Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ndị Eze 15
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ

      • Azaraya malitere ịchị Juda (1-7)

      • Ndị eze ikpeazụ chịrị Izrel bụ: Zekaraya (8-12), Shalọm (13-16), Menahem (17-22), Pekahaya (23-26), Pika (27-31)

      • Jotam malitere ịchị Juda (32-38)

2 Ndị Eze 15:1

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, Jeroboam nke Abụọ.

  • *

    Azaraya pụtara “Jehova Nyere Aka.” A kpọrọ ya Ọzaya ná 2 Eze 15:13; 2 Ihe 26:1-23; Aịza. 6:1; na Zek. 14:5.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:21
  • +2Ez 14:1
  • +2Ih 26:1, 3

2 Ndị Eze 15:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 26:4, 5

2 Ndị Eze 15:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 33:52
  • +Di 12:13, 14; 1Ez 22:41, 43; 2Ez 14:1, 4

2 Ndị Eze 15:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 12:10; 2Ez 5:27
  • +Le 13:45, 46
  • +2Ez 15:32
  • +2Ih 26:16-21

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    4/15/2015, p. 21

    8/1/2005, p. 11

2 Ndị Eze 15:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 26:22, 23

2 Ndị Eze 15:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 6:1

2 Ndị Eze 15:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:21
  • +2Ez 14:29

2 Ndị Eze 15:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 13:33; 14:16

2 Ndị Eze 15:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ho 1:4; Em 7:9
  • +Jos 17:11

2 Ndị Eze 15:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 10:30
  • +2Ez 13:1, 10; 14:23, 29

2 Ndị Eze 15:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 26:1

2 Ndị Eze 15:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 14:17; 15:21; 16:8, 17
  • +2Ez 15:10

2 Ndị Eze 15:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 13:33; 14:16

2 Ndị Eze 15:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 5:26
  • +2Ez 12:18; 16:8

2 Ndị Eze 15:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 23:35

2 Ndị Eze 15:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 15:14

2 Ndị Eze 15:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 13:33; 14:16

2 Ndị Eze 15:25

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 28:6

2 Ndị Eze 15:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 28:6; Aịz 7:1, 4

2 Ndị Eze 15:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 13:33; 14:16

2 Ndị Eze 15:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 16:7; 1Ih 5:6, 26; 2Ih 28:19, 20
  • +1Ez 15:20
  • +Jos 20:7, 9
  • +Ọg 32:40
  • +Aịz 9:1
  • +Le 26:38; Di 28:64; 2Ez 17:22, 23; Aịz 8:4

2 Ndị Eze 15:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 17:1
  • +2Ih 27:1

2 Ndị Eze 15:32

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 27:7; Mt 1:9
  • +2Ez 14:21

2 Ndị Eze 15:33

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 27:1

2 Ndị Eze 15:34

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 27:2

2 Ndị Eze 15:35

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 33:52; Di 12:14
  • +2Ih 27:3

2 Ndị Eze 15:37

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 15:27; 2Ih 28:6
  • +2Ez 16:5; Aịz 7:1, 2

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Eze 15:12Ez 14:21
2 Eze 15:12Ez 14:1
2 Eze 15:12Ih 26:1, 3
2 Eze 15:32Ih 26:4, 5
2 Eze 15:4Ọg 33:52
2 Eze 15:4Di 12:13, 14; 1Ez 22:41, 43; 2Ez 14:1, 4
2 Eze 15:5Ọg 12:10; 2Ez 5:27
2 Eze 15:5Le 13:45, 46
2 Eze 15:52Ez 15:32
2 Eze 15:52Ih 26:16-21
2 Eze 15:62Ih 26:22, 23
2 Eze 15:7Aịz 6:1
2 Eze 15:82Ez 14:21
2 Eze 15:82Ez 14:29
2 Eze 15:91Ez 12:28-30; 13:33; 14:16
2 Eze 15:10Ho 1:4; Em 7:9
2 Eze 15:10Jos 17:11
2 Eze 15:122Ez 10:30
2 Eze 15:122Ez 13:1, 10; 14:23, 29
2 Eze 15:132Ih 26:1
2 Eze 15:141Ez 14:17; 15:21; 16:8, 17
2 Eze 15:142Ez 15:10
2 Eze 15:181Ez 12:28-30; 13:33; 14:16
2 Eze 15:191Ih 5:26
2 Eze 15:192Ez 12:18; 16:8
2 Eze 15:202Ez 23:35
2 Eze 15:212Ez 15:14
2 Eze 15:241Ez 12:28-30; 13:33; 14:16
2 Eze 15:252Ih 28:6
2 Eze 15:272Ih 28:6; Aịz 7:1, 4
2 Eze 15:281Ez 12:28-30; 13:33; 14:16
2 Eze 15:292Ez 16:7; 1Ih 5:6, 26; 2Ih 28:19, 20
2 Eze 15:291Ez 15:20
2 Eze 15:29Jos 20:7, 9
2 Eze 15:29Ọg 32:40
2 Eze 15:29Aịz 9:1
2 Eze 15:29Le 26:38; Di 28:64; 2Ez 17:22, 23; Aịz 8:4
2 Eze 15:302Ez 17:1
2 Eze 15:302Ih 27:1
2 Eze 15:322Ih 27:7; Mt 1:9
2 Eze 15:322Ez 14:21
2 Eze 15:332Ih 27:1
2 Eze 15:342Ih 27:2
2 Eze 15:35Ọg 33:52; Di 12:14
2 Eze 15:352Ih 27:3
2 Eze 15:372Ez 15:27; 2Ih 28:6
2 Eze 15:372Ez 16:5; Aịz 7:1, 2
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
  • 35
  • 36
  • 37
  • 38
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ndị Eze 15:1-38

Ndị Eze nke Abụọ

15 N’afọ nke iri abụọ na asaa n’ọchịchị Jeroboam* eze Izrel, Azaraya*+ nwa Amazaya+ eze Juda malitere ịchị.+ 2 Ọ dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri ise na abụọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jekọlaya. Ọ bụ onye Jeruselem. 3 Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova otú Amazaya nna ya mere.+ 4 Ma, o bibighị ebe ndị dị elu.+ Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu.+ 5 Jehova mere ka eze rịawa ekpenta. Ọ rịagidekwara ya+ ruo ụbọchị ọ nwụrụ. O bikwa n’ụlọ a rụpụrụ iche.+ Jotam+ nwa ya nọzi na-ahụ maka otú ihe si na-aga n’ụlọ* ya, na-ekpekwara ndị obodo ahụ ikpe.+ 6 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Azaraya+ na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 7 Azaraya mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ,+ e lie ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid. Jotam nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.

8 N’afọ nke iri atọ na asatọ n’ọchịchị Azaraya+ eze Juda, Zekaraya+ nwa Jeroboam nọ na Sameria malite ịchị Izrel. Ọ chịkwara ọnwa isii. 9 Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, otú nna nna ya hà mere. Ọ hapụghị mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 10 Ka oge na-aga, Shalọm nwa Jebesh gbaara ya izu, gbuokwa ya+ n’Ibliam.+ Mgbe o gbuchara ya, ọ nọchiri ya, malite ịchị. 11 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Zekaraya n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 12 Otú a ka ihe Jehova gwara Jihu si mezuo. Ọ gwara ya, sị: “Ụmụ gị ndị nwoke ga-anọ n’ocheeze Izrel+ ruo ọgbọ anọ.”+ Ihe a mekwara otú ahụ.

13 Shalọm nwa Jebesh malitere ịchị n’afọ nke iri atọ na itoolu n’ọchịchị Ọzaya+ eze Juda. Ọ nọ na Sameria chịa otu ọnwa zuru ezu. 14 Menahem nwa Gedaị sizi Teza+ bịa gbuo Shalọm+ nwa Jebesh na Sameria. Mgbe o gbuchara ya, ọ nọchiri ya, malite ịchị. 15 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalọm na izu ọjọọ ọ gbara n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 16 Mgbe Menahem si na Teza pụta, ndị Tifsa emeghereghị ya ọnụ ụzọ ámá. N’ihi ya, ọ lụsoro Tifsa agha ma bibie ya, gbuokwa ndị niile bi na ya, nakwa ndị bi n’obodo ndị gbara ya gburugburu. Ọ bọwakwara ụmụ nwaanyị dị ime na Tifsa afọ.

17 N’afọ nke iri atọ na itoolu n’ọchịchị Azaraya eze Juda, Menahem nwa Gedaị malitere ịchị Izrel. Ọ nọkwa na Sameria chịa afọ iri. 18 Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. N’oge niile ọ dị ndụ, ọ hapụghị mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 19 Pul+ eze Asiria bịara ka ọ lụso ndị Izrel agha. N’ihi ya, Menahem nyere ya otu puku (1,000) talent* ọlaọcha, ka o nyere ya aka mee ka ọchịchị ya sie ike.+ 20 Otú Menahem si nweta ọlaọcha ahụ o nyere ya bụ na o kere ndị aka ji akụ̀ a ma ama+ nọ n’Izrel ụtụ. Ọ natara onye nke ọ bụla n’ime ha shekel* ọlaọcha iri ise ma nye ha eze Asiria. Eze Asiria hapụziri ịlụso obodo ahụ agha, laghachi. 21 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Menahem+ na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 22 Menahem mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, Pekahaya nwa ya anọchie ya, malite ịchị.

23 N’afọ nke iri ise n’ọchịchị Azaraya eze Juda, Pekahaya nwa Menahem nọ na Sameria malite ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. 24 Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Ọ hapụghị mmehie Jeroboam nwa Nibat mere, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 25 Ka oge na-aga, Pika+ nwa Remalaya, bụ́ osote onyeisi ndị agha ya, gbaara ya izu ma gbuo ya na Agọb na Araye n’ebe a rụsiri ike n’ụlọ* eze na Sameria. Ụmụ nwoke ndị Gilied iri ise sokwa ya. Mgbe Pika gbuchara Pekahaya, ọ nọchiri ya, malite ịchị. 26 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Pekahaya na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel.

27 N’afọ nke iri ise na abụọ n’ọchịchị Azaraya eze Juda, Pika+ nwa Remalaya malitere ịchị Izrel. Ọ nọkwa na Sameria chịa afọ iri abụọ. 28 Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Ọ hapụghị mmehie Jeroboam nwa Nibat mere, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ 29 N’oge Pika na-achị Izrel, Tiglat-piliza+ eze Asiria lụsoro obodo ụfọdụ agha ma weghara ha. Obodo ndị ahụ bụ Aịjọn, Ebel-bet-meaka,+ Janoa, Kidesh,+ Hezọ, Gilied,+ na Galili, ya bụ, obodo Naftalaị niile.+ Ọ dọkwaara ndị bi n’obodo ndị a n’agha laa Asiria.+ 30 Hoshia+ nwa Ịla mechakwara gbaara Pika nwa Remalaya izu ma gbuo ya. Ọ nọchikwara ya, malite ịchị n’afọ nke iri abụọ n’ọchịchị Jotam+ nwa Ọzaya. 31 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Pika na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel.

32 N’afọ nke abụọ n’ọchịchị Pika nwa Remalaya eze Izrel, Jotam+ nwa Ọzaya+ eze Juda malitere ịchị. 33 Ọ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jerusha nwa Zedọk.+ 34 Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova otú Ọzaya nna ya mere.+ 35 Ma, o bibighị ebe ndị dị elu. Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu.+ Ọ bụ ya rụrụ ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe mgbago n’ụlọ Jehova.+ 36 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jotam na ihe ndị o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. 37 N’oge ahụ, Jehova mere ka Rizin eze Siria na Pika+ nwa Remalaya malite ịlụso Juda agha.+ 38 Jotam mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ. E liri ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid bụ́ nna nna ya. Ehaz nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya