Ọpụpụ 3:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Mmụọ ozi Jehova wee pụta ìhè n’ihu ya n’ire ọkụ n’etiti otu osisi ogwu.+ Ka ọ nọ na-ele anya, lee, ọkụ nọ na-enwu n’osisi ogwu ahụ ma o reghị osisi ogwu ahụ. Diuterọnọmi 4:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ ọkụ na-erepịa ihe,+ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.+ Ezikiel 1:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 M wee hụ ihe yiri ọla na-egbu maramara+ dị ka ọkụ gbaa gburugburu n’ime ya,+ malite n’ihe yiri úkwù ya gbagoo; malitekwa n’ihe yiri úkwù ya gbadaa, m hụrụ ihe yiri ọkụ, ìhè na-enwukwa gburugburu ya. Ndị Hibru 12:29 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 N’ihi na Chineke anyị bụkwa ọkụ na-erepịa erepịa.+
2 Mmụọ ozi Jehova wee pụta ìhè n’ihu ya n’ire ọkụ n’etiti otu osisi ogwu.+ Ka ọ nọ na-ele anya, lee, ọkụ nọ na-enwu n’osisi ogwu ahụ ma o reghị osisi ogwu ahụ.
24 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị bụ ọkụ na-erepịa ihe,+ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.+
27 M wee hụ ihe yiri ọla na-egbu maramara+ dị ka ọkụ gbaa gburugburu n’ime ya,+ malite n’ihe yiri úkwù ya gbagoo; malitekwa n’ihe yiri úkwù ya gbadaa, m hụrụ ihe yiri ọkụ, ìhè na-enwukwa gburugburu ya.