Nehemaya
10 Ndị bịanyere aka na ya+ bụ:
Nehemaya onye bụ́ gọvanọ,* nwa Hakalaya,
Na Zedekaya, 2 Seraya, Azaraya, Jeremaya, 3 Pash-họ, Amaraya, Malkaịja, 4 Hatọsh, Shebanaya, Malọk, 5 Herim,+ Meremọt, Obedaya, 6 Daniel,+ Ginetọn, Barọk, 7 Meshọlam, Abaịja, Mijamin, 8 Meazaya, Bilgaị, na Shemaya. Ha bụ ndị nchụàjà.
9 Ndị Livaị bịanyere aka na ya bụ: Jeshụa nwa Azanaya, Binuaị bụ́ otu n’ime ụmụ Henadad, Kadmiel,+ 10 na ụmụnne ha ndị nwoke bụ́ Shebanaya, Hodaya, Kelaịta, Peleya, Henan, 11 Maịka, Rihọb, Hashabaya, 12 Zakọ, Sherebaya,+ Shebanaya, 13 Hodaya, Benaị, na Benaịnu.
14 Ndị isi ndị bịanyere aka na ya bụ: Perọsh, Pehat-moab,+ Ịlam, Zatu, Benaị, 15 Bọnaị, Azgad, Bibaị, 16 Adọnaịja, Bigvaị, Edin, 17 Eta, Hezekaya, Azọ, 18 Hodaya, Heshọm, Bizaị, 19 Herif, Anatọt, Nibaị, 20 Magpiash, Meshọlam, Hiza, 21 Meshezabel, Zedọk, Jadua, 22 Pelataya, Henan, Anaya, 23 Hoshia, Hananaya, Hashọb, 24 Halohesh, Pilha, Shobek, 25 Rihọm, Hashabna, Measaya, 26 Ahaịja, Henan, Enan, 27 Malọk, Herim, na Beana.
28 Ndị ọzọ kwetakwara ihe ahụ e kpebiri. Ha bụ ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ndị na-abụ abụ, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* ndị niile kwụsịrị iso ndị bi n’ala ndị a emekọ ihe ka ha wee na-edebe Iwu ezi Chineke,+ ha na ndị nwunye ha, ụmụ ha ndị nwoke, na ụmụ ha ndị nwaanyị, na ndị niile ọzọ ma ihe ma na-aghọta ihe.* 29 Ha so ụmụnne ha, bụ́ ndị a ma ama, ṅụọ iyi ka ihe ọjọọ mee ha ma ọ bụrụ na ha edebeghị Iwu Jehova Onyenwe anyị, bụ́ ezi Chineke, nke o si n’aka Mosis ohu ezi Chineke nye ndị Izrel nakwa ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi n’iwu ya niile, n’ihe ndị o kpebiri, nakwa ná ntụziaka ya. 30 Anyị agaghị akpọnye ndị bi n’ala a ụmụ anyị ndị nwaanyị, anyị agaghịkwa alụtara ụmụ anyị ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị.+
31 Ọ bụrụ na ndị bi n’ala a ebute ngwá ahịa ha na ụdị ọka ọ bụla ka ha ree n’Ụbọchị Izu Ike, anyị agaghị azụ ha ihe ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike+ ma ọ bụ n’ụbọchị ọzọ dị nsọ.+ Anyị agaghị ewe ihe ubi n’afọ nke asaa,+ anyị ga-akagbukwa ụgwọ ọ bụla e ji anyị.+
32 Anyị kpebikwara na onye ọ bụla n’ime anyị ga na-enye otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu shekel* kwa afọ maka ozi a na-eje n’ụlọ* Chineke anyị,+ 33 maka achịcha a na-enye Chineke,+ maka àjà ọka a na-achụ mgbe niile,+ maka àjà a na-esu ọkụ mgbe niile n’Ụbọchị Izu Ike+ nakwa n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ maka oriri a na-eme n’oge a kara aka,+ maka ihe ndị dị nsọ, maka àjà mmehie+ e ji ekpuchiri Izrel mmehie, nakwa maka ọrụ niile a na-arụ n’ụlọ Chineke anyị.
34 Anyị fekwara nza ka a mata mgbe ezinụlọ nke ọ bụla ná ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị ọzọ ga na-ebute nkụ n’ụlọ Chineke anyị n’oge a kara aka, kwa afọ, ka e jiri ha na-esonye ọkụ n’ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke anyị otú e dere ya n’Iwu.*+ 35 Kwa afọ, anyị ga na-ewetakwa mkpụrụ mbụ kara aka ala anyị mepụtara nakwa mkpụrụ mbụ chara acha nke ụdị osisi ọ bụla mịrị n’ụlọ Jehova.+ 36 Anyị ga na-akpọtakwa ọkpara anyị ma na-eweta anụ e bu ụzọ mụọ n’anụ ụlọ anyị,+ otú e dere ya n’Iwu,* nakwa anụ e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi anyị na ìgwè ewu na atụrụ anyị. Anyị ga-eweta ha n’ụlọ Chineke anyị, nye ha ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọ Chineke anyị.+ 37 Anyị ga-ebutekwara ndị nchụàjà ntụ ọka si ná mkpụrụ mbụ anyị,+ butekwa onyinye anyị, mkpụrụ ụdị osisi ọ bụla mịrị,+ mmanya ọhụrụ, na mmanụ+ n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* n’ụlọ Chineke anyị,+ nyekwa ndị Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ala anyị mepụtara+ n’ihi na ọ bụ ndị Livaị na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri n’ebe niile a na-akọ ugbo n’obodo anyị.
38 Onye nchụàjà, bụ́ nwa Erọn, na ndị Livaị ga-anọ mgbe ndị Livaị ga-anata otu ụzọ n’ụzọ iri. Ndị Livaị ga-ewepụtakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ụzọ n’ụzọ iri ha natara+ ma weta ha n’ụlọ Chineke anyị, n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe.* 39 N’ihi na ọ bụ n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* ka ndị Izrel na ndị Livaị ga-eweta onyinye+ ọka,* mmanya ọhụrụ, na mmanụ.+ Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka arịa ndị e ji arụ ọrụ n’ebe nsọ dị, bụrụkwa ebe ndị nchụàjà ndị na-eje ozi, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, na ndị na-abụ abụ na-anọ. Anyị agaghị eleghara ụlọ Chineke anyị anya.+