Jenesis 28:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 Ya mere, Aịzik kpọrọ Jekọb wee gọzie ya ma nye ya iwu wee sị ya: “Esila n’etiti ndị inyom Kenan lụta nwaanyị.+ Diuterọnọmi 7:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Gị na ha agọkwala ọgọ. Akpọrọla nwa gị nwaanyị kpọnye nwa ya nwoke, alụtarala nwa gị nwoke nwa ya nwaanyị.+ 1 Ndị Kọrịnt 7:39 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 39 Iwu ji nwunye n’oge niile di ya dị ndụ.+ Ma ọ bụrụ na di ya adaa n’ụra ọnwụ, o nweere onwe ya ịlụ onye ọ chọrọ, naanị n’ime Onyenwe anyị.+ 2 Ndị Kọrịnt 6:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,+ nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu?+ Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?+
28 Ya mere, Aịzik kpọrọ Jekọb wee gọzie ya ma nye ya iwu wee sị ya: “Esila n’etiti ndị inyom Kenan lụta nwaanyị.+
3 Gị na ha agọkwala ọgọ. Akpọrọla nwa gị nwaanyị kpọnye nwa ya nwoke, alụtarala nwa gị nwoke nwa ya nwaanyị.+
39 Iwu ji nwunye n’oge niile di ya dị ndụ.+ Ma ọ bụrụ na di ya adaa n’ụra ọnwụ, o nweere onwe ya ịlụ onye ọ chọrọ, naanị n’ime Onyenwe anyị.+
14 Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,+ nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu?+ Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?+