Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb17 p. 84-88
  • Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Jọjia

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Jọjia
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
yb17 p. 84-88
Ihe a bụ otu obodo dị n’ebe ugwu Saneti, dị na Jọjia

Ebe Ugwu Saneti

JỌJIA

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Jọjia

Ebe otu nwoke bu mkpụrụ vaịn na nkata; ụyọkọ mkpụrụ vaịn

Ebe otu nwoke bu mkpụrụ vaịn ọ ghọtara n’ubi, obi ana-atọ ya ụtọ

Otú Ala Ya Dị E nwere nnukwu ugwu dị iche iche na Jọjia. Ụfọdụ n’ime ha dị elu karịa puku mita anọ na narị ise. Snoo na-ekpuchikwa elu ugwu ndị ahụ. E kere obodo Jọjia ụzọ abụọ. E nwere ebe ọwụwa anyanwụ na ebe ọdịda anyanwụ. Ebe nke ọ bụla nwere obodo dị iche iche. Oge okpomọkụ na oge oyi ha anaghị abụ otu. Omenala ha, egwú na nri ha dịchakwa iche iche.

Ndị Bi na Ya E nwere ihe dị ka nde mmadụ atọ na narị puku asaa bi na Jọjia. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nwe ala.

Okpukpe Ha Ọtụtụ n’ime ndị bi na Jọjia na-ekpe Chọọchị Ọtọdọks. Ma, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ iri n’obodo ahụ bụ ndị Alakụba.

Asụsụ Ha Asụsụ Jọjia dị iche n’asụsụ obodo ndị ọzọ ha na ha gbara agbata obi. Ihe ndị a kọrọ gbasara obodo a gosiri na e wepụtara mkpụrụ akwụkwọ ndị Jọjia tupu Oge Ndị Kraịst.

Ihe Ha Na-arụ Ọtụtụ ndị bi na Jọjia bụ ndị ọrụ ugbo. N’oge na-adịchabeghị anya, ndị mmadụ malitere ịna-abịa ebe ndị pụrụ iche na Jọjia elegharị anya. Ihe a so n’ihe kacha enye obodo a ego.

Otú Ebe Ahụ Na-adị Ebe ọwụwa anyanwụ Jọjia anaghị ekpo oké ọkụ, ọ naghịkwanụ ajụ oké oyi. A na-enwe oké okpomọkụ n’akụkụ Oké Osimiri Ojii dị n’ebe ọdịda anyanwụ Jọjia. Mkpụrụ osisi ndị dị ka oroma na-emekwa nke ọma ebe ahụ.

Ndị na-ewe mkpụrụ vaịn n’ubi

Ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn n’obodo Kaketi

Nri Ha O nweghị ihe ndị Jọjia riwere ghara bred. Ha na-eme bred ha n’ekwu ọkụ. Ihe ha na-ejikarị eri nri ha bụ stuu e ji akwụkwọ nri na ihe ndị na-eme ka nri tọọ ụtọ sie. E ji ime mmanya mara ndị Jọjia kemgbe ụwa. Ọ na-abụ ha pịpụtachaa mmiri mkpụrụ osisi vaịn ha ji eme mmanya, ha agbanye ya n’ite ájá. Ọtụtụ ezinụlọ na-eji aka ha akọ mkpụrụ vaịn e ji eme mmanya, jirikwa aka ha mee mmanya nke ha. Ụdị mkpụrụ vaịn dị iche iche e nwere na Jọjia ruru ihe dị ka narị ise.

Ebe otu nwaanyị na-eme bred

Ebe otu nwaanyị na-eme bred

OTÚ ALA HA HÀ (na kilomita)

26,900

MMADỤ OLE BI NA YA

3,720,400

NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA N’AFỌ 2016

18,619

MMADỤ OLE OTU ONYE NKWUSA KETARA IZI OZI ỌMA

200

NDỊ BỊARA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS N’AFỌ 2016

32,216

Map Jọjia
    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya