Joshụa
12 Ndị a bụ ndị eze na-achị ala ụmụ Izrel meriri, ndị ha weghaara ala ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ+ nke Jọdan, malite n’iyi ndagwurugwu Anọn+ ruo n’Ugwu Hemọn,+ tinyere Araba+ dum nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ: 2 Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn,+ bụ́ onye na-achị malite n’Aroa+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn,+ na etiti ndagwurugwu ahụ, na ọkara nke Gilied ruo Jabọk+ bụ́ iyi ndagwurugwu, nke bụ́ ókè nke ala ụmụ Amọn, 3 nakwa Araba+ ruo oké osimiri Kineret*+ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruokwa n’oké osimiri Araba, Oké Osimiri Nnu,+ n’ebe ọwụwa anyanwụ Bet-jeshimọt,+ nakwa n’ebe ndịda nke dị n’ala ala mkpọda Pisga.+
4 Tinyere ókèala Ọg+ eze Beshan, onye fọdụrụ n’ime ndị Refeyim,+ bụ́ ndị biri n’Ashtarọt+ na Edriaị,+ 5 onye chịrị n’Ugwu Hemọn+ nakwa na Saleka nakwa na Beshan dum,+ ruo n’ókè ndị Geshọ+ na ndị Meakat,+ na ọkara nke Gilied, ruo n’ókèala Saịhọn+ eze Heshbọn.+
6 Ọ bụ Mozis ohu Jehova na ụmụ Izrel meriri ha,+ Mozis ohu Jehova wee nye ya ụmụ Ruben+ na ụmụ Gad+ na ọkara ebo Manase+ ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
7 Ndị a bụ ndị eze na-achị ala Jọshụa na ụmụ Izrel meriri n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Jọdan, malite na Bel-gad+ nke dị na ndagwurugwu* Lebanọn,+ ruo n’Ugwu Helak,+ nke dị ruo Sia,+ Jọshụa wee nye ya ebo niile nke Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa ha n’òkè n’òkè,+ 8 n’ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa na Shefila nakwa n’Araba nakwa n’ebe ndị dị ná mkpọda nakwa n’ala ịkpa nakwa na Negeb+—ndị Het, ndị Amọraịt+ na ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs:+
9 Eze Jeriko,+ otu; eze E-aị,+ nke dị n’akụkụ Betel, otu;
10 eze Jeruselem,+ otu; eze Hibrọn,+ otu;
11 eze Jamọt,+ otu; eze Lekish,+ otu;
12 eze Eglọn,+ otu; eze Giza,+ otu;
13 eze Diba, +otu; eze Gida, otu;
14 eze Họma, otu; eze Erad, otu;
15 eze Libna,+ otu; eze Adọlam, otu;
16 eze Makida,+ otu; eze Betel,+ otu;
17 eze Tapua, otu; eze Hifa,+ otu;
18 eze Efek, otu; eze Lasharọn, otu;
19 eze Medọn,+ otu; eze Hezọ,+ otu;
20 eze Shimrọn-mirọn, otu; eze Akshaf,+ otu;
21 eze Teanak, otu; eze Megido,+ otu;
22 eze Kidesh, otu; eze Jọkniam+ nke dị na Kamel, otu;
23 eze Dọọ nke dị na mkputamkpu ugwu nke Dọọ,+ otu; eze Goyim nke dị na Gilgal, otu;