13 Ọ ga-ejikwa mmiri saa eriri afọ+ ya na ụkwụ ya;+ onye nchụàjà ga-eweta ha niile suree ha n’ọkụ+ n’elu ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà nsure ọkụ, àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.+
21 O wee jiri mmiri saa eriri afọ ya na ụkwụ ya, Mozis wee suree ebule ahụ dum n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà.+ Ọ bụ àjà a na-esure n’ọkụ ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ.+ Ọ bụ àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, dị ka Jehova nyere Mozis n’iwu.