwaa.

4 Ọ̀ na-esiri gị ike ịghọta otú Jehova si dịrị “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi”? (Ihe e dere n’ala ala peeji Aịza. 40:28.) Ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Elaịhu kwuru gbasara Chineke, sị: “E nweghị ike ịghọta afọ ndụ ya.” (Job 36:26) Ma, ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe, ọ pụtaghị na ihe ahụ abụghị eziokwu. Dị ka ihe atụ, e nwere ike anyị aghọtachaghị otú ìhè si adị. Ma, ọ̀ pụtara na ìhè adịghị? Mbanụ. E nwekwara ike anyị bụ́ ụmụ mmadụ agaghị aghọtacha otú o si bụrụ na Jehova dị kemgbe nakwa na ọ gaghị akwụsị ịdị. Ma, ọ pụtaghị na Chineke anaghị adịru ebighị ebi. Ihe e ji amata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke abụghị ma ànyị ghọtara ya ma ọ bụ na anyị aghọtaghị ya. (Rom 11:33-36) Ihe ọzọ bụ na ọ dịrịla tupu ihe ọ bụla adịrị, ma anyanwụ ma kpakpando. Jehova mere ka obi sie anyị ike na “ọ bụ [ya] ji ike ya kee ụwa,” nakwa na ọ dịrịla tupu ‘ya agbasaa eluigwe.’ (Jere. 51:15; Ọrụ 17:24) Oleekwa ihe ọzọ mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị ga-adịli ndụ ebighị ebi?

E KERE ANYỊ KA ANYỊ DỊRỊ NDỤ EBIGHỊ EBI

5. Olee olileanya Adam na Iv nweburu?

5 Jehova ekeghị ihe ndị dị ndụ n’ụwa ka ha na-adị ndụ ebighị ebi. O nwere mgbe ọ ga-eru, ha anwụọ. Ọ bụ naanị ụmụ mmadụ ka o kere ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. O kere ụmụ mmadụ ka ha ghara ịnwụ anwụ. Ma, ọ gwara Adam, sị: “Erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na ị ga-anwụrịrị n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya.” (Jen. 2:17) A sị na Adam na Iv rubeere Jehova isi, ha agaraghị anwụ. E nwere ezigbo ihe mere anyị nwere ike iji sị na o nwere mgbe ọ gaara eru, Jehova ahapụ ha ka ha rie “mkpụrụ osisi nke ndụ” ahụ. Ihe ọ gaara apụta bụ na ha ga-adị ‘ndụ ebighị ebi.’b—Jen. 3:22.

Ihe “Mgbe Ebighị Ebi” Pụtara na Baịbụl

Okwu Hibru a na-akacha asụgharị “mgbe ebighị ebi” bụ ʽoh·lamʹ. Na Baịbụl, o nwere ike ịpụta ihe dịterela aka ma ọ bụ ihe ga-adịte aka, nke a na-ekwughị mgbe ọ malitere ma ọ bụ mgbe ọ ga-agwụ. (Josh. 24:2; Ọma 24:7, 9) O nwekwara ike ịpụta ihe na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ otú a ka o si bụrụ na Jehova na-anọ ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 102:12, 24, 27) Otú e si sụgharịa okwu Hibru ahụ ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bụ “mgbe ebighị ebi,” “ga-adịte aka,” ma ọ bụ “mgbe dị anya gara aga.” Ọ bụ ihe a na-ekwu ka e ji amata ihe a ga-asụgharị ya.

6-7. (a) Olee ihe ọzọ gosiri na e keghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ? (b) Olee ihe ị ga-achọ ime n’ụwa ọhụrụ? (Kọwaa ihe ndị e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 Ụfọdụ ndị sayensị achọpụtala ihe gosiri na ụbụrụ anyị nwere ike ibuli ihe karịrị ihe anyị ga-amụtali ná ndụ anyị ugbu a. Ihe a dị ịtụnanya. N’afọ 2010, otu isiokwu gbara n’otu akwụkwọ sayensị kwuru na ụbụrụ anyị ga-ebuteli ihe nwere ike ịha ka vidio a ga-eji nde awa atọ lee, ma ọ bụ ihe karịrị narị afọ atọ. O nwekwara ike ịbụ na ụbụrụ anyị ga-ebuteli ihe karịrị ya. Ma, ihe a na-egosi na Jehova kere ụbụrụ anyị ka o butelie ihe karịrị ihe anyị ga-amụta naanị n’afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ.—Ọma 90:10.

7 Jehova kekwara anyị ka ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịdịrị ndụ na-aga. Baịbụl kwuru na Chineke “medịrị ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụu.” (Ekli. 3:11) Ọ bụ ya mere anyị ji were ọnwụ ka onye iro. (1 Kọr. 15:26) Ọ bụrụ na ezigbo ọrịa abịa anyị, ànyị na-agbachi nkịtị, chere ka anyị nwụọ? Mba. Anyị na-aga ụlọ ọgwụ. Mgbe ụfọdụkwa, anyị aṅụọ ọgwụ ka ọrịa ahụ kwụsị. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịnwụ. Ọ bụrụkwa na onye anyị anwụọ, ma ọ̀ bụ nwata ma ọ̀ bụ okenye, ọ na-agbawa anyị obi ruo ogologo oge. (Jọn 11:32, 33) A sị na Nna anyị hụrụ anyị n’anya ebughị n’obi ka anyị na-anọru ebighị ebi, o doro anya na ọ garaghị eke anyị ka anyị nwee ike ịdịrị ndụ na-aga, meekwa ka ọ na-agụ anyị agụụ ime otú ahụ. Ma, e nwekwara ihe ndị ọzọ mere anyị ji kweta na anyị ga-adịli ndụ ebighị ebi. Ka anyị hụ ihe ụfọdụ Jehova mere n’oge gara aga nakwa n’oge a gosiri na nzube ya agbanwebeghị.

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna merela agadi nọ na tebụl ọtụtụ ọgwụ dị n’elu ya, na-agụ Baịbụl ma na-eche gbasara ihe ndị ọ ga-enwe ike ime mgbe ọ ghọrọ okorobịa n’ime ụwa ọhụrụ. 1. Ebe ọ na-akwọ ụgbọ mmiri. 2. Ebe ọ na-ese ihe. 3. Mgbe ọ na-agafe n’akụkụ ebe mmiri si n’elu ugwu na-asọda.

Ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, obi na-adị anyị ụtọ iche gbasara ihe ndị anyị ga-eme n’ọdịnihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)c

NZUBE JEHOVA AGBANWEBEGHỊ

8. Olee ihe Aịzaya 55:11 na-akụziri anyị gbasara nzube Jehova?

8 Ọ bụ eziokwu na Adam na Iv mehiere ma mee ka ụmụ ha na-anwụ anwụ, Jehova agbanweghị obi ya. (Gụọ Aịzaya 55:11.) Nzube ya ka bụ ka ụmụ mmadụ na-erubere ya isi dịrị ndụ ebighị ebi. Ihe mere anyị ji mara ihe a bụ ihe ndị Jehova kwuru na ihe ndị o mere iji mezuo nzube ya.

9. Gịnị ka Chineke kwere nkwa ya? (Dan. 12:2, 13)

9 Jehova kwere nkwa na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, meekwa ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Ọrụ 24:15; Taị. 1:1, 2) Obi siri Job ike na ọ na-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Job 14:14, 15) Daniel onye amụma ma na ndị mmadụ nwere olileanya na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha enweekwa ohere ịdị ndụ ebighị ebi. (Ọma 37:29; gụọ Daniel 12:2, 13.) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ndị Juu ma na Jehova nwere ike ime ka ndị na-efe ya dịrị “ndụ ebighị ebi.” (Luk 10:25; 18:18) Jizọs kwuru gbasara nkwa a ọtụtụ ugboro. Nna ya kpọlitekwara yanwa n’ọnwụ.—Mat. 19:29; 22:31, 32; Luk 18:30; Jọn 11:25.

Ebe nwaanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ ji obi ụtọ na-anabata nwa ya nwoke Ịlaịja onye amụma kpọlitere n’ọnwụ.

Gịnị ka akụkọ onye Ịlaịja kpọlitere n’ọnwụ na-eme ka obi sie gị ike na ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee ihe akụkọ ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’oge gara aga na-egosi? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 Ọ bụ Jehova na-enye ndụ, o nwekwara ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. O nyere Ịlaịja onye amụma ike ya akpọlite nwa nwoke nwaanyị Zarefat di ya nwụrụ. (1 Eze 17:21-23) Mgbe e mechakwara, Chineke nyeere Ịlaịsha onye amụma aka ya akpọlite nwa nwoke nwaanyị Shunem. (2 Eze 4:18-20, 34-37) Akụkọ ndị a na akụkọ ndị ọzọ gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ na-akụziri anyị na Jehova nwere ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na Nna ya nyere ya ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Jọn 11:23-25, 43, 44) Ugbu a, Jizọs nọ n’eluigwe, e nyekwala ya “ike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” N’ihi ya, ọ ga-emezuli nkwa ahụ bụ́ na a ga-akpọlite “ndị nwụrụ anwụ,” ha enweekwa olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Mat. 28:18; Jọn 5:25-29.

11. Olee otú àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ si mee ka o kwe anyị omume inweta ndụ ebighị ebi?

11 Gịnị mere Jehova ji kwe ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya taa ahụhụ ma nwụọ? Jizọs gwara anyị ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Jehova ji Ọkpara ya chụọ àjà iji kpuchie mmehie anyị ma mee ka o kwe anyị omume inweta ndụ ebighị ebi. (Mat. 20:28) Pọl onyeozi kọwara ihe a dị mkpa gbasara nzube Chineke. Ọ sịrị: “Otú ahụ ọnwụ si n’aka otu onye ka ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ga-esikwa n’aka otu onye. Otú ahụ mmadụ niile na-anwụ n’ihi Adam ka a ga-ejikwa maka Kraịst kpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.”—1 Kọr. 15:21, 22.

12. Olee otú Alaeze ahụ ga-esi eme ka Jehova mezuo nzube ya gbasara ụmụ mmadụ?

12 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa nakwa ka uche Chineke mee n’ụwa. (Mat. 6:9, 10) Ihe so n’uche Chineke bụ ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Iji mezuo ya, Jehova họpụtara Ọkpara ya ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze ya. Chineke si n’ụwa na-ahọta otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ga-eso Jizọs mezuo nzube Chineke.—Mkpu. 5:9, 10.

13. Gịnị ka Jehova na-eme ugbu a, oleekwa ihe gịnwa kwesịrị ịna-eme?

13 Ugbu a, Jehova na-akpọkọta “oké ìgwè mmadụ” ma na-azụ ha ka ha nwee ike ibi n’ụwa mgbe Alaeze ya ga na-achị. (Mkpu. 7:9, 10; Jems 2:8) Ọ bụ eziokwu na egwu na agha mere ka ọtụtụ ndị nọ n’ụwa a kewaa, ndị so n’oké ìgwè mmadụ a na-agbalị ka ha ghara ịkpọ ibe ha asị n’agbanyeghị mba ma ọ bụ agbụrụ ha si. Ihe ndị ha na-eme na-egosi na ha akpụgharịala mma agha ha ka ọ bụrụ mma ogè. (Maị. 4:3) Kama iso na-alụ agha ma na-egbu ọtụtụ ndị, ha na-enyere ndị mmadụ aka inweta “ndụ ahụ nke bụ́ ezigbo ndụ.” Otú ha si eme ya bụ ịkụziri ha gbasara Chineke na nzube ya. (1 Tim. 6:19) Ndị ezinụlọ ha nwere ike ịkpọ ha asị ma ọ bụ a napụ ha ihe ha nwere n’ihi na ha na-akwado Alaeze Chineke, ma, Jehova ga-ahụ na ha nwetara ihe niile dị ha mkpa. (Mat. 6:25, 30-33; Luk 18:29, 30) Ihe ndị a na-egosi anyị na Alaeze Chineke dị adị, nakwa na ọ ga-eme ka uche Jehova mezuo.

ỌDỊNIHU GA-AMAGBU ONWE YA

14-15. Olee otú a ga-esi mee ka ọnwụ gharazie ịdị otú ahụ Jehova kwere nkwa ya?

14 Jizọs achịwala n’eluigwe. Ọ ga-emezukwa nkwa niile Jehova kwere. (2 Kọr. 1:20) Kemgbe afọ 1914, Jizọs nọ na-emeri ndị iro ya. (Ọma 110:1, 2) N’oge na-adịghị anya, ya na ndị ya na ha ga-eso chịa ga-ebibi ndị ọjọọ.—Mkpu. 6:2.

15 N’ime otu puku (1,000) afọ ahụ Jizọs ga-achị, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, meekwa ka ndị na-erubere Chineke isi zuo okè. Ule ikpeazụ gachaa, ndị Jehova kpebiri na ha bụ ndị ezi omume “ga-enweta ụwa. Ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọma 37:10, 11, 29) Obi dị anyị ụtọ na ‘a ga-emeri ọnwụ, bụ́ onye iro ikpeazụ.’—1 Kọr. 15:26.

16. Olee ihe kwesịrị ịbụ isi ihe mere anyị ji efe Jehova?

16 Anyị ahụla na olileanya anyị nwere na anyị ga-adịli ndụ ebighị ebi si n’Okwu Chineke. Olileanya ahụ nwere ike inyere anyị aka ka anyị na-erubere Jehova isi n’oge ikpeazụ a ihe siri ike. Ma, ihe kwesịrị ime ka anyị chọọ ime ihe dị Jehova mma abụghị naanị na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi. Ihe bụ́ isi kwesịrị ime ka anyị na-erubere Jehova na Jizọs isi bụ na anyị hụrụ ha n’anya nke ukwuu. (2 Kọr. 5:14, 15) Ọ bụ ịhụnanya a ga-eme ka anyị chọọ ịna-eme ka ha ma na-agwa ndị ọzọ gbasara olileanya anyị nwere. (Rom 10:13-15) Ọ bụrụ na anyị amụta ịna-emesapụ aka, gharakwa ịna-achọ ihe ga-adị naanị anyị mma, anyị ga-abụ ụdị ndị Jehova chọrọ ka ha bụrụ ndị enyi ya ruo mgbe ebighị ebi.—Hib. 13:16.

17. Olee ihe dịzi onye ọ bụla n’ime anyị n’aka? (Matiu 7:13, 14)

17 Ànyị ga-eso ná ndị ga-adị ndụ ebighị ebi? Jehova enyela anyị ohere iso na ha. Ọ bụzi anyị ka ọ dị n’aka ịna-eme ihe ndị ga-eme ka anyị nọrọ n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ. (Gụọ Matiu 7:13, 14.) Olee otú ndụ ga-adị mgbe anyị ga-adị ndụ ebighị ebi? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee ihe ndị gosiri na e kere ụmụ mmadụ ka ha dịrị ndụ ebighị ebi?

  • Olee otú anyị si mara na Jehova agbanwebeghị nzube ya gbasara ụmụ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi?

  • Olee ihe kwesịrị ịbụ isi ihe mere anyị ji chọọ ịdị ndụ ebighị ebi?

ABỤ NKE 141 Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

a Ị̀ na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi? Jehova kwere anyị nkwa na e nwere mgbe anyị ga-adị ndụ, anyị agaghị na-echegbu onwe anyị na anyị nwere ike ịnwụ. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe ụfọdụ mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ya.

b Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe ‘Mgbe Ebighị Ebi’ Pụtara na Baịbụl.”

c NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna merela agadi na-eche gbasara ihe ụfọdụ ọ ga-eme mgbe ọ ga-adị ndụ ebighị ebi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya