Abụ Mgbago. Abụ Devid.
131 Jehova, adịghị m mpako.
Anaghị m ebuli onwe m elu.+
Anaghịkwa m achọ oké ihe+
Ma ọ bụ ihe ndị karịrị m.
2 Kama m weturu obi ala nọrọ jụụ+
Ka nwatakịrị a kwụsịrị ara nke ya na nne ya nọ.
Afọ juru m ka nwatakịrị a kwụsịrị ara.
3 Ka Izrel chere Jehova+
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.