14 Ebreham wee bilie n’isi ụtụtụ were achịcha na karama akpụkpọ mmiri nye Hega,+ dọkwasị ya n’ubu ya, kpọnyekwa ya nwata ahụ,+ wee chụpụ ya. O wee gawa, na-agagharị n’ala ịkpa Bia-shiba.+
30 Otú o sina dị, gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? “Chụpụ nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi na nwa ya, n’ihi na nwa nke nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi agaghị eso nwa nke nwaanyị ahụ nweere onwe ya bụrụ onye nketa ma ọlị.”+