15 ka gị na ndị bi n’ala ahụ wee ghara ịgba ndụ, n’ihi na ha na chi ha ga na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ,+ ha ga na-achụkwara chi ha àjà,+ mmadụ ga-akpọkwa gị, i wee rie ihe ha chụrụ n’àjà.+
14 Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,+ nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu?+ Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?+